Gịnị ka Ị Ga-aza?
Gịnị ka Ị Ga-aza?
Olee ebe o mere?
1. Olee obodo ihe a mere?
IHE GA-ENYERE GỊ AKA: Gụọ Ọrụ 2:1-13.
Kaa ihe gburugburu na nke bụ́ azịza ya na map.
Athens
Jerusalem
Babylon
▪ Olee obodo ọtụtụ n’ime ndị na-eso ụzọ Jizọs si?
․․․․․
▪ Gịnị mere ụfọdụ ndị ji kwaa ndị na-eso ụzọ Jizọs emo?
․․․․․
IHE A GA-EKWURỊTA:
Olee otú ihe a a kọrọ n’Ọrụ 2:1-13 na nke a a kọrọ na Jenesis 11:1-9 si yie, oleekwa ọdịiche dị na ha abụọ?
Site na Magazin A
Zaa ajụjụ ndị a, ma denye amaokwu Baịbụl ndị na-adịghị na ha.
PEEJI NKE 8 Ịtụ mmadụ egwu nwere ike ime gịnị? Ilu 29:․․․
PEEJI NKE 7 Gịnị ka onye nzuzu na-ejegharị na ya? Ekliziastis 2:․․․
PEEJI NKE 7 Atụmatụ onye dị uchu na-eweta gịnị? Ilu 21:․․․
PEEJI NKE 12 Gịnị ka ndị nwụrụ anwụ maara? Ekliziastis 9:․․․
Olee Ihe Ị Maara Banyere Onye Ikpe Bụ́ Ọtniel?
Gụọ Ndị Ikpe 3:7-11. Zazie ajụjụ ndị a.
2. ․․․․․
Olee agbụrụ o si?
IJI NYERE GỊ AKA: Gụọ Jọshụa 15:17, 20.
3. ․․․․․
Olee onye ọchịchị ọ napụtara ndị Izrel n’aka ya?
4. ․․․․․
Eziokwu ka ọ bụ ụgha? Ọ dịrị ndụ tupu Mozis.
IHE A GA-EKWURỊTA:
Olee ihe ọma Keleb nwanne papa Ọtniel mere, nke mere o ji bụrụ onye e ji ama atụ?
IJI NYERE GỊ AKA: Gụọ Ọnụ Ọgụgụ 14:6-9. Olee onye ikwu gị nke ihe ya na-amasị gị, kwuokwa ihe mere ihe ya ji amasị gị.
AZỊZA
1.Jeruselem.—Ọrụ 2:5.
▪ Galili.—Ọrụ 2:7.
▪ Ha chere na mmanya na-egbu ha.—Ọrụ 2:13.
2. Juda.—Jọshụa 15:17, 20.
3. Kushan–rishateyim.—Ndị Ikpe 3:8.
4. Ụgha.