Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Anyị Chọtara Ihe Anyị Na-achọ

Anyị Chọtara Ihe Anyị Na-achọ

Anyị Chọtara Ihe Anyị Na-achọ

Dị Ka Bert Tallman Si Kọọ

Ana m eji obi ụtọ echeta mgbe m bụ nwata nwoke ka na-eto eto n’ebe a na-akpọ Blood Reserve, bụ́ obodo Ndị Nwe Ala America, nke so ná Mba Blackfoot dị n’Alberta, Canada. Ebe anyị bi dịdebere Ugwu Rocky nke Canada na ọmarịcha Ọdọ Mmiri Louise.

N’EZINỤLỌ anyị, anyị dị ụmụ nwoke asaa na ụmụ nwaanyị abụọ. Mụ na ụmụnne m ndị nwoke na ndị nwaanyị na-anọkarị na nke nne m ochie. Ọ bụ nwaanyị na-arụsi ọrụ ike, ọ kụzikwaara anyị otú ọtụtụ ọgbọ ndị Blackfoot sirila bie ndụ tupu a mụọ anyị. Anyị mụtara otú e si atụtụ mkpụrụ osisi ndị a na-aracha aracha n’ọhịa, otú e si esi nri ndị obodo anyị, na otú e si akọ ugbo. Nna m ochie na papa m na-akpọ m aga nta na ịkụ azụ̀. Anyị na-egbu isi aba ọhịa na mgbada maka oriri nakwa maka akpụkpọ ha. Nne na nna anyị bụ ndị na-arụsi ọrụ ike, ha gbalịkwara ịhụ na ahụ́ ruru anyị ala. Ndụ m n’ebe ahụ anyị bi tọrọ m ụtọ.

Ma, ihe niile gbanwere mgbe nne m ochie nwụrụ n’afọ 1963. Adị m afọ ise mgbe ahụ, ọnwụ ya gbagwojukwara m anya. Ọ dịghị ihe a gwara m nke kasiri m obi. Ọbụna n’oge ahụ m dị obere, anọ m na-ajụ onwe m, sị, ‘Ọ bụrụ na Onye Okike dị, ebee ka ọ nọ? Gịnị mere mmadụ ji anwụ anwụ?’ Mgbe ụfọdụ, m na-amalite ibe ákwá arịrị. Ndị mụrụ m jụọ m ihe na-eme m, naanị ihe m na-agwa ha bụ na ahụ́ na-egbu m mgbu.

Otú Mụ na Ndị Ọcha Si Bie

Tupu nne m ochie anwụọ, anyị na ndị ọcha anaghị ahụkarị. Mgbe ọ bụla anyị hụrụ ha, ndị obodo anyị na-ekwu ihe ndị dị ka: “Lekwa ekwensu ọzọ, onye anyaukwu obi fere azụ. Omume ndị ọcha jọgburu onwe ya ná njọ.” A gwara m na ọ bụ naanị ndị ọcha ole na ole bụ ezigbo mmadụ nakwa na ha abụghị ndị e nwere ike ịtụkwasị obi. Ọ bụ ezie na ọ na-agụ m agụụ ịhụ ha, m na-akpachara anya mụ na ha imekọ ihe n’ihi na ndị ọcha bi n’ógbè anyị na-ejikarị anyị eme akaje ma na-akparị anyị.

Obere oge ka nne m ochie nwụchara, nne m na nna m malitere ịṅụbiga mmanya ókè, bụ́ nke mere ka oge ahụ bụrụ oge m kasị nọrọ ná mwute ná ndụ m. Mgbe m dị afọ asatọ, mmadụ abụọ bụ́ ndị ụka Mormon malitere ịbịa n’ụlọ anyị. Ha yiri ndị ezigbo mmadụ. Ndị mụrụ m nabatara aro ha tụrụ ka m sonye ná ndokwa nke ịkpọ ụmụaka aga ebe ọzọ. Otú m si ghọta ndokwa ahụ bụ na e mere ya iji mee ka ndụ ụmụ Ndị Nwe Ala America ka mma site n’ịkpọgara ha ndị ọcha ka ha na ha biri. Eleghị anya, n’ihi otú ihe si dịrị nne na nna m, ha chere na ọ ga-aka mma ka mụ na ezinụlọ ọzọ biri. O riri m ọnụ ma wute m n’ihi na anụla m ebe ndị mụrụ m na-ekwu na ndị ọcha abụghị ndị mmadụ ga-atụkwasị obi. Achọghị m ịga, achọkwara m otú m ga-esi zere ịga. N’ikpeazụ, ekwetara m ịga mgbe nne m na nna m mesiri m obi ike na nwanne m nwoke nke tọrọ m ga-eso m gaa.

Ma, mgbe anyị rutere Vancouver, nke dị na British Columbia, e kewara mụ na nwanne m nwoke ma kpọga m ebe dị otu narị kilomita site n’ebe ọ nọ! Obi gbawara m. Ọ bụ ezie na ezinụlọ m bi na nke ha bụ ndị ezigbo mmadụ, ibi ebe ahụ adịtụghịrị m mfe, egwu nọkwa na-atụ m. Emesịrị m laa mgbe ihe dị ka ọnwa iri gasịrị.

Alọghachikwutere M Ndị Mụrụ M

Ọ bụ ezie na ihe agbanwechabeghị n’ezinụlọ anyị, obi dị m ụtọ na m lọtara. Mgbe m dị ihe dị ka afọ iri na abụọ, ndị mụrụ m kwụsịrị ịṅụbiga mmanya ókè. Nke ahụ mere ka ahụ́ ruo m ala, ma n’oge ahụ, amalitela m ibi ndụ ọjọọ nke m n’ihi na amalitela m ịṅụ ọgwụ ọjọọ na ịṅụbiga mmanya ókè. Ndị mụrụ m gbara m ume ka m chọọ ihe ndị ọzọ m ga na-eji oge m eme, nke gụnyere ịnya oké ehi, bụ́ egwuregwu na-atọ m ụtọ. Ịnya oké ehi abụghị egwuregwu ndị obi na-akaghị. Amụtara m ịnọkwasị n’elu oké ehi nke na-amali elu ma na-amada ma jiri otu aka jide eriri e kere gburugburu afọ ya ruo tịnkọm tịnkọm asatọ ma ọ bụ karịa n’adapụghị.

Mgbe m dị afọ iri na ụma, ndị okenye agbụrụ anyị kụziiri m okpukpe ndị obodo anyị. Okpukpe a masịrị m nnọọ ebe ọ bụ na ọ dịchaghị ihe m ji okpukpe ndị a sịrị na ha bụ nke ndị ọcha kpọrọ. Agwara m onwe m na omenala ndị Blackfoot yiri ka ọ̀ na-akwado inwe obiọma na ikpe ikpe ziri ezi, bụ́ ihe ndị na-adịghị n’ọtụtụ okpukpe ndị a sịrị na ha bụ nke Ndị Kraịst. Ahụ́ na-eru m ala mgbe mụ na ndị obodo anyị nọ, otú ha si eme ihe ọchị na otú ezinụlọ na ndị enyi si akpachi anya tọkwara m ụtọ.

N’oge a, anụrụ m otú e sirila na-emegbu Ndị Nwe Ala America kemgbe ọtụtụ narị afọ. A gwara m na ndị ọcha bunyere anyị ọrịa ma gbuchapụ anụmanụ kasị enye anyị ego, bụ́ atụ. N’ezie, e kwuru na Colonel R. I. Dodge, nke so n’Òtù Ndị Agha U.S., kwuru, sị: “Gbuo atụ ọ bụla i nwere ike igbu. I gbuo otu atụ, i gbuola otu onye n’ime Ndị Nwe Ala America.” Anụrụ m na nke a mere ka ike ụwa gwụ ndị Blackfoot.

Ọzọkwa, ụfọdụ ndị ọchịchị na ndị okpukpe ha na ha jikọrọ aka agbaala nnọọ mbọ ịhụ na ha kesasịrị Ndị Nwe Ala America n’etiti ndị mba ọzọ ma gbanwee otú ha si ebi ndụ n’ihi na ha lere ha anya dị ka ndị ime ọhịa. Ha kweere na e kwesịrị ịgbanwe ihe niile gbasara ndị agbụrụ anyị—gụnyere omenala, nkwenkwe, àgwà, na asụsụ ha—iji mee ka ha yie ndị ọcha. Na Canada, a na-akparị ụfọdụ ụmụ Ndị Nwe Ala America n’ụlọ akwụkwọ ndị okpukpe nwe, bụ́ ndị nwere ebe a na-ebi ebi. Ndị ọzọ malitere ịṅụ ọgwụ ọjọọ, ime ihe ike, na igbu onwe ha—bụ́ nsogbu ndị ka dị n’ebe ụfọdụ ndị agbụrụ anyị bi taa.

Iji zere nsogbu ndị a, ụfọdụ Ndị Nwe Ala America gbahapụrụ omenala e ji mara ndị agbụrụ ha. Ha họọrọ ịdị na-asụrụ ụmụ ha Bekee kama ịsụrụ ha asụsụ ndị Blackfoot, ha malitekwara ịdị na-eme ihe ụfọdụ otú ndị ọcha si eme. Ma, kama a ga na-akwanyere ha ùgwù, ụfọdụ ndị ọcha na ndị obodo ha na-akparị ọtụtụ n’ime ha, na-ekwu na ha bụ Ndị Nwe Ala America n’elu ahụ́ ma na-eme ka ndị ọcha.

O wutere m ịhụ ụzọ dị iche iche ndị obodo anyị si na-ata ahụhụ. Ọ gụsiri m agụụ ike ịhụ ka ọnọdụ ha kara mma, ma ndị bi n’ebe anyị bi ma ndị ọzọ bi na Canada nakwa na United States.

Achọrọ M Inweta Azịza

Mgbe m dị ihe dị ka afọ iri na isii, m chere na ọ dịghị mgbe ndị ọzọ ga-ekwe ka mụ na ha na-emekọrịta ihe. Nke a mekwara ka m na-ewesokarị ndị mmadụ iwe. Amalitedịrị m ịkpọ ndị ọcha asị. Ma, ndị mụrụ m na nwanne papa m nke nwaanyị dụrụ m ọdụ ka m zere ịkpọasị na ịchọ imegwara ihe ọjọọ e mere m; kama nke ahụ, ha gbara m ume ịdị na-agbaghara ndị mmadụ ma na-ahụ ha n’anya, nakwa ịghara ikwe ka omume ndị kpọrọ ndị agbụrụ ọzọ asị wute m. Emesịrị m mụta na ndụmọdụ a kwekọrọ n’ụkpụrụ Baịbụl. Tụkwasị na nke ahụ, ọ ka nọ na-agụ m agụụ inweta azịza nke ajụjụ ndị nọ na-enye m nsogbu n’obi mgbe m dị obere. Amalitekwara m iche ihe mere anyị ji nọrọ n’ụwa na ihe mere ikpe na-ezighị ezi ka ji dịrị. Echeghị m na mmadụ ịdị ndụ ruo naanị obere oge ma nwụzie nwere isi. Ihe niile gbagwojuru m anya.

Mgbe ọ bụla Ndịàmà Jehova bịara n’ụlọ anyị, ọ bụ m ka a na-asị gaa mepere ha ụzọ. M na-akwanyere ha ùgwù n’ihi na o yighị m ka hà na-akpọ ndị agbụrụ ọzọ asị. Ọ bụ ezie na anaghị m ama otú m ga-esi dewe ọnụ jụọ ha ajụjụ ndị ahụ na-enye m nsogbu n’obi, mụ na ha na-ekwurịta nnọọ okwu nke ọma mgbe ọ bụla ha bịara. Echetara m otu mgbe John Brewster na Harry Callihoo, bụ́ Onyeàmà bụ́ onye Blackfoot, bịara na nke anyị. Anyị ji ogologo oge kwurịta okwu ka anyị na-aga ije n’elu ahịhịa. Anatara m ha otu akwụkwọ, m gụkwara ihe dị ka ọkara ya tupu ya efuo.

Amalitere M Egwuregwu nke Ịnya Oké Ehi

Agakwuuru m ndị tọrọ m bi n’ebe ahụ anyị bi ka ha dụọ m ọdụ. Ọ bụ ezie na ndụmọdụ ndị ha chere nnọọ echiche nye m masịrị m, enwetaghị m azịza ndị rijuru afọ maka ajụjụ ndị m nwere banyere ndụ. Mgbe m dị ihe dị ka afọ iri na isii, ahapụrụ m ụlọ ma jiri oge m niile na-egwu egwuregwu nke ịnya oké ehi. Ndị mmadụ na-aṅụbiga mmanya ókè ma na-aṅụ ọgwụ ọjọọ n’oriri ndị anyị na-eme mgbe anyị gwuchara egwuregwu ahụ. Akọ na uche m nọ na-ama m ikpe n’ihi na m maara na omume dị otú ahụ adịghị mma, anọkwa m na-eche na ụdị ndụ m na-ebi amasịghị Chineke. Mgbe mgbe, m na-ekpegara Onye Okike ekpere ka o nyere m aka ime ihe ziri ezi na ịchọta azịza nke ajụjụ ndị ka na-enye m nsogbu n’obi.

N’afọ 1978, mgbe m bi na Calgary, ezutere m otu nwa agbọghọ onye obodo anyị aha ya bụ Rose. Nne ya bụ onye Blackfoot ebe nna ya bụ onye Cree. Achọpụtara m na ihe ndị na-amasị m na-amasịkwa ya, ọ naghịkwa ara m ahụ́ ịgwa ya ihe dị m n’obi. Anyị bịara hụ nnọọ onwe anyị n’anya ma lụọ n’afọ 1979. Anyị mesịrị mụta nwa anyị nwaanyị bụ́ Carma na ọkpara anyị bụ́ Jared. Nwunye m bụụrụ m nnọọ ezigbo nwunye na onye inyeaka, bụrụkwa ezi nne. Otu ụbọchị, mgbe m kpọ ezinụlọ m gaa ileta deede m, ahụrụ m otu akwụkwọ aha ya bụ Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Ala. * Ihe m gụrụ na ya dọọrọ mmasị m ma yie ihe echiche dị na ya. Ma, ozugbo ọ dị m ka m̀ ghọtawala ihe Baịbụl na-ekwu, eruteziri m n’ebe peeji ụfọdụ nke akwụkwọ ahụ dọkapụrụ adọkapụ. Mụ na nwunye m gbara nnọọ ezigbo mbọ ịchọta peeji ndị ahụ dọkapụrụ adọkapụ, ma o nweghị isi. N’agbanyeghị nke ahụ, anọgidere m na-ekpe ekpere ka Chineke nyere m aka.

Otú Anyị Si Gaa na nke Onye Ụkọchukwu

N’oge opupu ihe ubi nke afọ 1984, nwunye m mụrụ nwa anyị nke atọ, bụ́ nwa anyị nwaanyị mara mma nke aha ya bụ Kayla. Ma, mgbe Kayla dị naanị ọnwa abụọ, ọrịa obi o bu pụta ụwa gburu ya. Obi gbawara anyị, amakwaghị m otú m ga-esi akasi nwunye m obi. Nwunye m mere ka m kweta iso ya gaa na nke onye ụkọchukwu chọọchị Katọlik bi n’ebe ahụ anyị bi iji nweta nkasi obi na azịza nke ajụjụ ndị na-enye anyị nsogbu n’obi.

Anyị jụrụ ya ihe mere obere nwa anyị nwaanyị ga-eji nwụọ nakwa ebe ọ gara. Ọ gwara anyị na Chineke kpọọrọ Kayla n’ihi na ọ chọrọ inwe mmụọ ozi ọzọ. Ajụrụ m onwe m, sị, ‘Olee otú Chineke ga-esi kpọrọ nwa anyị nwaanyị ka ọ bụrụ mmụọ ozi ya ma ọ bụrụ na ọ bụ Onye Okike Pụrụ Ime Ihe Niile? Olee uru obere nwa a ga-abara ya?’ Ụkọchukwu ahụ emepetụghị Baịbụl. Mgbe anyị si ebe ahụ laa, obi jọkwuru anyị njọ.

Ekpere Bụ Ihe Ji Anyị Ndụ

Otu ụtụtụ Monday ná ngwụsị November 1984, ekpetere m ekpere aka, na-arịọsi Chineke arịrịọ ike ka o nyere m aka imezi ndụ m, ịghọta ihe ndị na-emenụ, na ịghọta ihe bụ́ nzube nke ndụ. N’ụtụtụ ahụ, Diana Bellemy na Karen Scott, bụ́ mmadụ abụọ bụ́ Ndịàmà Jehova, kụrụ aka n’ọnụ ụzọ anyị. Ha nwere obi ọcha ma dị obiọma, ọ dịkwa ha ọkụ n’obi ịgwa m ihe ha ji bịa. Egere m ha ntị, nata ha otu Baịbụl na akwụkwọ aha ya bụ Nlanarị Baa n’Ime Ụwa Ọhụrụ, * kwerekwa ka Diana na di ya, bụ́ Darryl, bịaghachi n’oge ọzọ n’izu ahụ.

Ọ bụ mgbe ha lawara ka obi m gwara m na ọbịbịa ha ga-abụrịrị azịza nke ekpere m. Ọṅụ ekweghị m nọrọ ọdụ, m gara ruo n’isi ụlọ ebe a, mụ agara ruo n’isi nke ọzọ, na-eche ka nwunye m lọta ọrụ ka m kọọrọ ya ihe merenụ. O juru m anya mgbe nwunye m gwara m na yanwa nọkwa na-ekpe ekpere n’abalị bọtara ụbọchị ahụ, na-arịọ Chineke ka o nyere ya aka ịchọta nke bụ́ ezi okpukpe. Na Friday izu ahụ, e duziiri anyị ọmụmụ Baịbụl mbụ anyị. Anyị mechara nụ na n’ụbọchị ahụ Karen na Diana bịara na nke anyị, ha achọtalighị ụlọ ndị ha kwesịrị izi ozi ọma na ha. N’agbanyeghị nke ahụ, mgbe ha hụrụ ụlọ anyị, ya dị ha ka ọ̀ dị ihe gwara ha bịa zie anyị ozi ọma.

A Zara Ajụjụ M Niile n’Ikpeazụ!

Mgbe anyị malitere ịmụ Baịbụl, ọ gbagwojuru ndị ikwu na ibe anyị anya, ha kwụsịkwara imesapụrụ anyị ihu. Ha nwaziri ime ka anyị kwụsị site n’ịgwa anyị na anyị ji ndụ anyị eme ihe iberibe nakwa na anyị ejighị nkà ndị anyị nwere eme ihe n’ụzọ zuru ezu. N’agbanyeghị nke ahụ, anyị kpebisiri ike na anyị agaghị ahapụ Enyi ọhụrụ a anyị chọtara, bụ́ Onye Okike anyị bụ́ Jehova. A sị ka e kwuwe, anyị achọtala ihe dị oké ọnụ ahịa, ya bụ, eziokwu dị ebube na ihe omimi ndị dị nsọ dị n’Okwu Chineke, bụ́ Baịbụl. (Matiu 13:52) E mere mụ na nwunye m baptizim dị ka Ndịàmà Jehova na December 1985. Ndị ikwu anyị na-akwanyeziri nnọọ Ndịàmà Jehova ùgwù, n’ihi na ha ahụla otú ndụ anyị si ka mma kemgbe e mesịrị anyị baptizim.

Ee, achọtara m ihe m na-achọ! Baịbụl na-aza ajụjụ ndị gbara ọkpụrụkpụ n’ụzọ dị mfe ma doo anya. Obi dị m ụtọ mgbe m mụtara ihe bụ́ nzube nke ndụ, ihe mere anyị ji anwụ anwụ, nakwa nkwa Chineke kwere na anyị ga-ahụ ka nwa anyị nwaanyị bụ́ Kayla ga-eto n’ebe magburu onwe ya. (Jọn 5:28, 29; Mkpughe 21:4) Ka oge na-aga, amụtakwara m na anyị ekwesịghị imetọ ahụ́ anyị, jiri ndụ na-egwu egwú, ma ọ bụ na-asọ mpi. (Ndị Galeshia 5:26) Ịhapụ egwuregwu nke ịnya oké ehi siiri m ike, ma ekpebiri m ịhapụ ya iji mee ihe na-atọ Chineke ụtọ.

Ihe ọmụma ziri ezi nke sitere na Baịbụl atọhapụla anyị na nkwenkwe ụgha e ji kee ndị agbụrụ anyị agbụ, dị ka ikwere na ikwiikwii ịbịa na nke mmadụ na nkịta ibe ákwá ga-eme ka onye ezinụlọ mmadụ nwụọ. Anyị anazighị atụ ụjọ na mmụọ ndị a na-anaghị ahụ anya, bụ́ ndị dị n’ime ihe ndị dị ndụ na ihe ndị na-adịghị ndụ, nwere ike imerụ anyị ahụ́. (Abụ Ọma 56:4; Jọn 8:32) Anyị jizi ihe ndị magburu onwe ha Jehova kere kpọrọ ihe. Enwere m ndị enyi si n’ọtụtụ agbụrụ, bụ́ ndị m na-akpọ ụmụnna m, ha kwenyekwara na anyị niile ha nhata nakwa na anyị niile so na-ejere Chineke ozi. (Ọrụ 10:34, 35) Ọtụtụ n’ime ha na-agba mbọ ịmụ ihe banyere omenala na nkwenkwe nke Ndị Nwe Ala America na ịsụ asụsụ ndị Blackfoot ka ha wee nwee ike ikwusara ha ozi ọma otú ọ ga-eru ha n’obi.

Ezinụlọ anyị bi na Blood Reserve, n’ebe ndịda Alberta, bụ́ ebe anyị nwere obere ebe anyị na-akpa anụ ụlọ. Omenala Ndị Nwe Ala America ka na-atọ anyị ụtọ—bụ́ nke gụnyere nri na egwú ha. Anyị anaghị eso ha agba egwu ọdịnala ndị a na-agba n’ihu ọha, bụ́ ndị a na-akpọkwa powwow, ma, anyị na-aga elere ha mgbe ụfọdụ. M na-agbalịkwa ịkụziri ụmụ anyị omenala ndị obodo anyị na ụfọdụ ihe n’asụsụ ndị Blackfoot. Ihe e ji mara ọtụtụ ndị obodo anyị bụ àgwà ọma ndị dị ka obiọma, obi umeala, na ịhụnanya maka ndị ikwu na ibe ha. E jikwa ile ọbịa na ịkwanyere ndị mmadụ ùgwù mara ha, bụ́ nke gụnyere ịkwanyere ndị agbụrụ ọzọ ùgwù. M ka ji àgwà ndị a kpọrọ ihe, ha ka na-amasịkwa m.

Ihe kasị enye anyị obi ụtọ bụ iji oge na ihe onwunwe anyị enyere ndị ọzọ aka ịmata Jehova ma hụ ya n’anya. Nwa anyị nwoke, bụ́ Jared, na-eje ozi dị ka onye ọrụ afọ ofufo n’alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dịdebere Toronto. Enwere m ihe ùgwù nke ije ozi dị ka okenye n’ọgbakọ anyị bụ́ Ọgbakọ Macleod. Mụ na nwunye m na Carma bụkwa ndị ọsụ ụzọ oge niile, ya bụ, ndị na-ekwusa ozi ọma oge niile. Ọ na-enye anyị ọṅụ ikwusa ozi ọma n’asụsụ anyị. Obi na-atọ m ụtọ ịhụ ka ndị ọzọ na-anabata eziokwu banyere Onye Okike anyị na nzube ya.

Baịbụl kwuru banyere Jehova, sị: “Ọ bụrụ na ị chọọ ya, ọ ga-ekwe ka ị chọta ya.” (1 Ihe E Mere 28:9) Ekelere m ya na o mezuola nkwa ya site n’inyere mụ na ndị ezinụlọ m aka ịchọta ihe anyị na-achọ.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 22 Nke Ndịàmà Jehova bipụtara. A naghịzi ebipụta ya.

^ par. 27 Nke Ndịàmà Jehova bipụtara. A naghịzi ebipụta ya.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 27]

‘Ọ bụrụ na Onye Okike dị, ebee ka ọ nọ? Gịnị mere ndị mmadụ ji anwụ anwụ?’

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 30]

‘Ihe e ji mara ọtụtụ ndị obodo anyị bụ àgwà ndị dị ka obiọma na obi umeala’

[Foto dị na peeji nke 26]

Nne m ochie kụziiri m omenala ndị Blackfoot

[Foto dị na peeji nke 29]

Egwuregwu ịnya oké ehi riri m isi

[Foto dị na peeji nke 29]

Traktị pụrụ iche nke isiokwu ya bụ “You Can Trust the Creator” (Ị Pụrụ Ịtụkwasị Onye Okike Obi) dị n’asụsụ ndị Blackfoot nakwa n’asụsụ ndị ọzọ

[Foto dị na peeji nke 29]

M na-enwezi ọṅụ nke ịkụziri ndị ọzọ ihe ndị dị na Baịbụl

[Foto dị na peeji nke 29]

Mụ na ezinụlọ m ugbu a