Olee otú m ga-esi die ọnwụ papa m ma ọ bụ mama m?
Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị
Olee otú m ga-esi die ọnwụ papa m ma ọ bụ mama m?
“Mgbe mama m nwụrụ, ọ bịara dị m ka nke m na-eme n’ụwa a agwụla. Ọ bụ mama m mere ezinụlọ anyị ji dịrị n’otu.”—Chinasa. *
ỌNWỤ nne ma ọ bụ nna so n’ihe ndị na-akacha ewute mmadụ ná ndụ. Ọ bụghị naanị na obi ga-agbawa gị maka ihe merenụ, kamakwa, o yikarịrị ka ndụ gị agaghịzi adị otú ị tụrụ anya na ọ ga-adị.
O nwere ike ị na-atụ anya na mama gị ma ọ bụ papa gị ị hụrụ n’anya ga-anọ ya mgbe ị gụchara akwụkwọ, ma ọ bụ mgbe i nwetara ọrụ, ma ọ bụkwanụ soro gị ṅụrịa n’ụbọchị agbamakwụkwọ gị. Ma ugbu a, ihe agaghị adịzi otú ahụ i si chee ya. Ihe a merenụ agwụla gị ike, ị nọzi ná mwute, ma ọ bụdị na-ewe iwe. Olee otú ị ga-esi die obi mgbawa niile a ị na-enwe n’ihi ọnwụ mama gị ma ọ bụ papa gị?
‘Otú A M Si Eru Uju Ò Nwere Ihe O Mere?’
Mgbe mbụ ọ ga-edo gị anya na mama gị ma ọ bụ papa gị anwụọla, ọtụtụ ihe ndị ị na-echetụbeghị mbụ nwere ike ịbatawa gị n’obi. Nnamdị, onye dị afọ iri na atọ mgbe obi nkụchi gburu papa ya, sịrị: “N’abalị anyị chọpụtara na ọ nwụọla, naanị ihe anyị nwere ike ime bụ ibe ákwá na ịmakụ ibe anyị.” Nkechi, onye dị afọ iri mgbe ọrịa kansa gburu papa ya, sịrị: “O nweghị ihe m maara m ga-eme eme. N’ihi ya, anọ m na-ele anya shii. Ákwá ekweghị m obube.”
Onye ọ bụla nwere otú o si eru uju nke ya ma mmadụ nwụọ. Baịbụl kwudịrị na “onye ọ bụla” nwere “ihe na-egbu ya mgbu na ihe na-afụ ya ụfụ.” (2 Ihe E Mere 6:29) Buru ihe a Baịbụl kwuru n’uche ma chetụgodị otú obi dị gị mgbe mama gị ma ọ bụ papa gị nwụrụ. N’okpuru ebe a, kọwaa (1) otú obi dị gị n’oge mbụ ị chọpụtara na mama gị ma ọ bụ papa gị anwụọla na (2) otú obi dị gị ugbu a. *
(1) ․․․․․
(2) ․․․․․
O nwere ike ihe ị zara na-egosi na, ma ọ dịghị ihe ọzọ, uju ị na-eru akwụsịlatala. O nweghị ihe nke a mere. Ọ pụtaghị na i chefuola mama gị ma ọ bụ papa gị ahụ. Ihe ị zara nwekwara ike na-egosi na ọnwụ ahụ ka dị gị n’obi otú ọ dị gị n’oge ahụ o mere, ma ọ bụdị ya abụrụ na ọ kala njọ. O nwere ike otú i si eru uju na-eme ka mmiri dị n’oké osimiri, mgbe ụfọdụ ya ejiri nwayọọ nwayọọ na-aga, n’oge ọzọ ya “enupụta” mgbe a na-atụghị anya ya. A sịgodị na ọ na-eme gị otú ahụ ka ọtụtụ afọ gaferela mama gị ma ọ bụ papa gị nwụrụ, cheta na o nweghị ihe nke a mere. Ihe bụ́ isiokwu bụ, Olee otú i nwere ike isi kwụsị iru uju a ị na-eru, n’agbanyeghị otú i si na-eru ya?
Ihe Ndị Ga-enyere Gị Aka Idi Ya
Ákwá gụọ gị, bee ya! Ibe ákwá na-enye aka ebelata otú ọnwụ si afụ mmadụ ụfụ n’obi. Ma, o nwere ike ịdị gị otú ọ dị Ifeọma, onye dị afọ iri na itoolu mgbe mama ya nwụrụ. Ọ sịrị, “Echere m na m bewe ezigbo ákwá, ọ ga-eyizi ka enweghị m okwukwe.” Ma chegodị echiche: Jizọs Kraịst bụ nwoke zuru okè, onye nwere okwukwe siri ike na Chineke. Ma “anya mmiri gbara” ya mgbe ezigbo enyi ya bụ́ Lazarọs nwụrụ. (Jọn 11:35) N’ihi ya, atụla ụjọ ibe ákwá. Na i bere ákwá apụtaghị na i nweghị okwukwe! Ifeọma sịrị: “Emechara m bee ákwá. Ebere m ezigbo ákwá. Ebere m ákwá ụbọchị ọ bụla.” *
Kọọrọ onye ọzọ otú obi gị si ama gị ikpe. Chinasa, onye dị afọ iri na atọ mgbe mama ya nwụrụ, sịrị: “N’abalị ọ bụla tupu mụ alakpuo, ana m aga n’ebe mama m na-arahụ gaa susuo ya ọnụ, sị ya ‘ka chi bọọ.’ O nwere otu abalị m na-emeghị ya, mgbe chi ya bọrọ, ya abụrụ na mama m anwụọla. Ama m na ekwesịghị m ịtawa onwe m ụta, ma obi m mawara m ikpe n’ihi na agaghị m hụ ya n’abalị ikpeazụ ahụ, nakwa n’ihi ihe ndị ọzọ mere ka chi ya bọrọ. Tupu papa m emewe njem, ọ gwara mụ na nwanne m nwaanyị ka anyị hụ na anyị na-aga ele otú mama anyị mere. Ma n’ụbọchị ahụ, anyị alakpughị n’oge. N’ụtụtụ ya, mgbe m gara ịhụ mama m n’ebe ọ na-arahụ, achọpụtara m na ọ naghịzi eku ume. Obi gbawara m nnọọ, n’ihi na ahụ́ dị ya tupu papa m apụwa!”
Dị ka ọ dị Chinasa, o nwere ike obi gị na-amatụ gị ikpe n’ihi na i meghị ihe ụfọdụ i kwesịrị ime. Naanị ihe i nwedịrị ike na-echeta bụ ihe ndị ị gaara eme ma a sị na ị maara. ‘A sị na m maara, m gaara agwa papa m ka ọ gaa ụlọ ọgwụ.’ ‘A sị na m maara, m gaara aga hụ mama m n’oge.’ Ọ bụrụ na ụdị ihe a na-echegbu gị, cheta na: O nweghị ihe o mere ma ị kwaa ụta maka ihe ndị ị na-emeghị. Nke bụ́ eziokwu bụ na ị gaara eme ihe dị iche ma a sị na ị maara ihe ga-emenụ. Ma ị maghịnụ. N’ihi ya, i kwesịghị ịtawa onwe gị ụta. Ọ bụghị gị mere mama gị ma ọ bụ papa gị ji nwụọ! *
Mee ka ndị ọzọ mara otú ọ dị gị n’obi. Ilu 12:25 sịrị: “Okwu ọma na-eme ka [mmadụ] ṅụrịa ọṅụ.” Izochiri ndị ọzọ otú obi dị gị nwere ike ime ka o siere gị ike idi ọnwụ ahụ. Ma, ịkọrọ onye ị tụkwasịrị obi otú obi dị gị, ga-eme ka i nwee ike ịnụ “okwu ọma” nke ga-agba gị ume mgbe ọ kacha dịrị gị mkpa. N’ihi ya, gbalịa mee otu ma ọ bụ abụọ n’ime aro ndị a na-esonụ.
Kọọrọ mama gị ma ọ bụ papa gị nke dị ndụ. Ọ bụ eziokwu na ihe adịrịghị mama gị ma ọ bụ papa gị nke dị ndụ mfe n’oge a, ma o doro anya na ọ ka chọkwara inyere gị aka. N’ihi ya, kọọrọ ya otú obi dị gị. O doro anya na ụdị mkparịta ụka ahụ ga-eme ka uju ị na-eru belata, ọ ga-emekwa ka gị na ya dịrịkwuo ná mma.
Iji nyere gị aka ịmalite mkparịta ụka, gbalịa mee ihe a: Dee ihe abụọ ma ọ bụ atọ ị gaara achọ ịma banyere papa gị ma ọ bụ mama gị ahụ nwụrụ anwụ, jụzie onye nke dị ndụ ka ọ kọọrọ gị otu n’ime ihe ndị ahụ ị chọrọ ịma. *
․․․․․
Kọọrọ ezigbo ndị enyi gị. Baịbụl kwuru na ezi enyi bụ nwanne “a mụrụ maka oge nsogbu.” (Ilu 17:17) Ifeọma sịrị: “Onye ị na-atụghịdị anya na ọ ga-enyere gị aka nwere ike ịbụ onye ga-enyere gị aka. N’ihi ya, atụla ụjọ ịkọrọ ndị ọzọ otú obi dị gị.” N’eziokwu, ihe unu ga-ekwu nwere ike ịnyị unu arọ n’ọnụ n’ihi na unu amaghị ihe unu ga-agwa ibe unu agwa. Ma e mechaa, ịkọrọ ndị ọzọ otú obi dị gị ga-abara gị uru. Chiemerie, onye dị naanị afọ itoolu mgbe obi nkụchi gburu papa ya, chetara ihe mere ya n’oge ahụ ma kwuo, sị: “Ekweghị m ka onye ọ bụla mara otú obi dị m. Ọ gaara akara m mma ma a sị na m kọọrọ ya onye ọzọ. Ọ gaara enyere m aka idi ya.”
Kọọrọ Chineke. O yiri ka obi ọ ga-aka ruo gị Abụ Ọma 62:8) Ekpere abụghị ihe ị na-eme naanị ka obi gị dajụọ. Kama, ọ bụ ịrịọ ‘Chineke nke nkasi obi niile, onye na-akasi anyị obi ná mkpagbu anyị niile’ arịrịọ.—2 Ndị Kọrịnt 1:3, 4.
ala ma ọ bụrụ na ị ‘wụpụ obi gị dị ka mmiri’ n’ihu Jehova Chineke n’ekpere. (Otu ụzọ Chineke si akasi anyị obi bụ site ná mmụọ nsọ ya. Mmụọ nsọ ya nwere ike inye gị “ike karịrị ike nkịtị,” ka i nwee ike die ọnwụ ahụ. (2 Ndị Kọrịnt 4:7) Chineke na-enyekwa anyị “nkasi obi sitere n’Akwụkwọ Nsọ.” (Ndị Rom 15:4) N’ihi ya, rịọ Chineke ka o nye gị mmụọ ya, wepụtakwa oge gụọ okwu agbamume ndị dị n’Okwu ya bụ́ Baịbụl. (2 Ndị Tesalonaịka 2:16, 17) Ọ ga-adị mma ma i depụta amaokwu Akwụkwọ Nsọ ndị kacha kasie gị obi ma debe ya ebe aka gị ga-eru ya ngwa ngwa. *
Àga M Akwụsịli Iru Uju Ya?
Mmadụ anaghị akwụsị iru uju n’otu ntabi anya. Chinyere, onye mama ya nwụrụ mgbe ọ dị afọ iri na isii, sịrị: “Mmadụ anaghị ekpebi mgbe ọ ga-akwụsị iru uju. A na-enwe ụbọchị ndị m ga-ebegide ákwá ruo mgbe ụra buuru m. N’oge ndị ọzọ, m na-agbalị ka m ghara ichewe banyere ọnwụ mama m, kama, banyere ihe ndị Jehova kwere nkwa imere mụ na mama m ma ụwa ghọọ Paradaịs.”
Baịbụl gwara anyị na n’ime Paradaịs ahụ Chinyere kwuru okwu ya, “ọnwụ agaghị adị ọzọ, iru uju ma ọ bụ mkpu ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịkwa adị ọzọ.” (Mkpughe 21:3, 4) Gịnwa nwekwara ike ịchọpụta na ịtụgharị uche n’ụdị nkwa ndị a ga-enyere gị aka idi ọnwụ mama gị ma ọ bụ papa gị.
Ị gaa n’adres Ịntanet anyị bụ́ www.watchtower.org/ype ị ga-ahụ ihe ndị ọzọ a tụlerela n’isiokwu bụ́ “Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị”
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
^ par. 3 Aha a kpọrọ ndị e kwuru okwu ha n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.
^ par. 8 Ọ bụrụ na ọ na-esiri gị ike ịza ajụjụ ndị a ugbu a, i nwere ike hapụgodị ha ma gbalịa ka ị zaa ha n’oge ọzọ.
^ par. 13 Echekwala na ị ga-eberịrị ákwá iji gosi na ị na-eru uju. Onye ọ bụla nwere otú o si eru uju nke ya. Ihe i ga-eburu n’uche bụ: Ọ bụrụ na anya mmiri agbajuo gị n’anya, mara na o nwere ike ịbụ “oge ịkwa ákwá.”—Ekliziastis 3:4.
^ par. 15 Ọ bụrụ na obi gị anọgide na-ama gị ikpe, kọọrọ mama gị ma ọ bụ papa gị nke dị ndụ ma ọ bụkwanụ onye ọzọ toro eto otú obi dị gị. Ka oge na-aga, ị ga-amụtakwu ile ihe anya otú kwesịrịnụ.
^ par. 18 Ọ bụrụ na ọ bụ naanị mama gị ma ọ bụ papa gị zụrụ gị, ma ọ bụkwanụ na n’ihi ihe ụfọdụ, mama gị ma ọ bụ papa gị nke dị ndụ anọghị gị nso, i nwere ike ịkọrọ ya onye ọzọ torola eto.
^ par. 22 Amaokwu Akwụkwọ Nsọ ndị a akasiela ụfọdụ ndị obi: Abụ Ọma 34:18; 102:17; 147:3; Aịzaya 25:8; Jọn 5:28, 29.
IHE Ị GA-ECHEBARA ECHICHE
▪ Olee aro ndị a tụrụ n’isiokwu a ị ga-achọ ime? ․․․․․
▪ N’okpuru ebe a, dee amaokwu Akwụkwọ Nsọ ole na ole ga-akasi gị obi mgbe o yiri ka uju ị na-eru ọ̀ karịwala. ․․․․․
[Igbe dị na peeji nke 23]
Ọ DỊGHỊ NJỌ MA I BEE ÁKWÁ . . . HA BERE ÁKWÁ!
Ebreham—Jenesis 23:2.
Josef—Jenesis 50:1.
Devid—2 Samuel 1:11, 12; 18:33.
Meri, nwanne Lazarọs—Jọn 11:32, 33.
Jizọs—Jọn 11:35.
Meri Magdalin—Jọn 20:11.
[Igbe/Foto dị na peeji nke 24]
DEE YA EDEE
Idetu ihe ndị ị na-eche banyere mama gị ma ọ bụ papa gị ahụ nwụrụ anwụ nwere ike inyere gị ezigbo aka idi ọnwụ ya. E nwere ọtụtụ ihe ndị i nwere ike ide. Lee aro ole na ole ga-enyere gị aka.
▪ Dee ihe ndị na-enye gị obi ụtọ ị na-echeta banyere mama gị ma ọ bụ papa gị ahụ.
▪ Dee ihe ndị ị gaara achọ ịgwa ya ma a sị na ọ ka dị ndụ.
▪ Weregodị ya na obi na-ama nwanne gị ị tọrọ ikpe n’ihi ọnwụ mama gị ma ọ bụ papa gị. Dee ihe ndị ị ga-agwa ya iji kasie ya obi. Nke a nwere ike inyere gị aka ka obi nke gị ghara ịma gị ikpe.
[Igbe dị na peeji nke 25]
IHE NNE MA Ọ BỤ NNA NKE NỌ NDỤ GA-EBURU N’UCHE
Ọnwụ di ma ọ bụ nwunye na-agbawa obi. Ma, ugbu a bụ oge nwa gị na-eto eto chọrọ enyemaka gị. Olee otú ị ga-esi nyere ya aka idi ọnwụ ahụ ka gịnwa na-agbalị idikwa nke gị? *
Ezochila otú obi dị gị. Ọ bụ n’aka gị ka nwa gị si mụta ọtụtụ ihe ndị bara uru ọ na-eme ná ndụ. Ọ ga-esikwa n’aka gị mụta otú ọ ga-esi die ọnwụ mmadụ. N’ihi ya, echekwala na ị ga-emere nwa gị ihe ọma ma i zochiere ya otú ọnwụ ahụ si ewute gị. I mee nke a, o nwere ike ịmụtakwa izochiri gị otú obi dị ya. Ma, ọ bụrụ na i gosi otú o si ewute gị, ọ ga-amụta na mmadụ igosi otú ihe si ewute ya ka mma karịa izochi ya, mụtakwa na ọ dịghị ihe o mere ma o wute ya, ma ọ gwụ ya ike, ma ọ bụdị na-ewe ya iwe.
Gbaa nwa gị ume ka o kwuo otú obi dị ya. Gbaa nwa gị ume ka ọ gwa gị otú obi dị ya, ma amanyela ya amanye. Ọ bụrụ na ọ chọghị ịgwa gị ihe ọ bụla, gị na ya nwere ike iso gụọ isiokwu a. Kọọkwara ya ihe ndị na-atọ gị ụtọ ị na-echeta banyere di ma ọ bụ nwunye gị ahụ nwụrụ anwụ. Mee ka ọ ghọta na ọ ga-esiri gị ike idi ọnwụ ahụ. Ịhụ ka ị na-ekwu otú obi dị gị ga-emekwa ka nwa gị kwuo otú obi dị ya.
Mara ebe ike gị ruru. O doro anya na ị ga-achọ ime ihe ọ bụla i nwere ike ime iji nyere nwa gị aka n’oge nsogbu a. Ma cheta na ọ bụ nnukwu ihe mere gị. Ọ bụ di ma ọ bụ nwunye gị ị hụrụ n’anya nwụrụ. Ọ ga-enwekwa mgbe ike na-agaghị adị gị. (Ilu 24:10) N’ihi ya, o nwere ike dị mkpa na ị ga-agwa ndị ọzọ, bụ́ ndị toro eto n’ezinụlọ unu nakwa ndị enyi gị, ka ha nyere gị aka. Ịrịọ ka e nyere gị aka na-egosi na ị maara ihe. Ilu 11:2 na-ekwu, sị: “Ndị dị obi umeala nwere amamihe.”
Onye ga-akacha enyere gị aka bụ Jehova Chineke n’onwe ya, onye kwere ndị na-efe ya nkwa, sị: “Mụ onwe m, bụ́ Jehova Chineke gị, sekpụ gị n’aka nri gị. Ọ bụ m bụ Onye na-asị gị, ‘Atụla egwu. Mụ onwe m ga-enyere gị aka.’”—Aịzaya 41:13.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 53 Iru uju nwere ike ịdị ka mmiri dị n’oké osimiri nke na-enupụta mgbe a na-atụghị anya ya