Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Otú M Ga-esi Hazie Oge M?

Olee Otú M Ga-esi Hazie Oge M?

Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị

Olee Otú M Ga-esi Hazie Oge M?

“Anụpeere m ka mmadụ ji egwuregwu na-agwa onye ọzọ na ọ bụrụ na mmadụ chọrọ ka m bịa ihe ga-amalite n’elekere anọ, na onye ahụ kwesịrị ịgwa m na ọ bụ n’elekere atọ ka a ga-amalite ya. Ọ bụ mgbe ahụ ka m chọpụtara na m kwesịrị ịmụtakwu ịhazi oge m nke ọma!”—Obi. *

AWA olee ka ị ga-achọ ka e tinyekwuo n’ụbọchị? E tinyekwuo ya, gịnị ka ị ga-eji ya eme?

□ Mụ na ndị enyi m ga-eji ya nọrịa

□ M ga-eji ya hie ụra

□ M ga-eji ya mụọ ihe

□ M ga-eji ya megaa ahụ́

□ Ihe ndị ọzọ ․․․․․

Ọ bụ eziokwu na ọ ga-amagbu onwe ya ma e tinyekwuo ihe n’awa ole anyị nwere n’ụbọchị, ma nke ahụ agaghị eme eme! Gịnịzi ka ị ga-eme? Ọtụtụ ndị na-eto eto achọpụtala na ịhazi oge ha ahazi enyerela ha aka inwetakwu oge ha ga-eji mee ihe ndị ka mkpa. Ha achọpụtakwala na ịchịkwa ihe ndị ha ji oge ha eme enyerela ha aka ka ha ghara ịna-echegbukarị onwe ha, nyere ha aka ime nke ọma n’ụlọ akwụkwọ, ma meekwa ka ndị mụrụ ha na-atụkwasịkwu ha obi. Ka anyị lee otú ịhazi oge gị ga-esi baara gị uru.

Nsogbu nke mbụ Ịhazi Ihe Ndị Ị Chọrọ Ime

Ihe nwere ike igbochi gị. Naanị ichetadị na ị ga-ahazi ihe ndị ị chọrọ ime ahazi nwere ike ime ka ike gwụ gị! Ị na-achọ ime ihe ọ bụla ị chọrọ ime mgbe ọ masịrị gị, ị chọghịkwa ka e nwee ihe ga na-atụrụ gị mgbe ị ga-eme ihe ọ bụla ị chọrọ ime.

Ihe mere o ji dị mkpa ka i mee ya. Eze Sọlọmọn dere, sị: “Atụmatụ onye dị uchu aghaghị iweta uru.” (Ilu 21:5) O doro anya na Sọlọmọn bụ nwoke ji ọrụ n’aka mgbe niile. Ọ bụ di, bụrụ nna, bụrụkwa eze—o yikwara ka ọ bụrụla ihe ndị a niile tupu ya eruo afọ iri abụọ! Ka oge na-agakwa, o nwekwuru ọtụtụ ihe ndị ọ na-arụ. Dị ka ọ dị Sọlọmọn, i nwere ọtụtụ ihe ị na-eme ugbu a. Ma ọrụ nwere ike izukwu gị ahụ́ ka ị na-etokwu. Ọ ka mma ka ị malite ugbu a haziwe ihe ndị ị na-eme kama ịhapụ ka ọ bụrụ mgbe e mechara!

Ihe ndị na-eto eto ibe gị kwuru. “Ihe dị ka ọnwa isii gara aga, amalitere m na-ahazi ihe ndị m na-eme ahazi. Achọrọ m ime ka ihe dịkwuoro m mfe, o yikwara ka ịhazi oge m ahazi nyeere m aka!”—Chidi.

“Idepụta ihe ndị m chọrọ ime edepụta na-enyere m aka ime ha otú m si hazie ha. Mgbe ọ bụla m nwere ọtụtụ ihe ndị ọzọ m chọrọ ime, mụ na mama m na-anọdụ ala depụtachaa ihe ahụ niile iji mata otú anyị ga-esi nyere ibe anyị aka hụ na anyị mechara ha niile.”—Nneka.

Ihe ga-enyere gị aka. Sigodị otú a lee ya anya: Weregodị ya na gị na ndị ezinụlọ unu chọrọ iji ụgbọala unu mee njem. Onye bịa ya atụnye akpa ya na buutu ụgbọala ahụ. Ya abịazi yie ka ngwongwo unu niile agaghị abacha n’ime buutu ahụ. Gịnị ka i nwere ike ime? I nwere ike ibupụta ihe niile dị na buutu ahụ ma bido n’isi bubawa ha, buru ụzọ dọnye akpa ndị kacha ibu. Ị ga-emecha chọpụta na akpa ndị nke obere ga-enwe ebe ha ga-aba.

Otú ahụkwa ka ọ dị n’ihe gbasara ndụ gị. Ọ bụrụ na ihe ndị na-adịchaghị mkpa eburu ụzọ werechaa oge gị, ọ ga-esiri gị ike inwe oge ị ga-eji mee ihe ndị ka mkpa. Buru ụzọ wepụta oge maka ihe ndị ka mkpa, ọ ga-ejukwa gị anya na ị ka ga-enwe oge ime ihe ndị ọzọ ị chọrọ ime!—Ndị Filipaị 1:10.

Gịnị bụ ihe ndị kacha mkpa i kwesịrị ime?

․․․․․

Ugbu a i depụtacharala ha, leghachi ha anya ọzọ ma nye nke ọ bụla nọmba dabere n’otú ọ dịruru mkpa. Ọ bụrụ na i buru ụzọ mee ihe ndị kacha mkpa, ị ga-ahụ na ị ka ga-enwe oge ga-ezuru gị iji mee obere ihe ndị ọzọ dị gị mkpa. Ma chetakwa na ị gaghị enwe oge ime ihe ndị kacha mkpa ma i buru ụzọ mewe ihe ndị ahụ na-adịchaghị mkpa!

Ihe i nwere ike ime. Nweta obere akwụkwọ e ji edetu ihe, ma detuo ihe ndị ị chọrọ ime n’usoro ha ji dị mkpa. Ma ọ bụkwanụ, i nwere ike iji otu n’ime ihe ndị a na-edetu ha.

□ Kalenda na-adị n’ekwe ntị

□ Obere akwụkwọ

□ Kalenda na-adị na

□ Obere kalenda

□ kọmputa na-adị na tebụl

Nsogbu nke abụọ Ịhụ na I mere Ihe Otú I Si Hazie Ha

Ihe nwere ike igbochi gị. I si akwụkwọ lọta, sị ka i zurutụ ike ma jiri nkeji ole na ole kiritụ tiivi. Ma ọ bụkwanụ na ị chọrọ ibido ịmụ ihe, gị enweta ozi n’ekwe ntị gị ka ị bịa soro kirie otu fim. Ị gaghị agbanweli oge a ga-eji eme ihe nkiri a, ma i nwere ike ịmụ ihe n’abalị ma ị lọta. Ihe ị ga-agwazi onwe gị, bụ, ‘O yidịrị ka m na-aka eme nke ọma ma ọ bụrụ na m bido ịmụ ihe mgbe ule ruwere nso.’

Ihe mere o ji dị mkpa ka i mee ya. Ị ga-aka eme nke ọma n’ule ma ị na-agụ akwụkwọ mgbe uche gị na-aka adị n’ihe ị na-agụ. E wezụgakwa nke ahụ, oleedị ihe mere ị ga-eji nyewekwuo onwe gị ọrụ ebe i nwere ọtụtụ ihe ndị ị ga-eme? Gịnị mere ị ga-eji nyewekwuo onwe gị nsogbu site n’ịmụ ihe ọkụ ọkụ n’ime abalị iji mee nke ọma n’ule? Olee otú i chere ahụ́ ga-adị gị ma chi bọọ? I nwere ike ihife ụra, ahụ́ akụrisie gị, ma ọ bụ jiri ọkụ ọkụ hapụ ụlọ, ma ọ bụkwanụ gaa akwụkwọ n’azụ oge.—Ilu 6:10, 11.

Ihe ndị na-eto eto ibe gị kwuru. “Ọ na-amasị m ikiri tiivi, ịkpọ ụbọ, na iso ndị enyi m nọrịa. Ime ihe ndị a adịghị njọ; ma mgbe ụfọdụ ha na-eme ka m chefuo ihe ndị ka mkpa m kwesịrị ime, ọ na-emekwa ka m mewezie ihe niile ọkụ ọkụ.”—Okechukwu.

Ihe ga-enyere gị aka. Ahazila ime naanị ihe ndị i kwesịrị ime—haziekwa ihe ndị na-atọ gị ụtọ ime. Okechukwu sịrị: “Ọ na-akara m mfe ime ihe ndị m kwesịrị ime ma m cheta na e nwekwara ihe ndị ọzọ na-atọ m ụtọ m haziri ime ma m mechaa ndị nke ka mkpa.”

Ihe ọzọ i nwere ike ime: Họrọ otu ọkpụrụkpụ ihe ị chọrọ ịrụzu, ma hazizie otú ị ga-esi jiri nwayọọ nwayọọ rụzuo ya. Chidi, bụ́ onye dị afọ iri na isii, anyị kwuru okwu ya na mbụ, sịrị: “Achọrọ m ịbụ onye ji oge ya niile na-akụziri ndị mmadụ Baịbụl. Ihe a m kpebiri ịbụ na-enyere m aka ugbu a ịhụ na m na-eme ihe ndị m haziri ime, iji kwadebe onwe m maka oge ọrụ dịịrị m ga-ehikwu nne.”

Ihe i nwere ike ime. Olee otu ihe ma ọ bụ abụọ i chere na i nwere ike ịrụzu n’ime ọnwa isii na-abịanụ?

․․․․․

Olee otu ihe i nwere ike ịrụzu n’ime afọ abụọ na-abịanụ, oleekwa ihe ndị ọ dị mkpa ka ị malite mewe ugbu a iji rụzuo ya?

․․․․․

Nsogbu nke Atọ Ịdị Ọcha na Ịhazi Ihe Ahazi

Ihe nwere ike igbochi gị. Ị ghọtaghị otú ịdị ọcha na ịhazi ihe nke ọma si gbasa ihe i ji oge gị eme. E wezụga nke ahụ, o yiri ka ịhapụ ịhazi ihe ahazi na-aka nnọọ mfe. I cheta idebe ebe i bi ọcha, gị asị ka ọ dịwa echi, ma ọ bụdị chefuzie ya kpamkpam! Otú ahụ ebe i bi si ghasasịa adịghịdị emetụ gị n’ahụ́, n’ihi ya, ị na-ewere ya na o nweghị ihe o mere. Ma, ọ̀ bụnụ eziokwu na o nweghị ihe o mere?

Ihe mere o ji dị mkpa ka i mee ya. Idebe ihe niile ọcha na idebe ha ebe ha kwesịrị ịdị ga-eme ka ọ dịrị gị mfe ịchọta ihe n’ụlọ gị n’egbughị oge. Nke a ga-emekwa ka obi rukwuo gị ala, bụ́kwanụ ihe ahụ́ gị chọrọ.—1 Ndị Kọrịnt 14:40.

Ihe ndị na-eto eto ibe gị kwuru. “Mgbe ụfọdụ, mgbe m na-enweghị ohere doghachi uwe m n’ebe ha kwesịrị ịdị, ọ na-esiri m ike ịchọta ihe m na-achọ ọsọ ọsọ n’ihi na ebe niile dị ghaa ghaa ghaa!”—Chiamaka.

“Achọgidere m wọlet m ruo otu izu. Nke a mekwara ka ahụ́ na-agbakasị m. Emechaziri m hụ ya mgbe m zachasịrị ma dozie ụlọ m.”—Emeka.

Ihe ga-enyere gị aka. Gbalịa hụ na i weghachiri ihe ebe i si wepụta ya ozugbo i mechara. Iweghachi ihe ndị i ji mee ihe n’ebe ha na-adị ozugbo i mechara, kama ịhapụ ka ihe niile ghasasịa, ga-eme ka ọ dịrị gị mfe ihichasị ụlọ gị ngwa ngwa, meekwa ka ọ dịrị gị mfe ịchọta ihe.

Ihe i nwere ike ime. Mee ka idebe ihe ọcha mara gị ahụ́. Malite ugbu a debewe ihe ọcha karịa ka ị na-emebu, ma lee ma ihe ọ̀ ga-aka adịrị gị mfe.

Malite ya obere obere—malite ya taa! Olee aro ndị a tụrụ n’isiokwu a bụ́ ndị kacha baara gị uru?

․․․․․

Aga m agbalị ime ihe ndị a a tụrụ aro ha ruo ․․․․․․ izu iji hụ ma hà ga-enyere m aka.

Ị gaa n’Ịntanet, ị ga-enweta ihe ndị ọzọ a tụlerela n’isiokwu bụ́ “Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị” n’adres bụ́ www.watchtower.org/ype

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 Aha a kpọrọ ndị e kwuru okwu ha n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.

IHE Ị GA-ECHEBARA ECHICHE

▪ Awa ole ka ahụ́ gị chọrọ iji hie ụra, nke ga-eme ka i nwee ike ịrụ ọrụ nke ọma?

▪ Ònye ka i nwere ike ịgwa ka o nyere gị aka hazie ihe ndị i nwere ime?

▪ Ọ bụrụ na ị haziela ihe ndị i nwere ime, olee mgbanwe ndị o nwere ike ịdị mkpa ka i mee?

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 30, 31]

Ihe ndị na-eto eto nọ n’agbata afọ asatọ na afọ iri na asatọ ji oge ha mee n’ime otu izu:

Awa 17

ha na ndị mụrụ ha

Awa 30

n’ụlọ akwụkwọ

Awa 44

ikiri tiivi, igwu egwuregwu vidio, iziga ozi na kọmputa ma ọ bụ n’ekwe ntị, na igere egwú

OLEE IHE NDỊ M NA-EJI OGE M EME?

Gbakọọ awa niile i ji eme ihe ndị a n’otu izu

ikiri tiivi: ․․․․․

igwu egwuregwu vidio: ․․․․․

ịchọ ihe na kọmputa: ․․․․․

igere egwú: ․․․․․

Ngụkọta: ․․․․․

Awa ole m nwere ike iwepụta iji mee ihe ndị ka mkpa: ․․․․

[Foto dị na peeji nke 30]

Ọ bụrụ na ihe ndị na-adịchaghị mkpa eburu ụzọ werechaa oge gị, ị gaghị enwe oge ị ga-eji mee ihe ndị ka mkpa