Olee otú m ga-esi amata ndị mụrụ m nke ọma?
Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị
Olee otú m ga-esi amata ndị mụrụ m nke ọma?
Jesika, na ndị mụrụ ya, na ndị enyi ha nọ na-eri nri. Ka ha na-eri nri, otu n’ime ndị toro eto nọ n’ebe ahụ sịrị mama Jesika, “Ị̀ ma onye m hụrụ ụbọchị a? Richaad—nwa okorobịa ahụ gị na ya kpara mgbe anyị nọ n’ụlọ akwụkwọ sekọndrị.”
Jesika akwụsị nri ọ na-eri, lewe mama ya shii. Ọ nụtụbeghị ihe gbasara Richaad!
Ihe pụziri Jesika n’ọnụ bụ, “Maama, ya bụ na o nwere onye gị na ya kpara tupu papa m alụọ gị? Amaghịdị m!”
Ò NWETỤLA ihe ị nụrụ banyere mama gị ma ọ bụ papa gị, ya atụọ gị n’anya otú ahụ ọ tụrụ Jesika? Ọ bụrụ na o nweela, ikekwe, ị bịara chewe ma ò nwere ihe ndị ọzọ ị na-amabeghị banyere ndị mụrụ gị!
Gịnị mere a ga-eji enwe ihe ndị ị na-amaghị banyere ndị mụrụ gị? Olee uru ọ ga-abara gị ma ị matakwuo ihe banyere ha? Oleekwa otú ị ga-esi amatakwu ha?
I Nwere Ọtụtụ Ihe Ị Ga-amụta
Gịnị mere a ga-eji enwe ihe ndị ị na-amaghị banyere ndị mụrụ gị? Mgbe ụfọdụ, ihe nwere ike ịkpata ya bụ na gị na ha ebighị. Jekọb, * onye dị afọ iri abụọ na abụọ, sịrị: “Papa m na mama m gbara alụkwaghịm mgbe m dị afọ asatọ. Kemgbe ahụ, naanị ugboro ole na ole ka mụ na papa m na-ahụ n’afọ. E nwere ọtụtụ ihe m ga-achọ ịma banyere ya.”
A sịgodị na ọ bụ gị na papa gị na mama gị bi kemgbe, o nwere ike ha akọbereghị gị ihe niile banyere onwe ha. Maka gịnị? Mgbe ụfọdụ, ihere anaghị ekwe ndị nne na nna kọọ ihe ọjọọ ndị ha mere oge ha na-eto eto, otú ahụ ihere na-anaghị ekwe onye Ndị Rom 3:23) Ụjọ ha nwere ike ịbụ na ha kọọrọ gị ihe ọjọọ ndị ha mere, ị ga-eledawazi ha anya ma ọ bụdị ya emee ka obi kaa gị imewe ihe otú o si masị gị.
ọ bụla ọzọ kọọ nke ya. (Ma ọtụtụ mgbe, e nwere ihe ndị mụrụ gị na-akọbereghị gị n’ihi na e nwebeghị ihe mere ha ga-eji akọrọ gị ya. Otu nwa okorobịa aha ya bụ Emeka, sịrị, “Ọ na-eju m anya na mmadụ na ndị mụrụ ya ga-ebi n’otu ụlọ ọtụtụ afọ ma aka nwee ọtụtụ ihe onye ahụ na-amaghị banyere ha!” Ọ́ gaghị adị mma ma ị gbalịa jụọ ndị mụrụ gị ajụjụ ndị ga-eme ka ị matakwuo ha? Lee uru anọ i nwere ike irite ma i mee ya.
Uru nke mbụ: Ndị mụrụ gị ga-enwe obi ụtọ na i nwere mmasị n’ebe ha nọ. O doro anya na obi ga-atọ ha ụtọ na ha dị gị n’obi nke na ị chọrọ ịmatakwu ha. Nke a nwekwara ike ime ka hanwa na-agbalịkwu ịghọta nsogbu ndị ị na-enwe na otú obi na-adị gị!—Matiu 7:12.
Uru nke abụọ: Ị ga-aghọta otú ndị mụrụ gị si eche echiche. Dị ka ihe atụ, ndị mụrụ gị hà daburu ogbenye? Nke a nwere ike inyere gị aka ịghọta ihe mere ha anaghị achọ ịna-emefusi ego, n’agbanyeghị na gịnwa na-ewere ya na ha dị aka ntagide.
Ịghọta ihe mere ndị mụrụ gị ji eche echiche otú ha si eche ga-enyere gị ezigbo aka. Otu nwa okorobịa aha ya bụ Ugochukwu kwuru, sị, “Ịma otú ndị mụrụ m si eche echiche emeela ka m na-ebu ụzọ echebara ihe m chọrọ ikwu echiche tupu m kwuwe ya, ọ na-emekwa ka m ghara ikwu ihe ga-ewute ha.”—Ilu 15:23.
Uru nke atọ: O nwere ike ime ka ọ na-adịrị gị mfe ịkọrọ ha ihe ndị na-eme ná ndụ gị. Otu nwa agbọghọ dị afọ iri na asatọ, aha ya bụ Nkiru, kwuru, sị: “Amaghị m otú m ga-esi akọrọ papa m na e nwere otu nwa okorobịa ihe ya na-amasị m. Ma mgbe m katara obi kọọrọ ya ya, papa m kọọrọ m banyere nwa agbọghọ mbụ ya na ya kpara nakwa ụdị obi ụtọ ya nwere n’oge ahụ. Ọ kọdịịrị m otú ya na nwa agbọghọ ahụ si gbasaa nakwa otú obi dị ya n’oge ahụ. Ihe a ọ kọọrọ m, meziri ka m kọọrọ ya ihe niile banyere nwa okorobịa ahụ.”
Uru nke anọ: I nwere ike ịmụta ihe n’aka ha. Ihe ndị mụrụ gị ga-akọrọ gị banyere onwe ha nwere ike inyere gị aka ịma ihe ị ga-eme nsogbu ndị ị na-enwe. Jọshụa, bụ́ otu nwa okoro dị afọ iri na isii, sịrị: “Achọrọ m ịma otú ndị mụrụ m si na-enwe ike elekọta ezinụlọ anyị, na-egboro anyị mkpa anyị, ma nke ime mmụọ ma nke anụ ahụ́, n’agbanyeghị na anyị dị ọtụtụ. Ama m na a ga-enwerịrị ihe dị mkpa m nwere ike ịmụta n’aka ha.” Ka a sịkwa ihe mere Baịbụl ji jụọ ajụjụ a: “Ọ̀ bụ na amamihe adịghị n’etiti ndị agadi, ọ̀ bụ na nghọta adịghịkwa n’ogologo ndụ?”—Job 12:12.
Kwulite Ya
Ọ bụrụ na ị ga-achọ ịmatakwu ndị mụrụ gị, olee otú ị ga-esi amalite? Lee aro ndị ga-enyere gị aka.
Mara oge dị mma ikwulite ya. Ọ dịghị mkpa ịgwa ha agwa na o nwere ihe ị chọrọ ka gị na ha kpaa. Kama, kwulite ya mgbe unu na-akparịta ụka nkịtị. O nwere ike ịbụ mgbe unu na-egwukọ egwu, mgbe unu na-arụkọ ọrụ, ma ọ bụ mgbe gị na ha ji ụkwụ na-aga otu ebe ma ọ bụkwanụ mgbe unu nọ n’ụgbọala. Ugochukwu, onye e kwuru okwu ya ná mbụ, sịrị: “Mụ na ndị mụrụ m enweela mkparịta ụka ndị dị ụtọ mgbe anyị na-eme njem. N’eziokwu, ama m na m nwere ike na-egere egwú m kwụnyere ná ntị m ma ọ bụdị rahụwa ụra, ma achọpụtara m na ikwulite otu ihe na-emekarị ka ha kọọrọ m ihe ndị na-abara m uru!”
Jụọ ajụjụ. E nwere otu ihe doro anya: Ya bụrụgodị na gị na mama gị akparịtawa ụka, o nwere ike ọ gaghị anọkata kọwara gị ihe banyere nwa okorobịa mbụ ya na ya kpara. Papa gị nwekwara ike ọ gaghị anọkata kọwara gị otú ya si gaa buru ụgbọala papa ya otu ụbọchị ma kpọkaa ya. Ma ndị mụrụ gị nwere ike ịkọrọ gị ụdị ihe ndị ahụ ma ọ bụrụ na ị jụọ ha!— Igbe dị na peeji nke 12 ga-enyere gị aka ịma ihe ị ga-ajụ ha.
Esila ọnwụ. Ọtụtụ mgbe, ha zawa gị otu ajụjụ, ha nwere ike isi na ya banye n’ihe ọzọ. I nwere ike chọọ ịgwa ha ka ha zaa gị ihe ahụ ị jụrụ ha, ma gbalịa ka ị ghara ikwu ya! Cheta na ihe i bu n’obi na-ajụ ajụjụ ahụ abụghị ka ị nụ akụkọ, kama ka gị na ndị mụrụ gị dịkwuo ná mma. Otu ụzọ kacha mma ị ga-esi mee ya bụ ige ha ntị mgbe ha Ndị Filipaị 2:4.
na-akọrọ gị ihe dị ha n’obi.—Gosi na i nwere nghọta. “Echiche nke dị n’obi mmadụ yiri mmiri miri emi, ma, ọ bụ onye nwere nghọta ga-esepụta ya.” (Ilu 20:5) Ọ dị ezigbo mkpa ka i gosi na i nwere nghọta mgbe ndị mụrụ gị na-akọrọ gị ihe ụfọdụ ha na-anaghị achọkarị ịkọrọ mmadụ. Dị ka ihe atụ, o nwere ike ị chọrọ ka papa gị kọọrọ gị ụfọdụ ihe ọjọọ o mere mgbe ọ ha ka gị nakwa ka ọ gwa gị ihe ọ gaara eme ma ọ bụrụ ugbu a o torola eto. Tupu ị jụwa ya ụdị ajụjụ ahụ, i nwere ike ịsị ya, “Iwe ọ̀ ga-ewe gị ma m jụọ gị ihe dị otú a ma ọ bụ ihe dị otú a.”
Gosi na ị ma ihe. Ndị mụrụ gị kọwara gị akụkọ ndụ ha, bụrụ “onye na-anụ ihe ngwa ngwa, onye na-adịghị ekwu okwu ngwa ngwa.” (Jems 1:19) Ihe ọ sọkwara ya ya bụrụ, ejikwala ihe ahụ ha kọọrọ gị chịwa ha ọchị ma ọ bụ kparịwa ha. Ikwu ihe ndị dị ka “Chei! A gwa m na i mere ụdị ihe a, agaghị m ekwe!” ma ọ bụ “Ọ̀ bụ ya mere ị naghị ekwe m megharịa ahụ́?” ga-eme ka ndị mụrụ gị ghara ịkọziri gị ihe ndị ọzọ. Ọ gaghị adịkwa mma ma ị kọọrọ ndị na-abụghị ndị ezinụlọ unu ihe ndị ahụ ndị mụrụ gị kọọrọ gị.
Oge Ya Anaghị Agafe Agafe!
Ihe ndị a a kọwara ga-enyere gị aka ịmatakwu ndị mụrụ gị mgbe gị na ha ka bi. Ọ bụrụkwanụ na gị na ha ebighịzi? Ọ ka nwekwara ike inyere gị aka ka gị na ndị mụrụ gị dịkwuo ná mma—ma ọ bụdị mee ka gị na papa gị ma ọ bụ mama gị ị na-amachaghị dịwakwuo ná mma. Ọ bụ ihe a ka Jekọb, bụ́ onye e kwuburu okwu
ya ná mbụ, chọpụtara. Ọ bụ eziokwu na o biziiri onwe ya ugbu a, ọ sịrị, “Na nso nso a ka m bịara matawa onye papa m bụ nke ọma, nke a na-enyekwa m obi ụtọ.”N’ihi ya, ma ì bi n’ụlọ nne na nna gị ma ì biiri onwe gị, oge ị matakwu ha anaghị agafe agafe. Ọ́ gaghị adị mma ma ị gbalịa mee ihe ndị a a tụrụ aro ha n’isiokwu a iji matakwuo ndị mụrụ gị?
Ị gaa n’adres Ịntanet anyị bụ́ www.watchtower.org/ype ị ga-ahụ ihe ndị ọzọ a tụlerela n’isiokwu a bụ́ “Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị”
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 9 Aha a kpọrọ ụfọdụ ndị n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.
IHE NDỊ Ị GA-ECHEBARA ECHICHE
▪ Olee ihe ndị a kọwara n’isiokwu a i nwere ike ịjụ ndị mụrụ gị?
▪ Olee otú ịmatakwu ndị mụrụ gị ga-esi enyere gị aka ịghọtakwu onwe gị?
[Igbe/Foto dị na peeji nke 12]
Jụọ ndị mụrụ gị ajụjụ ndị dị ka:
ALỤMDI NA NWUNYE HA: Olee otú i si mata papa m (ma ọ bụ mama m)? Olee ihe mbụ mere unu ji nwee mmasị n’ibe unu? Ebee ka unu biri mgbe unu lụchara?
MGBE HA BỤ ỤMỤAKA: Olee ebe a mụrụ gị? Ò nwere mgbe gị na ụmụnne gị sere okwu mgbe unu dị obere? Ndị mụrụ gị hà dị aka ike ka hà na-ahapụ gị ka i mere otú masịrị gị?
AGỤMAKWỤKWỌ HA: Olee ihe ọmụmụ a kụziiri unu n’ụlọ akwụkwọ ị kacha mee nke ọma na ya? Olee nke ị na-emeghị nke ọma na ya? È nwere onye nkụzi unu ihe ya kacha masị gị? Gịnị mere ihe ya ji masị gị?
ỤDỊ ỌRỤ HA RỤRỤ: Olee ọrụ mbụ ị rụrụ? Ọrụ ahụ ò nyere gị obi ụtọ? A sị gị họrọ ụdị ọrụ ọzọ, olee nke ị ga-ahọrọ?
IHE NDỊ NA-AMASỊ HA: I nwee ego iji gaa ebe ọ bụla ị chọrọ n’ụwa, olee ebe ị ga-aga? Olee ọrụ aka ị ga-achọ ịmụ ma i nwee ohere ya?
OTÚ HA SI BIDO FEWE CHINEKE: Ndị mụrụ gị hà bụ Ndị Kraịst? Ọ bụrụ na ha abụghị, olee otú i si malite inwe mmasị na Baịbụl? Olee nsogbu ndị bịaara gị mgbe ị malitere ime ihe ndị ị na-amụta na Baịbụl?
IHE NDỊ HA JI KPỌRỌ IHE: Olee ihe i chere kacha mkpa, bụ́ nke ga-enyere mmadụ aka ịbụ ezigbo enyi na inwe obi ụtọ ná ndụ? Olee ihe i chere ga-eme ka di na nwunye na-enwe obi ụtọ? Olee ndụmọdụ kacha mma mmadụ nyetụrụla gị?
Gbalịa mee ihe a: Jiri akwụkwọ detuo ihe i chere mama gị na papa gị ga-aza ma ị jụọ ha ajụjụ ụfọdụ a jụrụ ebe a. Jụzie ha ajụjụ ndị ahụ, lezie ma ihe ndị i dere ọ̀ bụ ihe ha zara gị.
[Igbe dị na peeji nke 13]
IHE NDỊ MỤRỤ ỤMỤ KWESỊRỊ IBURU N’UCHE
Gị na di gị, nwa gị nwaanyị na ụfọdụ ndị enyi unu nọ na-eri nri. Ka unu na-akparịta ụka, enyi gị nwaanyị ekwute okwu otu nwa okorobịa gị na ya kpaburu tupu ị lụọ di. Ị kọtụbereghị nwa gị nwaanyị na e nwere nwa okorobịa gị na ya kpara tupu ị lụọ di. Ugbu a nwa gị nwaanyị chọrọ ka ị kọọrọ ya otú o si mee. Gịnị ka ị ga-eme?
Ọ na-akacha mma ịza nwa gị ajụjụ ndị ọ jụrụ gị. A sị ka e kwuwe, ọ na-atọ ọtụtụ ndị nne na nna ụtọ mgbe ọ bụla ụmụ ha jụwara ha ajụjụ ma na-ege ntị mgbe ha na-aza ya, n’ihi na ọ na-egosi na ha na ha dị ná mma.
Ma ị chọọ ịkọrọ nwa gị akụkọ ndụ gị, gịnị na gịnị ka i kwesịrị ịkọrọ ya? O kwere nghọta na e nwere ihe ndị ị na-agaghị achọ ịkọrọ nwa gị. Ma, mgbe o kwere mee, ịkọrọ ụmụ gị ụfọdụ ihe ndị na-adịghị mma i mere nakwa ihe isi ike ụfọdụ ndị i nwere ná ndụ nwere ike inyere ha aka. Olee otú o nwere ike isi nyere ha aka?
Ka anyị were otu ihe atụ. Pọl onyeozi dere banyere onwe ya, sị: “Mgbe m chọrọ ime ihe ziri ezi, ọ bụ ihe ọjọọ na-adị n’ebe m nọ. . . . Lee nhụsianya m nọ na ya!” (Ndị Rom 7:21-24) Jehova Chineke ji ike mmụọ nsọ ya mee ka Pọl kwuo ihe ndị ahụ ma hụ na e dere ha na Baịbụl ka ọ baara anyị uru. (2 Timoti 3:16) N’eziokwu, ọ na-abara anyị uru n’ihi na o nweghị onye n’ime anyị ga-asị na ihe ahụ Pọl kwuru anaghị eme ya, ka ò nwere?
Ịkọrọ ụmụ gị mkpebi ndị dị mma i mere na ihe ndị ị na-emetaghị nwere ike ime ka ha kọkwaara gị ihe ndị hanwa mere. N’eziokwu, otú ụwa dị n’oge ị ka na-eto eto na otú ụwa dị ugbu a abụghị otu. Ọ bụ eziokwu na ihe agbanweela, ọnwụnwa na nsogbu ụmụ mmadụ na-enwe agbanwebeghị; ndụmọdụ ndị dị n’Akwụkwọ Nsọ agbanwebeghịkwa. (Abụ Ọma 119:144) Ịkọrọ ụmụ gị ndị na-eto eto nsogbu ndị i nwetara ná ndụ—nakwa otú i si merie ha—nwere ike nyere ha aka imeri nsogbu ndị nke hanwa na-enwe. Otu nwa okorobịa aha ya bụ Emeka, sịrị: “Mgbe ị chọpụtara na ndị mụrụ gị enwetụla ụdị nsogbu ndị ị na-enwe ugbu a, ọ ga-eme ka ị ghọta na hanwa ezughị okè otú gịnwa na-ezughị.” O kwukwara, sị, “I nwezie nsogbu mgbe ọzọ, ị ga-echewe ma ndị mụrụ gị hà enwetụla ụdị nsogbu ahụ mbụ.”
Ihe ị ga-ezere: Ọ bụghị ihe ọ bụla ị kọọrọ nwa gị ka ị ga-eji dụọ ya ọdụ. N’eziokwu, ụjọ gị nwere ike ịbụ na nwa gị ga-aghọtahie ihe ahụ ị kọọrọ ya ma ọ bụdị chewe na ọ dịghị njọ ma ya mee ihe ndị ahụ na-adịghị mma i mere. Ma kama ịgwa nwa gị ihe o kwesịrị ịmụta n’akụkọ ahụ, dị ka ịsị, “Ọ bụ ya mere na i kwesịghị ime ihe dị otú a ma ọ bụ ihe dị otú a,” gwa ya ná nkenke otú ihe ahụ i mere dị gị n’obi. Kwuo ihe dị ka, “A sị na m maara mgbe ahụ, agaaraghị m eme ihe ahụ m mere n’ihi ihe dị otú a ma ọ bụ ihe dị otú a.” I mee ya otú ahụ, nwa gị ga-amụta ihe n’ihe ahụ ị kọọrọ ya, ọ gaghị adịkwa ya ka ị̀ na-agwa ya okwuchukwu.—Ndị Efesọs 6:4.
[Igbe dị na peeji nke 13]
“E nwere oge m gwara mama m na obi na-aka eru m ala ma mụ na ụmụ akwụkwọ ibe m nọrọ karịa mgbe mụ na Ndịàmà ibe m nọ. N’echi ya, ahụrụ m akwụkwọ ozi mama m deweere m n’elu tebụl m. N’akwụkwọ ozi ahụ, ọ gwara m na ọ dịkwa mgbe yanwa na-enweghị ndị enyi bụ́ Ndịàmà ibe ya. O chetaara m na e nwere ndị a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl, ndị jeere Chineke ozi n’agbanyeghị na o nweghị onye ọ bụla nọ ha nso nke ga-agba ha ume. Ọ jakwara m mma na m gbalịrị imeta ụfọdụ ndị bụ́ ezigbo mmadụ enyi. Ọ tụrụ m n’anya na ọ bụghị naanị m nwere nsogbu a. Obi tọrọ m ụtọ ịma na mama m nwedịrị ụdị nsogbu ahụ, nke a gbakwara m anya mmiri. Ihe a mama m gwara m gbara m nnọọ ume nke na m kpebiri ime ihe dị mma.”—Junko, ọ dị afọ iri na asaa, o si Japan.
[Foto dị na peeji nke 11]
Gwa ndị mụrụ gị ka ha gosi gị foto ụfọdụ ha sere ma ọ bụ ihe ụfọdụ ha nwere mgbe a na-amụbeghị gị. Nke a nwere ike ime ka ha kọọrọ gị banyere onwe ha