Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

‘Ọ Zara Ajụjụ Ndị Anyị Nwere’

‘Ọ Zara Ajụjụ Ndị Anyị Nwere’

‘Ọ Zara Ajụjụ Ndị Anyị Nwere’

▪ ‘Ọ zara ajụjụ ndị anyị nwere.’ Ọ bụ ihe a ka ndị na-eto eto na-ekwu banyere akwụkwọ ọhụrụ ahụ bụ́ Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè, Nke 2. Jessicah, onye nọ n’obodo Texas nke dị na U.S.A. dere, sị: “Anaghị m ama ihe m ga-eme eme. Akwụkwọ a gbara m nnọọ ume. Ịmata na e nwere ọtụtụ ndị na-eto eto ibe m, ndị na-enwekwa nsogbu dị ka m na-enwe, ka ha na-agba mbọ ife Chineke, baara m uru. Akwụkwọ a zara ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ ajụjụ niile dị m n’obi ịjụ dị ka onye na-eto eto.”

Breann, onye nọ n’obodo Colorado, sịrị: “Akwụkwọ unu a na-arụ ọrụ unu ji maka ya bipụta ya, nke bụ́ ịgba ndị nne na nna na ụmụ ha ume ka ha na-akparịta ụka. Ọ na-abụ m chọọ ịgwa mama m okwu, mụ ewere akwụkwọ ahụ gụọrọ ya ihe m chọrọ ịgwa ya. Otu enyi m na-akwadebe ịkọrọ ndị mụrụ ya otu nsogbu o nwere naanị n’ihi ihe ọ gụtara n’akwụkwọ a.”

Isiokwu ndị mbụ dị n’akwụkwọ ahụ zara ajụjụ banyere ihe na-adịkarị n’obi ọtụtụ ndị na-eto eto, nke bụ́ okwu nwoke na nwaanyị. Katrina, onye nọ n’obodo New Jersey dere, sị: “Akwụkwọ ahụ mere ka m kpebisikwuo ike na ihe ọ sọkwara onye ọ bụla kwuo, adịbeghị m njikere ka mụ na nwoke ọ bụla kpawa. Ihe ọzọkwa bụ na onye na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye na-enwe ohere ime ọtụtụ ihe! Achọbeghị m ịkwụsị ime ihe ndị ahụ ugbu a. Mgbe m dịkwa njikere ka mụ na nwoke kpawa, ọ gaghị esiri m ike ịma ihe ndị m ga-achọ n’aka onye m ga-alụ nakwa otú mụ na ya ga-esi akpa.”

Ọ bụrụ na ọ ga-amasị gị inweta akwụkwọ a, biko dejupụta akụkụ peeji a e nwere ike ịdọkapụta adọkapụta ma zite ya n’adres e dere na ya ma ọ bụ n’adres nke kwesịrị ekwesị e depụtara na peeji nke 5 na magazin a.

□ Biko, bịanụ mụwara m Baịbụl n’ụlọ m n’efu.

[Foto dị na peeji nke 32]

Jessicah

[Foto dị na peeji nke 32]

Breann

[Foto dị na peeji nke 32]

Katrina