Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Chineke Ọ̀ Chọrọ Ka Ị Bụrụ Ọgaranya?

Chineke Ọ̀ Chọrọ Ka Ị Bụrụ Ọgaranya?

Echiche Baịbụl

Chineke Ọ̀ Chọrọ Ka Ị Bụrụ Ọgaranya?

“Taa bụ ụbọchị ọhụrụ Chineke meghere ná ndụ m! Ana m aga ịghọ aka ji akụ̀!”

“Achọrọ m ịba ọgaranya n’ihi na Chineke na ndị mmụọ ozi ya niile chọrọ ka m baa ọgaranya.”

“Chineke na-enye anyị ike ka anyị jiri ya kpata akụ̀.”

“Ọ bụ akwụkwọ ahụ bụ́ [Baịbụl] mere m ji enwe ego.”

IHE ndị a ka ọtụtụ okpukpe, bụ́ ndị na-akụzi na mmadụ ịba ọgaranya bụ ihe e ji ama onye Chineke gọziri, na-ekwu. Ha na-akụzi na ọ bụrụ na mmadụ emee ihe Chineke chọrọ ka o mee, Chineke ga-eme ka onye ahụ nweta ezigbo ihe niile dị na ndụ a ma gọziekwa onye ahụ n’ikpeazụ. Ọtụtụ ndị nwere mmasị n’ozizi a, akwụkwọ ndị na-akụzikwa ya na-aga ezigbo ahịa. Ma, Baịbụl ọ̀ kwadoro “ozizi ịba ọgaranya” a?

O doro anya na Onye kere anyị, bụ́ onye Baịbụl kpọrọ “Chineke bụ́ onye obi ụtọ,” chọrọ ka anyị bie ndụ obi ụtọ nakwa ka ihe dịrị anyị mma ná ndụ. (1 Timoti 1:11; Abụ Ọma 1:1-3) Ihe ọzọkwa bụ na ọ na-agọzi ndị na-erubere ya isi. (Ilu 10:22) Ma ihe ebe a na-ekwu ọ̀ bụ na Chineke na-agọzi anyị naanị site n’inye anyị akụnụba? Azịza ya ga-edo anyị anya ma ọ bụrụ na anyị aghọta oge anyị nọ na ya ugbu a dị ka uche Chineke si dị.

Ugbu A Ọ̀ Bụ Oge Ịba Ọgaranya?

N’oge ochie, Jehova Chineke ji akụnụba gọzie ndị ohu ya. Mmadụ abụọ e nwere ike iji maa atụ nke a bụ Job na Eze Sọlọmọn. (1 Ndị Eze 10:23; Job 42:12) Ma, e nwekwara ọtụtụ ndị ọzọ fere Chineke, bụ́ ndị na-abaghị ọgaranya, Jọn Onye Na-eme Baptizim na Jizọs Kraịst so na ha. (Mak 1:6; Luk 9:58) Gịnị ka anyị na-ekwu? Ihe anyị na-ekwu bụ na Baịbụl na-egosi na Chineke na-agọzi ndị ohu ya dị ka uche ya maka ha n’oge ahụ si dị. (Ekliziastis 3:1) Olee otú nke a si gbasa anyị taa?

Amụma Baịbụl na-egosi na anyị bi ‘n’ọgwụgwụ usoro ihe a,’ ma ọ bụ “n’oge ikpeazụ” nke ụwa a. Ihe a ga-eji mara oge a bụ agha, ọrịa, ụnwụ nri, ala ọma jijiji, nakwa mmebi iwu. Ihe ndị a niile na-akpa ụmụ mmadụ aka ọjọọ n’ụdị dị egwu kemgbe afọ 1914. (Matiu 24:3; 2 Timoti 3:1-5; Luk 21:10, 11; Mkpughe 6:3-8) Iji gbuo okwu nkenke, ụwa a dị ka ụgbọ mmiri nke na-achọ ikpu ekpu! Ebe ọ dị otú ahụ, ọ̀ bara uru ma Chineke were akụnụba gọziwe onye ọ bụla na-ejere ya ozi ugbu a, ka è nwere ihe ndị ọzọ Chineke chọrọ ka anyị were dị ka ihe ka mkpa?

Jizọs Kraịst ji oge anyị tụnyere oge Noa. Jizọs sịrị: “Dị ka ha nọ n’ụbọchị ndị ahụ tupu iju mmiri ahụ, na-eri ihe ma na-aṅụ ihe ọṅụṅụ, ndị ikom ana-alụ nwunye, a na-ekekwa ndị inyom di, ruo ụbọchị Noa banyere n’ụgbọ ahụ; ha amaghịkwa ruo mgbe iju mmiri ahụ bịara wee kpochapụ ha niile, otú ahụ ka ọnụnọ Nwa nke mmadụ ga-adị.” (Matiu 24:37-39) Jizọs jikwa oge anyị tụnyere oge Lọt. Ndị Sọdọm na Gọmọra, bụ́ ebe Lọt bi, nọ ‘na-eri ihe, na-aṅụ ihe ọṅụṅụ, na-azụ, na-ere, na-akụ ihe, ma na-ewu ihe.’ Jizọs sịrị, “Ma n’ụbọchị Lọt si na Sọdọm pụta, ọkụ na sọlfọ si n’eluigwe zoo ma bibie ha niile.” Ọ sịkwara: “Otú ahụ ka ọ ga-adị n’ụbọchị ahụ mgbe a gaje ikpughe Nwa nke mmadụ.”—Luk 17:28-30.

O doro anya na o nweghị ihe ọjọọ dị n’iri ihe, n’ịṅụ ihe ọṅụṅụ, ịlụ di ma ọ bụ ịlụ nwaanyị, ịzụ ihe, na ire ihe. Ebe nsogbu dị bụ mgbe mmadụ weere oge ya niile tinye n’ime ihe ndị a nke na ọ gaghị echetazi na oge anyị bi na ya bụ oge ọgwụgwụ. N’ihi ya jụọ onwe gị sị, ‘Chineke ọ̀ na-emere anyị ihe ọma ma ọ bụrụ na ọ na-enye anyị ihe ndị ga-eme ka uche anyị ghara ịdị n’ihe ndị ka mkpa ná ndụ?’ * Ọ bụrụ na o mee otú ahụ, ọ na-egbu anyị egbu. Ma, ọ bụghị otú ahụ ka Chineke bụ́ ịhụnanya si eme!—1 Timoti 6:17; 1 Jọn 4:8.

Ugbu A Bụ Oge Ịzọpụta Ndụ!

N’oge a tara akpụ ná ndụ ụmụ mmadụ, ndị Chineke nwere ọrụ ọ dị mkpa ka ha rụọ ngwa ngwa. Jizọs sịrị: “A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze n’elu ụwa dum mmadụ bi ka ọ bụrụ àmà nye mba niile; mgbe ahụkwa ka ọgwụgwụ ga-abịa.” (Matiu 24:14) Ndịàmà Jehova anaghị eji ọrụ a e kwuru okwu ya ebe a egwuri egwu. N’ihi ya, ha na-agba ndị agbata obi ha ume ka ha mụta ihe banyere Alaeze ahụ na ihe Chineke chọrọ n’aka ha iji nweta ndụ ebighị ebi.—Jọn 17:3.

Ma, Chineke achọghị ka ndị na-erubere ya isi na-anapụ onwe ha ihe ndị e ji atụ ndụ mmanụ. Kama ọ chọrọ ka ihe ndị dị mkpa ha nwere ná ndụ ju ha afọ, ka ha ghara inwe ihe ndị ga-adọpụ ha uche n’ozi ha na-ejere ya. (Matiu 6:33) Ọ ga-ahụkwa na o nyere ha ihe ndị na-akpa ha. Ndị Hibru 13:5 kwuru, sị: “Ka ụzọ ndụ unu bụrụ nke ịhụnanya ego na-adịghị na ya, ka unu nọ na-enwe afọ ojuju n’ihe ndị dị ugbu a. N’ihi na o [Chineke] kwuwo, sị: ‘M gaghị ahapụ gị ma ọlị, m gaghịkwa agbahapụ gị ma ọlị.’”

Chineke ga-emezu nkwa ahụ o kwere n’ụzọ pụtara ìhè mgbe ọ ga-echebe “oké ìgwè mmadụ” nke ndị na-efe ya ma o bibiwe ụwa ochie a ma mee ka ha banye n’ime ụwa ọhụrụ nke udo nakwa nke ha ga-aba ọgaranya nke ezigbo ya. (Mkpughe 7:9, 14) Jizọs sịrị: “Abịara m ka ha [ndị na-eso ụzọ ya na-erubere ya isi] nwee ndụ, ka ha nweekwa ya n’uju.” (Jọn 10:10) ‘Inwe ndụ n’uju’ a na-ekwu okwu ya ebe a abụghị inwe ọtụtụ akụnụba ugbu a, kama ọ bụ ndụ na-agaghị agwụ agwụ a ga-enwe na Paradaịs mgbe Alaeze Chineke ga-achịwa ụwa.—Luk 23:43.

Ekwekwala ka e jiri ihe a a na-akpọ ozizi ịba ọgaranya rafuo gị, n’ihi na, ihe ozizi a bụ n’ezie bụ ihe na-emegharị mmadụ anya. Kama, mee ihe a bara uru Jizọs kwuru na anyị kwesịrị ime n’egbughị oge: “Lezienụ onwe unu anya ka a ghara inwe mgbe iribiga ihe ókè na ịṅụ oké mmanya na nchegbu nke ndụ ga-anyịgbu obi unu, ụbọchị ahụ ewee bịakwasị unu na mberede n’otu ntabi anya dị ka ọnyà.”—Luk 21:34, 35.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 13 Dị ka ọ dị na narị afọ mbụ, e nwere ụfọdụ Ndị Kraịst nke oge a na-ekwesị ntụkwasị obi, ndị bụ́kwa ọgaranya. Ma Chineke dọrọ ha aka ná ntị ka ha ghara ịtụkwasị obi n’akụnụba ha ma ọ bụ kwe ka o megharịa ha anya. (Ilu 11:28; Mak 10:25; Mkpughe 3:17) Ma ànyị bụ ọgaranya ma ànyị bụ ogbenye, ihe kwesịrị ịkacha mkpa ná ndụ anyị niile bụ ime uche Chineke.—Luk 12:31.

Ì CHETỤLA NKE A N’ECHICHE?

Gịnị ka oge ruru maka ya ugbu a?—Matiu 24:14.

▪ Olee ndị a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl bụ́ ndị Jizọs ji oge ha tụnyere oge anyị a?—Matiu 24:37-39; Luk 17:28-30.

▪ Gịnị ka ọ dị mkpa ka anyị zere ma ọ bụrụ na anyị chọrọ inweta ndụ ebighị ebi?—Luk 21:34.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 11]

Ihe ahụ a na-akpọ ozizi ịba ọgaranya bụ n’ezie ozizi na-emegharị mmadụ anya