Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Nsogbu Ndị Ị Na-enwe Hà Bụ Ntaramahụhụ Si n’Aka Chineke?

Nsogbu Ndị Ị Na-enwe Hà Bụ Ntaramahụhụ Si n’Aka Chineke?

Echiche Baịbụl

Nsogbu Ndị Ị Na-enwe Hà Bụ Ntaramahụhụ Si n’Aka Chineke?

Mgbe otu nwaanyị dị ihe dị ka afọ iri ise na ise matara na ya nwere ọrịa kansa, o kwuru, sị: “Ọ dị m ka a na-ata m ahụhụ maka ihe ọjọọ m mere.” Mgbe o chetara otu ihe ọjọọ o mere ọtụtụ afọ gara aga, o kwuru, sị, “Ihe a ga-abụrịrị ụzọ Chineke si agwa m na m mere ihe ọjọọ.”

MGBE ọtụtụ ndị nọ ná nsogbu, ha na-eche na Chineke na-ata ha ahụhụ maka ihe ọjọọ ha mere n’oge gara aga. Mgbe ọtụtụ nsogbu bịaara ha na mberede, ha nwere ike ịdị na-ekwu, sị: “Ọ̀ bụ naanị m nọ n’ụwa a? Olee ihe m mere ụdị ihe a ga-eji na-eme m?” Ànyị kwesịrị ichewe na nsogbu ndị na-abịara anyị na-egosi na Chineke na-ewesa anyị iwe? Ọ̀ bụ eziokwu na nsogbu ndị anyị na-enwe bụ ahụhụ Chineke na-ata anyị maka mmehie ndị anyị mere?

Ndị Ohu Chineke Kwesịrị Ntụkwasị Obi Nwere Nsogbu

Tụlegodị ihe Baịbụl kọrọ banyere otu nwoke aha ya bụ Job. Ihe niile o nwere lara n’iyi na mberede. Oké ifufe abịa gbuo ụmụ ya iri. Obere oge nke ahụ mesịrị, ya ebido ịrịa ọrịa na-asọ oyi, nke na-akpatakwa ike ọgwụgwụ. (Job 1:13-19; 2:7, 8) Nsogbu ndị a mere ka Job kwuo, sị: “Chineke atụkwasịla m aka ya igosi na iwe na-ewe ya.” (Job 19:21, Baịbụlụ Nsọ—International Bible Society) O doro anya na Job chere na Chineke na-ata ya ahụhụ dịkwa nnọọ ka ọtụtụ ndị na-eche taa.

Ma, Baịbụl gosiri na tupu ọnwụnwa ndị a abịara Job, Chineke n’onwe ya kwuru na Job bụ “nwoke na-enweghị ihe a ga-eji taa ya ụta, bụrụkwa onye ezi omume, ọ na-atụ egwu Chineke, ọ naghịkwa etinye aka n’ihe ọjọọ.” (Job 1:8) Ebe ọ bụ na Chineke kwuru ihe ọma dị otú a banyere Job, o doro anya na nsogbu ndị ahụ bịaara ya abụghị ahụhụ Chineke na-ata ya.

Nke bụ́ eziokwu bụ na e nwere ọtụtụ ndị bụ́ ndị ezi omume a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl, bụ́ ndị nsogbu dị iche iche bịaara. N’agbanyeghị na Josef rubeere Chineke isi, ọ gara mkpọrọ ọ na-ekwesịghị ịga ma nọrọ ebe ahụ ruo ọtụtụ afọ. (Jenesis 39:10-20; 40:15) Onye Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi bụ́ Timoti nwekwara ‘ọrịa ọ na-arịakarị.’ (1 Timoti 5:23) E mekpọdịrị Jizọs Kraịst na-emetụdịghị ihe ọjọọ ọ bụla ọnụ tupu ya anwụọ ọnwụ ahụhụ. (1 Pita 2:21-24) N’ihi ya, o kwesịtụghị ekwesị mmadụ ikwu na ahụhụ anyị na-ata ga-abụrịrị ụzọ Chineke si egosi na obi adịghị ya mma n’ebe anyị nọ. Ma, ọ bụrụ na ọ bụghị Chineke na-akpatara anyị nsogbu, ònye na-akpata ya, ka ọ̀ bụ na e nweghị onye na-akpata ya?

Ihe Ndị Na-akpatara Anyị Nsogbu

Baịbụl gosiri na ọ bụ Setan bụ́ Ekwensu kpataara Job nsogbu ya niile. (Job 1:7-12; 2:3-8) O gosikwara na ọ bụ Setan kasị akpatara anyị nsogbu ndị anyị na-enwe taa site n’ikwu, sị: “Ahụhụ ga-adịrị ụwa na oké osimiri, n’ihi na Ekwensu agbadatawo n’ebe unu nọ, ọ na-ewe oké iwe, ebe ọ maara na o nwere oge dị mkpirikpi.” (Mkpughe 12:12) Ebe ọ bụ Setan bụ “onye na-achị ụwa a,” o meela ka ọtụtụ ndị tinye aka n’omume ndị rụrụ arụ, bụ́ ndị kpataarala ha nhụsianya na obi mgbawa.—Jọn 12:31; Abụ Ọma 37:12, 14. *

Ma, anyị ekwesịghị ịdị na-ebo Ekwensu ihe ọjọọ ọ bụla mere anyị. N’ihi mmehie anyị ketara eketa nakwa n’ihi na anyị ezughị okè, anyị na-eme mkpebi ụfọdụ na-adịghị mma, bụ́kwa ndị nwere ike ịkpatara anyị nsogbu. (Abụ Ọma 51:5; Ndị Rom 5:12) Dị ka ihe atụ, chegodị otú ọ ga-adị ma mmadụ kpebie na ya agaghị eri nri na-edozi ahụ́ ma ọ bụ zuo ike nke ọma. Ọ bụrụ na o mechaa kpatara ya nnukwu ọrịa, ò kwesịrị ịta Ekwensu ụta? Mbanụ, onye ahụ na-ata ahụhụ maka mkpebi iberibe o mere. (Ndị Galeshia 6:7) Ọ bụ ụdị ihe a mere otu ilu dị na Baịbụl ji kwuo, sị: “Nzuzu mmadụ na-emebi ndụ ya.”—Ilu 19:3, The New English Bible.

N’ikpeazụ, anyị kwesịkwara icheta na ọtụtụ ihe isi ike ndị anyị na-enwe bụ n’ihi “oge ọdachi na ihe a na-atụghị anya ya.” (Ekliziastis 9:11) Ka anyị jiri onye mmiri ozuzo bịakwutere na mberede mgbe ọ na-aga n’ụzọ mee ihe atụ. Ihe nwere ike ikpebi ma mmiri ahụ ọ̀ ga-amazu ya ahụ́ ma ọ̀ ga-ama ya obere bụ ebe ọ nọ mgbe mmiri ahụ malitere izo. N’otu aka ahụ, n’oge a dị “oké egwu, nke tara akpụ,” e nwere ọtụtụ ihe nwere ike ịkpatara mmadụ ọtụtụ nsogbu. (2 Timoti 3:1-5) Ihe na-ekpebi otú ihe ọjọọ ga-emetụtaru anyị na-abụkarị ebe anyị nọ mgbe o mere na ọnọdụ anyị nọ na ya, bụ́kwanụ ihe ndị anyị na-enweghị ike ịgbanwe. Nke a ọ̀ pụtaziri na anyị ga-atagide ahụhụ ruo mgbe ebighị ebi?

Nsogbu Niile Ga-akwụsị n’Isi Nso

Ọ bụ ihe na-enye obi ụtọ ịma na Jehova Chineke ga-eme ka ahụhụ niile anyị na-ata kwụsị n’oge na-adịghị anya. (Aịzaya 25:8; Mkpughe 1:3; 21:3, 4) Ka ọ dịgodị, ọ na-egosi na ọ hụrụ anyị n’anya site n’inye anyị “ntụziaka” na “nkasi obi sitere n’Akwụkwọ Nsọ” ka anyị wee nwee ike idi ọnwụnwa ndị na-abịara anyị ugbu a ma na-echere oge ahụ magburu onwe ya na-abịa n’ọdịnihu. (Ndị Rom 15:4; 1 Pita 5:7) N’oge ahụ, ndị na-eme ihe dị mma n’anya Chineke ga-adị ndụ ebighị ebi n’ime ụwa ọhụrụ nke nsogbu ọ bụla na-agaghị adị na ya.—Abụ Ọma 37:29, 37.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

Ì CHETỤLA NKE A N’ECHICHE?

▪ Ọ̀ bụ naanị ndị mmehie na-enwe nsogbu?—Job 1:8.

▪ È kwesịrị ịta Ekwensu ụta maka nsogbu ọ bụla bịaara anyị?—Ndị Galeshia 6:7.

▪ Ihe isi ike ọ̀ ga-adịgide?—Mkpughe 21:3, 4.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke]

“Oge ọdachi na ihe a na-atụghị anya ya na-abịakwasị ha niile.”—Ekliziastis 9:11