Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

I Nwere Ike Igbo Mkpa Ime Mmụọ Gị

I Nwere Ike Igbo Mkpa Ime Mmụọ Gị

Echiche Baịbụl

I Nwere Ike Igbo Mkpa Ime Mmụọ Gị

DỊ NNỌỌ ka nri nkịtị dị ụmụ mmadụ mkpa, otú ahụkwa ka nri ime mmụọ dị ha mkpa. Ma a bịa ná nri nkịtị, e nwere ọtụtụ nri dị mma anyị nwere ike ịhọrọ. Ọ̀ bụ otú ahụ ka ọ dị ma a bịa ná nri ime mmụọ? E nwere ọtụtụ omenala na ụzọ e si efe ofufe ndị a sị na ha na-eme ka mmadụ na Chineke dịrị n’ezigbo mma.

Ọtụtụ na-eche na ọ bụrụhaala na mmadụ na-eme ihe ọ bụla gbasara ofufe Chineke, ihe onye ahụ kweere ma ọ bụ otú o si kpebie ife Chineke enweghịzi ihe o mere. Gịnị ka i chere? Otú i si na-efe Chineke ò nwere ihe o mere? Gịnị ka Baịbụl kwuru?

Ihe Igbo Mkpa Ime Mmụọ Pụtara

Na Jenesis 1:27, Baịbụl kwuru ihe mere anyị ji enwe mkpa ime mmụọ. Ọ sịrị: “Chineke wee kee mmadụ n’onyinyo ya, ọ bụ n’onyinyo Chineke ka o kere ya; nwoke na nwaanyị ka o kere ha.” Ebe ọ bụ na Jehova Chineke bụ mmụọ, ọ pụtara na amaokwu Baịbụl a anaghị ekwu na mmadụ dị otú Chineke dị, kama na anyị yiri ya n’àgwà. Nwoke mbụ ahụ bụ́ Adam yiri Onye kere ya. O nwere àgwà ndị dị ka ịhụnanya, obiọma, ọmịiko, ikpe ziri ezi, na njide onwe onye, ọ na-amasịkwa ya ịkpa àgwà ndị ahụ. Chineke nyekwara ya akọnuche, nke na-enyere ya aka ịma ihe dị mma na ihe dị njọ, ma na-enyere ya aka irubere Chineke isi n’agbanyeghị na o nweere onwe ya ikpebi ihe ọ ga-eme. Àgwà ndị ahụ o nwere mere ka ọ dị iche n’ụmụ anụmanụ, meekwa ka o nwee ike ịna-eme uche Onye kere ya.—Jenesis 1:28; Ndị Rom 2:14.

Baịbụl kwuru ihe dị ezigbo mkpa nke ga-enyere anyị aka igbo mkpa ime mmụọ anyị. Ná 1 Ndị Kọrịnt 2:12-15, o kwuru na onye mmụọ nsọ na-achị bụ onye nwere mmụọ nke si na Chineke. Mmụọ a bụ ike Chineke nke nọ n’ọrụ, ọ bụkwa mmụọ a na-eme ka mmadụ ghọta ihe ime mmụọ. Ọ bụ ya na-eme ka onye ahụ nwee ike na-eche echiche ma na-ele ihe anya otú Chineke si ele ya. Ma a kpọrọ onye na-enweghị mmụọ Chineke onye anụ ahụ́ na-achị, onye na-ewere ihe ime mmụọ ka ihe nzuzu. N’ihi ya, otú onye ahụ si ele ihe anya na-abụ otú mmadụ nkịtị si ele ihe anya.

Ma, n’agbanyeghị na ihe mere anyị ji enwe mkpa ime mmụọ bụ n’ihi na e kere anyị n’onyinyo Chineke, ihe ga-eme ka anyị na Chineke dịrị n’ezigbo mma abụghị obi ike anyị nwere, amamihe anyị, ma ọ bụ ihe ndị anyị nwere. Ọ bụ mmụọ nsọ Chineke ga-eme ya. N’eziokwu, ndị na-ekweghị ka mmụọ Chineke na-achị ha, kama họrọ ịgbaso ọchịchọ nke onwe ha ma na-eme omume asọpụrụghị Chineke, bụ ndị na-ejighị ihe ime mmụọ kpọrọ ihe. Ihe na-achị ha bụ ihe na-agụ anụ ahụ́ agụụ.—1 Ndị Kọrịnt 2:14; Jud 18, 19.

Otú E Si Egbo Mkpa Ime Mmụọ

Anyị na-amalite igbo mkpa ime mmụọ anyị mgbe anyị ghọtara na Jehova bụ Onye kere anyị nakwa na ọ bụ ya nyere anyị ndụ. (Mkpughe 4:11) Nke a ga-eme ka anyị ghọta na naanị ihe ga-eme ka ndụ anyị nwee isi bụ ma anyị na-eme uche ya. (Abụ Ọma 115:1) Ime uche Chineke na-eme ka e nwee ebe ndụ anyị hiwere isi. Ọ bụkwa otu ụzọ anyị si egbo mkpa ime mmụọ anyị, nke dị anyị mkpa otú nri nkịtị si dị anyị mkpa. Ọ bụ ya mere Jizọs, onye a ma ama na o ji ihe ime mmụọ kpọrọ ihe, ji sị: “Ihe oriri m bụ ka m mee uche onye zitere m, ka m rụchaa ọrụ ya.” (Jọn 4:34) Ime uche Chineke nyere ya ike, meekwa ka o nwee afọ ojuju na obi iru ala.

Ebe ọ bụ na e kere anyị n’onyinyo Chineke, ụzọ ọzọ anyị si egbo mkpa ime mmụọ anyị bụ ịkpa àgwà otú Chineke si chọọ. (Ndị Kọlọsi 3:10) Anyị mee otú ahụ, anyị agaghị na-eme omume ndị ga-eme ka a ghara ịna-akwanyere anyị ùgwù ma ọ bụkwanụ ndị ga-emebi adịm ná mma anyị na ndị ọzọ. (Ndị Efesọs 4:24-32) Ibi ndụ otú Jehova chọrọ na-eme ka ndụ anyị ka mma, ọ na-emekwa ka obi ruo anyị ala n’ihi na akọnuche anyị agaghị na-ama anyị ikpe.—Ndị Rom 2:15.

Jizọs kwuru ihe ọzọ dị mkpa banyere igbo mkpa ime mmụọ anyị. Ọ sịrị: “Ọ bụghị naanị achịcha ga-eme ka mmadụ dị ndụ, kama ọ bụ okwu niile nke na-esi n’ọnụ Jehova pụta.” (Matiu 4:4) Anyị kwesịrị ịna-elebara mkpa ime mmụọ anyị anya mgbe niile. Na Baịbụl, Jehova zara ajụjụ niile banyere ndụ, bụ́ ajụjụ ndị mmadụ n’ebe niile na-ajụ.—2 Timoti 3:16, 17.

Ebe E Si Enweta Ezigbo Obi Ụtọ

Onye agụụ na-agụ nwere ike iji nri ratụ ratụ kwụsị agụụ na-agụ ya. Otú ahụkwa ka mmadụ nwere ike iche na ya ga-eji omenala ma ọ bụ nkà ihe ọmụma na-egbo mkpa ime mmụọ ya. Ma otú ahụ nri ratụ ratụ ga-eme ka ahụ́ ghara ịdị mmadụ mma, kpatara onye ahụ ọrịa ma ọ bụdị ihe ka ya njọ, otú ahụkwa ka mmadụ ga-esi enwe ezigbo nsogbu ma ọ bụrụ na ọ naghị egbo mkpa ime mmụọ ya nke ọma.

Ma ọ bụrụ na anyị na Jehova Chineke adịrị ná mma, anyị ana-eme ihe ọ chọrọ, na-eso nduzi ya, anyị ga-ahụ na ihe a Baịbụl kwuru bụ eziokwu: “Obi ụtọ na-adịrị ndị maara mkpa ime mmụọ ha.”—Matiu 5:3.

Ì CHETỤLA NKE A N’ECHICHE?

▪ Olee ihe mere anyị ji enwe mkpa ime mmụọ?—Jenesis 1:27.

▪ Ànyị ga-ejili aka anyị gboo mkpa ime mmụọ anyị?—1 Ndị Kọrịnt 2:12-15.

▪ Gịnị ka anyị ga-eme iji gboo mkpa ime mmụọ anyị?—Matiu 4:4; Jọn 4:34; Ndị Kọlọsi 3:10.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 27]

Mmadụ ga-enwe ezigbo nsogbu ma ọ bụrụ na ọ naghị egbo mkpa ime mmụọ ya nke ọma