Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Nsogbu Ndị Na-eto Eto Na-enwe Taa?

Olee Nsogbu Ndị Na-eto Eto Na-enwe Taa?

Olee Nsogbu Ndị Na-eto Eto Na-enwe Taa?

Ì chere na nsogbu ndị na-eto eto na-enwe taa siri ike karịa nke ndị oge mbụ? Ọ bụrụ na i cheghị otú ahụ, o nwere ike ị na-eche na ndị na-eto eto taa na-enwe obi ụtọ karịa ndị nke oge mbụ.

N’ọtụtụ obodo, e nweela ọgwụ ndị e ji agwọ ọrịa ndị na-akwarụbu ndị na-eto eto ma ọ bụdị gbuo ha egbuo. Nkà na ụzụ arụpụtala ngwá ọrụ electronics na ihe ndị e ji egwuri egwu, bụ́ ndị ndị oge ochie na-amaghị na ọ ga-emecha dịrị. Ọtụtụ ụzọ e si na-akpata ego taa emeekwala ka ọtụtụ ezinụlọ gharazie ịda ogbenye. N’eziokwu, ọtụtụ ndị nne na nna na-agbalịsi ike ugbu a inye ụmụ ha ihe ndị ha chọrọ na ịhụ na ha gụrụ ezigbo akwụkwọ, bụ́kwanụ ihe a na-emereghị hanwa n’oge nke ha.

O doro anya na ndị na-eto eto ugbu a nwere ọtụtụ ihe ọma. Ma, nsogbu ndị ha na ha na-alụ karịkwara akarị. Otu ihe kpatara ya bụ na oge ụmụ mmadụ bi ugbu a bụ oge Baịbụl kpọrọ “ọgwụgwụ usoro ihe a.” (Matiu 24:3) Jizọs Kraịst kwuru eziokwu na oge a ga-abụ oge a ga-enwe ọgba aghara dị egwu. (Matiu 24:7, 8) Baịbụl kpọrọ oge a “oge ikpeazụ,” kwuokwa na ndị mmadụ ga-ebi ndụ “tara akpụ.” (2 Timoti 3:1) Ka anyị leba anya n’ụfọdụ nsogbu ndị tara akpụ ha na ndị na-eto eto na-alụ taa.

Nsogbu nke Mbụ

Naanị Ha Na-anọkarịzi

Na fim, tiivi, nakwa n’akwụkwọ ọgụgụ, a na-ekwukarị na ndị na-eto eto na-enwe ọtụtụ ndị enyi ha na ha tokọrọ, gakọọ akwụkwọ ma dịgide ná mma ruo mgbe ha mere okenye. Ma nke bụ́ eziokwu bụ na ọ naghị adịrị ọtụtụ ndị na-eto eto otú ahụ.

Barbara Schneider na David Stevenson, bụ́ ndị na-eme nnyocha, lebara anya n’ajụjụ ọnụ a gbara ọtụtụ puku ụmụ akwụkwọ ndị na-eto eto bi na United States. Ha chọpụtara na “ọ bụ ole na ole n’ime ha ka ha na ezigbote ndị enyi ha na-abụgide enyi ruo ogologo oge.” Ha chọpụtakwara na ọtụtụ ndị na-eto eto “anaghị enwe ndị ha na ha na-abụte enyi aka, nke mere na ọ na-esiri ha ike inwe ezigbo ndị enyi ahụ́ na-eru ha ala ịkọrọ nsogbu ndị ha na-enwe.”

O yiri ka ndị na-eto eto ndị nke nwere ndị enyi anaghị enwe oge ha na ndị enyi ha ji anọ. Na United States, a gara ebe dị iche iche mee nnyocha ma chọpụta na e kee oge ndị na-eto eto nwere n’ụbọchị ụzọ iri, nke ha na ndị enyi ha na-eji anọkọ bụ ihe dị ka otu ụzọ, ebe nke ha na-eji anọ naanị ha bụ ihe dị ka ụzọ abụọ. Nke a pụtara na oge ha ji anọ naanị ha na-aka oge ha na ndị ezinụlọ ha ma ọ bụ ndị enyi ha ji anọ. Ha na-eri nri naanị ha, na-eme njem naanị ha, na-atụrụ ndụ naanị ha.

Ihe mere nsogbu a ji ka njọ bụ ngwá electronics juru ebe niile taa. Dị ka ihe atụ, n’afọ 2006, magazin a na-akpọ Time kwuru na ndị na-eto eto ndị nọ n’agbata afọ asatọ na afọ iri na asatọ, bụ́ ndị bi n’America, na-eji ihe dị ka awa isii na ọkara elepagide anya na tiivi n’ụbọchị, ma ọ bụ jiri ya na-ege egwú ha kwụnyere ná ntị, ma ọ bụkwanụ na-egwu egwuregwu kọmputa. *

N’eziokwu, ndị na-eto eto e nwere ugbu a abụghị ha bụ ndị mbụ na-eji ọtụtụ awa ege egwú ma ọ bụ egwuri egwu. (Matiu 11:16, 17) Ma, oge buru ibu ha na-eji anọ naanị ha taa na kọmputa nakwa na tiivi, kama ha na ndị ezinụlọ ha ịnọ kpaa nkata, nwere ike ịkpa ha aka ọjọọ. Schneider na Stevenson bụ́ ndị na-eme nnyocha, kwuru, sị: “Ndị na-eto eto kwuru na mgbe ha nọ naanị ha, ọ naghị adịcha ha ka ha bara uru, obi anaghị adịcha ha ụtọ, ihe ha na-eme anaghị atọcha ha ụtọ, nakwa na ọ na-adị ha ka o nweghị ezigbo ihe ha na-eme.”

Nsogbu nke Abụọ

A Na-enye Ha Nsogbu Ka Ha Kwaa Iko

A na-enye ndị na-eto eto ezigbo nsogbu ka ha kwaa iko. Otu nwa okoro bi n’Australia, aha ya bụ Nathan, sịrị: “Ọtụtụ ụmụ akwụkwọ anyị malitere inwe mmekọahụ mgbe ha dị afọ iri na ise ma ọ bụdị afọ iri na abụọ.” Otu nwa agbọghọ bi na Mexico, aha ya bụ Vinbay, kwuru na o nweghị ihe e ji inwe mmekọahụ kpọrọ n’ụlọ akwụkwọ ha. Ọ sịrị: “E nwere otú e si ele ndị na-anaghị enwe mmekọahụ anya.” Nwa agbọghọ ọzọ dị afọ iri na ise aha ya bụ Ana, onye bi na Brazil, kwuru, sị: “Inwe mmekọahụ bụ ihe ndị ọgbọ m na-emekarị, nke na ọ bụrụ na mmadụ agwa gị okwu ya, ọ bụghị naanị otu ugbo ka ị ga-asị ya mba. Ị ga na-asị ya mba mgbe ọ bụla ọ gwatara gị okwu ya tupu ya aghọta na ị chọghị.”

N’ajụjụ ọnụ ndị na-eme nnyocha ná mba United Kingdom gbara otu puku ndị na-eto eto, ndị nọ n’agbata afọ iri na abụọ na afọ iri na itoolu, bụ́ ndị si n’ezinụlọ dị iche iche, ha chọpụtara na ọ fọrọ obere ka ọ bụrụ ọkara n’ime ha na-enwe mmekọahụ mgbe niile. E keekwa ndị a na-enwe mmekọahụ mgbe niile ụzọ ise, ihe karịrị otu ụzọ n’ime ha dị naanị afọ iri na abụọ! Dr. Dylan Griffiths, onye bụ́ onyeisi ndị mere nnyocha ahụ, kwuru, sị: “Mgbe mbụ, ndị ezinụlọ, Chọọchị, ụlọ akwụkwọ na ndị ọzọ, na-enyere ụmụaka aka ka ha na-akpa ezigbo àgwà, ma ugbu a ọ dịghịzi otú ahụ. Nke a emeekwala ka ọtụtụ n’ime ha na-ala n’iyi.”

Ọ̀ bụnụ eziokwu na ndị na-eto eto, ndị na-enwe mmekọahụ, “na-ala n’iyi”? N’otu akụkọ e bipụtara n’afọ 2003, ndị nnyocha aha ha bụ Rector, Noyes, na Johnson, kwuru na ndị na-eto eto ndị na-enwe mmekọahụ na-adakarị mbà n’obi, ha na-achọkarịkwa igbu onwe ha. Ha lebara anya n’ajụjụ ọnụ a gbara puku ndị na-eto eto isii na narị ise ma chọpụta na “ụmụ agbọghọ ndị na-enwe mmekọahụ na-aka ada mbà n’obi karịa ụmụ agbọghọ ndị na-anaghị enwe mmekọahụ.” A bịakwa ná ndị nke nwoke, “ndị na-enwe mmekọahụ n’ime ha na-aka ada mbà n’obi karịa ndị nke na-anaghị enwe.”

Nsogbu nke Atọ

Ezinụlọ Ha Na-ekewa

Ndị na-eto eto na United States ahụla ọtụtụ mgbanwe n’otú ezinụlọ si adị nakwa n’omume ọma a na-akụziri ụmụaka n’ezinụlọ. Otu akwụkwọ nke kwuru banyere mgbanwe a na otú o si emetụta ndị na-eto eto, kwuru, sị: “N’iri afọ ole na ole gara aga, ọtụtụ ihe agbanweela ná ndụ ndị America, ihe ndị a emetụtakwala ndụ ndị na-eto eto. N’America, ọtụtụ ndị di na nwunye anaghịzi amụ ọtụtụ ụmụ, nke mere na ọtụtụ ndị na-eto eto anaghịzi enwekarị ndị nne ji ha na ha. Ebe ọ bụ na a ka na-enwe ọtụtụ di na nwunye na-agba alụkwaghịm, a na-enwekarịzi ụmụaka ha na naanị mama ha ma ọ bụ papa ha na-ebi. Ihe ọzọkwa bụ na ọtụtụ ndị nne ụmụ ha na-erubeghị afọ iri na asatọ na-anọkarị n’ebe ha na-arụ ọrụ, nke na-eme ka a ghara inwe onye toro eto nọ n’ụlọ ga-elebara mkpa ụmụ ha anya.”

Ma ọ̀ bụ ụmụaka na naanị otu n’ime ndị mụrụ ha bi ma ọ̀ bụkwanụ na ha na ha abụọ bi, ọ na-adị ọtụtụ ụmụaka ka ndị mụrụ ha anaghị anọ ha nso mgbe ha kacha chọọ enyemaka. N’otu nchọpụta e mere ruo afọ ole na ole, bụ́kwanụ nke e ji puku ndị na-eto eto asaa mee, a chọpụtara na ọtụtụ n’ime ha kwetara na ndị mụrụ ha hụrụ ha n’anya ma na-ekwe ka ha na-eme otú ha chọrọ. N’agbanyeghị nke ahụ, e kee ndị kwuru ihe a ụzọ atọ “ọ bụ naanị otu ụzọ n’ime ha kwetara na ndị mụrụ ha na-elebara ha ezigbo anya ma na-enyere ha aka mgbe ha nwere nsogbu.” A chọpụtakwara na “ọ na-abụ oge ụmụaka ndị a banyere ná nsogbu ka o yikarịrị ka ndị nne na nna ọtụtụ n’ime ha na-anaghị abịa enyere ha aka.”

Na Japan, ịchụ ego aghakasịala ọtụtụ ezinụlọ. Ọkà mmụta n’ihe gbasara mmekọrịta ọha na eze, bụ́ Yuko Kawanishi, sịrị: “A mụrụ ọtụtụ ndị nne na nna, ndị ụmụ ha ka na-eto eto ugbu a, mgbe a lụchara agha ụwa nke abụọ, bụ́ mgbe ịmụ ọtụtụ ụmụ wuru ewu. Ndị nne na nna a tokwara mgbe okwu a kpụ n’ọnụ bụ inwe ego na ịba ọgaranya.” Olee ihe ndị nne na nna dị otú a ga-akụziri ụmụ ha? Kawanishi kwuru, sị: “Ihe ka ọtụtụ ndị nne na nna taa mkpa bụ ka ụmụ ha mee nke ọma n’akwụkwọ. Ọ bụrụhaala na ụmụ ha na-aga akwụkwọ, ha na-ewerezi na ihe ndị ọzọ a na-eme n’ụlọ adịghị oké mkpa, ma ọ bụdị na ha adịghị mkpa ma ọlị.”

Olee otú ihe a ha na-eche banyere inwe ego na ịgụ oké akwụkwọ si emetụta ndị na-eto eto? Na Japan, ụlọ ọrụ mgbasa ozi na-ekwukarị okwu gbasara kireru. Kireru bụ okwu a na-eji akọwa otú ndị na-eto eto si ewe iwe ọkụ ma a manye ha ime ihe karịrị ha ike. Kawanishi sịrị: “Mgbe ụmụaka kpawara àgwà ka ndị isi mebiri, o nwere ike ịbụ n’ihi na ha echeghị na ndị ezinụlọ ha kwesịrị ịna-atụrụ ha otú ha ga-esi na-akpa àgwà.

Ihe Mere Anyị Ga-eji Kwere na Ihe Ga-aka Mma

N’eziokwu, anyị bi ‘n’oge dị oké egwu, nke tara akpụ.’ (2 Timoti 3:1) Ma, ihe Baịbụl mere abụghị naanị ikwu na ndị mmadụ, ndị bi n’oge a, ga-enwe ọtụtụ nsogbu.

Baịbụl nyere ndị na-eto eto ndụmọdụ ndị ga-enyere ha aka ibi ndụ dị mma. Jehova Chineke, Onye chepụtara Baịbụl, nwere ezigbo mmasị ịkụziri ndị na-eto eto otú ha ga-esi merie nsogbu ndị ha na-enwe. (Ilu 2:1-6) Ọ chọrọ ka ndụ ha tọọ ha ụtọ. Okwu ya ga-emeli ka “ndị na-enweghị amamihe nwee amamihe, meekwa ka nwa okorobịa nwee ihe ọmụma na ikike iche echiche.” (Ilu 1:4) Ka anyị tụlee otú ihe ndị e kwuru na Baịbụl ga-esi enyere ha aka.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 10 Na Japan, ọtụtụ ndị na-eto eto na-anọkarịzi naanị ha n’ime ụlọ, nke na a maliteziri na-akpọ ha hikikomori. Ụfọdụ ndị na-ekwu na ndị na-eto eto a a na-akpọ hikikomori dị ihe dị ka narị puku ise ma ọ bụ otu ijeri.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 13]

Otu nchọpụta e mere gosiri na ụmụ agbọghọ ndị na-enwe mmekọahụ na-aka ada mbà n’obi karịa ụmụ agbọghọ ndị na-anaghị enwe mmekọahụ

[Igbe/Foto dị na peeji nke 14]

Àgwà Mmadụ Imerụ Onwe Ya Ahụ́

Akụkọ e nwetara n’aka gọọmenti mba Britain n’afọ 2006 kwuru na ná mba ahụ, ọnụ ọgụgụ ndị na-eto eto, ndị nọ n’agbata afọ iri na otu na afọ iri na ise, bụ́ ndị na-aṅụ koken mụbara okpukpu abụọ n’ime otu afọ. Ihe dị ka puku iri isii na ise ná ndị na-eto eto kwuru na ha aṅụtụla ọgwụ ike. Ná mba Holland, e kwuru na ihe karịrị otu onye n’ime ndị na-eto eto ise, bụ́ ndị nọ n’agbata afọ iri na isii na afọ iri abụọ na anọ, aghọọla ndị ịṅụ mmanya na-aba n’anya riri ahụ́ ma ọ bụkwanụ ha ana-arịa otu ọrịa ịṅụ mmanya na-aba n’anya kpataara ha.

Ọtụtụ ndị na-eto eto na-emerụ onwe ha ahụ́ iji gosi na obi adịghị ha mma. Ha na ebepu onwe ha ahụ́, taa onwe ha arụ, ma ọ bụ ree onwe ha ọkụ. Len Austin na Julie Kortum, bụ́ ndị na-eme nnyocha, kwuru, sị: “Ihe dị ka nde ndị America atọ na-emerụ onwe ha ahụ́, àgwà a eriekwala ihe dị ka otu onye n’ime ndị na-eto eto narị abụọ ahụ́.

[Foto dị na peeji nke 11]

Ọtụtụ ndị na-eto eto enweghị ezigbo ndị enyi ha nwere ike ịkọrọ nsogbu ha