Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ịkpọasị na Ịkpa Ókè Olee Ihe Ndị Na-akpata ha?

Ịkpọasị na Ịkpa Ókè Olee Ihe Ndị Na-akpata ha?

Ịkpọasị na Ịkpa Ókè Olee Ihe Ndị Na-akpata ha?

‘A mụrụ mmadụ niile ka ha nwere onwe ha, nwee ùgwù na ikike hà nhata. E nyere ha uche na mmụọ ime ihe ziri ezi nke na ha kwesịrị ịkpaso ibe ha àgwà n’obi nwanne na nwanne.’—Nkeji edemede 1 ná Nkwuwapụta Ụwa Niile Banyere Ikikere Mmadụ Nwegasịrị.

N’AGBANYEGHỊ ọmarịcha ihe a e kwuru, ịkpọasị na ịkpa ókè ka na-akpa ụmụ mmadụ aka ọjọọ. Nke a na-egosi ụdị oge anyị bi na ya, na-egosikwa na ụmụ mmadụ ezughị okè. (Abụ Ọma 51:5) Ma, nke ahụ apụtaghịzi na olileanya adịghị. Ọ bụ eziokwu na o nwere ike anyị agaghị akwụsịli ịkpa ókè na-eme gburugburu anyị, ma anyị nwere ike gbaa mbọ wepụ ihe ọ bụla nwere ike ime ka anyị na-akpọ ndị mmadụ asị.

Ebe anyị ga-ebidogodị bụ ikweta na onye ọ bụla n’ime anyị nwere ike ịkpọ mmadụ asị n’enweghị ihe onye ahụ mere ya. Otu akwụkwọ nke na-ekwu gbasara ịkpọasị na ịkpa ókè, sịrị: “O yiri ka ihe ndị kacha mkpa a chọpụtarala ná nnyocha e mere gbasara ịkpọasị bụ: (1) ọ dịghị onye na-enweghị ike iburu onye na-enweghị ihe o mere ya ihe ọjọọ n’obi, (2) mmadụ ga-ekweta na ya nwere àgwà a, gbasiekwa mbọ ike iji kwụsị ya (3) mmadụ kpebisie ike na ya ga-akwụsị ya, ọ ga-akwụsịli ya.”

E kwuola na ịkụziri ndị mmadụ ihe bụ “ihe kacha mma” e ji alụso ịkpọasị ọgụ. Dị ka ihe atụ, inweta ọzụzụ dị mma ga-eme ka anyị ghọta ihe na-akpata ịkpọasị, nyere anyị aka inyocha onwe anyị nke ọma, ma mee ka anyị mara ihe anyị ga-eme mgbe ndị ọzọ kpọrọ anyị asị n’enweghị ihe anyị mere ha.

Ihe Ndị Na-akpata Ya

Ọ bụrụ na ndị mmadụ akpọọ ibe ha asị n’enweghị ihe kpatara ya, ọ na-eme ka a ghara inwe ihe ndị ahụ ga-eme na-adị ha mma, mee ka ha na-aghọtahie ihe ọ bụla ha mere, meekwa ka ha leghara ihe ọ bụla ga-eme ka ha gbanwee obi ha anya. Mmadụ nwere ike ịmalite ịkpọ onye na-enweghị ihe o mere ya asị ma o sowe ihe ndị a kụziiri ya n’ezinụlọ ha, bụ́ ndị nwere ike ime ka ọ kpọwa ndị ọzọ asị. E nwekwara ike ịmụta ịkpọ ndị ọzọ asị n’aka ndị na-akpacha anya ekwu ihe ga-eme ka ndị ọzọ kpọọ agbụrụ ma ọ bụ omenala ibe ha asị. Ihe ọzọ na-akpata ịkpọasị bụ mmadụ ịhụ mba ya n’anya, ọzọkwa abụrụ ozizi okpukpe ụgha. Mpako nwekwara ike ịkpata ya. Ka ị na-echebara ihe ndị anyị ga-atụle ugbu a na ihe Baịbụl kwuru banyere ha echiche, ọ ga-adị mma ma i leruo otú i si akpa àgwà anya ma chọpụta ma è nwere ndị i kwesịrị ịgbanwe.

Ndị Gị na Ha Na-akpa. Ụmụ mmadụ na-achọkarị ka ha na ibe ha na-akpa, ọ dịghịkwa njọ ime otú ahụ. Baịbụl kwudịrị na “onye na-akpa iche ga-achọ ihe na-agụ naanị onwe ya,” nakwa na onye ahụ agaghị anabata ezi amamihe. (Ilu 18:1) Ma, anyị kwesịrị ịsa anya ná mmiri họrọ ndị anyị na ha ga na-akpa, n’ihi na ha nwere ike ime ka anyị kpawa àgwà otú ha si akpa. Ọ bụ ya mere ndị nne na nna maara ihe ji achọkarị ịma ndị ha na ụmụ ha na-akpa. Nchọpụta e mere na-egosi na ụmụaka ndị dị afọ atọ nwedịrị ike ịmụta ịkpọ ndị agbụrụ ọzọ asị ma ha hụ otú ndị ọzọ si emeso ndị agbụrụ ahụ, ma ọ bụkwanụ nụ ihe ha na-ekwu banyere ha. N’ihi ya, ndị nne na nna kwesịrị ime ike ha niile iji hụ na ihe ụmụaka ha na-amụta n’aka ha bụ ezigbo ihe, ebe ọ bụ na àgwà ụmụaka na-akacha amụta bụ àgwà nne na nna ha.

Olee ihe Baịbụl kwuru? “Zụlite nwatakịrị n’ụzọ ziri ezi ọ ga-eso, mgbe o tolitere ọ gaghị ahapụ ya.” (Ilu 22:6, Baịbụl Nsọ Nhazi Katọlik) “Onye ya na ndị maara ihe na-eje ije ga-ama ihe, ma ihe agaghị agaziri onye ya na ndị nzuzu na-emekọ ihe.” (Ilu 13:20) Ọ bụrụ na ị bụ nne ma ọ bụ nna, i nwere ike jụọ onwe gị, sị: ‘Àna m akụziri ụmụ m ka ha họrọ ụzọ ziri ezi na nke dị mma n’anya Chineke? Ndị mụ na ha na-akpa hà na-akụziri m ịkpa ezigbo àgwà? Ndị ọzọ hà na-amụta ezigbo ihe n’aka m?’—Ilu 2:1-9.

Ịhụ Mba n’Anya. Otu akwụkwọ ọkọwa okwu kwuru na ịhụ mba n’anya bụ “mmadụ ibuli mba ya elu karịa mba ndị ọzọ nakwa ịna-ekwukarị na omenala mba ya na ihe mba ya na-eme kacha nke mba ndị ọzọ niile mma.” N’otu akwụkwọ kwuru banyere esemokwu na adịm ná mma mba na mba, nke Ivo Duchacek bụ́ prọfesọ nkà mmụta ndọrọ ndọrọ ọchịchị, dere, ọ sịrị: “Ịhụ mba n’anya na-eme ka ụmụ mmadụ gharazie ichebara ibe ha echiche. N’ihi nke a, ndị mmadụ na-asịkarị: ‘Otú a ka ndị America anyị, ndị Russia anyị, ndị China anyị, ndị Ijipt anyị ma ọ bụ ndị Peru anyị si eme,’ tupu ha ekwuwe ihe hanwa chere, ma ọ bụrụdị na ha ga-ekwu ya ekwu.” Otu onye bụ́bu onyeisi ọrụ òtù UN dere, sị: “Ihe na-akpata ọtụtụ n’ime nsogbu ndị anyị nwere taa bụ otú na-adịghị mma anyị si ele ihe anya, nke ụfọdụ n’ime ha bụ ndị anyị mụtara n’amaghị ama. Otu n’ime ha bụ mmadụ ịhụ mba ya n’anya ruo n’ókè nke ịkwado ihe ọ bụla mba ya na-eme ma ọ̀ dị mma ma ọ̀ dị njọ.”

Olee ihe Baịbụl kwuru? “Chineke hụrụ ụwa n’anya [ụmụ mmadụ niile] nke ukwuu nke na o nyere Ọkpara ọ mụrụ naanị ya, ka e wee ghara ibibi onye ọ bụla nke nwere okwukwe na ya, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.” (Jọn 3:16) “Chineke adịghị ele mmadụ anya n’ihu, kama ná mba ọ bụla, onye na-atụ egwu ya ma na-eme ezi omume bụ onye ọ na-anabata nke ọma.” (Ọrụ 10:34, 35) Jụọ onwe gị, sị, ‘Ọ bụrụ na Chineke hụrụ ma m ma ndị ọzọ niile n’anya n’agbanyeghị ebe anyị si, ọ̀ bụ na ekwesịghị m ime ka ya, nke ka nke, ma ọ bụrụ na m na-ekwu na m na-efe ya?’

Ịkpa Ókè Agbụrụ. Otu akwụkwọ ọkọwa okwu kwuru na ndị na-akpa ókè agbụrụ kweere “na ọ bụ agbụrụ mmadụ si na-ekpebi otú onye ahụ ga-esi na-akpa àgwà ma ọ bụ ihe ndị ọ ga-emeli, nakwa na e nwere agbụrụ ka nke ndị ọzọ mma.” Ma, otu akwụkwọ nkà ihe ọmụma kwuru na “enwebeghị ihe ndị sayensị chọpụtarala na-egosi na e nwere [agbụrụ] ka nke ndị ọzọ mma.” Ihe ndị jọgburu onwe ha ịkpa ókè agbụrụ na-akpata, dị ka ịkpachara anya napụ mmadụ ihe ndị ruuru ya, socha egosi na ihe ndị mmadụ na-ekwu mere ha ji akpa ókè agbụrụ abụghị eziokwu.

Olee ihe Baịbụl kwuru? “Eziokwu ahụ ga-emekwa ka unu nwere onwe unu.” (Jọn 8:32) “[Chineke] sitekwara n’otu mmadụ mee mba ọ bụla nke ụmụ mmadụ.” (Ọrụ 17:26) “Ọ bụghị otú mmadụ si ahụ ihe ka Chineke si ahụ, n’ihi na mmadụ na-ahụ ihe anya na-ahụ; ma Jehova na-ahụ ihe dị n’obi.” (1 Samuel 16:7) Jụọ onwe gị, sị: ‘Àna m agbalị iwere mmadụ niile otú Chineke si were ha? Àna m agbalị ịmata ndị mmadụ nke ọma, ma eleghị anya ndị mụ na ha na-esighị n’otu agbụrụ, iji mara ụdị onye onye ọ bụla n’ime ha bụ n’eziokwu?’ Ọ bụrụ na anyị amara ụdị onye mmadụ bụ, ọ ga-eme ka anyị wepụ ihe ọjọọ ọ bụla anyị na-eche banyere onye ahụ n’obi anyị.

Okpukpe. Otu akwụkwọ nke kwuru banyere ịkpọasị, sịrị: “Ndị mmadụ na-akpa arụ mgbe ha gbakwasịrị ụkwụ n’ihe a kụziiri ha n’okpukpe ha na-achọ naanị [ọdịmma onwe ha] nakwa nke ndị agbụrụ ha. Ya dị otú ahụ, mara na okpukpe na-akwado ka mmadụ kpọọ onye na-enweghị ihe o mere ya asị.” Akwụkwọ ahụ kwukwara na nke ka njọ bụ otú ọtụtụ ndị bu okpukpe n’isi si “esi n’ịnụrụ okpukpe ha ọkụ n’obi, kpọwazie mmadụ ibe ha asị.” Ihe na-egosi na ihe a akwụkwọ a kwuru bụ eziokwu bụ na e nwere chọọchị ndị na-anabata naanị ndị ọcha ma ọ bụ naanị ndị ojii, nwee okpukpe ndị e nwere òtù ndị kpọrọ ibe ha asị ma na-alụso ibe ha ọgụ, nweekwa ndị na-agwa ndị okpukpe ha ka ha lụsoo ndị ọzọ ọgụ.

Olee ihe Baịbụl kwuru? ‘Amamihe nke si n’aka Chineke na-eme udo, nwee ezi uche, ọ dịghị akpa ókè n’ihi ile mmadụ anya n’ihu.’ (Jems 3:17) “Ndị na-efe ezi ofufe ga-efe Nna m n’ime mmụọ na n’eziokwu [ndị dị na Baịbụl].” (Jọn 4:23) “Na-ahụnụ ndị iro unu n’anya, na-ekpekwanụ ekpere maka ndị na-akpagbu unu.” (Matiu 5:44) Jụọ onwe gị, sị: ‘Okpukpe m ọ̀ na-akụziri m ịhụ mmadụ niile n’anya, ma ndị nwere ike ịchọ ime m ihe ọjọọ? Chọọchị anyị ọ̀ na-anabata ụdị mmadụ ọ bụla n’agbanyeghị obodo ha si, otú ha si acha, ma hà bụ nwoke ma ọ bụ nwaanyị, ma hà nwere ego ma ọ bụ na ha enweghị, ma hà bụ ndị a ma ama ma ọ bụ na ha abụghị?’

Mpako. Onye dị mpako na-eche na ya ka ndị ọzọ mma. Ọ na-adịkwara ya mfe ịkpọ onye na-enweghị ihe o mere ya asị. Dị ka ihe atụ, mpako nwere ike mee ka mmadụ na-ebuli onwe ya elu ma ọ bụ na-eleda ndị na-agụghị akwụkwọ ma ọ bụ ndị ogbenye anya. O nwekwara ike mee ka o kwere ụgha ndị mmadụ na-agha iji bulie obodo ha ma ọ bụ agbụrụ ha elu. Ndị bụ́ aka ochie n’ịkọsa ụdị ụgha a, ndị dị ka Adolf Hitler, bụ́ onye Nazi chiri ọchịchị aka ike, na-akpachara anya ebuli mba ha ma ọ bụ agbụrụ ha elu. Ha na-eme ka ndị ọzọ kwadoo ha, ha na-ekwukwa ihe ndị ga-eme ka ndị ahụ kpọọ ndị ha weere na hanwa ka mma asị.

Olee ihe Baịbụl kwuru? “Onye ọ bụla nke dị nganga n’obi bụ ihe arụ n’anya Jehova.” (Ilu 16:5) “[Unu emela] ihe ọ bụla n’ihi esemokwu ma ọ bụ n’ihi ịbụ ndị onwe ha na-ebu isi, kama n’ịdị nwayọọ n’obi na-ewere na ndị ọzọ ka unu.” (Ndị Filipaị 2:3) Jụọ onwe gị, sị: ‘Ọ̀ na-abụ ndị mmadụ jawa agbụrụ anyị mma ma ọ bụ kwujọwa nke ndị ọzọ, obi ana-atọ m ụtọ? Àna m enwere ndị ma ihe karịa m anyaụfụ, ka ihe ha na-eme ọ̀ na-atọ m ụtọ?’

Ka a sịkwa ihe mere Baịbụl ji dọọ anyị aka ná ntị, sị: “Karịa ihe niile ọzọ a ga-eche nche, chebe obi gị, n’ihi na ọ bụ na ya ka isi iyi nke ndụ si apụta.” (Ilu 4:23) N’ihi ya, were obi gị ka ihe dị ezigbo ọnụ ahịa, ekwekwala ka ihe ọ bụla mebie ya! Kama, tinyejuo amamihe ndị sitere n’okwu Chineke n’ime ya. Ọ bụ naanị mgbe ahụ ka ‘ikike iche echiche ga-eche gị nche, nghọta echebekwa gị, ịnapụta gị n’ụzọ ọjọọ, n’aka onye na-ekwu ihe rụrụ arụ.’—Ilu 2:10-12.

Ma, olee ihe ị ga-eme ma ọ bụrụ na ndị mmadụ akpọọ gị asị ma ọ bụ na-asọ gị asọ? Isiokwu na-esonụ ga-eleba anya na nke a.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 6]

Ọ bụrụ na anyị amara ụdị onye mmadụ bụ, ọ ga-eme ka anyị wepụ ihe ọjọọ ọ bụla anyị na-eche banyere ya n’obi anyị