Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe nke Isii: Ịgbaghara Ibe Ha

Ihe nke Isii: Ịgbaghara Ibe Ha

Ihe nke Isii: Ịgbaghara Ibe Ha

“Na-ediri ibe unu ihe ma na-agbaghara ibe unu kpamkpam.”—Ndị Kọlọsi 3:13.

Gịnị ka ọ pụtara? Di na nwunye ndị na-enwe obi ụtọ na-esi n’ihe ndị mere ha amụta ihe; ma ha anaghị eburu ibe ha iwe n’obi nke na e nwee onye mejọrọ ibe ya, onye nke ọzọ agwawa ibe ya okwu ka à ga-asị na ọ bụ ihe onye nke ahụ na-emekarị, dị ka ịsị “Ị na-egbukarị oge” ma ọ bụ “O nweghị mgbe ị na-ege m ntị.” Ma di ma nwunye na-aghọta na ‘ileghara mmejọ anya bụ ịma mma.’—Ilu 19:11.

Gịnị mere o ji dị mkpa? Chineke ‘dị njikere ịgbaghara mmehie,’ ma ọ bụghị mgbe niile ka ụmụ mmadụ na-eme otú ahụ. (Abụ Ọma 86:5) Ọ bụrụ na di na nwunye edozighị nghọtahie ha nwere, o nwere ike ime ka ha na-eburu ibe ha iwe n’obi ruo n’ókè nke na ọ ga-esiri ha ezigbo ike ịgbaghara ibe ha. Ha nweziri ike ghara ịna-agwa ibe ha otú obi dị ha, nke ga-eme ka onye nke ọ bụla mewe otú dị ya mma n’achọghị ịma otú ihe ahụ ọ na-eme dị ibe ya. Ọ na-adị ha abụọ ka hà tọrọ atọ n’alụmdi na nwunye ha ebe ọ bụ na ịhụnanya adịghịzi.

Megodị ihe a. Kirie foto ndị unu sere mgbe unu gbara akwụkwọ ma ọ bụ ndị unu sere mgbe unu na-akpa. Gbalịa cheta otú unu si hụ ibe unu n’anya mgbe ahụ tupu nsogbu abịa gbanwee otú unu si ele ibe unu anya. Gbalịakwa ka i cheta àgwà ya ndị mere ka ihe ya masị gị n’oge mbụ unu matara.

Olee àgwà ya ndị na-akacha amasị gị ugbu a?

Chegodị ihe ọma ụfọdụ ụmụ gị ga-amụta ma ọ bụrụ na ị mụtakwuo ịna-agbaghara mmadụ.

Kpebie ihe ị ga-eme. Gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị nwee nghọtahie, chee otu ihe ma ọ bụ ihe abụọ ị ga-eme iji hụ na ị naghị echetara ya iwe ọ kpasuru gị n’oge gara aga.

Í cheghị na ọ ga-adị mma ma ị jaa di gị ma ọ bụ nwunye gị mma maka àgwà ya ndị na-amasị gị?—Ilu 31:28, 29.

Chọpụta ihe ụfọdụ ị ga-eme iji gosi ụmụ gị na ị na-agbaghara ha.

Ọ́ gaghị adị mma ma gị na ụmụ gị kwurịta gbasara mgbaghara nakwa otú ịgbaghara ndị ọzọ ga-esi abara onye ọ bụla n’ezinụlọ unu uru?

[Foto dị na peeji nke 8]

Ịgbaghara mmadụ yiri ịkagbu ụgwọ onye ahụ ji gị. Ị gaghị agbakwa ya ụgwọ ahụ ọzọ