Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe nke Ise: Inwe Ezi Uche

Ihe nke Ise: Inwe Ezi Uche

Ihe nke Ise: Inwe Ezi Uche

‘Meenụ ka a mara na unu nwere ezi uche.’—Ndị Filipaị 4:5.

Gịnị ka ọ pụtara? N’ezinụlọ ndị na-enwe obi ụtọ, di na nwunye na-agbaghara ibe ha mgbe niile. (Ndị Rom 3:23) Ha anaghịkwa esi ọnwụ na ụmụ ha ga-emerịrị ihe ha kwuru ma ọ bụkwanụ na-ahapụ ha ka ha mere otú dị ha mma. Iwu ndị ha na-enye ụmụ ha anaghị akarịkwa akarị. Ha chọọ inye ụmụ ha ntaramahụhụ maka ihe ọjọọ ha mere, ha na-enye ya “n’ókè kwesịrị ekwesị.”—Jeremaya 30:11.

Gịnị mere o ji dị mkpa? Baịbụl kwuru na ‘amamihe nke si n’elu nwere ezi uche.’ (Jems 3:17) Ebe ọ bụ na Chineke anaghị atụ anya na ụmụ mmadụ na-ezughị okè ga-emetacha ihe niile, oleezi ihe mere di na nwunye ga-eji chọwa ka ibe ha na-emetacha ihe niile? N’eziokwu, ịtụchasịwa obere ihe ọ bụla mmadụ mere anaghị eme ka ihe dị mma, kama ọ na-akpata iwe. Ọ kacha mma ikweta n’eziokwu ahụ bụ́ na “anyị niile na-asụ ngọngọ ọtụtụ ugboro.”—Jems 3:2.

N’ezinụlọ nwere obi ụtọ, ndị nne na nna na-eji ezi uche emeso ụmụ ha ihe. Obi anaghị efe ha azụ ma ha dọwa ụmụ ha aka ná ntị, ha abụghịkwa “ndị ọ na-esi ike ime ihe dị ha mma.” (1 Pita 2:18) Ha na-enye ụmụ ha ndị na-eto eto ohere ime ihe ụfọdụ ma ha chọpụta na ha akpawala àgwà ka ndị toro eto. Ha anaghị achọ ka ọ bụrụ ha na-atụrụ ụmụ ha ihe niile ha na-eme. Dị ka otu akwụkwọ kwuru, ọ ga-abụ mgbalị furu ọhịa ma ọ bụrụ na ndị nne na nna na-achọ ka ọ bụrụ ha na-ekpebiri nwa ha na-eto eto ihe niile ọ na-eme. Ọ ga-adị ka ebe mmadụ na-agbanye mmiri na nkata. Nkata ahụ emekataghị ju eju, ike ga-agwụkwa onye ahụ na-agbanye mmiri na ya.

Megodị ihe a. Jiri ajụjụ ndị a chọpụta otú i nweruru ezi uche.

Olee mgbe ikpeazụ ị jara di gị ma ọ bụ nwunye gị mma?

Olee mgbe ikpeazụ ị katọrọ di gị ma ọ bụ nwunye gị?

Kpebie ihe ị ga-eme. Ọ bụrụ na o siiri gị ike ịza ajụjụ nke mbụ n’ajụjụ ndị ahụ a jụrụ n’aka ekpe ma dịrị gị mfe ịza nke abụọ, chee ihe ị ga na-eme ka i nwee ike na-ejikwu ezi uche emeso ndị mmadụ ihe.

Ọ́ gaghị adị mma ma gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị kwurịta ihe unu abụọ ga na-eme?

Ọ bụrụ na nwa gị nwoke ma ọ bụ nwa gị nwaanyị na-akpa àgwà ka onye toro eto, chegodị ihe ụfọdụ ị ga na-ekwezi ka o jiri aka ya kpebie.

Ọ́ gaghị adị mma ma gị na nwa gị ahụ kwurịta ihe ndị dị ka oge ọ ga-eji na-alọta n’ụlọ n’abalị?

[Foto dị na peeji nke 7]

Onye na-eji ezi uche emeso ndị ọzọ ihe n’ezinụlọ anaghị esi ọnwụ, dị nnọọ ka ọkwọ ụgbọala nke na-akpachapụ anya na-anaghị esi ọnwụ