Olee Ihe Ị Ga-aza?
Olee Ihe Ị Ga-aza?
Olee Ihe Na-ekwesịghị Ekwesị na Foto A?
Chọpụta ihe atọ dị na foto a bụ́ ndị na-ekwekọghị n’ihe a kọrọ na Baịbụl na Jenesis 6:15; 7:1-9, 13-16, 23; 8:15-19.
1. ․․․․․
2. ․․․․․
IJI NYERE GỊ AKA: Gụọ Levitikọs 11:3 na Diuterọnọmi 14:4.
3. ․․․․․
IJI NYERE GỊ AKA: Gụọ Diuterọnọmi 14:7-19.
IHE A GA-EKWURỊTA: Olee otú ụmụ Noa na ndị nwunye ha si nyere ya aka? Olee otú i nwere ike isi ṅomie ụmụ Noa?
Site na Magazin A
Zaa ajụjụ ndị a ma denye amaokwu Baịbụl (ndị) na-adịghị na ha.
PEEJI NKE 6 Olee ihe onye hụrụ ego n’anya na-emekataghị nwee? Ekliziastis 5:․․․
PEEJI NKE 9 Olee ndị ga-enwe obi ụtọ? Matiu 5:․․․
PEEJI NKE 10 Mgbe mmadụ na-ekpe ekpere, olee ihe ọ na-ekwesịghị ime? Matiu 6:․․․
PEEJI NKE 18 Olee ihe anyị kwesịrị ime nchegbu anyị niile? 1 Pita 5:․․․
Ònye So n’Ezinụlọ Jizọs?
Tụlee ihe ndị e depụtara iji nyere gị aka. Gụọ amaokwu Baịbụl ndị e depụtara. Denyezie aha kwesịrị ekwesị n’ohere e wepụtara.
4. ․․․․․
IJI NYERE GỊ AKA: N’agbanyeghị na nna m efeghị Jehova, abụ m eze nke ‘rapaara Jehova n’ahụ́.’
Gụọ 2 Ndị Eze 18:1-6.
5. ․․․․․
IJI NYERE GỊ AKA: Eji m ikike m nwere mee ihe na-adịghị mma site n’ịwụfu ọbara na-emeghị ihe ọjọọ n’ebe ọ dị nnọọ ukwuu.
Gụọ 2 Ndị Eze 21:16.
6. ․․․․․
IJI NYERE GỊ AKA: Esooro m ihe nlereanya ọjọọ nke nna m, ndị na-ejere m ozi gbukwara m.
Gụọ 2 Ndị Eze 21:19-23.
AZỊZA
1. Ihu na azụ nke ụgbọ ahụ apịghị apị.
2. Noa chịịrị asaa n’ime anụ ọ bụla “dị ọcha,” dị ka atụrụ, banye n’ime ụgbọ ahụ.
3. Noa chịịrị naanị abụọ n’ime anụ ọ bụla “na-adịghị ọcha” banye n’ime ụgbọ ahụ.
4. Hezekaya.—Matiu 1:9.
5. Manase.—Matiu 1:10.
6. Emọn.—Matiu 1:10.