Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ite Ime Abụghị Ebe Okwu Biri

Ite Ime Abụghị Ebe Okwu Biri

Ite Ime Abụghị Ebe Okwu Biri

KEMGBE Bill bụ nwata, o kweere na ite ime bụ mmehie dị oké njọ, nakwa na ya na igbu mmadụ bụ otu. Ma n’afọ 1975, otú a o si ele ite ime anya gbanwere mgbe otu nsogbu gbasara ite ime bịaara ya. Ọ tụwara enyi ya nwaanyị bụ́ Victoria ime mgbe ọ na-adịbeghị njikere ịlụ nwaanyị na ịzụ nwa. Bill sịrị, “Ihe gbatara m n’obi ozugbo bụ ime ihe ga-akara mụ mma. Agwara m Victoria ka ọ gaa tee ime ahụ.”

Ọtụtụ ndị na-eme ihe a Bill kwuru na ọ bụ ihe ga-akara ya mma ime ma ọ bụrụ na ha tụrụ ime ọkwà ma ọ bụ tụrụ ime mgbe ha na-achọbeghị ịmụ nwa. N’otu nnyocha e mere n’ụwa niile n’afọ 2007, a chọpụtara na n’afọ 2003, e nwere ihe dị ka nde ụmụ nwaanyị iri anọ na abụọ ndị tere ime. Ụmụ nwaanyị ndị a tere ime si n’agbụrụ dị iche iche nakwa mba dị iche iche, na-ekpekwa okpukpe dị iche iche, ma ndị ogbenye ma ndị ọgaranya, ma ndị gụrụ akwụkwọ ma ndị na-agụghị akwụkwọ, ha nọkwa n’afọ ndụ dị iche iche, ma ndị ka na-etopụta agbọghọ ma ndị kwụsịrịla ịhụ nsọ ha. Ọ bụrụ na ị tụrụ ime mgbe ị na-achọghị ya, gịnị ka ị ga-eme? Gịnị mere ọtụtụ ndị ji ahọrọ ite ime?

‘Otu Ihe Ka M Maara Ga-akara M Mma Ime’

Otu nwaanyị dị afọ iri atọ na ise sịrị: “O tebeghị aka m si n’afọ ime nyere m ezigbo nsogbu pụta, anyị nwekwara nsogbu ego nakwa nsogbu ndị ọzọ n’ezinụlọ anyị. Naanị izu isii m mụchara nwa ahụ, achọpụtara m na m dịkwa ime ọzọ. Anyị kpebiri ite ime ahụ. N’ime obi m, ama m na ọ dị njọ ime ya, ma ọ bụ ihe a ka m maara ga-akara m mma ime.”

E nwere ọtụtụ ihe mere ụmụ nwaanyị ji ete ime. Ihe ndị so na ya bụ nsogbu ego na esemokwu di na nwunye nke na-eme ka nwaanyị gharazie ịchọ ihe ọzọ ga-ejikọta ya na nke nwoke. Ma ọ bụkwanụ ya abụrụ na nwaanyị ma ọ bụ ya na di ya achọbeghị ịmụ nwa n’oge ahụ.

Ụfọdụ ndị na-ete ime ka ha ghara iwetara onwe ha ma ọ bụ ezinụlọ ha aha ọjọọ. Nke a dabara n’ihe Dr. Susan Wicklund dere n’akwụkwọ ya bụ́ This Common Secret—My Journey as an Abortion Doctor. Otu nwaanyị nke bịara ite ime n’ụlọ ọgwụ ya, sịrị: “Ndị mụrụ m anaghị eji okpukpe ha egwuri egwu. . . . Ọ bụrụ na m mụọ nwa n’alụghị di, ọ ga-ebutere ha aha ọjọọ. Ọ ga-eme ka ndị enyi ha niile mara na nwa ha nwaanyị bụ onye mmehie.”

Dr. Wicklund jụziri ya, sị: “Ugbu a ị tụụrụ ime, ị bụ onye mmehie n’anya ha, ma gịnịkwanụ ka ha ga-ekwu ma i tee ya?” Nwa agbọghọ ahụ kwuziri, sị: “Ị̀ sị ite ime? A naghị agbaghara mmehie nke ahụ agbaghara. Ma, ọ katụ mma n’ihi na m ga-ezochi ya. Ọ bụrụ na m tee ime, o nweghị otú ndị enyi [ndị mụrụ m], bụ́ ndị chọọchị anyị ga-esi ama.”

N’agbanyeghị ihe mere nwaanyị ji kpebie ite ime, ọ naghị adịkarị mfe ikpebi ime ya. Ọ na-akpatakarị nnọọ obi ọjọọ. Ma, ọ̀ bụ e tee ime, okwu ebie?

Chebara Nsogbu Ndị Ọ Na-akpata Echiche

N’otu nnyocha e mere n’afọ 2004, bụ́ nke e ji narị ụmụ nwaanyị ndị Russia atọ na iri atọ na otu nakwa narị ụmụ nwaanyị ndị America abụọ na iri na asaa, bụ́ ndị terela ime, mee, a chọpụtara na obi jọrọ ihe dị ka ọkara ụmụ nwaanyị ndị Russia ahụ njọ, jọọkwa ihe dị ka ọkara ndị nke America njọ mgbe ha techara ime. Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ọkara ndị nke Russia nakwa ihe dị ka mmadụ anọ n’ime mmadụ ise ná ndị nke America, kwuru na “obi ha mara ha ikpe” mgbe ha techara ime. Ihe karịrị ụmụ nwaanyị ndị America atọ n’ime ụmụ nwaanyị ndị America ise ka ‘na-enwe mwute’ na ha tere ime. Ebe ọ bụ na obi ọtụtụ ndị tere ime na-ama ha ikpe—ma ndị nke e weere na ha ejighị ihe gbasara okpukpe kpọrọ ihe—olee ihe mere ọtụtụ ụmụ agbọghọ ka ji ete ime?

Ọ na-abụkarị n’ihi ọkụ a na-akwanye ha n’ahụ́ ka ha tee ime. Ndị nne na nna ha, di ha ma ọ bụ enyi ha nwoke, ma ọ bụkwanụ ndị enyi ha ndị ọzọ bú ọdịmma ha n’obi, nwere ike ịgwa onye ahụ dị ime na ite ime ka mma karịa nsogbu ndị ọzọ ga-apụta ma ọ mụọ nwa ahụ. Nke a nwere ike ime ka mmadụ jiri ọkụ ọkụ mee mkpebi n’ihe ọ na-aghọtabeghị nke ọma. Dr. Priscilla Coleman, onye bụ́ ọkà n’ihe gbasara ọrịa uche nke ite ime na-akpata, sịrị: “Ma, mgbe nwaanyị ahụ jichara ọkụ ọkụ kpebie ite ime ma tee ya, ọ na-abịa mata onwe ya, obi ya na-amalitekarịkwa ịma ya ikpe, ya ana-ewute ya, ya ana-akwakwa mmakwaara.”

Ihe na-akpatakarị ha ji akwa mmakwaara bụ ma ha jụọ onwe ha ajụjụ a: Ime a m tere, ọ̀ pụtara na mụ egbuola mmadụ dị ndụ? Akụkọ si n’aka òtù ọrụ gbalụ gbalụ nke mba South Dakota hiwere maka ileba anya n’okwu gbasara ite ime, kwuru na ọtụtụ ụmụ nwaanyị ndị dị ime, bụ́ ndị ka na-atụle ma hà ga-ete ime, bụ ndị “a ghọgburu iche na naanị ihe a na-ewepụ ha n’ahụ́ bụ ‘ọbara.’ Akụkọ ahụ kwukwara na ha agaraghị ete ime ahụ ma ọ bụrụ na a gwara ha eziokwu.”

Mgbe ndị mere nnyocha a tụlechara “okwu ndị na-awụ akpata oyi n’ahụ́ na nke na-agbawa obi” ụmụ nwaanyị dị otu puku narị itoolu na iri anọ, bụ́ ndị tetụrụla ime, kwuru, ha kwuziri, sị: “Obi adịghị ọtụtụ n’ime ụmụ nwaanyị ndị a mma n’ihi mwute ha na-enwe maka iwepụ nwa a gwara ha na ọ bụ ọbara nkịtị.” Ha kwukwara na “ụdị mwute nwaanyị na-enwe ma o cheta na ya gburu nwa ya abụghị ihe e ji ọnụ ekwu.”

Ma olee nke bụ́ eziokwu? Ọ̀ bụ naanị ọbara na-apụ nwaanyị dị ime n’ahụ́ ma o tee ime? Nwa a na-amụbeghị amụ, ọ̀ bụ onye dị ndụ mgbe ọ nọ n’afọ?

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 4]

NDỊ MỤRỤ NWA NA NDỊ TERE IME

Otu nnyocha e mere n’afọ 2006 mere ka a ghọta otú ihe si kwụrụ ná ndụ ọtụtụ ụmụ nwaanyị ndị tụụrụ ime ọkwà mgbe ha ka na-eto eto. Ọkara ndị e ji mee nnyocha ahụ mụrụ nke ha amụ, ebe ọkara nke ọzọ tere nke ha ete. Ndị mere nnyocha ahụ chọpụtara na “ọ bụ ndị tere ime ka chọọ enyemaka maka mwute ha na-enwe, ọ bụkwa ha ka ụra ka chuo, o yikwara ka ọ̀ bụ ha banyere ná nsogbu ịṅụ wii wii karịa ndị nke mụrụ nke ha amụ.”—Journal of Youth and Adolescence.

Akụkọ ọzọ e nwetara kwuru “ihe a chọpụtara ná nnyocha anọ ọzọ e ji nnọọ ọtụtụ ndị mee.” Olee ihe ndị a chọpụtara ná nnyocha ndị a? “Ụmụ nwaanyị ndị nwerela mgbe ha tere ime na-akakarị arịa ọrịa uche n’ụdị ya dị iche iche ma e jiri ha tụnyere ndị nke na-etetụbeghị ime.”—Report of the South Dakota Task Force to Study Abortion.—2005.