Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Chineke Ọ̀ Na-anabata Ekpere E Ji Ihe Ndị A Na-ahụ Anya Kpee?

Chineke Ọ̀ Na-anabata Ekpere E Ji Ihe Ndị A Na-ahụ Anya Kpee?

Echiche Baịbụl

Chineke Ọ̀ Na-anabata Ekpere E Ji Ihe Ndị A Na-ahụ Anya Kpee?

Ndị okpukpe Buddha, ndị Hindu, ndị Alakụba, ndị na-ekpe okpukpe ndị Juu, ndị Roman Katọlik, na ndị Chọọchị Ọtọdọks nke Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa, na-ejicha ihe ndị a na-ahụ anya ekpe ekpere. N’ihi ya, ọtụtụ nde mmadụ nọ n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ná mba niile kweere na ihe ndị dị otú ahụ na-enyere ha aka ikpegara Chineke ekpere, inweta ihu ọma ya, ma ọ bụkwanụ ngọzi ya. Gịnị ka Baịbụl na-akụzi?

KEMGBE ọtụtụ puku afọ, ndị mmadụ ejirila ihe ndị a na-ahụ anya kpee ekpere. Dị ka ihe atụ, n’ebe obodo Ninive oge ochie dịbu, ndị ọkà mmụta ihe ochie gwupụtara “ụmụ nwaanyị abụọ a kpụrụ akpụ nwere nku bụ́ ndị nọ dị ka ndị na-ekpe ekpere n’ihu otu osisi dị nsọ; ha . . . ji ihe yiri ihe olu ma ọ bụ chaplet n’aka ekpe ha.”—Akwụkwọ nkà ihe ọmụma bụ́ The Catholic Encyclopedia.

Olee ihe e ji chaplet eme? Otu akwụkwọ nkà ihe ọmụma ahụ zara, sị: “Mgbe ọ bụla ọ dị mkpa ka e kpeghachi otu ekpere ọtụtụ ugboro, o yikarịrị ka ndị mmadụ hà ga-achọ inwe ihe ha ga-eji n’aka na-ekpeghachi ya, bụ́ nke ga-adịrị ha mfe karịa ịgụ mkpịsị aka ha.”

Ndị mmadụ na-eme ka ikpeghachi otu ekpere ọtụtụ ugboro dịkwuoro ha mfe site n’iji ihe a na-akpọ wiil ekpere ekpe ekpere. Mgbe ọ bụla a kwagharịrị wiil ahụ, ma è ji aka, ikuku, mmiri, ma ọ bụ ọkụ eletrik kwagharịa ya, a na-ewere ya na e kpeghachila ekpere ahụ. A na-ejikarị wiil ekpere ekpe ekpere ndị e dere ede. Ka anyị tụlee otú Chineke si ele ihe ndị dị otú ahụ anya.

“Ekwughachila Otu Ihe Ugboro Ugboro”

Jizọs Kraịst, bụ́ onye ọtụtụ nde ndị na-abụghị Ndị Kraịst kwetadịrị na ọ bụ onye amụma Chineke, kọwara otú Onye Okike si ele ikpeghachi ekpere ugboro ugboro anya, sị: “Mgbe ị na-ekpe ekpere, ekwughachila otu ihe ugboro ugboro, dị ka ndị mba ọzọ na-eme, n’ihi na ha na-eche na a ga-anụ olu ha n’ihi ọtụtụ okwu ha na-ekwu.” *Matiu 6:7.

Ya mere, ọ bụrụ na Chineke achọghị ka anyị ‘na-ekwughachi otu ihe ugboro ugboro,’ ọ̀ ga-achọ ka anyị jiri ihe ndị ahụ e ji na-emere ihe enyemaka n’ikpeghachi ekpere ugboro ugboro na-eme ihe? Ọ bụkwa ya mere na o nwetụghị ebe Baịbụl kwuru na onye ji ikwesị ntụkwasị obi na-ejere ezi Chineke ahụ ozi jitụrụ chaplet, wiil ekpere, ma ọ bụ ihe ọ bụla ọzọ dị otú ahụ kpee ekpere. Nke a ga-edokwudị anyị anya mgbe anyị ghọtara ihe ekpere bụ n’ezie na ihe mere anyị ji ekpe ekpere.

Ekpere Chineke Na-anụ

N’ekpere ihe nlereanya Jizọs, o kwuru kpọmkwem na Chineke bụ “Nna Anyị.” Ee, Onye kere anyị abụghị onye na-enweghị mmasị n’ebe anyị nọ ma ọ bụ ihe omimi a na-enweghị ike ịghọtacha aghọtacha, nke na a ghaghị iji ịgọ ọfọ, ememme dị iche iche, ma ọ bụ ekpere ndị e dere ede mee ka iwe ghara iwe ya. Kama nke ahụ, ọ bụ Nna anyị hụrụ anyị n’anya, ọ chọkwara ka anyị mata nke ahụ ma hụ ya n’anya n’ihi ya. Jizọs sịrị: “M hụrụ Nna m n’anya.” (Jọn 14:31) Otu onye amụma n’Izrel oge ochie kwuru, sị: “Jehova, ị bụ Nna anyị.”—Aịzaya 64:8.

Olee otú anyị nwere ike isi bịaruo Jehova nso dị ka Nna anyị nke eluigwe? (Jems 4:8) Dị ka ọ na-adị n’etiti mmadụ abụọ ọ bụla bụ́ enyi, anyị na-abịaru Chineke nso mgbe anyị na ya na-agwarịta ibe anyị okwu. Chineke “na-agwa” anyị “okwu” site na Baịbụl—bụ́ Okwu ya e dere ede—bụ́ ebe o kwuru ihe ndị ọ rụrụ, ụdị onye ọ bụ, na nzube ya. (2 Timoti 3:16) N’aka nke ọzọ, anyị na-agwa Chineke okwu site n’ikpegara ya ekpere, ma ọ bụ iji nkwanye ùgwù agwa ya okwu. O doro anya na ekpere dị otú ahụ kwesịrị isi n’obi, o kwesịghị ịbụ ihe e ji emezu iwu.

Tụlee nke a: N’ezinụlọ dị n’otu ebe onye ọ bụla hụrụ ibe ya n’anya, olee otú ụmụaka maara ihe ga na-esi agwa ndị mụrụ ha okwu? Hà ga na-ekwughachi otu ihe ugboro ugboro, ma eleghị anya jiri ihe na-agụ ugboro ole ha kwughachiri ya? Mbanụ! Kama nke ahụ, ha ga-esi n’obi ha kwuo okwu bara uru, kwuokwa ya otú ọ ga-egosi nsọpụrụ.

Ọ bụ otú ahụ ka ekpere anyị na-ekpegara Chineke kwesịkwara ịdị. N’eziokwu, anyị nwere ike ịgwa Chineke ihe ọ bụla na-echegbu anyị. Ndị Filipaị 4:6, 7 kwuru, sị: “Unu echegbula onwe unu banyere ihe ọ bụla, kama n’ihe niile, jirinụ ekpere na ịrịọsi arịrịọ ike na inye ekele mee ka Chineke mara ihe unu na-arịọ; udo nke Chineke . . . ga-eche obi unu na ike iche echiche unu nche.” Mgbe ihe na-echegbu anyị, anyị nwere nnọọ ike ikpe ekpere banyere ya ugboro ugboro. Ma, ime otú ahụ abụghị ikwughachi otu ihe ugboro ugboro.—Matiu 7:7-11.

Na Baịbụl, e nwere ọtụtụ ekpere ndị masịrị Chineke, bụ́ ndị gụnyere abụ ọma, na ekpere ndị Jizọs n’onwe ya kpere. * (Abụ Ọma nke 17 na nke 86, okwu mmeghe; Luk 10:21, 22; 22:40-44) Otu n’ime ekpere ndị ahụ Jizọs kpere dị na Jọn isi 17. Jiri nkeji ole na ole gụọ ya. Ka ị na-agụ ya, buru n’uche otú Jizọs si gwa Chineke okwu site n’ala ala obi ya. Ị ga-ahụkwa na ekpere ya abụghị naanị maka ọdịmma ya—hụkwa otú ekpere ahụ si gosi ịhụnanya dị ukwuu o nwere n’ebe ụmụazụ ya nọ. Ọ sịrị: “Nna dị nsọ, . . . chee ha nche n’ihi ajọ onye ahụ,” bụ́ Setan.—Jọn 17:11, 15.

Ọ̀ dị ihe Jizọs kwuru n’ekpere ahụ nke yitụdịrị ihe na-esighị ya n’obi ma ọ bụ ihe o bu n’isi? Ọ dịtụghị ihe dị otú ahụ dị na ya! Nke ahụ bụ nnọọ ihe nlereanya magburu onwe ya ọ hapụụrụ anyị! Ee, ndị niile chọrọ ịbịaru ezi Chineke ahụ nso kwesịrị ịmata onye ọ bụ nke ọma. Ịhụnanya ha nwere n’ebe ọ nọ n’ihi ihe ndị ha mụtarala banyere ya ga-emezi ka ha jụ omenala okpukpe ndị na-akpasu Chineke iwe. Jehova gwara ndị dị otú ahụ, sị: “M ga-abụkwara unu nna, unu ga-abụkwara m ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.”—2 Ndị Kọrịnt 6:17, 18.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 8 N’ekpere nlereanya Jizọs, o kwughị, sị: “Ya mere, kpeenụ ekpere a,” bụ́ nke na-agaraghị ekwekọ n’ihe ọ ka kwupụrụ. Kama nke ahụ, ọ sịrị: “Ya mere, kpeenụ ekpere otú a.” (Matiu 6:9-13) Gịnị ka ọ chọrọ ịkụziri anyị? Dị ka ekpere nlereanya ahụ na-egosi, anyị kwesịrị ibute ihe ndị gbasara ofufe anyị na-efe Chineke ụzọ kama ibute mkpa anụ ahụ́ anyị ụzọ.

^ par. 15 Ọ bụ ezie na n’oge ochie a na-abụ abụ ọma n’oge dịgasị iche iche, a naghị abụghachi ha ọtụtụ ugboro otú e si ekpeghachi ekpere ndị e dere ede, e jighịkwa ha kpee ụdị ekpere ndị a na-eji chaplet ma ọ bụ wiil ekpere ekpe.

Ì CHETỤLA NKE A N’ECHICHE?

▪ Ò nwere otú ndụmọdụ Jizọs nyere ka a ghara ikwughachi otu ihe ugboro ugboro n’ekpere si gbasa iji chaplet na wiil ekpere ekpe ekpere?—Matiu 6:7.

▪ Olee ihe ekpere anyị kwesịrị igosi banyere otú anyị si were Chineke?—Aịzaya 64:8.

▪ Ọ bụrụ na anyị ajụ ụgha ndị a na-akụzi n’okpukpe, olee otú Chineke ga-esi were anyị?—2 Ndị Kọrịnt 6:17, 18.