Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Mmadụ Ọ̀ Ga-ahụli Ndị Iro Ya n’Anya?

Mmadụ Ọ̀ Ga-ahụli Ndị Iro Ya n’Anya?

Echiche Baịbụl

Mmadụ Ọ̀ Ga-ahụli Ndị Iro Ya n’Anya?

Jizọs Kraịst sịrị, “Ana m asị unu: na-ahụnụ ndị iro unu n’anya, na-ekpekwanụ ekpere maka ndị na-akpagbu unu; ka unu wee bụrụ ụmụ nke Nna unu nọ n’eluigwe, n’ihi na ọ na-eme ka anyanwụ ya waara ndị ọjọọ na ndị ọma, na-emekwa ka mmiri zooro ndị ezi omume na ndị ajọ omume.”—Matiu 5:44, 45.

OKPUKPE ọ̀ na-eme ka ndị mmadụ hụ ibe ha n’anya ma dịrị n’udo ka ọ̀ na-eme ka ha kpọọ ibe ha asị ma na-alụso ibe ha ọgụ? Taa, ọtụtụ ndị na-ele okpukpe anya ka ihe na-eme ka ndị mmadụ na-akpọ ibe ha asị, karịchaa mgbe ha na-ahụ ka ndị okpukpe so na-azọ ọchịchị, na-akpa ókè agbụrụ, ma ọ bụ na-ahụ mba n’anya. Ma, ihe ahụ Jizọs kwuru gosiri na ndị bụ́ ezigbo ‘ụmụ Chineke’ na-ahụ ndị ọzọ n’anya, ọbụnadị ndị iro ha, otú Chineke si hụ mmadụ niile n’anya.

Otu onye ọzọ na-ejere Chineke ozi sịrị: “Ọ bụrụ na agụụ na-agụ onye iro gị, nye ya nri; ọ bụrụ na akpịrị na-akpọ ya nkụ, nye ya mmiri ka ọ ṅụọ . . . Ekwela ka ihe ọjọọ merie gị, kama jiri ihe ọma na-emeri ihe ọjọọ.” (Ndị Rom 12:20, 21) Ma n’ụwa a ịhụnanya na-adịghị, mmadụ ọ̀ ga-ahụli onye iro ya n’anya? Ndịàmà Jehova agaghị egbu oge zaa ee! Ka anyị tụlegodị ihe Jizọs na ndị mbụ soro ụzọ ya mere.

Ha Hụrụ Ndị Iro Ha n’Anya

Jizọs kụziri eziokwu banyere Chineke, ọtụtụ ndị jikwa obi ha niile gee ya ntị. Ma, ndị ọzọ megidewere ya, ụfọdụ n’ime ha kwa mewere otú ahụ n’ihi na ndị iro Jizọs duhiere ha. (Jọn 7:12, 13; Ọrụ 2:36-38; 3:15, 17) N’agbanyeghị nke ahụ, Jizọs nọgidere na-ekwusara ndị niile, ma ndị ahụ na-emegide ya, okwu na-azọpụta ndụ. (Mak 12:13-34) Maka gịnị? Maka na ọ maara na ụfọdụ n’ime ha nwere ike ịgbanwe, ghọta na ya bụ Mesaya ahụ, ma biwe ndụ otú Okwu Chineke kwuru.—Jọn 7:1, 37-46; 17:17.

Jizọs gosiri na ya hụrụ ndị iro ya n’anya, ọbụna n’abalị ahụ ha ji ngwá agha bịa ijide ya n’agbanyeghị na o nweghị ihe ọjọọ o mere. Ọ gwọdịrị otu n’ime ndị bịara ijide ya mgbe Pita onyeozi ji mma agha merụọ ya ahụ́. Jizọs ji ohere ahụ kwuo otu ihe dị mkpa nke na-enyere ezigbo ndị na-eso ụzọ ya aka ịghara imegwara ihe ọjọọ e mere ha. Ọ sịrị: “Ndị niile na-eji mma agha ga-ala n’iyi site ná mma agha.” (Matiu 26:48-52; Jọn 18:10, 11) Ka ihe dị ka iri afọ atọ gachara, Pita dere, sị: “Kraịst tara ahụhụ n’ihi unu, wee hapụrụ unu ihe nlereanya ka unu wee sochie nzọụkwụ ya anya. . . . Mgbe ọ na-ata ahụhụ, o yighị onye ọ bụla egwu, kama ọ nọ na-enyefe onwe ya n’aka [Chineke].” (1 Pita 2:21, 23) O doro anya na Pita mụtara na ezi ndị na-eso ụzọ Kraịst kwesịrị ịhụ ndị ọzọ n’anya, ọ bụghị imegwara ihe ọjọọ e mere ha.—Matiu 5:9.

Ndị niile ‘na-esochi nzọụkwụ Jizọs anya’ na-egosikwa ndị ọzọ obiọma na ịhụnanya dị ka Jizọs mere. 2 Timoti 2:24 kwuru, sị: “Ohu nke Onyenwe anyị ekwesịghị ịlụ ọgụ, kama o kwesịrị ịbụ onye na-emeso mmadụ niile n’ụzọ dị nwayọọ, . . . onye na-ejide onwe ya mgbe ọnọdụ dị njọ.” Onye Kraịst kwesịrị inwe àgwà ndị ahụ, ya bụ, ịchọ udo na idozi esemokwu.

‘Ndị Nnọchiteanya Kraịst’ Na-eme Udo

Pọl onyeozi degaara ndị kwere ekwe ibe ya akwụkwọ ozi, sị: “Ya mere, anyị bụ ndị nnọchiteanya nọ n’ọnọdụ Kraịst . . . Dị ka ndị nọ n’ọnọdụ Kraịst, anyị na-arịọ, sị: ‘Meenụ ka unu na Chineke dị ná mma.’” (2 Ndị Kọrịnt 5:20) Ndị nnọchiteanya obodo anaghị etinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị obodo ha nọ na-eje ozi ma ọ bụ n’agha obodo ahụ. Kama ha na-anọpụ iche. Ọrụ ha bụ ịnọchite anya na ikwuchite ọnụ mba ha na-ejere ozi.

Otú ahụkwa ka ndị nnọchiteanya Kraịst na-eme. Ha ma na Jizọs bụ Eze, ha na-akwadokwa ọchịchị ya site n’ikwusa ozi ọma Alaeze ya nke ga-esi n’eluigwe bịa. (Matiu 24:14; Jọn 18:36) N’ihi ya, Pọl degaara Ndị Kraịst oge ya akwụkwọ ozi, sị: “Anyị adịghị ebu agha dị ka ihe anyị bụ n’anụ ahụ́ si dị. N’ihi na ngwá agha anyị ji ebu agha abụghị nke anụ ahụ́, kama ọ bụ ihe Chineke mere ka ọ dị ike, nke e ji akụghasị . . . echiche na-ezighị ezi na ihe ọ bụla dị elu nke na-emegide ihe ọmụma Chineke.”—2 Ndị Kọrịnt 10:3-5; Ndị Efesọs 6:13-20.

Mgbe Pọl dere ihe a, a na-akpagbu Ndị Kraịst n’ọtụtụ obodo. N’eziokwu, ọ bụrụ na ha chọrọ imegwara, ha gaara emegwara. Ma, ha nọgidere na-ahụ ndị iro ha n’anya, na-ekwusakwara ndị niile chọrọnụ ozi udo. Akwụkwọ bụ́ Encyclopedia of Religion and War kwuru, sị: “Ndị mbụ soro ụzọ Jizọs jụrụ ịlụ agha na ịrụ ọrụ ọ bụla e ji akwado agha,” n’ihi na ha ghọtara na ime ihe ndị a “dị iche n’ihe Jizọs kụziiri ha, nke bụ́ ka ha hụ ibe ha nakwa ndị iro ha n’anya.” *

Ndịàmà Jehova ma na Jizọs bụ Eze ha otú ahụ Ndị Kraịst oge mbụ ma. Ha makwa na ọ bụ ya bụ Eze nke Alaeze Chineke—nke bụ́ ọchịchị ga-esi n’eluigwe weta udo na obi iru ala n’ụwa a. (Daniel 2:44; Matiu 6:9, 10) N’ihi ya, ebe ha bụ ndị nnọchiteanya, ha na-ekwusara ndị mmadụ ihe ọma dị iche iche Alaeze ahụ ga-eme. Ha na-agbalịkwa ka ha bụrụ ezi ụmụ amaala obodo ọ bụla ha bi, ha na-atụ ụtụ isi ma na-erube isi n’iwu obodo ndị na-emegideghị iwu Chineke.—Ọrụ 5:29; Ndị Rom 13:1, 7.

Ma ọ dị mwute ikwu na mgbe ụfọdụ, a na-aghọtahie Ndịàmà Jehova, na-akọsa akụkọ ụgha banyere ha ma na-akpagbu ha otú ahụ a kpagburu Ndị Kraịst oge mbụ. Ma ha anaghị emegwara. Kama ha na-agbalị ka ha na “mmadụ niile dịrị n’udo,” na-enwe olileanya na ụfọdụ n’ime ndị na-akpagbu ha ga-emecha bịa ka ha na “Chineke dị ná mma” ma nwee olileanya inweta ndụ ebighị ebi. *Ndị Rom 12:18; Jọn 17:3.

[Ihe e ndị dere n’ala ala peeji]

^ par. 13 Akwụkwọ bụ́ Encyclopedia of Religion and War kwuru na “tupu ọchịchị Kọnstantin [eze ukwu Rom nke chịrị malite n’afọ 306 ruo 337 Oge Anyị], Ndị Kraịst niile dere akwụkwọ kwekọrịtara na ịga agha adịghị mma.” Ma ha kwusịrị ikwu na ịga agha adịghị mma mgbe ozizi ndị dapụrụ n’okwukwe bịara ju ebe niile dị ka Baịbụl buru n’amụma.—Ọrụ 20:29, 30; 1 Timoti 4:1.

^ par. 15 Dị ka Ndị Kraịst oge mbụ mere, mgbe ọ dị mkpa, Ndịàmà Jehova na-aga ụlọikpe nweta ikike iji nọgide na-ekwusa ozi ọma.—Ọrụ 25:11; Ndị Filipaị 1:7.

Ì CHETỤLA NKE A N’ECHICHE?

▪ Olee otú Ndị Kraịst kwesịrị isi na-emeso ndị iro ha?—Matiu 5:43-45; Ndị Rom 12:20, 21.

▪ Mgbe a na-akpagbu Jizọs, gịnị ka o mere?—1 Pita 2:21, 23.

▪ Gịnị mere Ndị Kraịst oge mbụ ekweghị aga agha?—2 Ndị Kọrịnt 5:20; 10:3-5.