Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ijidesi Aka Nri Chineke Ike

Ijidesi Aka Nri Chineke Ike

Ijidesi Aka Nri Chineke Ike

▪ Jezreel, onye bi na Mexico, bu otu ọrịa akpụkpọ ahụ́ a na-adịghị ahụkebe pụta ụwa. Ọrịa a na-eme ka akpụkpọ ahụ́ ya na-akpọ nkụ ma na-ewe iwere. Jezreel, sịrị: “Ọrịa a mere ka m na-asọ oyi n’anya, ma ọ naghị efe efe.”

Mgbe Jezreel dị obere, a gbalịrị ịgwọ ya n’ụlọ ọgwụ dị iche iche. N’otu ụlọ ọgwụ a kpọgara ya mgbe ọ dị afọ abụọ, e dowere ya n’ebe naanị ya na-anọ, e mekwara ka ebe ahụ dị ezigbo ọcha ka ọ ghara ibute nje ọ bụla. Ma ihe a niile emeghị ka nsogbu ya ka mma. Ndị ụlọ ọgwụ nyeziiri ya aka ịma otú ọ ga-esi na-edi otú ndị mmadụ si emeso ya.

Ndị chere na ọrịa Jezreel na-efe efe na-eze ya eze. Otú a ndị mmadụ si eze ya eze adịghịrị ya mfe idi mgbe ọ dị obere, karịchaa ma ọ chọọ ka ya na ụmụaka ndị ọzọ gwuo egwu. O chetara otu ihe merenụ, sị, “Ha na-eji m eme ihe ọchị ma na-akpọ m aha ọjọọ ndị dị ka ozu a gbasiri agbasi na onye si n’ụwa ọzọ.”

Ma ọrịa a a na-ahụ anya emeela ka Jezreel nwee ohere ịkọrọ ndị ọzọ banyere olileanya o nwere n’ihi ihe ndị ọ mụtara na Baịbụl. Ndị mmadụ na-ajụkarị ya ma ọkụ ọ̀ gbara ya. Ọ bụrụ na ọ sị ha mba, ha ajụzie ya ihe mere akpụkpọ ahụ́ ya ji dị otú ọ dị. Ọ na-akọwaziri ha otú ọrịa akpụkpọ ahụ́ ahụ si eme ya, gwakwa ha na e nwebeghị otú e si agwọ ya.

Ọ na-agwakwa ha, sị: “Enwere m olileanya kacha mma n’ụwa, n’ihi na Jehova Chineke kwere nkwa na ndị niile na-erube isi n’iwu ya ga-adị ndụ n’ụwa ọhụrụ nke ọrịa na ahụ́ mgbu na-agaghị adị.” (Mkpughe 21:3, 4) Otú a Jezreel si na-akọwara ndị mmadụ banyere ọrịa a ọ na-arịa emeela ka o nweta ndị ha na ya na-amụ Baịbụl. Ọ na-enyekwa ya ọṅụ ịhụ ka ọtụtụ n’ime ha na-aghọ ndị ha na ya na-efekọ Chineke.

Jezreel sịrị: “Obi dị m ụtọ na a mụrụ m n’ezinụlọ Ndị Kraịst, nakwa na m nwere ezigbo ndị enyi bụ́ Ndịàmà Jehova ibe m. Ọ dịghị onye n’ime ha na-agbara m ọsọ n’ihi otú m dị. E mere m baptizim mgbe m dị afọ iri na asaa, enweekwala m ọtụtụ ohere ijere Onye kere m ozi kemgbe afọ iri na anọ e mechara m baptizim.”

Jezreel na-echeta okwu na-agba ume Jehova kwuru n’Aịzaya 41:10, 13, ebe na-agụ, sị: “Atụla egwu, n’ihi na m nọnyeere gị. . . . M ga-eji aka nri m nke ezi omume jidesie gị ike. N’ihi na mụ onwe m, bụ́ Jehova Chineke gị, sekpụ gị n’aka nri gị. Ọ bụ m bụ Onye na-asị gị, ‘Atụla egwu. Mụ onwe m ga-enyere gị aka.’”

Ijidesi aka nri Jehova ike enyerela Jezreel aka ka ọ ghara ịna-echegbu onwe ya banyere otú ndị mmadụ si ele ya anya, o nyekwarala ya aka idi nsogbu niile ọrịa ya ahụ kpataara ya. O so ọtụtụ nde ndị ọzọ na-atụ anya oge Chineke ga-emezu nkwa ndị mara mma o kwere.