Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ikiri Ụwa

Ikiri Ụwa

Ikiri Ụwa

N’ime afọ iri abụọ gara aga, ọnụ ọgụgụ nke ọdachi ndị na-emere onwe ha amụbaala okpukpu anọ. Ọ na-emetụta ihe karịrị narị nde mmadụ abụọ na nde iri ise kwa afọ.—EL UNIVERSAL, MEXICO.

“Ruo ọtụtụ afọ ugbu a, otu ụdị ikuku kasị eku n’ógbè Pacific ejirila nwayọọ nwayọọ bukọta ọtụtụ ihe mkpofu n’otu ebe.” Ala ihe mkpofu ndị a weere ahala ka mba Australia.—LA DÉPÊCHE DE TAHITI, TAHITI.

Ọ na-ewe ọka dị narị kilogram abụọ n’arọ—“bụ́ ọka ga-ezuru otu onye nri ruo otu afọ!”—iji mepụta lita iri ise nke mmanụ otu obere ụgbọala ga-eji rụọ ọrụ.—GAZETA WYBORCZA, POLAND.

Baịbụl Ndị E Bipụtara na China

Ye Xiaowen, bụ́ onyeisi nke Ụlọ Ọrụ Gọọmenti Na-ahụ Maka Ihe Ndị Metụtara Okpukpe na China, kwuru, sị: “China aghọọla otu n’ime mba ndị kasị ebipụta Baịbụl n’ụwa niile.” Otu ụlọ ọrụ na-ebi akwụkwọ na China, nke dị na Nanjing, bụ́ isi obodo nke Jiangsu Province, bipụtara Baịbụl nke mere ya nde Baịbụl iri ise mba ahụ bipụtarala. Otu ebe a na-edebe ihe n’Ịntanet bụ́ People’s Daily Online kwuru na “kemgbe afọ ole na ole gara aga, [ụlọ ọrụ] ahụ na-ebipụta ihe dị ka nde Baịbụl atọ kwa afọ.” A na-akọ na ọnụ ọgụgụ ndị sị na ha bụ Ndị Kraịst na China na-arị elu.

Ha Ejighị Anya Ahụ Ihe Oyiyi

Akwụkwọ akụkọ bụ́ Russky Newsweek kwuru, sị: “N’ime afọ ise gara aga, e zuola ihe karịrị otu puku chọọchị ohi na Russia. A gwara Ụlọ Ọrụ Gọọmenti Russia Na-ahụ Maka Ihe Ndị Na-eme n’Ime Obodo na e zuola ihe dị ka ihe oyiyi dị nde iri anọ. Ugbu a, Ụlọ Ọrụ ahụ na Chọọchị Ọtọdọks nke Russia ekwekọrịtala na ihe oyiyi niile ndị chọọchị nwe ga na-ebuzi akara pụrụ iche a ga-eji na-amata ha, bụ́ nke e nwere ike ịhụ naanị ma e jiri ụdị ọkụ pụrụ iche lee ha. Nke a ga-enyere ndị uwe ojii aka ịmata ndị nwe ihe oyiyi ndị a chọtara. Akwụkwọ akụkọ Russky Newsweek ahụ kwuru na Onyeisi Chọọchị Ọtọdọks na Moscow nabatara atụmatụ a “ebe ọ bụ na ịkanye ihe oyiyi ndị ahụ akara ‘ụwa’ agaghị egbochi ha ịrụ ọrụ ebube.”

Agha Na-amịkọrọ Ihe Niile Africa Nwere

Akwụkwọ akụkọ bụ́ International Herald Tribune kwuru, sị: “N’agbata afọ 1990 na afọ 2005, mba iri abụọ na atọ dị n’Africa nọ na-alụ agha, ego ha mefuru na ha dịkwa narị ijeri dọla US atọ.” Onyeisi ala mba Liberia bụ́ Ellen Johnson-Sirleaf kwuru, sị: “Ego Africa na-emefu n’agha ezuola iji kwụsị nsogbu ọrịa o biri n’ájá ọcha n’Africa, ma ọ bụ ịzụ ndị mmadụ n’ụlọ akwụkwọ, inye ha mmiri ọṅụṅụ, na igbochi ma gwọọ ọrịa ụkwara nta na ịba. A gaara eji ha rụọ ọtụtụ puku ụlọ ọgwụ, ụlọ akwụkwọ, na okporo ụzọ.” Akwụkwọ akụkọ ahụ kwuziri na e wezụga agha, Africa “gaara abụ kọntinent bara ọgaranya kama ịbụ kọntinent kasị daa ogbenye n’ụwa.”

Ihitụ Obere Ụra Nwere Ike Ịbara Gị Uru

Nnyocha e ji ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị ndị Gris dị puku iri abụọ na atọ mee gosiri na ihitụ obere ụra n’ehihie ugboro atọ n’izu nwere ike ime ka ọnụ ọgụgụ ndị nkụchi obi na-egbu jiri pasent iri atọ na asaa belata. Dimitrios Trichopoulos, bụ́ onye nchọpụta na ọkachamara n’ihe banyere ọrịa na-efe efe n’Ụlọ Akwụkwọ Harvard Maka Ahụ́ Ike Ọhaneze, nke dị na U.S.A., kọwara, sị: “E nwere ọtụtụ ihe ndị na-egosi na e nwere ihe jikọrọ ọrịa obi na nchegbu, ma oké nchegbu ma nchegbu na-anaghị ala ala.” O kwuru, sị: “Ụra ehihie nwere ike ibelata nchegbu [na] ọnụ ọgụgụ ndị na-anwụ n’ihi ọrịa obi.”