Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Mere Ụmụ Agbọghọ ji Agbara M Ọsọ?

Gịnị Mere Ụmụ Agbọghọ ji Agbara M Ọsọ?

Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị

Gịnị Mere Ụmụ Agbọghọ ji Agbara M Ọsọ?

Akọjuola m nwa agbọghọ a isi. Akọọrọla m ya ihe niile banyere onwe m—ndị m maara, ihe ndị m nwere, na ebe ndị m garala. Ama m na ọ na-agụsi ya agụụ ike ka mụ na ya kpawa!

Ọ dị m ka ala mepee ka m daba! Nwa okoro a, ò nweghị ike ịghọta na ihe ya amasịghị m? Olee otú m ga-esi kwụsị ụka a ọ na-akpanyere m ka ọ ghara ịdị ka m na-akparị ya?

I TORUOLA inwe nwa agbọghọ gị na ya ga na-akpa. Obi ga-adị gị mma ma ị hụ onye masịrị gị gị na ya na-ekpe otu okpukpe. (1 Ndị Kọrịnt 7:39) Ma n’oge ndị gara aga, mgbe ọ bụla ị chọrọ ka gị na nwa agbọghọ kpawa, ị naghị ama ihe ị ga-agwa ya agwa.

Ọ bụrụ na ị chọrọ ka gị na otu nwa agbọghọ kpawa, olee ihe ndị i kwesịrị iburu n’uche? Oleekwa ihe ndị Baịbụl kwuru ọ ga-adị mkpa ka i cheta?

Ihe Mbụ I Kwesịrị Ime

Tupu i kpebie ịgwa nwa agbọghọ na ị chọrọ ka gị na ya kpawa, e nwere ihe ụfọdụ dị mkpa ka ị mụta otú e si eme ha, ihe ndị a ga-enyekwara gị aka imete onye ọ bụla enyi. Ka anyị lebara ihe ndị ahụ anya.

Mụta ịkpa ezi àgwà. Baịbụl na-ekwu na ‘ịhụnanya adịghị akpa àgwà na-ekwesịghị ekwesị.’ (1 Ndị Kọrịnt 13:5) Ịkpa ezi àgwà na-egosi na ị na-akwanyere ndị ọzọ ùgwù nakwa na ị kpawala àgwà yiri nke Kraịst. Ma ezi àgwà adịghị ka uwe ị na-eyiri ka ndị ọzọ jaa gị mma, ma ị laruo n’ụlọ, gị eyipụ ya. Jụọ onwe gị, sị, ‘Àna m akpa ezi àgwà mgbe mụ na ndị ezinụlọ m nọ?’ Ọ bụrụ na ị naghị akpa ya, ọ pụtara na  ọ ga na-esiri gị ike ịkpa ezi àgwà mgbe gị na ndị ọzọ nọ. Cheta na nwa agbọghọ ọ bụla maara ihe ga-esi n’otú i si emeso ndị ezinụlọ gị mara ụdị onye ị bụ.—Ndị Efesọs 6:1, 2.

Ihe ụmụ agbọghọ na-ekwu: “Nwa okorobịa ihe ya na-amasị m bụ onye m hụrụ na ọ na-akpa ezigbo àgwà ma n’obere ihe, dị ka i mepere m ụzọ, nakwa ná nnukwu ihe, dị ka igosi na ya nwere obi ọma nakwa na ya na-echebara m echiche, na-echebakwara ndị ezinụlọ m echiche.”—Nkiru, ọ dị afọ iri abụọ. *

“Ọ na-ewe m iwe ma nwa okorobịa mụ na ya ka matara amata jụwa m ajụjụ ụfọdụ na-agbasaghị ya, dị ka ‘Ì nweela onye gị na ya na-akpa?’ na ‘Olee ihe ị ga-achọ ime ná ndụ?’ Ana m ewere ya na ọ na-akparị m, ọ na-emekwa ka ahụ́ ghara iru m ala!”—Adanna, ọ dị afọ iri na itoolu.

Na-adị Ọcha. Idebe onwe gị ọcha na-egosi na ị na-akwanyere ma onwe gị ma ndị ọzọ ùgwù. (Matiu 7:12) Ọ bụrụ na ị na-akwanyere onwe gị ùgwù, o yikarịrị ka ndị ọzọ ga na-akwanyere gị ùgwù. Ma ọ bụrụ na ị naghị adị ọcha, ọ ga-eme ka mbọ ị na-agba iji nweta nwa agbọghọ ghara inwe isi.

Ihe ụmụ agbọghọ na-ekwu: “Ọnụ otu nwa okorobịa nwere mmasị n’ebe m nọ na-esi ezigbo ísì. O kweghị m odidi.”—Ijeọma, ọ dị afọ iri abụọ na anọ.

Mụta otú e si akpanyere ndị ọzọ ụka. Ihe na-eme ka mmadụ abụọ dịrị ná mma na-aga bụ inwe ezi nkwurịta okwu. Nke a pụtara na ihe unu ga na-akpa agaghị abụ naanị ihe ndị na-amasị gị kama unu ga na-akpakwa ihe ndị na-amasị enyi gị.Ndị Filipaị 2:3, 4.

Ihe ụmụ agbọghọ na-ekwu: “Ọ na-atọ m ụtọ ma m hụ nwa okoro na-anaghị eme okomoko n’otú o si ekwu okwu ma mụ na ya na-akparịta ụka, onye na-echetali ihe ndị m gwara ya ma nwee ike ịjụ m ajụjụ ndị ga-eme ka mkparịta ụka anyị na-aga n’ihu.”—Chinyere, ọ dị afọ iri abụọ.

“N’uche m, ihe na-adọrọ mmasị ụmụ okoro bụ ihe ha ji anya ha ahụ, ma ihe na-aka adọrọ mmasị ụmụ agbọghọ bụ ihe ha nụrụ.”—Ebere, ọ dị afọ iri abụọ na abụọ.

“Nwa okoro nye m onyinye, ọ na-adị m mma. Ma m hụ nwa okorobịa maara ka e si akpanyere mmadụ ụka, onye mara ka e si akasi mmadụ obi na onye okwu ya na-agba ume . . . O nweghị ihe dị ka ya! Ọ na-atọgbu m atọgbu.”—Ọlụchi, ọ dị afọ iri abụọ na otu.

“Ụdị nwa okoro m ga-achọ ka mụ na ya kpawa bụ onye maara ka e si akpa mmadụ ọchị na onye nwekwara ike isi n’obi ya kpaa ihe ndị dị mkpa.”—Ijeọma, ọ dị afọ iri abụọ na anọ.

Ọ bụrụ na i mee ihe ndị a a tụrụ aro ha, gị na ndị enyi gị ga na-adịkwu ná mma. Ma, ọ bụrụ na i chere na ị dịla njikere ka gị na otu nwa agbọghọ kpachiwe anya, gịnị ka i kwesịrị ime?

Ihe Ọzọ Ị Ga-eme

Gakwuru ya. Ọ bụrụ na i nwere otu enyi gị ihe ya na-amasị gị, onye i lere anya na ọ ga-abụ ezigbo nwunye, gwa ya na i nwere mmasị n’ebe ọ nọ. Gwa ya hoo haa na ị chọrọ ịlụ ya. N’eziokwu, o nwere ike isiri gị ezigbo ike ịgwa ya ụdị ihe a. Ụjọ na-atụ gị ma ọ̀ ga-ekwekwa. Ma, na ị katara obi gakwuru ya ma gwa ya ihe i bu n’obi gosiri na i toruola ihe e ji nwoke eme.

Ihe ụmụ agbọghọ na-ekwu: “O nweghị otú m si ama ihe dị mmadụ n’obi. N’ihi ya, ọ bụrụ na o nwere onye chọrọ ka mụ na ya kpawa, ọ ka mma na ọ pụtara gwa m ihe o bu n’obi.”—Nneka, ọ dị afọ iri abụọ na atọ.

“Ọ bụrụ na gị na onye ahụ dị ná mma kemgbe, o nwere otú ọ na-adịcha ma ọ bịa gwawa gị okwu ọlụlụ. Ma m ga-akwanyere nwa okorobịa mụ na ya dị ná mma kemgbe ùgwù ma ọ bịa gwa m na ọ ga-amasị ya ka mụ na ya kpachiwekwuo anya.”—Nkechi, ọ dị afọ iri abụọ na ise.

Nabata ihe ọ bụla nwa agbọghọ ahụ kpebiri. Ọ̀ bụrụkwanụ na nwa agbọghọ ahụ agwa gị na ya achọghị ka gị na ya kpachiwekwuo anya? Kwanyere ya ùgwù site n’ịnabata ihe ọ gwara gị, kweta na ọ maara ihe ọ chọrọ, nakwa na ihe ahụ ọ gwara gị na ya achọghị, si ya n’obi. Ọ bụrụ na ị nọgide na-enye ya nsogbu ka o kweta, ọ na-egosi na ị ka na-eme ka ụmụaka. Ọ bụrụ na i kweghị ahapụ nwa agbọghọ gwara gị hoo haa na ya achọghị—ma ọ bụdị wewa iwe na ọ jụrụ gị—ị̀ na-egosi n’ezie na ị na-eche banyere ọdịmma ya ka ọ̀ bụ nke gị?—1 Ndị Kọrịnt 13:11.

Ihe ụmụ agbọghọ na-ekwu: “Ọ na-ewe m iwe ma m gwa nwa okoro na ihe ya amasịghị m, ya ana-abịakwa na-enye m nsogbu.”—Urenna, ọ dị afọ iri abụọ.

“Agwara m otu nwa okoro na ihe ya amasịghị m, ya anọgidekwa na-enye m nsogbu ka m nye ya nọmba ekwe ntị m. Ma achọghị m ịkparị ya. A sị ka e kwuwe, ọ dịghịrị ya mfe ịkata obi bịa gwa m obi ya. Ma emechara m gwa ya hoo haa ka ọ kwụsị inye m nsogbu.”—Ngọzi, ọ dị afọ iri abụọ na atọ.

Ihe Ị Na-ekwesịghị Ime

Ụfọdụ ụmụ okoro na-ekwu na ọ naghị esiri ha ike imete ụmụ agbọghọ enyi. Ha na ụmụ okoro ibe ha na-amadị aka onye ga-akacha emeta ụmụ agbọghọ enyi. Ma ụdị ịma aka a adịghị mma, ọ ga-ewetakwara gị aha ọjọọ. (Ilu 20:11) Ọ bụrụ na ị chọghị inwe aha ọjọọ, lee ihe ndị ị ga-eme.

Abụla onye mfegharị. Onye mfegharị na-eji ire ụtọ na otú o si ele anya enweta ụmụ agbọghọ ndị ọ chọrọ. Ma o bughị n’obi ịlụ nke ọ bụla. Onye na-eme ụdị ihe a na-eleghara ihe Baịbụl kwuru anya, nke bụ́ ka a na-emeso “ụmụ agbọghọ dị ka ụmụnne . . . ndị nwaanyị n’ịdị ọcha niile.” (1 Timoti 5:2) Ndị mfegharị anaghị abụ ezigbo enyi ma ya fọdụzie ịbụ ezigbo di. Ụmụ agbọghọ maara ihe maara nke a.

Ihe ụmụ agbọghọ na-ekwu: “Ọ na-ewe m iwe ma nwa okoro bịa gwa m okwu ndị na-eme ka isi kopụ m ma amakwa m na ọ gwara enyi m nwaanyị ụdị okwu ahụ naanị n’ọnwa gara aga.”—Nkechi, ọ dị afọ iri abụọ na ise.

“E nwere otu oge otu nwa okoro mara mma bịara na-akọju m isi, ihe ọ na-akọkwa bụ naanị banyere onwe ya. Mgbe otu nwa agbọghọ ọzọ sonyeere anyị, ya amalitekwa ịkọju ya isi. Mgbe onye nke atọ bịakwara, ya agwawakwa ya otu okwu ahụ. Ihe ahụ o mere mere ka ihe ya jọwa m njọ!”—Nkiru, ọ dị afọ iri abụọ.

Ejila obi nwa agbọghọ gwurie egwu. Echekwala na adịm ná mma gị na nwa agbọghọ ga-adị otú adịm ná mma gị na nwoke ibe gị na-adị. Maka gịnị? Tụlegodị nke a: Ọ bụrụ na ị gwara otu enyi gị nwoke na uwe ọhụrụ o yi amaka ma ọ bụkwanụ na ị na-akpanyekarịrị ya ụka, na-akọkwara ya ihe ndị na-enye gị nsogbu n’obi, ọ gaghị abịa chewe na i nwere mmasị n’ebe ọ nọ. Ma ọ bụrụ nwa agbọghọ ka ị gwara na uwe o yi mara mma ma ọ bụkwanụ gị ana-akpanyekarịrị ya ụka, na-akọkwara ya ihe ndị na-enye gị nsogbu n’obi, o nwere ike ichewe na i nwere mmasị n’ebe ọ nọ.

Ihe ụmụ agbọghọ na-ekwu: “Echeghị m na ụmụ okoro na-aghọta na otú ha si emeso ụmụ agbọghọ kwesịrị ịdị iche n’otú ha si emeso ndị enyi ha nwoke.”—Onyinyechi, ọ dị afọ iri abụọ na isii.

“Nwa okorobịa ga-anata m nọmba ekwe ntị m, ọ gaghị adị anya ya ejiri ekwe ntị zitere m ozi. À kpọkwanụ nke ahụ gịnị? Mgbe ụfọdụ gị na mmadụ nwere ike ịkpawa naanị site n’iji ekwe ntị na-ezigara ibe unu ozi, unu nwekwara ike isi otú ahụ nwụwara ibe unu, ma nke ahụ abụghị ezigbo ịhụnanya, ihe ole ka gị na onye ahụ ga-ejili ozi unu na-ezirịta n’ekwe ntị kparịta?”—Chidịmma, ọ dị afọ iri na itoolu.

“Echeghị m na nwa okorobịa na-aghọta na ọ na-adịrị nwa agbọghọ mfe ichewe na o nwere mmasị n’ebe ọ nọ, karịchaa ma ọ bụrụ na nwa okorobịa ahụ bụ onye na-echebara ndị ọzọ echiche nakwa onye ọ na-adị mfe ịgwa okwu. Ọ bụghị n’ihi na ọ dị nwa agbọghọ ahụ ọkụ n’ahụ́. Ana m eche na ihe na-akpata ya bụ na ọtụtụ ụmụ agbọghọ chọrọ onye ga-ahụ ha n’anya, anya ha na-adịkwa n’ịchọta onye ọ ga-adabara ha na ya.”—Chinwe, ọ dị afọ iri abụọ na ise.

Cheta Na Ọ Bụghị Mgbe Niile Ka Ọ Na-adaba

Nwa okorobịa ichewe na ihe ya ga na-amasịcha ụmụ agbọghọ niile bụ ihe na-agaghị ekwe omume, ọ bụdị mmadụ ibuli onwe ya elu. Ma ihe gị ga-amasị ụfọdụ n’ime ha ma ọ bụrụ na icheta ihe a: Ụdị mmadụ ị bụ ka mkpa karịa otú ị dị n’elu ahụ́. Ka a sịkwa ihe mere Baịbụl ji kwusie okwu ike ná mkpa ọ dị iyiri “mmadụ ọhụrụ ahụ.”—Ndị Efesọs 4:24.

Amaka, onye dị afọ iri abụọ na otu, chịkọtara okwu ọnụ otú a, sị: “Ụmụ okoro na-eche na o nwere ụdị ejiji ma ọ bụ otú ha ga-adị n’anya ya emee ka ihe ha masịwa ụmụ agbọghọ. Ọ bụ eziokwu na iji ejiji dị mma na-amasị ụmụ agbọghọ, ana m eche na ihe na-akacha amasị ha bụ àgwà ọma.” *

Ị gaa n’Ịntanet, ị ga-enweta ihe ndị ọzọ a tụlerela n’isiokwu bụ́ “Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị” n’adres bụ́ www.watchtower.org/ype

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 10 Aha a a kpọrọ ha abụghị ezigbo aha ha.

IHE Ị GA-ECHEBARA ECHICHE

▪ Olee otú ị ga-esi gosi na ị na-akwanyere onwe gị ùgwù?

▪ Olee otú ị ga-esi gosi na ị na-akwanyere mkpebi nwa agbọghọ mere ùgwù, gosikwa na ị na-echebara ya echiche?

[Foto dị na peeji nke 28]

Ezi àgwà adịghị ka uwe ị na-eyiri ka ndị ọzọ jaa gị mma, ma ị laruo n’ụlọ, gị eyipụ ya