Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ịhụnanya Na-emeri Ịkpọasị

Ịhụnanya Na-emeri Ịkpọasị

Ịhụnanya Na-emeri Ịkpọasị

“E nwere okpukpe ọhụrụ pụtaranụ nke a na-enwetụbeghị ụdị ya mbụ: ndị na-ekpe ya abụghị ndị na-efe mba ha ka chi, kama ha bụ ndị nwoke na ndị nwaanyị ndị wepụtara onwe ha ifekọ chi ha ọnụ: ha anaghị akpa ókè agbụrụ, ọ dịghịkwa onye n’ime ha na-ewere na ya ka ibe ya ma ọ bụ na mba ya ka nke ibe ya mma.”—Akwụkwọ bụ́ A History of Christianity, nke Paul Johnson dere.

MGBE ezigbo ndị na-eso ụzọ Kraịst na-agbasa n’Alaeze Ukwu Rom, o nwere ihe dị ịtụnanya ndị mmadụ chọpụtara. Ha chọpụtara na ha na-ebi n’udo, na-emekọ ihe ọnụ ma na-efekọ Chineke ọnụ dị ka otu ezinụlọ, n’agbanyeghị na ha si mba dị iche iche. Ihe mere ha ji dịrị n’udo bụ n’ihi na ha ji obi ha dum hụ ibe ha n’anya. Ụdị ịhụnanya a ha nwere abụghị nke elu ọnụ, kama ọ bụ nke ha mụtara n’Okwu Chineke.

Ọ bụ Jizọs Kraịst kụziiri ha inwe ụdị ịhụnanya a, yanwa nwekwara ya n’agbanyeghị na ndị mmadụ kpọrọ ya ezigbo asị n’enweghị ihe ha ga-asị na o mere ha. (1 Pita 2:21-23) Otu ihe mere ha ji kpọọ ya asị bụ n’ihi na ọ bụ onye Galili. Ebe ọ bụkwa na ọtụtụ ndị Galili bụ ndị ọrụ ugbo na ndị ọ́kụ̀ azụ̀, ndị ndú okpukpe ndị Juu ndị nọ na Jeruselem na-eleda ha anya. (Jọn 7:45-52) Ihe ọzọ bụ na Jizọs bụ ezigbo onye nkụzi, ndị nkịtị hụkwara ya n’anya ma na-akwanyere ya ùgwù. Ọ bụ ihe a mere ndị ndú okpukpe ahụ ji na-emere ya anyaụfụ nke na ha malitere kọsawa akụkọ ụgha banyere ya, kpawakwa nkata igbu ya!—Mak 15:9, 10; Jọn 9:16, 22; 11:45-53.

Ma, Jizọs ‘ejighị ihe ọjọọ kwụghachị ihe ọjọọ.’ (Ndị Rom 12:17) Dị ka ihe atụ, mgbe ụfọdụ ndị Farisii, ndị so ná ndị òtù okpukpe ndị Juu ahụ megidere Jizọs, bịakwutere Jizọs ma jiri obi ọcha ha jụọ ya ajụjụ, o ji obiọma ya zaa ha ihe ha jụrụ ya. (Jọn 3:1-21) O nwedịrị mgbe Jizọs so ndị Farisii rie nri, ma onye nke na-ekweghị emere ya ihe a na-emere onye ọbịa. Olee otú o si mee? N’oge ahụ, ọ bụ omenala ndị Juu ịsa ụkwụ onye ọbịa; ma, onye Farisii ahụ asaghị Jizọs ụkwụ. Jizọs ò were iwe? Mba. Kama nke ahụ, o ji oge ahụ kụziere ha na ọ dị mkpa inwe obi ebere na ịgbaghara mmehie.—Luk 7:36-50; 11:37.

Jizọs Hụrụ Ndị A Jụrụ Ajụ n’Anya

Otu n’ime ihe atụ a ma ama Jizọs ji kụzie ihe bụ akụkọ banyere ezigbo onye Sameria. N’akụkọ ahụ, onye Sameria ahụ ji ego ya nyere onye Juu ndị ohi naara ihe ya niile, ma kụọ ya ọ̀ dị ndụ ọnwụ ka mma, aka. (Luk 10:30-37) Gịnị mere ihe ahụ onye Sameria ahụ mere ji magbuo onwe ya? N’oge ahụ, ndị Juu na ndị Sameria anaghị eji anya ahụ ibe ha. Ndị Juu na-akpọkarị onye ha na-eleda anya “onye Sameria,” ha kpọdịri ya Jizọs. (Jọn 8:48) N’ihi ya, ihe atụ a Jizọs ji kụziere ndị na-ege ya ntị ka ha na-ahụ ndị agbata obi ha n’anya enweghị atụ.

Jizọs mere ihe ọ kụziri. Ọ gwọrọ onye Sameria ekpenta ya. (Luk 17:11-19) Jizọs kụzikwaara ndị Sameria nwere ezi obi ihe, nke na ya na nwaanyị onye Sameria kparịtara ụka were ogologo oge, bụ́kwanụ ihe ndị Juu na-anaghị eme. (Jọn 4:7-30, 39-42) Maka gịnị? Ndị rabaị ndị Juu, bụ́ ndị na-esoru iwu n’isi, emekataghị kwuoro nwaanyị ọ bụla okwu n’ihu ọha—ọ sọkwa ya ya bụrụ onye ikwu ha—ma ya fọdụzie ikwuru nwaanyị Sameria okwu!

Ma, ọ bụrụ na mmadụ bụ onye na-akpọ onye na-enweghị ihe o mere ya asị, ma ya ana-anwa ike ya ịkwụsị àgwà ahụ, olee otú Chineke si ele onye ahụ anya? Baịbụl nwekwara ihe ndị o kwuru ga-enyere anyị aka n’okwu a.

Chineke Na-enwere Anyị Ndidi

Na narị afọ mbụ, ọtụtụ ndị Juu bụ́ Ndị Kraịst ji maka na ndị Juu ibe ha na-asọ ndị na-abụghị ndị Juu asọ sọwakwuo ndị na-abụghị ndị Juu, n’agbanyeghị na ọtụtụ n’ime ha aghọọla Ndị Kraịst. Olee ihe Jehova Chineke mere iji kwụsị nsogbu a nwere ike ịkpata nkewa? O ji ndidi kụziere ọgbakọ Ndị Kraịst ahụ ihe. (Ọrụ 15:1-5) Ndidi ahụ rụpụtara ihe ọma, n’ihi na dị ka e kwuru ná mmalite isiokwu a, “ha anaghị akpa ókè agbụrụ, ọ dịghịkwa onye n’ime ha na-ewere na ya ka ibe ya ma ọ bụ na mba ya ka nke ibe ya mma.” N’ihi ya, “a nọgidere na-eme ka ọgbakọ dị iche iche dị ike n’okwukwe, ha na-amụbakwa n’ọnụ ọgụgụ site n’ụbọchị ruo n’ụbọchị.”—Ọrụ 16:5.

Olee ihe nke a na-akụziri anyị? Ike agwụla gị, kama tụkwasị Chineke obi, bụ́ onye ji mmesapụ aka na-enye ndị ‘ji okwukwe na-arịọ’ amamihe na ike nke ha ga-eji na-eme ihe dị mma. (Jems 1:5, 6) Ì chetara akụkọ a kọrọ gbasara Jennifer, Timothy, John, na Olga n’isiokwu nke mbụ? Tupu Jennifer abanye ụlọ akwụkwọ sekọndrị, ọ ghọọla Onye Kraịst ma nke a na-akọ, mụtakwa ịgbachi nkịtị ma a na-akparị ya n’ihi agbụrụ o si ma ọ bụ n’ihi mkpụmkpụ ọ dị. Mgbe ụmụ klas ha bịara kparịwa otu nwatakịrị nwaanyị ọzọ nọ na klas ha, Jennifer gbachiteere nwa ahụ ma kasie ya obi.

Olee ihe nyeere Timothy aka ịgbachi nkịtị mgbe ụmụ klas ha na-akparị ya n’ihi agbụrụ ya? Ọ sịrị: “M nọ na-eche aha ọjọọ m ga-ewetara Jehova Chineke. Echetakwara m na anyị kwesịrị ‘iji ihe ọma na-emeri ihe ọjọọ’ ma ghara ikwe ka ihe ọjọọ merie anyị.”—Ndị Rom 12:21.

Jọn mechara kwụsị ịkpọ nwa klas ya ahụ bụ́ onye Hausa asị. O kwuru, sị: “N’oge m ka na-eto eto, emetara m ụfọdụ ụmụ akwụkwọ anyị bụ́ ndị Hausa enyi. Mụ na otu n’ime ha so mee ihe a gwara anyị mee n’ụlọ akwụkwọ, anyị mekwara ya n’udo. M na-agbalị ugbu a ịmata ụdị onye mmadụ bụ kama ilewe agbụrụ ma ọ bụ ebo onye ahụ si.”

Olga na onye ya na ya so ekwusa ozi ọma n’ala ọzọ atụghị ụjọ mgbe ndị kpọrọ ha asị na-emegide ha, kama ha kwụsiri ike n’ozi ha, obi esiekwa ha ike na ụfọdụ ndị obodo ahụ ga-anabata ozi ọma si na Baịbụl ha na-ezi. Ọtụtụ ndị nabatakwara ya. Olga kwuru, sị: “Mgbe afọ iri ise gachara, otu nwoke bịakwutere m ma nye m obere ọmarịcha akpa. Ihe ndị dị n’ime ya bụ obere okwute e dere àgwà e ji ama Ndị Kraịst, ndị dị ka, ịdị mma, obiọma, ịhụnanya na udo. Ọ gwaziri m na ya so n’ụmụ okorobịa ndị ahụ tụrụ anyị okwute, nakwa na ya bụzi Onye Kraịst ibe m. Ya na nwunye ya nyekwara m okooko osisi iri na abụọ na-acha ọcha.”

Mgbe Ịkpọasị na Ịkpa Ókè Na-agaghị Adịkwa!

N’oge na-adịghị anya, ịkpọasị na ịkpa ókè ga-akwụsị. Olee otú ọ ga-esi eme? Otu ihe anyị ga-aghọta bụ na Jizọs Kraịst, Onye bụ́ isi ga-achị ụwa a, egosila na “ọ bụghị naanị ihe anya ya hụrụ ka ọ ga-eji na-ekpe ikpe.” (Aịzaya 11:1-5) Ọzọkwa, ndị Jizọs ga-achị n’ụwa ga-akpa nnọọ àgwà ka ya, n’ihi na Jizọs na Nna ya bụ́ Jehova Chineke ga-akụziri ha ihe.—Aịzaya 11:9.

A malitela ịkụziri ndị Chineke ihe ugbu a iji jikere ha maka ịdị ndụ n’ime ụwa e mere ka ọ dị ọhụrụ. N’ihi ya, gbalịanụ ka i soro ná ndị a na-akụziri Baịbụl n’efu. * N’eziokwu, Chineke anaghị ele mmadụ anya n’ihu; ọ bụ uche ya ka “a zọpụta ụdị mmadụ niile, ka ha nwetakwa ezi ihe ọmụma nke eziokwu.”—1 Timoti 2:3, 4.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 18 Ọ bụrụ na ị ga-achọ ka a mụwara gị Baịbụl n’efu n’ebe na n’oge ga-adị gị mma, gwa Ndịàmà Jehova nọ ebe i bi ma ọ bụkwanụ gị e jiri otu n’ime adres alaka ụlọ ọrụ anyị ndị e dere na peeji nke 5 detara Ndịàmà Jehova akwụkwọ ozi. I nwekwara ike zigara Ndịàmà Jehova ozi n’adres Ịntanet ha bụ́ www.watchtower.org.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 8]

N’oge na-adịghị anya, ịkpọasị na ịkpa ókè ga-akwụsị ịkpa ụmụ mmadụ aka ọjọọ

[Igbe/Foto dị na peeji nke 9]

ỤKPỤRỤ CHINEKE NDỊ ANYỊ KWESỊRỊ ISO

“Ejila ihe ọjọọ akwụ onye ọ bụla ụgwọ ihe ọjọọ. . . . Jiri ihe ọma na-emeri ihe ọjọọ.” (Ndị Rom 12:17-21) Gịnị ka anyị na-amụta n’ebe a? Ọ bụrụ na mmadụ e mee gị ihe ọjọọ, jiri ihe ọma kwụghachi ya. Jizọs Kraịst kwuru, sị: “Ha kpọrọ m asị na nkịtị.” Ma, ọ kpọgwaraghị ha asị.—Jọn 15:25.

“Ka anyị ghara ịbụ ndị onwe ha na-ebu isi, . . . na-enwere ibe anyị anyaụfụ.” (Ndị Galeshia 5:26) Anyaụfụ na mpako nwere ike ime ka mmadụ na Chineke ghara ịdị ná mma, ọ na-emekarịkwa ka onye ahụ kpọọ ndị ọzọ asị na nkịtị.—Mak 7:20-23.

“Ya mere, ihe niile unu chọrọ ka ndị mmadụ na-emere unu, unu onwe unu aghaghị imere ha otú ahụ.” (Matiu 7:12) Jụọ onwe gị, sị, ‘Olee otú m ga-achọ ka e si mesoo m?’ Na-emeso ndị ọzọ otú ahụ n’agbanyeghị afọ ole ha dị, otú ha si acha, asụsụ ha na-asụ, ma ọ bụ omenala ha.

“Na-anabatanụ ibe unu, dị nnọọ ka Kraịst nabatara anyị.” (Ndị Rom 15:7) Ị̀ na-agbalị ịmata ndị a na-azụghị otú e si zụọ gị, nakwa ndị omenala ha dị iche na nke gị, karịchaa ma ọ bụrụ na ha bụ ndị ohu Chineke ibe gị?—2 Ndị Kọrịnt 6:11.

“Ọ bụrụ na nna m na nne m ahapụ m, Jehova ga-akpọrọ m.” (Abụ Ọma 27:10) N’agbanyeghị otú ndị ọzọ nwere ike isi mesoo gị, Chineke agaghị ahapụ gị ma ọlị ma ọ bụrụ na ị na-erubere ya isi.

[Foto dị na peeji nke 7]

Onye Sameria, bụ́ ezigbo onye agbata obi, gbataara onye Juu ndị ohi naara ihe ya niile ọsọ enyemaka