Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

À Kara Ọdịnihu Gị Aka?

À Kara Ọdịnihu Gị Aka?

Echiche Baịbụl

À Kara Ọdịnihu Gị Aka?

Ọtụtụ mmadụ kweere na e nwere onye ka ha ike nke kpebirila ihe na-eme ná ndụ ha ugbu a na otú ndụ ha ga-adị n’ọdịnihu. Uche ha bụ na site n’ụbọchị a mụrụ anyị ruo mgbe anyị nwụrụ, ọ bụ otú Chineke si dee ya n’obi ya na ndụ anyị ga-adị ka ọ ga-adị. Ha na-asị, ‘Ebe ọ bụ na Chineke kacha onye ọ bụla ike, marakwa ihe niile, ọ ga-abụrịrị na ọ ma ihe niile mere n’oge gara aga, ihe niile na-eme ugbu a, na ihe niile ga-eme n’ọdịnihu.’

GỊNỊ ka i chere? Chineke ọ̀ kaala ihe ndị ga-eme ná ndụ anyị na ihe ga-eme anyị n’ọdịnihu akaa? Ya bụ, ọ̀ bụ eziokwu na o kere anyị ka anyị nwee ohere iji aka anyị na-ahọrọ ihe anyị ga-eme? Gịnị ka Baịbụl nwere ikwu?

Ọ̀ Na-achọ Ịma Ihe Niile Tupu Ha Emee Ka Ọ̀ Na-ahọrọ Ndị Ọ Chọrọ Ịma?

Baịbụl mere ka o doo anya na Chineke na-ama ihe ndị ga-emenụ tupu ha emee. Aịzaya 46:10 kwuru na ọ na-anọ “ná mmalite kwuo ihe ga-eme n’ikpeazụ.” O jidị ụmụ mmadụ ndị o ji mere ndị odeakwụkwọ detuo ọtụtụ amụma. (2 Pita 1:21) Nke ka nke bụ na amụma ndị ahụ ga-emezurịrị n’ihi na Chineke nwere ma amamihe ma ike ọ ga-eji hụ na ha mezuru kpọmkwem otú o si kwuo. N’ihi ya, ọ bụghị naanị na Chineke nwere ike ịma ihe ndị ga-emenụ tupu ha emee, kamakwa, mgbe ọ bụla ọ chọrọ, o nwere ike ịka ihe ndị ga-emenụ tupu ha emee. Ma, Chineke ọ̀ kaala ihe ga-eme ná ndụ mmadụ ọ bụla akaa ma ọ bụdị kaa mmadụ ole a ga-azọpụta? Baịbụl ekwughị otú ahụ.

Baịbụl na-agwa anyị na Chineke na-ahọrọ ihe ndị ọ ga-aka na ha ga-eme n’ọdịnihu na ihe ndị ọ na-agaghị aka. Dị ka ihe atụ, Chineke ekwuola na “oké ìgwè mmadụ,” bụ́ ndị ezi omume ga-afọdụ ndụ mgbe e bibichara ụwa ọjọọ anyị a. (Mkpughe 7:9, 14) Ma, ị̀ chọpụtara na Chineke ekwughị kpọmkwem mmadụ ole oké ìgwè mmadụ ahụ ga-adị? Gịnị mere na o kwughị ya? Ọ bụ n’ihi na o bughị ụzọ kaa ihe ga-abụ ọdịnihu onye ọ bụla n’ime ha akaa. Chineke dị ka nna nwere ezinụlọ buru ibu ma hụ ha niile n’anya. Ọ maara na ma ọ̀ dịghị ihe ọzọ, ụfọdụ n’ime ụmụ Ya ga-ahụ ya n’anya n’ihi na Yanwa hụrụ ha n’anya, ma O bughị ụzọ kpebie ole ga-ahụ ya n’anya.

Were ikike Chineke nwere ịka ihe ndị ga-eme n’ọdịnihu tụnyere otú o si eji ike ya arụ ọrụ. Ebe ọ bụ na Chineke bụ Onye Pụrụ Ime Ihe Niile, ike ya ka nke onye ọ bụla. (Abụ Ọma 91:1; Aịzaya 40:26, 28) Ma ọ̀ na-eji ike ya eme ihe otú masịrị ya? Mba. Dị ka ihe atụ, o bibighị Babịlọn, bụ́ ndị iro nke Izrel oge ochie, kama o cheere ruo mgbe oge ibibi ya ruru. Chineke kwuru, sị: “M jidere onwe m.” (Aịzaya 42:14) Ọ bụkwa otú ahụ ka o si ejide onwe ya mgbe a bịara n’ịma ihe ga-eme tupu ha emee na ịka ihe ga-eme n’ọdịnihu. Ihe mere na Jehova adịghị achọ ibu ụzọ mara ihe niile banyere anyị bụ n’ihi na ọ chọrọ inye anyị ohere iji aka anyị kpebiere onwe anyị ihe anyị ga-eme.

Na Chineke adịghị achọ ịma ihe niile tupu ha emee ma ọ bụ kaa ihe niile ga-emenụ apụtaghị na ọ bụghị ya kacha ike, ọ pụtaghịkwa na o zughị okè. Kama nke ahụ, ọ na-eme ka anyị ghọtakwuo na Chineke dị ukwuu, na-emekwa ka anyị hụkwuo ya n’anya. Ọ na-egosikwa na ọ bụghị naanị amamihe na ike ka o ji achị kama ọ na-eji ịhụnanya achị, na-akwanyekwara ụmụ mmadụ nwere ọgụgụ isi o kere eke ùgwù ka ha nwee ike iji aka ha họrọ ihe ha chọrọ ime.

N’aka nke ọzọ, ọ bụrụ na Chineke akaala ihe niile akaa, nke gụnyere ihe ọghọm na arụrụala niile metụrụlanụ, ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị ịta ya ụta maka nhụsianya niile na ahụhụ niile dị n’ụwa a? N’ihi ya, i leruo ya anya nke ọma, ị ga-achọpụta na ozizi akara aka anaghị enye Chineke otuto, kama ọ na-emebi aha ya. Ọ na-eme ka e lewe Chineke anya dị ka onye nwere obi ọjọọ, onye na-adịghị ekpe ikpe ziri ezi, na onye na-enweghị ịhụnanya. Nke a abụghị ihe Baịbụl kwuru banyere Chineke.—Diuterọnọmi 32:4.

Ọ Dị Gị n’Aka

Chineke si n’ọnụ ohu ya bụ́ Mozis gwa mba Izrel, sị: “Edebewo m ndụ na ọnwụ n’ihu unu, . . . ị ga-ahọrọkwa ndụ . . . site n’ịhụ Jehova bụ́ Chineke gị n’anya, site n’ige ntị n’olu ya na site n’ịrapara ya n’ahụ́; n’ihi na ya onwe ya bụ ndụ gị, bụrụkwa ogologo ụbọchị gị.” (Diuterọnọmi 30:19, 20) Ọ bụrụ na Chineke bu ụzọ kpebie onye Izrel nke ga-ahụ ya n’anya ma dị ndụ ma ọ bụ nke ga-akpọ ya asị ma nwụọ, ọ pụtara na okwu a Ọ gwara ha abaghị uru ọ bụla, ọ pụtakwara na o sighị Ya n’obi. Ì kweere na Chineke, bụ́ onye “hụrụ ikpe ziri ezi n’anya” na onye bụ́ ịhụnanya n’onwe ya, ga-eme ihe na-ezighị ezi dị otú ahụ?—Abụ Ọma 37:28; 1 Jọn 4:8.

Ihe ahụ Chineke gwara ndị ohu ya n’oge ochie ka ha họrọ ndụ kadị gbasa anyị taa n’ihi na otú amụma Baịbụl si emezu na-egosi na oge eruola nnọọ nso ka e bibie ụwa ọjọọ a. (Matiu 24:3-9; 2 Timoti 3:1-5) Olee otú anyị ga-esi họrọ ndụ? Ụzọ bụ́ isi anyị si eme ya bụkwa otú ahụ ndị Izrel oge ochie si mee ya.

Olee Otú I Nwere Ike Isi ‘Họrọ Ndụ’?

Anyị na-ahọrọ ndụ site ‘n’ịhụ Jehova n’anya,’ site “n’ige ntị n’olu ya,” na site “n’ịrapara ya n’ahụ́.” N’eziokwu, ọ bụ naanị mgbe anyị maara Chineke nke ọma ma ghọta ihe ndị ọ chọrọ anyị n’aka ka anyị ga-enwe ike ime ihe ndị a. N’ekpere Jizọs Kraịst kpegaara Chineke, ọ sịrị: “Iji nweta ndụ ebighị ebi, ọ dị . . . mkpa ịmata gị nke ọma, onye naanị ya bụ ezi Chineke, matakwa onye i zitere, bụ́ Jizọs Kraịst.”—Jọn 17:3.

Ọ bụ na Baịbụl Nsọ bụ́ Okwu Chineke ka a na-esi amata Chineke na ọkpara ya bụ́ Jizọs Kraịst nke ọma. (Jọn 17:17; 2 Timoti 3:16) N’ezie, Baịbụl bụ́ onyinye dị oké ọnụ ahịa Chineke nyere anyị bụ ihe doro anya na-egosi na Chineke ebughị ụzọ kaa ihe ọdịnihu anyị ga-abụ, kama ọ chọrọ ka anyị nyochaa Baịbụl nke ọma ka anyị nwee ike ịhọrọ ihe anyị ga-eme.—Aịzaya 48:17, 18.

E nwere ike ikwu na Chineke ji Baịbụl na-agwa anyị, sị: ‘Lekwanụ ihe bụ́ nzube m maka ụmụ mmadụ na ụwa a, lekwanụ ihe unu kwesịrị ime iji nweta ndụ ebighị ebi. Ọ bụzi unu ka ọ dị n’aka ikpebi ma ùnu ga-ege m ntị ma ọ bụ nupụrụ m isi.’ N’eziokwu, Chineke anaghị ekwe ka ikike o nwere ịka ihe ndị ga-eme n’ọdịnihu mee ka ọ gharazie inye anyị ohere ịhọrọ ihe anyị chọrọ ime. Ị̀ ga-ahọrọ ndụ “site n’ige ntị n’olu [Chineke] na site n’ịrapara ya n’ahụ́”?

Ì CHETỤLA NKE A N’ECHICHE?

▪ Ọ̀ bụ ihe niile ga-eme n’ọdịnihu ka Chineke na-achọ ibu ụzọ ama tupu ha emee?—Diuterọnọmi 30:19, 20; Aịzaya 46:10.

▪ Gịnị mere Chineke na-agaghị eji kaa ihe niile akaa tupu ha emee, gụnyere ihe ọjọọ niile na-abịara ụmụ mmadụ taa?—Diuterọnọmi 32:4.

▪ Gịnị ga-emecha kpebie ihe ọdịnihu anyị ga-abụ?—Jọn 17:3.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 11]

Baịbụl na-agwa anyị na Chineke na-ahọrọ ihe ndị ọ ga-aka na ha ga-eme n’ọdịnihu na ihe ndị ọ na-agaghị aka