Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe nke Abụọ: Ime Ka Obi Ha Dum Dịrị n’Alụmdi na Nwunye Ha

Ihe nke Abụọ: Ime Ka Obi Ha Dum Dịrị n’Alụmdi na Nwunye Ha

Ihe nke Abụọ: Ime Ka Obi Ha Dum Dịrị n’Alụmdi na Nwunye Ha

“Ihe Chineke kekọtara, mmadụ ọ bụla atọsala ya.”—Matiu 19:6.

Gịnị ka ọ pụtara? Di na nwunye ndị na-enwe obi ụtọ anaghị ewere alụmdi na nwunye ha ka ihe a ga-abanye taa, a pụọ echi. Ha nwee nsogbu, ha na-agbalị idozi ya kama ịgbakwasị ụkwụ na ya gbasaa. Mgbe obi di na nwunye dị n’alụmdi na nwunye ha, ụjọ anaghị atụ ha na otu onye nwere ike ịhapụ onye nke ọzọ. Obi na-esi onye nke ọ bụla n’ime ha ike na ibe ya ga na-akwanyere alụmdi na nwunye ha ùgwù.

Gịnị mere o ji dị mkpa? E nwere ike ikwu na obi di na nwunye ịdị n’alụmdi na nwunye ha bụ isi ihe na-eme ka ha ghara ịgbasa. Ma, ọ bụrụ na ha na-esekarị okwu, ọ ga-adịzi ka ihe mere ha ji nọgide n’alụmdi na nwunye ha bụ n’ihi na ha tọrọ atọ, ọ bụghị na obi dị ha ụtọ. Mgbe ahụ, nkwa ahụ ha kwere na ha ‘ga-abụ di na nwunye ogologo ndụ ha niile’ agaghịzi adị ha n’obi, kama, ha ga-achọwa otú ha ga-esi gbasaa. O nwere ike ha agaghị agba alụkwaghịm, ma ha nwere ike gbaa ụdị “alụkwaghịm” ọzọ. Dị ka ihe atụ, ha nwere ike gbawazie ibe ha nkịtị, ma mgbe ha nwere ezigbo ihe ha kwesịrị ikwurịta.

Megodị ihe a. Jiri ajụjụ ndị na-esonụ chọpụta otú obi gị dịruru n’alụmdi na nwunye unu.

E nwee ihe seere mụ na di m ma ọ bụ nwunye m okwu, àna m amalite kwawa mmakwaara na m lụrụ ya?

Àna m achọpụta na m na-echekarị banyere nwoke ọzọ na-abụghị di m ma ọ bụ nwaanyị ọzọ na-abụghị nwunye m?

Ọ̀ dị mgbe m na-asị di m ma ọ bụ nwunye m, “M ga-apụrụ gị n’ụlọ a” ma ọ bụ “M ga-aga chọrọ onye ọzọ ga-eji m kpọrọ ihe”?

Kpebie ihe ị ga-eme. Chegodị otu ihe ma ọ bụ ihe abụọ i nwere ike ime iji mee ka obi gị dịrịkwuo n’alụmdi na nwunye unu. (Lee ihe ụfọdụ ga-enyere gị aka: Ị nọkata mgbe ụfọdụ, deere nwunye gị ma ọ bụ di gị obere akwụkwọ ozi iji gwa ya na ị hụrụ ya n’anya. Dewe foto di gị ma ọ bụ nwunye gị n’ebe ị na-arụ ọrụ, ma ọ bụkwanụ hụ na ị na-akpọ ya n’ekwe ntị mgbe ị nọ n’ọrụ n’ụbọchị ọ bụla iji mara otú o mere.)

Ọ́ gaghị adị mma ma i chee ihe ndị ọzọ i nwere ike ime, jụzie di gị ma ọ bụ nwunye gị nke ga-akacha amasị ya ma i meere ya ya?

[Foto dị na peeji nke 4]

Obi di na nwunye ịdị n’alụmdi na nwunye ha na-eme ka ha ghara ịgbasa otú ahụ ihe a rụnyere n’akụkụ okporo ụzọ na-egbochi ụgbọala ịgbaba ọhịa

[Ebe E Si Nweta Foto]

© Corbis/age fotostock