Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe Ga-enyere Ndị Na-eto Eto Aka

Ihe Ga-enyere Ndị Na-eto Eto Aka

Ihe Ga-enyere Ndị Na-eto Eto Aka

A sị na ihe dị otú o kwesịrị, ndị nne na nna niile gaara na-enye ụmụ ha ntụziaka dị mma mgbe niile, jirikwa ịhụnanya na-azụ ha. Ha na ha ga na-ekwurịta okwu, na-agụkọ ihe, na-erikọ ihe, ha ana-aghọtakwa ụmụ ha. Ma, ndị nne na nna ezughị okè. Baịbụl kwuru eziokwu mgbe ọ sịrị: “Mmadụ niile emehiewo, ha adịghịkwa eru ebube Chineke.”—Ndị Rom 3:23. Ọ bụrụ na ị bụ onye na-eto eto, o nwere ike na-adị gị ka ihe adịchaghị otú o kwesịrị n’ezinụlọ unu, o nwekwara ike bụrụ eziokwu. Ma, e nwere ọtụtụ ihe i nwere ike ime iji belata nchegbu ndị ị na-enwe ma nwekwuo obi ụtọ. Legodị otú ihe ndị e kwuru na Baịbụl nwere ike isi nyere gị aka.

Aro nke Mbụ

Chọrọ Ndị Enyi Kama Ịnọ Naanị Gị

“Onye na-akpa iche ga-achọ ihe na-agụ naanị onwe ya; ọ bụ ezi amamihe niile ka ọ ga-agbaso mgba.” (Ilu 18:1) Ahụ́ anaghị eru ụfọdụ ndị na-eto eto ala ma ha na ndị mmadụ nọrọ, kama, ọ na-akara ha mma ịnọ na-ele tiivi ma ọ bụ na-egwu egwuregwu kọmputa. Ndị ọzọ na-eme ezigbo ihere, n’ihi ya, ha na-anọrọ onwe ha. Otu onye na-eto eto aha ya bụ Elizabeth kwuru na ya bụ onye “ihere na-eme mgbe niile.” Ọ sịrị: “Ihere nke m na-adị ka ebe ụjọ ji mmadụ. Ọ na-esiri m ezigbo ike ịgakwuru ndị mmadụ gwa ha okwu.”

Olee ihe na-enyere Elizabeth aka ịkwụsịlata ime ihere? Ọ bụ otu n’ime Ndịàmà Jehova, ọ na-agakwa ọmụmụ ihe Ndị Kraịst ha na-enwe mgbe niile, nke bụ́ otu ụzọ ha si efe Chineke. Elizabeth sịrị: “N’agbanyeghị na m na-eme ihere, mgbe ọ bụla m bịara ọmụmụ ihe, m na-ahụrịrị na e nwere onye m kwunyeere okwu. Ọ bụrụ na emelighị m ya, anaghị m ekwe ka ọ kụda m mmụọ. Kama, ana m elekwasị anya n’oge ndị m mere nke ọma. Achọpụtara m na ịmata ndị mmadụ abaarala m nnọọ uru.”

Ì cheghị na ọ ga-adị mma ma i dee aha mmadụ abụọ ma ọ bụ atọ ị ga-achọ ịmata ndị ha bụ nke ọma? Gbalịa hụ na e nwere otu ihe ọhụrụ ị mụtara banyere otu onye n’ime ha n’ime otu izu ma ọ bụ abụọ na-abịanụ. Dezie otu ezigbo ihe i nwere ike imere onye nke ọ bụla n’ime ha n’ọnwa na-abịanụ, hụkwa na i mere ya.—Ọrụ 20:35.

Ọ bụrụ na ihe mere na ị naghị akpa ndị mmadụ nso bụ ka ị gbaara nsogbu ọsọ, o doro anya na ị ga na-eche banyere onwe gị karịa ka i kwesịrị iche. Ma Baịbụl dụrụ anyị ọdụ ka anyị “na-elekwasị anya, ọ bụghị naanị n’ọdịmma onwe [anyị], kamakwa n’ọdịmma nke ndị ọzọ.” (Ndị Filipaị 2:4) Ọ bụrụ na ị na-eme ihe a Baịbụl kwuru mgbe gị na ndị ezinụlọ unu na ndị ọzọ na-emekọ ihe, ị ga-ahụ na nsogbu ndị ị na-enwe akarịghị akarị otú i chere, ọ ga-adịkwara gị mfe imeri ha.

Aro nke Abụọ

Gbaara Ịkwa Iko Ọsọ

“Gbaaranụ ịkwa iko ọsọ. Mmehie ọ bụla ọzọ nke mmadụ pụrụ ime dị n’elu ahụ́ ya, ma onye na-akwa iko na-emehie megide ahụ́ nke ya.” (1 Ndị Kọrịnt 6:18) Ọ bụrụ na ịkwa iko na-ewuru ndị na-eto eto ibe gị, gịnị ka ị ga-eme ka ha ghara ịraba gị ime ya?

Ihe mbụ ị ga-eme bụ ichebara okwu banyere inwe mmekọahụ echiche tupu mmadụ anwaa gị ka i mee ya. Otu ilu dị na Baịbụl sịrị: “Onye maara ihe na-echebara nzọụkwụ ya echiche.” (Ilu 14:15) Otu nwa agbọghọ bi na South Africa aha ya bụ Mbali, kwuru, sị: “Mgbe m nọ ụlọ akwụkwọ sekọndrị, otu nwa okorobịa nọ na klas anyị nke chọrọ ka mụ na ya mewe enyi anaghị ekwe m zuru ike. Ụmụ agbọghọ ndị ọzọ nọ na klas anyị nọ na-enye m nsogbu ka m kweta n’ihi na nwa okorobịa ahụ mara mma. O so ná ndị na-agbara ụlọ akwụkwọ anyị bọl, bụrụkwa onye a na-eji akpọsa uwe ọhụrụ. Amakwa m na ọ mara mma, ma ebula m ụzọ kpebie na agaghị m eme omume ọjọọ. Ndị ọgbọ m weere na ịkwa iko enweghị ihe o mere. Ma, ama m ihe dị mma na ihe na-adịghị mma, o teekwala m kpebiri ihe m ga-eme ma ụdị ọnwụnwa a bịara m.”

Ihe ọzọ i kwesịrị ime bụ ịrịọ Chineke n’ekpere ka o nyere gị aka ka ị ghara ime omume ọjọọ. Otu nwa agbọghọ bi n’England, aha ya bụ Maggie, kwuru, sị: “Ekpere na-enyere m aka inwe ike m ga-eji nọgidesie ike n’ihe m kpebiri mgbe a na-anwa m ka m kwaa iko. O nwetụbeghị mgbe m chere na m ga-emerili ọnwụnwa a n’ike aka m. Ana m agwakwa papa m na mama m nsogbu ahụ, mgbe ụfọdụkwa, mụ na ndị enyi m ndị toro eto na-ekwurịta ya.”

Aro nke Atọ

Ka Ihe Banyere Papa Gị na Mama Gị Na-emetụ Gị n’Obi

“Unu niile, nweenụ otu obi, ka ihe banyere onye ọzọ na-emetụ unu n’obi, nweenụ ịhụnanya ụmụnna, nweenụ obi ọmịiko, dịrịnụ umeala n’obi.” (1 Pita 3:8) Ọ bụghị gị ga-ekpebi ma papa gị na mama gị hà ga-agba alụkwaghịm ma ọ bụ na ha agaghị agba, nke ọ ga-eji bụrụ gị ga-ekpebi ma ọ̀ bụ ha abụọ ga na-arụ ọrụ ego mgbe niile. Ma, i nwere ike ikpebi ma ị̀ ga-ekwe ka nsogbu ndị ahụ mebie adịm ná mma gị na ha. Otu ihe ga-enyere gị aka inwekwu obi ụtọ ma kwụsịlata ịna-echegbu onwe gị bụ imetere mama gị na papa gị ebere, na ịgbalị ịghọta nsogbu ndị hanwa na-enwe.

Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Amber mere ihe a e kwuru. O kwuru na mgbe ụfọdụ, ya na mama ya na-ese okwu ma na-enwe nghọtahie. Ma, ọ sịrị: “Mama m ataala ezigbo ahụhụ ná ndụ ya. Naanị ya zụrụ anyị anọ ọ mụrụ. Ọ na-ahụ na e nwere ebe anyị bi, hụ na anyị nwere ihe anyị na-eri, nakwa na anyị na-enwe uwe anyị na-eyi. Ana m aja ya ike, m ga-achọkwa ime ka ya ma nsogbu bịara m.”

Ị gbalịa ịghọta ihe ha na papa gị na mama gị na-alụ, ghọtakwa otú obi na-adị ha, ọ ga-enyere gị aka ka ị ghara iwere na nsogbu ndị nke gị kacha njọ. O nwekwara ike nyere gị aka ịhụ àgwà ọma ndị ha nwere, meekwa ka i ṅomie ha.

Ebe Ị Ga-esi Nweta Ezigbo Ndụmọdụ

Aro ndị a a tụrụ so n’ọtụtụ ndụmọdụ ndị bara uru dị n’Okwu Chineke, bụ́ Baịbụl. Ka ị na-amụkwu Baịbụl, ị ga-eritekwu uru na ndụmọdụ ndị mara mma dị na ya. *

Otu ụzọ i nwere ike isi mụtakwuo Baịbụl bụ iso Ndịàmà Jehova na-akpa na iso ha na-amụ Baịbụl. I soro ha na-akpa, ị ga-enweta ezigbo ndị enyi ndị ga-enyere gị aka mgbe i nwere nsogbu, nyekwara gị aka ka ị na-eme ihe ndị ị na-amụta na Baịbụl. N’eziokwu, ọ dịghị mfe ime ihe Baịbụl kwuru. Ma, ọ bụrụ na i kpebie ịna-eme ya, ọ ga-abara gị uru ná ndụ gị niile.—Aịzaya 48:17, 18.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 20 Akwụkwọ bụ́ Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè, Nke 2, nke Ndịàmà Jehova bipụtara, bụ akwụkwọ nwere ndụmọdụ ndị mara mma si na Baịbụl, bụ́ ndị ga-enyere ndị na-eto eto aka imeri nsogbu ndị ha na-enwe. N’adres Ịntanet anyị bụ́ www.watchtower.org/ype e nwere isiokwu ndị yiri isiokwu a a tụlere.

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 16, 17]

Ihe Ndị Na-eto Eto Chọrọ n’Aka Ndị Mụrụ Ha

Oge Ha na Ndị Mụrụ Ha Ji Anọkọ: Jehova Chineke gwara ndị nne na nna bụ́ ndị Izrel ka ha na ụmụ ha na-ekwurịta okwu mgbe niile—“mgbe [ha] nọ ọdụ n’ụlọ [ha] na mgbe [ha] na-eje ije n’okporo ụzọ.” (Diuterọnọmi 6:6, 7) Nke a pụtara na ndị nne na nna ga-ewepụta oge ha na ụmụ ha ga-eji na-anọ. O doro anya na Jizọs ma na ọ dị mma ma ya wepụtara ụmụaka oge. Dị ka ihe atụ, mgbe ‘ndị mmadụ malitere ịkpọtara ya ụmụntakịrị ka o bitụ ha aka,’ gịnị ka Jizọs mere? ‘O kuuru ụmụaka ahụ wee malite ịgọzi ha.’ (Mak 10:13, 16) Jizọs setịpụụrụ ndị nne na nna ezigbo ihe nlereanya!

Ezigbo Nkwurịta Okwu: Baịbụl kwuru, sị: “Atụmatụ na-aghasasị ma ọ bụrụ na a gbaghị izu.” (Ilu 15:22) Mgbe ụmụ gị ka dị obere, ọ dị mkpa na gị na ha gbarịtara izu. Ọ kacha dịrị mkpa mgbe ha nọ n’afọ iri n’ụma, bụ́ mgbe o yiri ka oge ndị na-eto eto na ndị enyi ha n’ụlọ akwụkwọ ma ọ bụ ndị enyi ha ndị ọzọ na-eji anọ karịrị oge ha ji anọ n’ụlọ. Ọ bụrụ na gị na ha anaghị agbarịta izu, ya bụ, gị na ha anaghị akparịta ụka na-eru n’obi, ụmụ gị nwere ike ghọọ ndị ọbịa n’ụlọ unu.

Ịdọ Aka ná Ntị Kwesịrị Ekwesị: Ịdọ aka ná ntị pụtara ịgbazi mmadụ na inye ọzụzụ, ma ịta onye ahụ ahụhụ nwere ike iso ya. Ilu 15:5 kwuru, sị: “Onye ọ bụla nke dị nzuzu na-elelị ịdọ aka ná ntị nna ya, ma onye ọ bụla nke ji ịba mba kpọrọ ihe maara ihe.” O nweghị ihe onye na-eto eto ga-eji “ịba mba kpọrọ” ma ọ bụrụ na anaghị abara ya mba. Ma, ndị nne na nna ekwesịghị ikwe ka ịdọ aka ná ntị ha na-enye ụmụ ha gafee ókè. Ha ekwesịghị ịdị aka ike ma ọ bụdị mee ka ụmụ ha chewe na ọ dịghị ihe dị mma ha ga-emeteli ná ndụ. (Ndị Kọlọsi 3:21) Ha ekwesịghịkwa ịhapụ ụmụ ha ka ha na-emere otú masịrị ha ma hapụ inye ha ezigbo ọzụzụ. Ịhapụ ha ka ha na-eme otú masịrị ha nwere ike mebie ihe. *

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 28 Ị chọọ ịmatakwu banyere ihe ndị a e kwuru ebe a, gụọ akwụkwọ bụ́ Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ, isi nke 5 na nke 6. Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya.