‘Igbe Naanị Jehova Ga-emegheli’
‘Igbe Naanị Jehova Ga-emegheli’
▪ N’afọ 2007, papa ụmụaka abụọ, bụ́ Erika onye dị afọ isii na Mattia onye dị afọ anọ, nwụrụ. Ma olileanya ụmụaka a nwere ná mbilite n’ọnwụ emeela ka ụfụ ọnwụ ahụ na-afụ ha kwụsịtụ.—Ọrụ 24:15.
Ọ na-atọ Erika ụtọ ịkọrọ ndị ọzọ olileanya ahụ o nwere, karịchaa n’ụlọ akwụkwọ ha dị n’obodo Sicily. Dị ka ihe atụ, mgbe enyi Erika aha ya bụ Beatrice kwuru na papa Erika nọzi n’eluigwe, Erika gwara ya na ọ bụghị ihe Baịbụl kwuru. Beatrice jụrụ ya, sị: “Oleezi ebe ọ nọ?”
Erika zara ya, sị: “Ọ nọ n’ili.” Ozugbo o kwuru nke a, Beatrice jụrụ ya otú ili na-adị.
Erika gwara ya, sị: “Ọ dị ka igbe a na-emeghe emeghe, na-emechikwa emechi. Ma, e mechihaala igbe a, o nweghị mmadụ ga-emegheli ya. Ọ bụ naanị Jehova ga-emegheli ya ma ụwa ọhụrụ bịa.”
Erika gwaziri enyi ya na aha Chineke bụ Jehova, gwakwa ya na ọ ga-eme ka ụwa ghọọ paradaịs, na ọrịa agaghị adịzi, nakwa na ndị nwụrụ anwụ ga-adị ndụ ọzọ. Erika gwaziri Beatrice ka ọ jụọ mama ya ma ọ̀ ga-ekwe ka ya nye ya otu akwụkwọ kọwara ihe ndị a niile.
Mgbe Beatrice gwara Erika na mama ya ekwela ka ya nara akwụkwọ ahụ, Erika nyeziri ya akwụkwọ bụ́ Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ. Erika ka na-akọrọ ndị ọzọ ihe ndị ọ na-amụta na Baịbụl, o nyekwala onye nkụzi ha ụdị akwụkwọ ahụ o nyere enyi ya nwaanyị.
Ọ bụ eziokwu na ọnwụ papa ha ka na-ewute Erika na nwanne ya nwoke, olileanya ha nwere ná mbilite n’ọnwụ na-eme ka obi na-adị ha mma. Ụmụaka ndị a na-ekele Jehova, bụ́ Chineke nke nkasi obi niile, otú ọtụtụ ndị ọzọ n’ụwa niile na-eme.—Matiu 21:16; 2 Ndị Kọrịnt 1:3, 4.
I nwere ike inweta akwụkwọ a nwere ihe osise ndị mara mma, nke dị peeji 256, nke peeji ya hacha ka peeji magazin a. Naanị ihe ị ga-eme bụ idejupụta akụkụ peeji a e nwere ike ịdọkapụta adọkapụta ma zite ya n’adres e dere na ya ma ọ bụ zite ya n’adres nke kwesịrị ekwesị e depụtara na peeji nke 5 na magazin a.
□ Biko bịanụ mụwara m Baịbụl n’ụlọ m n’efu.