Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Ebe Anyị Nwere Ike Isi Nweta Nduzi?

Olee Ebe Anyị Nwere Ike Isi Nweta Nduzi?

Olee Ebe Anyị Nwere Ike Isi Nweta Nduzi?

OLEE onye nwere ike ịgwa anyị otú anyị ga-esi nwee ezi ihe ịga nke ọma—ọ bụghị ụdị ihe ịga nke ọma nke ụwa, kama ezigbo ihe ịga nke ọma? Di ka e kwuru n’isiokwu bu nke a ụzọ, ka mmadụ wee nwee ezi ihe ịga nke ọma, ma ọ́ dịghị ihe ọzọ, ọ ga-enwerịrị ezigbo ụkpụrụ ndị na-edu ya, nweekwa ezigbo ihe o ji ndụ ya achụ—bụ́ ihe ndị na-adabereghị ná mmadụ ịbụ onye a ma ama, ọgaranya, ma ọ bụ onye ikike dị n’aka.

Olee ebe anyị nwere ike inweta ụkpụrụ ndị rijuru afọ na azịza nke ajụjụ ndị a na-ajụ banyere nzube nke ndụ? Ọ̀ bụ site n’ịchọwa ha n’onwe anyị? Ka anyị gwa onwe anyị eziokwu—dị ka ụmụ mmadụ na-ezughị okè, anyị na-enwekarị ọchịchọ ọjọọ ndị nwere ike iduba anyị n’ime ihe ọjọọ. (Jenesis 8:21) N’ihi ya, ọtụtụ nde mmadụ anọgidela na-achụso ihe efu ndị Baịbụl kọwara dị ka “ọchịchọ nke anụ ahụ́ na ọchịchọ nke anya na oké ngosi nke ihe mmadụ ji ebi ndụ.” (1 Jọn 2:16) Nke ahụ abụghị otú e si enweta ezi ihe ịga nke ọma kama o nwere ike ịkpatara mmadụ obi mgbawa na obi ọjọọ. N’ihi ya, e nwere ezi ihe mere ọtụtụ mmadụ ji achọ azịza nke ajụjụ ndị ka mkpa ná ndụ n’aka Onye Okike anyị. *

Ànyị Kwesịrị Ịchọ Azịza Ha n’Aka Chineke?

Olee ihe mere o ji kwesị ekwesị ịchọ azịza nke ajụjụ ndị metụtara ndụ n’aka Onye Okike anyị? Ọ maara ihe mere o ji kee anyị, n’ihi ya kwa, ọ maara ihe kwesịrị ịbụ nzube anyị ná ndụ. Ọ makwaara otú o si kee anyị—ma ahụ́ anyị, ma uche anyị, ma obi anyị. Ya mere, Chineke maara ụkpụrụ ndị kasị mma ụmụ mmadụ nwere ike ịgbaso ná ndụ. Ọzọkwa, Chineke bụ ịhụnanya n’onwe ya, n’ihi ya kwa, ọ chọrọ ka anyị nwee ezi obi ụtọ na ezi ihe ịga nke ọma. (1 Jọn 4:8) Olee ebe anyị nwere ike isi nweta nduzi o ji ịhụnanya enye anyị? Ọ bụ na Baịbụl Nsọ nke Chineke ji ndị edemede ma ọ bụ ndị odeakwụkwọ iri anọ deere anyị. * (2 Timoti 3:16, 17) Ma, olee otú anyị nwere ike isi tụkwasị nduzi dị n’akwụkwọ ahụ obi?

Onye nnọchianya kasịnụ nke Chineke, bụ́ Jizọs Kraịst, kwuru, sị: “A na-egosi na amamihe ziri ezi site n’ọrụ ya,” ma ọ bụ site n’ihe ndị ọ rụpụtara. (Matiu 11:19; Jọn 7:29) Amamihe sitere n’aka Chineke na-eme ka anyị nwee ihe ịga nke ọma na ezi obi ụtọ—“bụ́ ụzọ dum nke ihe dị mma”— ma amamihe ụmụ mmadụ, nke na-emegide nke Chineke, na-akpata ọdachi na obi ilu.—Ilu 2:8, 9; Jeremaya 8:9.

Chee banyere otu òtù ndị na-eto eto e nwere n’ụwa n’agbata afọ 1960 na 1969. Ọtụtụ n’ime ha jụrụ ụkpụrụ na iwu ndị dị adị, gbaakwa ndị mmadụ ume ịṅụ ọgwụ ọjọọ, ibi ụdị ndụ rie taa nwụọ echi, iso onye ọ bụla sọrọ ha nwee mmekọahụ, na ime ihe ọjọọ ndị ọzọ. Ma ụdị ndụ ahụ ha biri ò gosiri na ha maara ihe n’ezie? Ò mere ka ndị mmadụ bie ndụ nwere nzube ma nwee ụkpụrụ ndị na-eme ka mmadụ nwee obi iru ala na obi ụtọ na-adịte aka? Akụkọ ihe mere eme gosiri na ụdị ndụ ahụ emeghị ka ndụ ndị mmadụ ka mma, kama o mere ka omume ụmụ mmadụ retọkwuo.—2 Timoti 3:1-5.

Amamihe a na-enweta na Baịbụl adịghị ka amamihe ụmụ mmadụ, ọ na-abakwa uru ruo ogologo oge. (Aịzaya 40:8) Ka ị na-agụ isiokwu na-esonụ, i nwere ike ịhụ ihe mere o ji dị otú ahụ n’ihi na ọ ga-atụle ụkpụrụ Baịbụl isii nyeerela ọtụtụ nde mmadụ si ná mba niile aka inwe ezi obi ụtọ na ihe ịga nke ọma—ma hà bụ ndị aka ji akụ̀ na ndị a ma ama ma ha abụghị.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 5 Lee Teta! (Bekee) nke November 2007, nke tụlere isiokwu bụ́ “Baịbụl—Ọ̀ Bụ Akwụkwọ I Nwere Ike Ịtụkwasị Obi?” Isiokwu ndị dị n’ime ya kwuru otú ihe ndị e gwutere n’ala, akụkọ ihe mere eme, nkà mmụta sayensị, na ihe ndị ọzọ si gbaa akaebe na Baịbụl sitere n’ike mmụọ nsọ Chineke n’ezie.

[Igbe dị na peeji nke 5]

 NKWENKWE NDỊ NA-EME KA MMADỤ ỊCHỌWA INWE EZI IHE ỊGA NKE ỌMA YIE IHE NA-ABACHAGHỊ URU

Ọtụtụ mmadụ na-ekwu na Chineke adịghị, nakwa na mmadụ si n’enwe pụta. Ya bụrụ na nke a bụ eziokwu, ihe ọ pụtara bụ na ndụ maliteere onwe ya, ọchịchọ anyị na-achọkwa inwe nzube ná ndụ na inwe ụkpụrụ ndị ga na-eduzi mmadụ niile abatụghịkwa uru.

Ndị ọzọ kweere na Chineke kere anyị ma gbahapụ anyị. Ihe nke ahụ pụtara bụ na anyị enweghị Onye Okike na-eche banyere anyị, n’ihi ya kwa, ịchọwa inwe nzube ná ndụ na inwe ụkpụrụ ndị ga na-eduzi anyị enweghị isi. Chegodị echiche: Chineke nyere anụ ọhịa ọ bụla amamihe dị ya mkpa iji mee ihe o kwesịrị ime. N’ihi ya, anyị na-ahụ amamihe ya dị ukwuu gburugburu anyị. Otu Onye Okike ahụ kere ihe ndị a ọ̀ ga-eke anyị ma hapụ anyị n’enyeghị anyị nduzi? Mbanụ!—Ndị Rom 1:19, 20.

Ndị sị na Chineke adịghị na-akụzi na ọ baghị uru ka anyị gbalịwa inwe nzube ná ndụ na ịchọwa ụkpụrụ ga na-eduzi mmadụ niile, ha sikwa otú a na-eme ka mmadụ ịchọwa inwe ezi ihe ịga nke ọma yie ihe na-abachaghị uru.

[Foto dị na peeji nke 5]

Ihe ọma ndị amamihe si na Baịbụl rụpụtarala na-egosi na ọ bụ nke ezigbo ya