Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Otu Onye Nkụzi Agbanwee Echiche Ya

Otu Onye Nkụzi Agbanwee Echiche Ya

Otu Onye Nkụzi Agbanwee Echiche Ya

▪ Afọ ole na ole gara aga, otu onye nkụzi n’obodo Batumi nke dị ná mba Georgia, gwara ụmụ akwụkwọ ya ka ha gụọrọ ya Iwu Iri ahụ. O juru onye nkụzi ahụ anya mgbe otu nwa akwụkwọ ya bụ́ Anna biliri ma gụtachaa Iwu Iri ahụ niile n’isi. Nwa akwụkwọ ahụ zakwara nnọọ ajụjụ ndị ọzọ si na Baịbụl otú tọrọ onye ọ bụla ụtọ. Nke a masịrị onye nkụzi ahụ nke na ọ jụrụ nwa akwụkwọ ahụ otú o si mụta ihe ndị a niile. Mgbe Anna gwara ya na ya na Ndịàmà Jehova mụrụ Baịbụl, onye nkụzi ahụ nabiiri ya okwu n’ọnụ, ma kwuo na ya na-ele Ndịàmà Jehova anya ka ndị okpukpe ha na-agba ara.

O nwere oge onye nkụzi ahụ gwara ụmụ akwụkwọ ya ka ha dee edemede banyere otú ihe dịịrị ndị bi na Georgia nakwa nsogbu ndị ha na-enwekarị. Mgbe Anna na-emechi edemede nke ya, o dere, sị: “Mgbalị ọ bụla ụmụ mmadụ na-eme iji kwụsị nsogbu niile e nwere n’ụwa agaghị enwe isi n’ihi na Jeremaya 10:23 kwuru, sị: ‘Ụzọ mmadụ adịghị ya n’aka. Ọ dịrịghị mmadụ nke na-eje ije ọbụna iduzi nzọụkwụ ya.’ Ọ bụ naanị Alaeze Chineke ga-akwụsị nsogbu niile.”

N’echi ya, onye nkụzi ahụ jara Anna mma maka edemede ya n’ihu ụmụ akwụkwọ ibe ya ma kwuo, sị: “Ọmarịcha edemede a Anna ji aka ya dee tọrọ m ụtọ. Ọ kọwara ihe ga-eme ka nsogbu ndị dị n’ụwa kwụsị.” Omume Anna tọkwara onye nkụzi ahụ ụtọ nke na ọ nọ n’ihu ụmụ klas ya niile jaa ya mma maka omume ọma ya na ejiji dị mma ọ na-eji.

Mgbe Ndịàmà Jehova bịara na nke onye nkụzi ahụ, ọ gwara ha na ya na-ewerebu ha ka ndị okpukpe ha na-agba ara ma ugbu a na ya adịghịzi ele ha anya otú ahụ n’ihi nwa akwụkwọ ya bụ́ Anna. N’afọ 2007, onye nkụzi ahụ so Ndịàmà Jehova gaa Ncheta Ọnwụ Jizọs Kraịst ma gee ntị nke ọma.

Mgbe a gbasara, onye nkụzi Anna kwuru na otú Ndịàmà Jehova si mara Baịbụl masịrị ya nke ukwuu. Ugbu a ya na Ndịàmà na-amụchizi Baịbụl anya. Dị ka onye nkụzi a, o doro anya na ị ga-eji obi dị ọcha chọọ ịmata ihe mere ndị ọzọ ji kwere n’ihe ndị ha kweere na ihe mere ha ji akpa àgwà otú ha si akpa. Ọ́ gaghị adị mma ma ị gwa Ndịàmà Jehova ka ha bịa mụwara gị Baịbụl n’ụlọ gị n’efu?

[Foto dị na peeji nke 9]

Ebe Anna na-ede edemede ya