M̀ kwesịrị ikwu ihe ọjọọ enyi m mere?
Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị
M̀ kwesịrị ikwu ihe ọjọọ enyi m mere?
“O siiri m nnọọ ike. Onye a bụ ezigbo enyi m.”—James. *
“Ihe adịtụghị nnọọ mfe na mbụ. Ndị enyi m lewere m anya dị ka onye ọjọọ n’ihi na m kwuru ihe ọjọọ ha mere.”—Ann.
BAỊBỤL kwuru, sị: “E nwere enyi nke na-arapara n’ahụ́ karịa nwanne.” (Ilu 18:24) Ị̀ chọtala ụdị enyi ahụ? Ọ bụrụ na ị chọtala, ị chọtara ezigbo ihe.
Ma gịnị ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na enyi gị kpọrọ onwe ya Onye Kraịst emee ihe ọjọọ? Dị ka ihe atụ, gịnị ma ọ bụrụ na o mere omume rụrụ arụ, see sịga, ṅụbiga mmanya ókè, ṅụọ ọgwụ ike, ma ọ bụ mee ihe ọzọ dị oké njọ? (1 Ndị Kọrịnt 6:9, 10; 1 Timoti 1:9, 10) Gịnị ka i kwesịrị ime? Ị̀ ga-ajụ enyi gị ihe ahụ o mere? Ị̀ ga-agwa ya ndị mụrụ gị? Ị̀ ga-agwa ya nne na nna enyi gị? Ị̀ ga-agwa ya okenye ọgbakọ? * Ọ bụrụ na i kwuo ihe ahụ o mere, ùnu ka ga-abụkwa enyi? Ọ̀ ga-aka mma ịgbachiri ụwa gị nkịtị?
Ọ̀ Bụ M Kwuo Ka Ọ̀ Bụ M Gba Nkịtị?
O nweghị onye na-anaghị emehie ihe. N’ezie, Baịbụl kwuru, sị: “Mmadụ niile emehiewo, ha adịghịkwa eru ebube Chineke.” (Ndị Rom 3:23) Ma ụfọdụ na-adaba ná mmehie dị oké njọ. Ndị ọzọ ‘na-azọhie ụkwụ’ nke nwere ike iduga ha ná nsogbu ndị ka njọ ma ọ bụrụ na e lebaraghị ya anya. (Ndị Galeshia 6:1) Ka anyị tụlee ihe a mere eme.
▪ Otu nwa agbọghọ bụ́ Onye Kraịst aha ya bụ Susan chọpụtara na enyi ya nwaanyị, bụ́kwa Onye Kraịst, nwere ebe ọ na-edebe ihe n’Ịntanet nke foto ndị na-akpali agụụ mmekọahụ na egwú ndị na-ekwu banyere mmekọahụ dị na ya.
․․․․․
Chebara ajụjụ ndị a echiche: Gịnị ka ị ga-eme ma ị bụrụ Susan? Ị̀ ga-eme ihe banyere ihe ahụ ị chọpụtara? Ka ị̀ ga-agwa onwe gị na ihe enyi gị
tinyere n’ebe ọ na-edebe ihe n’Ịntanet gbasara ya, na ọ dịghị onye ọzọ ọ gbasara? Ọ bụrụ na Susan abịakwute gị ka ị dụọ ya ọdụ, gịnị ka ị ga-agwa ya?Ihe Susan mere: Mgbe Susan chebachaara ihe ahụ echiche, o kpebiri ịkọrọ ya nne na nna enyi ya nwaanyị. O kwuru, sị: “Ezigbo ụjọ tụrụ m, n’ihi na ha bụkwa ezigbo ndị enyi m. O siiri m nnọọ ike ịkọrọ ha ya nke na ebewere m ákwá.”
Gịnị ka i chere? Ihe ahụ Susan mere ò kwesịrị ekwesị? Ka ọ̀ gaara aka mma ka ọ gbachi nkịtị?
Iji nyere gị aka ịma ihe ka mma ime n’okwu a, ka anyị tụlee ụfọdụ ihe ndị e kwesịrị ichebara echiche:
Gịnị ka ezigbo enyi ga-eme? Ilu 17:17 na-ekwu, sị: “Ezi enyi nwere ịhụnanya mgbe niile, ọ bụkwa nwanne a mụrụ maka oge nsogbu.” Mgbe mmadụ mewere ihe Baịbụl na-akwadoghị, onye ahụ nọ ‘ná nsogbu,’ ma ọ̀ maara, ma ọ bụ na ọ maghị. Ọ bụ ezie na ọ dịghị mma mmadụ ịbụ “onye ezi omume gabiga ókè” site n’inyochawa obere ihe ọ bụla, ezigbo enyi agaghị eleghara àgwà ọjọọ enyi ya na-akpa anya. (Ekliziastis 7:16) Ọ gadịghị echewe echiche ileghara omume ọjọọ ahụ anya.—Levitikọs 5:1.
Ya bụrụkwanụ gị? Jụọ onwe gị, sị: ‘Ọ bụrụ na m bụ nne ma ọ bụ nna, nwa m enweekwa ebe ọ na-edebe ihe n’Ịntanet nke ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ dị na ya, m̀ ga-achọ ka a gwa m banyere ya? Olee otú ọ ga-adị m ma ọ bụrụ na nwa m nwere enyi maara ihe na-emenụ ma gbachi nkịtị?’
Olee ihe Okwu Chineke kwuru? Nke a abụghị oge ịgba nkịtị. Kama nke ahụ, i kwesịrị irubere iwu Chineke ndị dị na Baịbụl isi. Nke bụ́ eziokwu bụ na mgbe ọ bụla i mere ihe dị mma, ị na-eme ka obi Onye kere gị ṅụrịa. (Ilu 27:11) Ọzọkwa, obi na-eru gị ala n’ihi na ị maara na ihe i mere bụ ihe ga-akasị abara enyi gị uru.—Ezikiel 33:8.
“Oge Ikwu Okwu”
Baịbụl kwuru na e nwere “oge ịgbachi nkịtị na oge ikwu okwu.” (Ekliziastis 3:7) Obere ụmụaka adịghị amakarị mgbe ha kwesịrị ịgbachi nkịtị na mgbe ha kwesịrị ikwu okwu. Mgbe enyi ha mere ihe ọjọọ, ha na-eche, sị: ‘Achọghị m itinye enyi m ná nsogbu’ ma ọ bụ ‘Achọghị m ka mụ na enyi m see okwu.’ Ọ bụrụ na ọ bụ naanị ihe ndị a ka mmadụ kwesịrị ichebara echiche, ihe ị ga-eme doro anya—ọ ga-abụ “oge ịgbachi nkịtị.”
Ma, ka ị na-eto, ị na-amalite ile ihe ndị dị otú ahụ anya dị ka onye toro eto. Ị na-aghọta na enyi gị abanyela ná nsogbu abanye nakwa na ọ dị mkpa ka e nyere ya aka—ikekwe, ọ bụ gị nwere ike inyere ya aka inweta enyemaka ahụ. Ma, gịnị kpọmkwem ka i nwere ike ime ma ị nụ na enyi gị mere ihe megidere iwu ma ọ bụ ụkpụrụ Baịbụl?
Nke mbụ, chọpụta ma ihe ị nụrụ ọ̀ bụ eziokwu. O nwere ike ịbụ naanị asịrị. (Ilu 14:15) Otu nwata nwaanyị dị afọ iri na ụma nke aha ya bụ Katie chetara ihe mere n’otu oge wee, sị: “Otu enyi m malitere iji m agba asịrị, ndị maara m nke ọma chekwara na ihe ọ na-ekwu bụ eziokwu. Egwu bịara tụwa m na ọ dịghị onye ga-ekweta ihe m kwuru!” Baịbụl buru amụma na Jizọs ‘agaghị adọ aka ná ntị naanị dị ka ihe ntị ya nụrụ si dị’—ma ọ bụ dị ka e si dee ya na Baịbụl bụ́ Contemporary English Version, ọ “gaghị . . . ege asịrị.” (Aịzaya 11:3) Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta na nke a? Adịla ngwa ikwere na ihe ọ bụla ị nụrụ bụ eziokwu. Gbalịa chọpụta nke bụ́ eziokwu. Ka anyị tụlee otu akụkọ mere eme.
▪ James, bụ́ onye a kpọrọ aha ná mmalite isiokwu a, nụrụ na ezigbo enyi ya ṅụrụ ọgwụ ike n’ebe ọ gara oriri.
Chebara ajụjụ ndị a echiche: Gịnị ka ị ga-eme ma ị bụrụ James? Olee otú i nwere ike isi mata ma ihe ị nụrụ ọ̀ bụ eziokwu?
․․․․․
Ihe James mere. Na mbụ, James mere ka à ga-asị na o nweghị ihe ọ nụrụ nakwa na ya amaghị ihe na-aganụ. O kwuru, sị: “Akọnuche m maliteziri inye m nsogbu. Amaara m na m kwesịrị ịjụ enyi m ihe ahụ m nụrụ.”
Gịnị ka i chere? Olee uru ndị ọ ga-aba ma i buru ụzọ jụọ onye a sị na o mere ihe ọjọọ ma ò mere ya?
․․․․․
Ọ bụrụ na ọ na-esiri gị ike ịjụ onye ahụ banyere ya, olee ihe ọzọ i nwere ike ime?
․․․․․
Enyi James kwetara na ya ṅụrụ ọgwụ ike n’ebe ya gara oriri. Ma, ọ rịọziri James ka ọ ghara ịkọrọ ya onye ọzọ. James chọrọ ime ihe ziri ezi. Ma, ọ chọkwara ka enyi ya mee ihe ziri ezi. N’ihi ya, ọ gwara enyi ya na ya ga-enye ya otu izu ka ọ gaa kọọrọ ya ndị okenye ọgbakọ ya. Na ọ bụrụ na o meghị otú ahụ, na ya ga-akọziri ya ndị okenye n’onwe ya.
Ì chere na ihe James mere dị mma? Gịnị mere i ji chee na ọ dị mma ma ọ bụ na ọ dịghị mma?
․․․․․
Enyi James agakwughị ndị okenye, n’ihi ya, James gaziri kọọrọ ha ya. Ma, ka e mechara, enyi ya ghọtara onwe ya. Ndị okenye nyeere ya aka ịhụ mkpa ọ dị ichegharị ma mee ka ya na Jehova dịghachi ná mma.
Ị̀ Bụ Onye Asịrị?
Ma, i nwere ike iche, sị: ‘Ḿ gaghị abụ onye asịrị ma m kọọ ihe ọjọọ enyi m mere? Ọ́ gaghị aka mma ime ka ọ dịghị ihe m maara banyere ya?’ Ọ bụrụ na ị hụ onwe gị n’ụdị ọnọdụ a, gịnị ka i nwere ike ime?
Nke mbụ, cheta na ime ihe ọma anaghị adị mfe mgbe niile; ọ bụghịkwa mgbe niile ka ihe dị mfe omume na-abụ ihe ọma. Mmadụ ikwu ihe ọjọọ enyi ya mere chọrọ obi ike. Gịnị ma i kpegara Chineke ekpere banyere ya? Rịọ ya ka o nye gị amamihe na obi ike iji mee ihe dị mma n’anya ya. Ọ ga-enyere gị aka.—Ndị Filipaị 4:6.
Nke abụọ, chee banyere uru ọ ga-abara enyi gị ma i kwuo ihe ahụ merenụ. Dị ka ihe atụ, ka e were ya na gị na enyi gị so na-akpọda otu ugwu, enyi gị azọhie ụkwụ ma daba n’ebe miri emi. O doro anya na enyemaka dị enyi gị ahụ mkpa. Gịnịkwanụ ma ọ bụrụ na enyi gị ejiri ihere sị gị hapụ ya ka ya jiri aka ya rịgote? Ị̀ ga-ekwe ya mee ihe ahụ nwere ike ịkpatara ya ọnwụ?
E nwere ike iji nke ahụ tụnyere mgbe enyi gị mere ihe Baịbụl na-akwadoghị. O nwere ike iche na ya ga-emeli ka ya na Jehova dịghachi ná mma n’enweghị onye nyeere ya aka. Ma nke ahụ bụ echiche iberibe. Ọ bụ eziokwu na ihe ahụ merenụ nwere ike ịdị na-eme enyi gị ihere. Ma, ịgwa mmadụ ka o nyere enyi gị aka nwere ike ịzọpụta ndụ enyi gị!—Jems 5:15.
N’ihi ya, ụjọ atụla gị ikwu okwu ma ọ bụrụ na enyi gị mere ihe ọjọọ. Ọ bụrụ na i mee ka e nyere ya aka, ị na-egosi na ị hụrụ Jehova Chineke nakwa enyi gị n’anya, otu ụbọchị, enyi gị ahụ nwekwara ike ikele gị maka otú i si jiri ịhụnanya nyere ya aka.
Ị gaa n’Ịntanet, ị ga-enweta ihe ndị ọzọ a tụlerela n’isiokwu bụ́ “Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị” n’adres bụ́ www.watchtower.org/ype
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
^ par. 3 A gbanwere aha ndị dị n’isiokwu a agbanwe.
^ par. 6 N’etiti Ndịàmà Jehova, ndị okenye bụ ndị na-enyere ndị dabara ná mmehie dị oké njọ aka ka ha na Chineke dịghachi ná mma.—Jems 5:14-16.
IHE Ị GA-ECHEBARA ECHICHE
▪ Olee otú ime ka a mara ihe ọjọọ enyi gị mere si egosi na ị hụrụ enyi gị n’anya?
▪ Olee ndị a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl i nwere ike icheta, bụ́ ndị nọ na-eche ma hà ga-ekwu ihe ọjọọ enyi ha mere ka ha ga-agba nkịtị? Olee ihe i nwere ike ịmụta n’aka ha?
[Foto dị na peeji nke 20]
Ọ bụrụ na enyi gị tinyere aka n’àgwà na-ekwesịghị Onye Kraịst, ọ dị mkpa ka ị hụ na o nwetara enyemaka