Jiri Ego Gị Na-eme Ihe Bara Uru
Jiri Ego Gị Na-eme Ihe Bara Uru
ỌTỤTỤ ndị na-eche na ihe ahụ ndị mmadụ na-ekwukarị, bụ́ na “Ego bụ mgbọrọgwụ nke ihe ọjọọ niile,” si na Baịbụl. Ma, ihe Baịbụl kwuru bụ: “Ịhụ ego n’anya bụ mgbọrọgwụ nke ụdị ihe ọjọọ niile.” (1 Timoti 6:10) N’eziokwu, ụfọdụ ndị abịala hụ nnọọ ego n’anya nke na ha jizi ndụ ha niile na-achụ ya. Ụfọdụ ekwela ka ego chịwa ha, ya akpatakwara ha ọtụtụ nsogbu. Ma, ọ bụrụ na e jiri ego mee ihe otú o kwesịrị, o nwere ike ịba ezigbo uru. Baịbụl kwudịrị na “ego na-egbo mkpa niile.”—Ekliziastis 10:19.
Ọ bụ ezie na Baịbụl abụghị akwụkwọ na-akọ maka ego, ma n’ime ya, ị ga-enweta ndụmọdụ ndị dị mma nwere ike inyere gị aka ịma otú ị ga-esi jiri ego gị mee ihe bara uru. Ọtụtụ ndị na-enye ndị mmadụ ndụmọdụ banyere ego na-agwakarị ha mee ihe ise anyị chọrọ ịtụle ugbu a. Ihe ise a dabakwara n’ihe ndị e dere na Baịbụl kemgbe ụwa.
Chekwaa Ya. Akụkọ Baịbụl na-egosi na a kụziiri ndị Izrel oge ochie na ichekwa ihe bara uru. A gwara ha na-edebe otu ụzọ n’ụzọ iri nke ihe ndị ha na-akpata kwa afọ, ọ ga-abụkwa naanị maka iji gaa ememme ndị ha na-eme. (Diuterọnọmi 14:22-27) Pọl onyeozi gwakwara Ndị Kraịst oge mbụ ka ha na-ewepụta ego n’izu ọ bụla ma na-echekwa ya iji nwee ego ha ga-eji enye onyinye maka Ndị Kraịst ibe ha nọ ná mkpa. (1 Ndị Kọrịnt 16:1, 2) Ọtụtụ ndị na-akụziri ndị mmadụ ihe ha ga-eji ego ha na-eme na-agwa ha ka ha na-echekwa ego ha. Were ichekwa ego dị ka ihe dị ezigbo mkpa. Ozugbo i riri ụgwọ ọnwa, kwụnye nke ị chọrọ ichekwa n’ụlọ akụ̀ ma ọ bụ debe ya n’ebe ị na-agaghị akpa ya aka. Nke a ga-eme ka ị ghara imefu ego ahụ i chekwara.
Mee Atụmatụ. Nke a bụ ụzọ kacha mma isi lebara otú i si emefu ego, otú i si achịkwa ya, ma ọ bụ otú ị ga-esi ebelata ihe ndị i ji ego gị azụ, anya. Ime ezigbo atụmatụ maka ihe ndị ị ga-eji ego gị mee ga-enyere gị aka ịma ebe ego gị na-aga, o nwekwara ike inyere gị aka ịhụ na i ji ego gị mee ihe ndị ị chọrọ iji ya eme. Mara ego ole ị na-akpata, hụkwa na ị naghị emefucha ya. Mata ihe ndị ọ dị mkpa ka i nwee na ihe ndị ị chọrọ inwe. Jizọs kwuru ihe yiri ihe ndị a mgbe ọ gwara ndị na-ege ya ntị ka ha “nọdụ ala gbakọọ ihe ọ ga-efu” Luk 14:28) Baịbụl dụrụ anyị ọdụ ka anyị ghara iji ụgwọ.—Ilu 22:7.
ha tupu ha amalite ime ihe ọ bụla. (Hazie Ihe Ahazie. Chebara ihe ndị ga-adị gị mkpa n’ọdịnihu echiche. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na ị na-eme atụmatụ ịzụ ụlọ, o nwere ike ịdị mma ma i kpebie ibiri ego ị na-agaghị akwụrụ nnukwu ọmụrụ nwa ma jiri ya zụrụ ya. N’otu aka ahụ, o nwere ike ịdị mkpa ka nwoke nwere ezinụlọ na-akwụnye ndị ịnshọransị ego ka ezinụlọ ya ghara ịta ahụhụ mgbe ọ nwụrụ, ma ọ bụ ma ọ rịawara ọrịa, ma ọ bụkwanụ ma ihe ọ bụla ọzọ mee ya. Ichebara ihe ndị ga-adị gị mkpa n’ọdịnihu echiche nwekwara ike ịgụnye ime ndokwa maka mgbe ị ga-ala ezumike nká. Ilu 21:5 na-echetara anyị na “atụmatụ onye dị uchu aghaghị iweta uru.”
Mụọ Ime Ihe Dị Iche Iche. Mụọ otú e si eme ihe dị iche iche ma na-elekọta onwe gị anya nke ọma. Ime ihe ndị a ga-abara gị uru n’ikpeazụ. Akwụsịla ịmụ ihe. Baịbụl kwuru na “ezi amamihe na ikike iche echiche” bara ezigbo uru, gbakwaa anyị ume ka anyị nọgide na-enweta ha.—Ilu 3:21, 22; Ekliziastis 10:10.
Enwela Anyaukwu. Na-ele ego anya otú kwesịrị ekwesị. Nnyocha dị iche iche e mere na-egosi na ndị na-echebara ndị mmadụ echiche karịa ego na-aka enwe obi ụtọ. Ụfọdụ na-ekwe ka anyaukwu mee ka ha hụwa ego n’anya. Olee otú nke a si eme? Mgbe ha nwetachara ihe ndị dị ha mkpa ná ndụ, ha achọwazie ịbụ aka ji akụ̀. Ma e wezụga nri, uwe, na ebe obibi, gịnị ọzọ dị mmadụ mkpa? Ka a sịkwa ihe mere onye so dee Baịbụl anyị kwuru okwu ya ná mmalite isiokwu a ji dekwuo, sị: “Ebe anyị nwere ihe oriri na uwe, anyị ga-enwe afọ ojuju n’ihe ndị a.” (1 Timoti 6:8) Ọ bụrụ na afọ ana-eju anyị n’ihe ndị anyị nwere, anyị agaghị na-ahụ ego n’anya, anyị agaghịkwa enwe nsogbu ndị ịhụ ego n’anya na-akpata.
Ịhụ ego n’anya bụ n’ezie mgbọrọgwụ nke ọtụtụ ihe ọjọọ. Ego ga-abụ ọga gị ma i kwere. Ma ọ bụrụ na i jiri ego na-eme ihe otú o kwesịrị, o nwere ike inye gị ohere ime ihe ndị ọzọ ka mkpa ná ndụ, dị ka iso ndị ezinụlọ gị na ndị enyi gị na-akpachi anya, nakwa ịbịarukwu Chineke nso. Ma o yiri ka ọ gaghị ekwe omume mmadụ ịnọ nnọọ n’echeghị banyere ego. Ego ọ̀ ga-anọgide na-akpatara ndị mmadụ nchegbu? Olileanya ọ̀ dị na ịda ogbenye ga-akwụsị? Isiokwu na-eso nke a ga-aza ajụjụ ndị ahụ.
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 5]
Mara ego ole ị na-akpata, hụkwa na ị naghị emefucha ya
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 5]
Mata ihe ọ dị mkpa ka i nwee na ihe ndị ị chọrọ inwe
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 6]
E wezụga nri, uwe, na ebe obibi, gịnị ọzọ dị mmadụ mkpa?
[Igbe/Foto dị na peeji nke 7]
KỤZIERE ỤMỤ GỊ KA HA JIRI EGO HA NA-EME IHE BARA URU
N’ihi nsogbu ego ọtụtụ ndị toro eto na-enwe taa, ndị ọkachamara na-agba ndị mụrụ ụmụ ume ka ha kụziere ụmụ ha banyere ego—nakwa ka ha malite n’oge kụziwe ya. Ị jụọ ọtụtụ ụmụaka ebe e si enweta ego, ihe ha nwere ike ịgwa gị bụ, ọ na-esi n’aka “papa m” ma ọ bụ ọ na-esi “n’ụlọ akụ̀.” Ọ bụrụ na i nwee ike ịkụziri ụmụ gị uru ego bara, nke gụnyere inyere ha aka ịmara na e nwere ihe dị iche n’ihe ndị ha chọrọ na ihe ndị dị ha mkpa, ịmara otú e si echekwa ego, na otú e si akpata ego, i nwere ike inyere ha aka ka ha ghara ịna-ejikarị ụgwọ na ịnọ n’ụkọ. Lee aro ụfọdụ ndị nwere ike inye aka.
1. Gosi ụmụ gị otú e si eme ya. Ụmụ gị ga-aka eme ihe ha hụrụ ị na-eme karịa ihe ị gwara ha mee.
2. Kwuo ego ole unu ga na-emefu. Gị na ha kwuo ego ole ma gị ma ha ga na-emefu. Mụta ịsị mba, ma nọgidesie ike n’ihe i kwuru.
3. Hapụ ha ka ha kpebie ihe ha ga-eji ego ha eme. Ọ bụrụ na ụmụ gị nwetara ego mmachi akpa ma ọ bụ na a kwụrụ ha ụgwọ n’ọrụ ụfọdụ ha rụrụ, gwa ha ihe ndị ha nwere ike iji ego ahụ mee. Hapụzie ha ka ha kpebie ihe ha ga-eji ya eme.
4. Kụziere ha inye ndị ọzọ ihe. Kụziere ụmụ gị inye ndị ọzọ ihe ha nwere nakwa iwepụta ego maka inye Chineke onyinye.