Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Mgbe Inwe Ihe Ịga nke Ọma Na-esi Ike

Mgbe Inwe Ihe Ịga nke Ọma Na-esi Ike

Mgbe Inwe Ihe Ịga nke Ọma Na-esi Ike

Mgbe ọ nọ n’agbata afọ iri abụọ na iri abụọ na atọ, ọ ghọọla ọpụrụiche n’ịgụ egwú, baakwa ezigbo ọgaranya. Ọ bụ mmadụ ole na ole na-aghọ ndị a ma ama na ọgaranya otú ahụ mgbe ha ka nọ n’afọ ndụ ahụ ọ nọ. Ma ndụ ya maliteziri ịghasa. Mgbe ọ gbasịrị alụkwaghịm ugboro abụọ, e nyere ya àkwà n’ụlọ ọgwụ ebe a na-agwọ ndị mmanya na ọgwụ ọjọọ riri ahụ́. Ndụ ya ghasasịrị.

Ọ DỊ mwute na ihe a mere nwa agbọghọ a na-emekwa ọtụtụ ndị; akụkọ ọjọọ banyere ndị a ma ama na-agba n’akwụkwọ akụkọ mgbe niile. Ọbụna n’etiti ndị ọchụ nta ego a na-adịghị anụkarị aha ha, ndị o yiri ka ihe ọ̀ na-agara nke ọma na-enwekarị nsogbu ná ndụ ha. Otu akwụkwọ akụkọ kwuru banyere ndị ọchụ nta ego na-ewu ewu na New York City, sị: “Ọchịchọ inwe oké uru ahịa na-emebiri ndị mmadụ ahịa, na-etisa ezinụlọ, na-emekwa ka ọtụtụ mmadụ na-agbapụ ndị na-ere ọgwụ ọjọọ aka ahịa . . . Ọ bụ ezie na oké uru ahịa ụfọdụ ndị ụlọ akụ̀ ha dị na Wall Street, bụ́ ebe bụ́ isi a na-azụ ahịa n’America, na-enweta na-eme ka ha chee na ọ dịghị onye ha na ha hà, obi na-eko ndị ọzọ n’elu ebe ha na-agbalị ịdị na-eme nke ọma dị ka ibe ha, ụlọ akụ̀ ụfọdụ na-adakwa.”

Ihe kpatara nsogbu ndị a ọ̀ bụ na ndị mmadụ na-achọ inwe obi ụtọ na ihe ịga nke ọma n’ụzọ na-ezighị ezi? N’eziokwu, ego dị anyị mkpa ná ndụ. Ma ọ̀ bụ ịba ọgaranya ga-eme ka anyị nwee ihe ịga nke ọma ná ndụ? Nchọpụta ndị e mere gosiri na ọ bụghị ya. Dị ka ihe atụ, otu nnyocha e mere na China gosiri na n’oge na-adịbeghị anya bụ́ mgbe ego ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ na-akpata rịrị elu okpukpu abụọ na ọkara, ndị mmadụ enwechakwaghị afọ ojuju ná ndụ otú ha nweburu.

Ebe ọ dị otú ahụ, ọ pụtaranụ na ihe na-egosi na mmadụ nwere ezi ihe ịga nke ọma ga-abụrịrị ihe dị mkpa karịa ụdị ọrụ ego onye ahụ na-arụ na ụlọ ego ole, ụgbọala ego ole, ma ọ bụ elekere aka ego ole o nwere. Ọ́ gaghị aka mma iji ụdị onye mmadụ bụ, gụnyere ụkpụrụ ndị ọ na-agbaso ná ndụ na nzube ya ná ndụ, mata ma ò nwere ihe ịga nke ọma ná ndụ ka ọ bụ na o nweghị? Dị ka ihe atụ, mmadụ nwere ike ịma ihe ma sie ike, ma omume ya ajọgbuo onwe ya ná njọ, ya abụrụkwa onye na-enweghị ịhụnanya na ezigbo ndị enyi. Onye ọzọ nwere ike ịbụ onye a ma ama na ọgaranya, ma mgbe o chebaara ndụ ya echiche, ya ana-ajụ onwe ya, sị, ‘Oleekwanụ isi ihe a niile? Olee isi ndụ m dị?’

Ya mere, o doro anya na ndị nwere ihe ịga nke ọma n’ezie bụ ndị nwere ezigbo ihe ndụ ha hiwere isi na ya, nke pụtakwara na ha nwere ezigbo ụkpụrụ ndị na-eduzi ha. N’ihi ya, obi ga-eru ha ala, ndụ ha eju ha afọ, ndị ọzọ ana-akwanyekwara ha ùgwù. Ha ga-enwekwa nzube ná ndụ nke na-abụghị naanị ịchọ ọdịmma onwe ha, kama nzube nke na-enye ha afọ ojuju ma mee ka ha nwee obi ụtọ. Ụfọdụ nwere ike ịjụ, sị ‘Oleedị ụkpụrụ ndị anyị na-ekwu okwu ha? Oleekwa nzube a na-ekwu banyere ya?’ Ànyị ga-azali onwe anyị ajụjụ ndị dị otú ahụ, ka ànyị ga-achọrịrị azịza ha ebe ọzọ? Isiokwu ndị na-eso nke a ga-atụle ajụjụ ndị ahụ.

[Igbe dị na peeji nke 3]

ECHICHE NA-EZIGHỊ EZI BANYERE IHE ỊGA NKE ỌMA

Ndị ọkachamara n’ihe metụtara ọgwụ na-ekwu na, kwa ụbọchị, ihe ka ọtụtụ ná ndị na-eto eto na-eme egwuregwu na-aṅụ ọgwụ ike ndị nwere ike imerụ ha ahụ́ n’ihi na ha chọrọ ime nke ọma n’egwuregwu ha. N’otu ebe a na-achọta ihe n’Ịntanet, bụ́ nke a na-akpọ Education Update, a kọrọ, sị: “N’otu nnyocha e mere n’oge na-adịbeghị anya, mgbe a jụrụ ụmụ kọleji, sị: ‘Ọ bụrụ na ị ma na ịṅụ ọgwụ ike ga-eme ka i merie n’egwuregwu, ma ọ bụ mee ka a gụnye gị ná ndị ga-eso mee egwuregwu ahụ, kama na ọ ga-akpatara gị ọrịa n’afọ ise na-abịa abịa, ị̀ ka ga-aṅụ ya?,’ ọ fọrọ obere ka ọ bụrụ ha niile zara ee. Mgbe a jụgharịrị ajụjụ ahụ, sị, ‘ọ bụrụ na ị ma na ị ga-anwụ n’ime afọ ise ma ị ṅụọ ya,’ ihe karịrị ọkara n’ime ha ka zakwara ee.”