Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Anyasị E Kwesịrị Icheta

Anyasị E Kwesịrị Icheta

Anyasị E Kwesịrị Icheta

Biko Bịa Soro Anyị—Thursday April 9, 2009

N’abalị bọtara ụbọchị Jizọs Kraịst nwụrụ, ọ malitere otu ihe a ga-eji na-echeta ọnwụ ya. O ji mmanya na achịcha na-ekoghị eko mee ihe nnọchianya. Jizọs nyere iwu, sị: “Na-emenụ nke a ka unu wee na-echeta m.”—Luk 22:19.

Ndịàmà Jehova ji obi ụtọ na-akpọ gị ka i soro ha cheta ọnwụ Jizọs, bụ́ nke ha na-eme kwa afọ dị nnọọ ka Jizọs nyere n’iwu. Biko jụta Ndịàmà Jehova bi n’ógbè gị oge a ga-eme ya na ebe a ga-anọ mee ya.