Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ego Ọ̀ Bụ Ọga Gị Ka Ọ̀ Bụ Odibo Gị?

Ego Ọ̀ Bụ Ọga Gị Ka Ọ̀ Bụ Odibo Gị?

Ego Ọ̀ Bụ Ọga Gị Ka Ọ̀ Bụ Odibo Gị?

Ị̀ NA arịa ọrịa ego? E kwuola na ọrịa a ji imeriime mmadụ n’ụwa taa. Gịnị bụ ọrịa ego?

Dr. Roger Henderson, bụ́ onye na-eme nnyocha banyere ọrịa uche ná mba United Kingdom, chepụtara okwu bụ́ “ọrịa ego” na nso nso a ma jiri ya kọwaa otú ahụ́ na-adị ndị mmadụ na otú àgwà ha na-adị ma ha chegbuwe onwe ha n’ihi ego. Ihe ndị e ji ama onye ọrịa a ji bụ na o nwere ike na-eku ume ọkụ, ma ọ bụ isi ana-awa ya, agbọ ana-enu ya, ọkọ aghaa ya n’ahụ́, afọ amachie ya, obere ihe ana-ewe ya iwe, obi ana-amapụ ya, ma ọ bụkwanụ ya ana-esiri ya ike ikweta na ihe ga-adị mma. Henderson kwuru, sị: “Nsogbu ego bụ otu ihe so akpata nchekasị.”

O kwesịghị iju anyị anya na n’ọnwa ndị na-adịchabeghị anya, e nwekwuola ndị ego na-akpatara nchegbu. Nsogbu ego e nwere n’ọtụtụ mba na nso nso a emeela ka a kwụsị ọtụtụ ndị n’ebe dị iche iche n’ụwa ọrụ, mee ka ọtụtụ ndị gharazie inwe ụlọ obibi, nakwa ka ego ndị mmadụ chekwara funahụ ha. E nweela nnukwu ụlọ ọrụ ego ndị dakpọrọlanụ, mba ndị kachadị nwee ego n’ụwa emeela atụmatụ ndị ga-enyere ha aka ka akụnụba ala ha ghara ịdakpọ kpamkpam. N’obodo ndị na-emepe emepe, otú ihe oriri na ihe ndị ọzọ dị mkpa ná ndụ si ada ọnụ emeela ka ndị mmadụ na-echegbu nnọọ onwe ha.

Ihe gbasara ego na-echegbukwa ndị mmadụ mgbe ihe dị mma. N’afọ ndị na-adịchabeghị anya nke ọtụtụ mba bịara nwee ego, ihe nchegbu ego na-akpata mere ọtụtụ ndị abụghị ihe e ji ọnụ ekwu. Dị ka ihe atụ, akwụkwọ akụkọ ndị South Africa a na-akpọ The Witness kọrọ na “imefusị ego, inwe oké uru ahịa, na ịchụ akụnụba ọnwụ ọnwụ” na-agbasa ebe niile n’Africa dị ka ọrịa. Akwụkwọ akụkọ ahụ kwukwara na ụfọdụ ihe ndị e ji ama “ọrịa” a bụ “nchekasị, iji ụgwọ, imefusị ihe, ịrụ oké ọrụ, mmadụ iche na e nyeghị ya ihe ndị dị ya mkpa, anyaụfụ, na ike ụwa ịgwụ mmadụ.” E kwuru na ọ bụ ego ndị Africa na-enwetakwu mere ka ha gharazie ibi ndụ obi ụtọ.

Tupu mba dị iche iche enwee nsogbu ego na nso nso a, akụnụba mba India bụ a kwaa a kwụrụ. Magazin bụ́ India Today International kwuru na ọ bụ n’afọ 2007 ka mba ahụ “maliteziri nnọọ imefusị ego ka à na-anwụ anwụ.” Ma, n’oge ahụkwa, ndị ọchịchị nke mba ahụ na-echegbu onwe ha na ego a mba ha malitere inwe ga-akpatakwu ọgba aghara na ime ihe ike.

N’oge ahụkwa, ndị na-eto eto e nwere ná mba United States na-emefusị ego ha n’ịzụ ihe ndị dara oké ọnụ. Ma ego ahụ ha na-emefusị anaghị eme ha obi ụtọ. Ndị na-eme nnyocha kwuru na inwe oké ego so n’ihe ndị bụ́ isi mere ndị mmadụ ji egbu onwe ha, aghọ ndị aṅụrụma, na ndị ike ụwa gwụrụ. Otu nnyocha e mere gosiri na “ọ bụ naanị ihe dị ka otu onye n’ime Ndị America atọ ọ bụla” nwere ike ịsị na ya “nwere ezigbo obi ụtọ” n’agbanyeghị akụnụba ya.

Ihe Mere na Ndị Ọzọ Anaghị Arịa Ọrịa Ego

Ma e nwere ọtụtụ ndị ọzọ, ma ndị ogbenye ma ndị ọgaranya, bụ́ ndị na-adịghị etinyecha uche ha n’akụnụba ma n’oge ihe dị mma ma n’oge ihe siri ike. Gịnị mere ụfọdụ ji arịa ọrịa ego, ndị ọzọ anaghị arịa ya?

N’otu nnyocha a kpọrọ The Meaning of Money, ndị mere nnyocha ahụ kwuru na ‘ihe banyere ego na-enu ụfọdụ ndị enu n’ahụ́, nakwa na ego na-achị ha. Nke a nwere ike ịkpatara mmadụ oké echiche na ọrịa uche.’ Ma, ha kwukwara, sị: “Ndị na-ahazi otú ha si emefu ego ha na-enwekarị ike ijide onwe ha, onwe ha na-ejukwa ha afọ. Ọ bụ ha na-achị ego, ọ bụghị ego na-achị ha . . . Ihe anyị na-ekwu bụ na ndị na-ahazi otú ha si emefu ego ha nke ọma agaghị na-enwekarị nchegbu, nke ha jikwanụ adọlịgbu onwe ha.”

Olee otú gịnwa si ele ego anya? Olee otú akụnụba ụwa a nke na-abịa taa laa echi si emetụta gị? Ego ọ̀ bụ ọga gị ka ọ̀ bụ odibo gị? O nwere ike ihe ndị ahụ e ji ama onye ọrịa ego ji anaghị arịa gị. Ma, ànyị bara ọgaranya ma ànyị dara ogbenye, ego nwere ike ịkpatara onye ọ bụla n’ime anyị nchegbu. Ka anyị tụlezie mgbanwe ndị ọ ga-abụ i mee n’otú i si emefu ego gị, obi erukwuo gị ala, gị enwekwuokwa obi ụtọ ná ndụ.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 4]

Ego nwere ike bụrụ ọga gị ma ọ bụrụ na . . .

Ị naghị achọ itinye ọnụ mgbe ọ bụla e kwutere okwu ego n’ihi na ọ na-amapụ gị obi

Ọ na-akpatakarị esemokwu n’ezinụlọ gị

Ị na-emefu ego aghara aghara

Ị na-echegbukarị onwe gị banyere ụgwọ ndị i ji

Ị maghị ego ole ị na-akpata

Ị maghị ego ole ị na-emefu

Ị maghị ego ole i ji n’ụgwọ

Ego i ji n’ụgwọ na-ehikarị nne karịa ego ole i chere na ọ bụ

Ị naghị akwụkarị ụgwọ ndị i ji n’oge

Ị naghị enwe ike ịkwụzu ụgwọ ihe ndị ị zụrụ n’aka mgbe ị kwesịrị ịkwụ ha

Ị na-eji ego ị chọrọ iji mee ihe ndị ọzọ akwụ ụgwọ ndị i ji

Ị gbasaa ọrụ, gị agaa rụwa ọrụ ọzọ iji nweta ego ga-ezuru gị ịkwụ ụgwọ ndị i ji

Ị gbaziiri ego iji kwụọ ndị mbụ ị gbaziiri

Ị na-eji ego i chekwara echekwa akwụ ụgwọ mmefu ndị ị na-eme mgbe mgbe

Ego na-akọkarị gị tupu ọnwa agwụ

Ọ na-agụsi gị agụụ ike inwe nnukwu ego

O nwere otú ahụ́ na-adị gị ma ọ bụkwanụ otú àgwà gị na-adị ma i chegbuwe onwe gị maka ego

[Ebe E Si Nweta Foto]

Ebe e si nweta ya: Akwụkwọ bụ́ Money Sickness Syndrome, nke Dr. Roger Henderson dere