Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee ihe Ị Ga-aza?

Olee ihe Ị Ga-aza?

Olee ihe Ị Ga-aza?

Gịnị Ka A Na-esetaghị n’Ihe Osise A?

Gụọ Ọrụ 8:26-40. Ugbu a, lee anya n’ihe a e sere ebe a. Olee ihe ndị i hụrụ n’ihe osise a nke a na-ekwughị n’akụkọ ahụ? Dee ihe ndị ị chọpụtara n’okpuru ebe a.

1. ․․․․․

2. ․․․․․

3. ․․․․․

IHE A GA-EKWURỊTA:

Gịnị mere ọnaozi ahụ aghọtaghị ihe ọ na-agụ? Olee otú e si nyere ya aka ịghọta ya? Olee otú ị ga-esi na-eme ihe ọnaozi ahụ mere?

Site na Magazin A

Zaa ajụjụ ndị a, ma denye amaokwu Baịbụl ndị na-adịghị na ha.

PEEJI NKE 3 Onye na-adịghị egboro ezinụlọ ya mkpa ha jọkarịrị gịnị ná njọ? 1 Timoti 5:․․․․․

PEEJI NKE 16 A bịa n’ihe gbasara ejiji, olee ihe anyị kwesịrị ilekwasị anya na ya? 1 Pita 3:․․․․․

PEEJI NKE 24 Ọ bụrụ na agụụ na-agụ onye iro gị, gịnị ka i kwesịrị ime? Ndị Rom 12:․․․․․

PEEJI NKE 27 Ọ bụrụ na anyị chọrọ inwe obi ụtọ, gịnị ka ọ dị mkpa ịma? Matiu 5:․․․․․

Olee Ihe Ị Maara Banyere Jefta Onyeikpe?

Gụọ Ndị Ikpe 11:1–12:7. Zazie ajụjụ ndị a.

4. ․․․․․

N’ebo iri na abụọ e nwere n’Izrel, olee nke Jefta si na ya? IJI NYERE GỊ AKA: Gụọ Ọnụ Ọgụgụ 26:29.

5. ․․․․․

Olee mba ọ napụtara Izrel n’aka ha?

6. ․․․․․

Eziokwu ka ọ̀ bụ ụgha? Josef, nwa Jekọb (ya bụ Izrel) anwụọla tupu a mụọ Jefta onyeikpe.

IHE A GA-EKWURỊTA:

Gịnị ka i chere mere ada Jefta ji kweta mee ihe papa ya kwere ná nkwa? Olee otú i nwere ike isi mee ka ada Jefta?

AZỊZA

1. Ọ ga-abụ na naanị Filip so.

2. Ọnaozi ahụ nọ n’ụgbọ ịnyịnya ọ bụghị n’ịnyịnya nkịtị.

3. Ebe ihe ahụ nọ mee bụ n’ọzara ọ bụghị n’ime obodo.

4. Manase.—Ọnụ Ọgụgụ 26:29; Ndị Ikpe 11:1.

5. Amọn.—Ndị Ikpe 11:4.

6. Eziokwu.