Ụmụaka Ndị Ike Gwụgburula
Ụmụaka Ndị Ike Gwụgburula
▪ Mgbe onye nkụzi Pablo jụrụ ya ihe mere na o meghị ihe omume ụlọ akwụkwọ e nyere ya mee n’ụlọ, Pablo, onye dị afọ asatọ, sịrị: “Enwetaghị m ohere mee ya. Ike gwụrụ m.” Ọ dị ọtụtụ ụmụaka otú ọ dị nwata nwoke a bi na Spain anya ya zara aza n’ihi ehighị ụra nke ọma. Ike na-agwụ ha n’ihi awa iri na abụọ ma ọ bụ karịa ha na-eji amụ ihe n’ụlọ akwụkwọ ma na-eme ihe omume ndị ọzọ e nyere ha mee n’ụlọ. Gịnị mere ụmụaka ndị a ji etinyecha oge niile a n’akwụkwọ?
Ụfọdụ ndị nne na nna na-edeba aha ụmụ ha ka ha soro n’ihe omume ndị a na-eme ma a gbasaa akwụkwọ, iji hụ na ha anọghị nkịtị tupu otu onye n’ime ha alọta ọrụ. Ndị ọzọ na-eme ya n’ihi na ha chọrọ ka ụmụ ha na-eme nke ọma n’ụlọ akwụkwọ ma nwee ike inweta ezigbo ọrụ. Ọ bụ nke a mere ọtụtụ ndị nne na nna na South Korea ji eziga ụmụ ha nọ afọ iri na ụma “ụlọ akwụkwọ ebe a na-agụwa isi.” N’ụlọ akwụkwọ ndị a, a na-akụziri ụmụaka ihe n’ụbọchị asaa niile dị n’izu. Mgbe ụfọdụ, ha na-amalite mgbe o ji ọkara gafee elekere asaa nke ụtụtụ ruokwa n’etiti abalị ma ọ bụ gafee ya. Otu akụkọ gbara n’akwụkwọ akụkọ bụ́ New York Times, sịrị: “O yiri ka ọ na-agbazi ha ara ịhụ na ụmụ ha banyere na mahadum ndị a na-anụ aha ha.”
Otu akwụkwọ akụkọ a na-ebipụta kwa izu na Spain, aha ya bụ Mujer hoy, sịrị: “Ndị nne na nna, ndị na-akwanye ụmụ ha ọkụ n’ahụ́ ka ha na-eme nke ọma, bu ọdịmma ụmụ ha n’obi, na-achọkwa ka ụmụ ha mee nke ọma karịa onye ọ bụla ọzọ.” Ụmụaka ndị a na-adọlịgbuzi onwe ha iji mee ka obi dị ndị mụrụ ha mma, nke a na-emekwa ka ike gwụgbuo ha. Antonio Cano, bụ́ onyeisi nke otu Òtù Na-eme Nnyocha Banyere Nchekasị na Nchegbu na Spain, sịrị: “Nchọpụta anyị mere na-egosi na a na-ebokwasị ụmụaka ibu karịrị ha.” Ná nnyocha ọzọ e mere, a chọpụtara na ụmụaka abụọ n’ime ụmụaka ise ọ bụla na-erubeghị afọ iri na ise na Spain nọ n’oké nchekasị. Ụdị nchekasị a anaghị adị ụmụaka mma n’ahụ́, o nwedịrị ike ime ka ha gbuo onwe ha. Dị ka ihe atụ, na South Korea, akwụkwọ akụkọ bụ́ The New York Times kwuru na “e wepụ ihe mberede okporo ụzọ, ihe nke abụọ kacha akpata ọnwụ ndị na-eto eto dị n’agbata afọ iri na afọ iri na itoolu bụ ha iji aka ha gbuo onwe ha.”
N’eziokwu, ụmụaka kwesịrị ịgụsi akwụkwọ ike, ndị mụrụ ha kwesịkwara inyere ha aka otú ọ bụla ha nwere ike, n’ihi na afọ ndị ahụ gafee, ọ gafechaala. Ma dị ka otu onye nkụzi aha ya bụ Irene Arrimadas si kwuo, “ụmụaka na ndị toro eto abụghị otu. Ha agaghị anagideli ịnọ na-amụ ihe ogologo ụbọchị niile.” Ndị nne na nna ndị hụrụ ụmụ ha n’anya, bụ́kwa ndị ghọtara nke a, na-ahụ na ụmụ ha na-ezu ike otú o kwesịrị, hụkwa na ụmụ ha na-eso na-eme ihe ndị ọzọ bara uru ha na-eme n’ezinụlọ ha. Mgbe Eze Sọlọmọn maara ihe na-ekwu okwu banyere ime ihe otú kwesịrị ekwesị, o dere, sị: “Obere ezumike dị mma karịa ịrụsi ọrụ ike gabiga ókè na ịchụso ifufe.”—Ekliziastis 4:6. *
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 5 Ị chọọ ịgụkwu banyere otú e si na-akwanye ọtụtụ ụmụaka ọkụ n’ahụ́ ka ha mee nke ọma n’ụlọ akwụkwọ, gụọ isiokwu atọ mbụ dị na Teta! (Bekee) April 2009.