Ikiri Ụwa
Ikiri Ụwa
▪ Mgbe e lere ihe karịrị puku ụmụaka abụọ na-anaghị ekutecha ume nke ọma ahụ́ n’ụlọ ọgwụ ụmụaka dị n’Atens nke Gris, a chọpụtara na “ihe karịrị ọkara n’ime ha butere ọrịa ahụ n’ihi na nne ha ma ọ bụ nna ha ma ọ bụkwanụ ha abụọ na-ese sịga.”—KATHIMERINI—ENGLISH EDITION, GREECE.
▪ Ụlọ ọrụ na-edekọ ọnụ ọgụgụ na United Kingdom kwuru na “ọnụ ọgụgụ ndị gbara akwụkwọ [n’England na Wales] n’afọ 2006, kacha pee mpe ma e jiri ya tụnyere ole ha na-adị kwa afọ kemgbe otu narị afọ na iri gara aga. Ọtụtụ ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị na-ahọrọ ibikọ ọnụ n’alụghị alụ.”—THE GUARDIAN WEEKLY, BRITAIN.
▪ Dị ka otu òtù nke na-akọwara ndị mmadụ ihe banyere okpukpe na ọhaneze si kwuo, “ihe dị ka mmadụ anọ n’ime mmadụ iri torola eto agbanweela okpukpe ha, ma ọ bụ malite ikpe otu okpukpe, ma ọ bụkwanụ kwụsị ikpe okpukpe ọ bụla.”—U.S.A.
Ụlọ Akwụkwọ Kọleji na Ịkwa Iko Aghara Aghara
“E wezụga n’ụfọdụ ụlọ akwụkwọ kọleji ndị Pentikọstal . . . , ịkwa iko aghara aghara e ji mara ụmụ akwụkwọ mahadum juru n’ụlọ akwụkwọ gọọmenti nwe, nke ndị mmadụ nwe, na nke ndị Katọlik nwe.” Ọ bụ Donna Freitas, onye bụ́ ọkà mmụta okpukpe ndị Katọlik, bụrụkwa osote prọfesọ na mahadum kwuru nke a mgbe o mechara nchọpụta banyere otú mmekọahụ a na-enwe na kọleji ndị dị n’America si gbasa okpukpe. Dị ka akwụkwọ akụkọ bụ́ National Catholic Reporter si kọọ, Freitas sịrị na ihe mere na okpukpe emebeghị ka a kwụsị ịkwa iko n’ụlọ akwụkwọ bụ n’ihi na “ịkwa iko aghara aghara eriela ụmụ akwụkwọ kọleji isi” nakwa na “otú okpukpe si akụzi ihe gbasara ịkwa iko anaghị eme ka ha kwụsị ya.”
A Na-enye Ndị Nne na Nna Ego Ha Ji Azụ Ụmụ Ha Ndị Nwaanyị
Akụkọ e si na BBC News nweta na-ekwu na gọọmenti mba India na-enye ndị nne na nna dara ogbenye ihe fọrọ obere ka o ruo puku dọla atọ (U.S.) ka ha jiri ya na-azụ ụmụ ha ndị nwaanyị. A na-enye ezinụlọ ọ bụla mụrụ nwa nwaanyị ego ozugbo a mụrụ nwa ahụ, a na-enyekwa ha ego site n’oge ruo n’oge ruo mgbe nwa ahụ gbara afọ iri na asatọ. N’agbanyeghị na n’afọ 1994 a machibidoro ndị di na nwunye iwu iji aka ha họrọ ma hà ga-amụ nwa nwoke ma ọ bụ nwa nwaanyị, maakwa iwu ka a ghara isikwopụ afọ ime mgbe nwa e bu n’afọ bụ nwaanyị, a ka na-eme ihe ndị a ebe niile. E kwudịrị na n’ime iri afọ abụọ gara aga, e sipụla ụmụaka nwaanyị e bu n’afọ dị ihe dị ka nde iri, nke a emeekwala ka ụmụaka nwoke karịa ụmụaka nwaanyị n’ebe ụfọdụ. Mgbe a gụrụ ndị India ọnụ n’afọ 2001, a chọpụtara na n’ebe e nwere otu puku ụmụaka ndị nwoke na-erubeghị afọ isii, a na-enwe narị ụmụaka ndị nwaanyị itoolu na iri abụọ na asaa na-erubeghị afọ isii, ka oge na-agakwa, ọnụ ọgụgụ ụmụ nwoke na-akakwa nke ndị nwaanyị n’ike n’ike. N’otu steeti, ebe a mụrụ otu puku ụmụaka ndị nwoke, a na-amụ narị ụmụaka ndị nwaanyị asaa na iri itoolu na atọ.
Ihe Ụmụ Nnụnụ Na-eme ma Ha Nọrọ n’Ebe Mkpọtụ Dị
Ụmụ nnụnụ ụfọdụ na-ewelitekwu olu ha ma ha bewe ube n’obodo ndị mepere emepe, bụ́ ebe mkpọtụ na-adịkarị. Magazin bụ́ New Scientist kwuru na ọ bụ eziokwu na mkpọtụ a na-eme n’obodo ndị mepere emepe nwere ike na-agbakasị ụmụ mmadụ ahụ́, o nwedịrị ike ịpụtara ụmụ nnụnụ ‘ọnwụ ma ọ bụ ndụ’ ebe ọ bụ na ndị nke oké na-eji ube ha “arata ndị nke nne, jirikwa ya na-eme ka nnụnụ ndị ọzọ bụ́ oké ghara irute nso n’ókèala ha.” Ebe ọ bụ na ọ bụghị mgbe niile ka mkpọtụ na-adị n’obodo ndị mepere emepe, ụfọdụ ụmụ nnụnụ na-eme ka a nụkwuo olu ha site n’iwelikwu olu ha elu mgbe ha na-ekwe ukwe ma ọ bụ na-ekwezi ukwe ha n’abalị. Magazin ahụ kwudịrị na ọ bụghị naanị ụmụ nnụnụ ndị nọ n’obodo ndị mepere emepe na-eme ya. Ndị nke bi nso “n’ugwu mmiri na-esi na ya asọda na ndị nke bi n’ebe osimiri na-ekwo ekwo na-ewelikwa olu ha ma ha kwewe ukwe.”