Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe nke Mbụ: Ịma Ihe Ndị Ka Mkpa

Ihe nke Mbụ: Ịma Ihe Ndị Ka Mkpa

Ihe nke Mbụ: Ịma Ihe Ndị Ka Mkpa

“Chọpụta ihe ndị ka mkpa.”—Ndị Filipaị 1:10.

Gịnị ka ọ pụtara? N’ezinụlọ na-enwe obi ụtọ, di na-ebu ụzọ elebara mkpa nwunye ya anya tupu ya elebawara mkpa nke ya anya, ma ọ bụdị chewe maka akụnụba ya, ọrụ ya, ndị enyi ya na ndị ikwu ya. Nwunye na-emekwa otu ihe ahụ. Di na nwunye na-ewepụtara ibe ha ezigbo oge ha na-eji anọkọ, wepụtakwa ezigbo oge ha na ụmụ ha ji anọkọ. Ha abụọ dị njikere ime ihe ọ bụla ọ dị mkpa ka ha mee maka ọdịmma ezinụlọ ha.—Ndị Filipaị 2:4.

Gịnị mere o ji dị mkpa? Baịbụl ejighị okwu gbasara ezinụlọ egwuri egwu. Pọl onyeozi dedịrị na onye na-anaghị egboro ezinụlọ ya mkpa ha ‘jọkarịrị onye na-ekweghị ekwe ná njọ.’ (1 Timoti 5:8) Ma, ihe mmadụ weere na ọ dị ya mkpa taa nwere ike ọ gaghị adịzi ya mkpa echi. Dị ka ihe atụ, otu onye nke na-enye ndị di na nwunye ndụmọdụ chọpụtara na ọtụtụ ndị di na nwunye, ndị bịara nnọkọ ọ haziri, yiri ka ọrụ ha ọ̀ ka ha mkpa karịa ezinụlọ ha. O kwuru na ọ dị ka ihe ha chọrọ ịmụta ná nnọkọ ahụ ọ̀ bụ otú nsogbu niile dị n’ezinụlọ ha ga-esi bie ozugbo ka ha nwee ike gụpụ ihe gbasara ezinụlọ ná mkpa ndị ha nwere ma tinyezie oge ha niile n’ọrụ ha. Gịnị ka nke a na-akụziri anyị? Ọ na-akụziri anyị na ọ dị mfe ikwu na ihe gbasara ezinụlọ anyị ka anyị mkpa karịa ime ya eme.

Megodị ihe a. Jụọ onwe gị ajụjụ ndị a na-esonụ, ka ị mara otú ezinụlọ gị dịruru gị ná mkpa.

Ọ bụrụ na di m ma ọ bụ nwunye m ma ọ bụkwanụ nwa m chọrọ ka mụ na ya kwurịta okwu, àna m ewepụtara ya oge ngwa ngwa o kwere mee?

Mgbe m na-akọrọ ndị mmadụ ihe ndị m na-eme, àna m akọrọ ha ihe mụ na ndị ezinụlọ m na-emekọ ọnụ?

È nwere m ike ịjụ iwere ọrụ e nyekwuru m ka m rụọ (n’ụlọ ọrụ ma ọ bụ n’ebe ọ bụla ọzọ) ma ọ bụrụ na ndị ezinụlọ m chọrọ ka mụ na ha na-anọkọ?

Ọ bụrụ na ị zara ee n’ajụjụ ndị ahụ, i nwere ike ịgwa onwe gị na ị ma ihe ndị ka mkpa. Ma, a jụọ nwunye gị na ụmụ gị ajụjụ ndị ahụ gbasara gị, gịnị ka i chere ha ga-aza? Ihe anyị chere banyere onwe anyị abụghị naanị ihe anyị ga-eji kpebie na anyị ma ihe ndị ka mkpa. Ọ bụkwa otu ihe ahụ ka ị ga-eburu n’uche ma anyị tụlewe ihe ndị ọzọ na-eme ka ezinụlọ nwee obi ụtọ na peeji ndị na-esonụ.

Kpebie ihe ị ga-eme. Chegodị otu ihe ma ọ bụ abụọ ị ga-eme iji gosi na ihe gbasara ezinụlọ gị ka gị mkpa. (Dị ka ihe atụ: Chọpụta ihe ndị na-ewekọrọ oge gị na nwunye gị ma ọ bụ di gị na ụmụ gị kwesịrị iji nọkọọ ma gbubilata oge i ji eme ihe ndị ahụ.)

Í cheghị na ọ ga-adị mma ma ị gwa ndị ezinụlọ gị ihe ndị a i kpebiri ime? Ọ bụrụ na otu onye n’ezinụlọ egosi na ya chọrọ imewekwu nke ọma n’ezinụlọ ha, ọ na-adịrị ndị nke ọzọ mfe imekwa otú ahụ.

[Foto dị na peeji nke 3]

Nne ma ọ bụ nna a ga-ewere na ọ na-eme nke ọma bụ onye ma na ndị ezinụlọ ya ka mkpa karịa ihe ndị ọzọ