Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee otú m nwere ike isi na-agwa ndị mụrụ m okwu?

Olee otú m nwere ike isi na-agwa ndị mụrụ m okwu?

Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị

Olee otú m nwere ike isi na-agwa ndị mụrụ m okwu?

“Agbalịrị m nnọọ ịgwa ndị mụrụ m otú obi dị m, ma ha anaghị aghọta ihe m na-ekwu, ihe ha mere ozugbo bụ ịnapụ m okwu n’ọnụ. O siiri m ezigbo ike ibili gaa gwa ha otú obi dị m, ugbu a kwa, ekwuchaghị m ihe m chọrọ ikwu!”—Rosa. *

MGBE ị ka dị obere, o nwere ike ọ bụ mama gị na papa gị bụ ndị mbụ ị na-akọrọ nsogbu ọ bụla i nwere. Ị na-akọrọ ha ihe ọ bụla merenụ, ma nke ọma ma nke ọjọọ. Ọ naghị esiri gị ike ịkọrọ ha otú ihe dị gị n’obi, ị na-ewerekwa ndụmọdụ ọ bụla ha nyere gị ka nke kacha mma.

Ma ugbu a, ọ na-adị gị ka ndị mụrụ gị anaghịzi aghọtacha gị. Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Ebere, sịrị: “Mgbe anyị na-eri nri n’otu mgbede, amalitere m ibe ákwá ma na-akọrọ ndị mụrụ m otú obi dị m. Ndị mụrụ m nụrụ ihe m na-ekwu ma o yiri ka ha aghọtaghị ihe m na-ekwu.” Gịnị meziri? “Abanyere m n’ọnụ ụlọ nke m gaa bee ezigbo ákwá!”

Mgbe ụfọdụ, o nwere ike ịdị gị ka gị akọrọla ndị mụrụ gị otú obi dị gị. Otu nwata nwoke, aha ya bụ Kristofa, sịrị: “Ana m akọrọ ndị mụrụ m ọtụtụ ihe. Ma obi dị m ụtọ na ha anaghị ama ihe niile m na-eche n’obi m.”

Ọ̀ dị njọ ma ọ bụrụ na ị gwaghị ndị mụrụ gị ihe ụfọdụ ị na-eche n’obi gị? Ọ dịchaghị njọ—ma ọ bụrụhaala na ị naghị eme ya iji ghọgbuo ha. (Ilu 3:32) Ka o sina dị, ma ọ̀ dị gị ka ndị mụrụ gị anaghị aghọta gị ma ọ̀ bụ na gịnwa anaghị achọ ịkọrọ ha ihe, otu ihe doro anya bụ: Ọ dị mkpa ka ị na-akọrọ ndị mụrụ gị ihe, ọ dịkwa mkpa ka ha na-aghọta ihe ị na-agwa ha.

Akwụsịla Ịgwa Ha Okwu!

E nwere ike iji ịgwa ndị mụrụ gị okwu tụnyere ịnya ụgbọala. Ọ bụrụ na ị nyara ụgbọala ruo ebe ihe nọchiri ụzọ, nke ga-egbochi gị isi ụzọ ahụ gafee, ị gaghị akwụsị ebe ahụ; ihe ị ga-eme bụ ịchọrọ ụzọ ọzọ gawa ebe ị na-aga. Ka anyị tụlee ihe atụ ụfọdụ.

Ihe mgbochi nke mbụ: O nwere ihe ị chọrọ ịkọrọ ndị mụrụ gị, ma ọ dị gị ka ha anaghị ege gị ntị. Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Lia, sịrị: “Ọ na-esiri m ike ịkọrọ papa m ihe. Mgbe ụfọdụ, m ga-anọ na-akọrọ ya ihe, ihe m ga-anụzi bụ, ‘Ewekwala iwe, ị sịdị gịnị?’”

AJỤJỤ: Ya bụrụkwanụ na e nwere otu nsogbu dị ezigbo mkpa ka Lia kọọrọ papa ya? O nwere ihe atọ o nwere ike ime.

Nke A Nke B Nke CH

Iji olu ike gwa Ịhapụ ịkọrọ ya Ịchọta oge ọzọ

papa ya okwu. papa ya. ka mma ọ ga-akọrọ

Lia nwere ike iji olu Lia nwere ike ya nsogbu ahụ.

ike sị papa ya: “Papa, hapụzie ịkọrọ Lia nwere ike ịgakwuru

ihe a m bịara ịkọrọ gị papa ya nsogbu papa ya ma kọọrọ

dị mkpa! Geekwanụ m ahụ o nwere. ya nsogbu ahụ, ma ọ bụdị

ntị!” dee ya edee nye papa ya.

Olee nke i chere Lia kwesịrị ime? ․․․․․

Ka anyị leba anya n’ihe ndị ahụ ma mara uru na ọghọm ndị nwere ike ịdị na nke ọ bụla. O nwere ihe na-adọpụ papa Lia uche—ọ bụkwa ya mere na ọ chọpụtaghịdị na iwe na-ewe Lia. N’ihi ya, ọ bụrụ na Lia ahọrọ Nke A, papa ya agaghị aghọta isi mba ọ na-aba. Lia iji olu ike agwa papa ya okwu nwere ike ọ gaghị emedị ka papa ya gee ya ntị, ọ gaghịkwa egosi na ọ na-asọpụrụ ndị mụrụ ya. (Ndị Efesọs 6:2) N’ihi ya, iji olu ike agwa papa ya okwu agaghị abara ya uru.

Ọ bụ eziokwu na ịhọrọ Nke B nwere ike iyi ka ọ̀ kacha mfe, ma ọ bụghị ya kacha mma. Maka gịnị? Maka na “atụmatụ na-aghasasị ma ọ bụrụ na a gbaghị izu, ma a na-arụzu ihe ma e nwee ọtụtụ ndị ndụmọdụ.” (Ilu 15:22) Ọ bụrụ na Lia chọrọ ka nsogbu ya ahụ bie, ọ dị mkpa na ọ ga-akọrọ ya ndị mụrụ ya—ọ bụrụkwa na ọ chọrọ ka ha nyere ya aka, ọ dị mkpa na ha ga-ama ihe bụ́ nsogbu ya. Ọ bụrụ na ọ jụ ịkọrọ ha ihe ọ bụla, nsogbu ya agaghị ebi, ndị mụrụ ya agaghịkwa enyere ya aka.

Ọ bụrụ na Lia họọrọ Nke CH, ọ pụtara na o kweghị ka ihe ọ bụla gbochie ya ime ihe ọ chọrọ ime. Kama, ọ gbalịrị ịgwa papa ya ihe ahụ n’oge ọzọ. Ọ bụrụkwa na Lia ekpebie ide ya ede nye papa ya, obi nwere ike iru ya ala ma o dechaa ya. O dee ya ede, ọ ga-enwe ike ide ihe niile dị ya n’obi, ọ ga-enyekwara ya aka ịma ihe ọ ga-ekwu mgbe papa ya ga-enwe ike ige ya ntị. Papa Lia gụọ ihe ahụ o dere, ọ ga-aghọta ihe ọ chọrọ ịgwa ya, nke ahụ nwekwara ike inyere ya aka ịghọta nsogbu ya. N’ihi ya, nke CH bụ nke kaara ma Lia ma papa ya mma.

Olee ihe ndị ọzọ Lia nwere ike ime? Legodị ma ị ga-echetali otu ma detuo ya n’okpuru ebe a. Dekwaa uru ma ọ bụ ọghọm o nwere ike ịkpata.

․․․․․

Ihe mgbochi nke abụọ: Ndị mụrụ gị chọrọ ka gị na ha kparịta ụka, ma gịnwa achọghị. Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Sera, sịrị: “O nweghị ihe na-ewe m iwe ka mmadụ iji ajụjụ zuo m ahụ́ ozugbo m si akwụkwọ lọta. Naanị ihe m chọrọ mgbe ahụ bụ iwepụ obi m n’ihe ọ bụla gbasara akwụkwọ, ma ọ bụ mgbe ahụ ka ndị mụrụ m na-amalite ịjụ m: ‘Olee otú akwụkwọ nke taa si gaa? È nwere nsogbu ndị i nwere taa?’” O doro anya na nne na nna Sera bu ọdịmma ya n’obi na-ajụ ya ajụjụ ndị ahụ. Ma Sera sịrị, “Ọ na-esiri m ike ịkọ ihe mere n’ụlọ akwụkwọ mgbe ike gwụgburu m agwụgbu.”

AJỤJỤ: Gịnị ka Sera nwere ike ime? Dị ka ọ dị n’ihe atụ nke mbụ anyị nyere, e nwere ihe atọ o nwere ike ime.

Nke A Nke B Nke CH

Ịjụ ịza ihe ha jụrụ Ịza ihe ha jụrụ Ịhapụ ikwu ihe

ya. O nwere ike ịsị: ya. N’agbanyeghị na ọ bụla gbasara akwụkwọ,

“Hapụnụ m aka. ike gwụrụ Sera, ma kparịta ihe ọzọ. Sera

Achọghị m ikwu ihe o nwere ike zaa ha nwere ike ịgwa ha na

ọ bụla ugbu a!” ajụjụ ahụ, ma ọ gaghị mgbe obi ruru ya ala

eji obi ya na-aza ya. na ya ga-akọrọ ha ihe

na ya ga-akọrọ ha ihe

ndị mere n’ụlọ akwụkwọ ha.

O nweziri ike ịjụ ndị mụrụ ya

ajụjụ na-egosi na

ọ na-echekwa banyere ha,

dị ka: “Olee otú ụbọchị taa

si gaa? Ọ̀ gakwara nke ọma?”

Olee nke i chere Sera kwesịrị ịhọrọ? ․․․․․

Ugbu a, ka anyị leba anya ọzọ n’ihe ndị ahụ ma mara uru na ọghọm ndị nwere ike ịdị na nke ọ bụla.

Tupu Sera ekpebie ịhọrọ Nke A, ike gwụrụ ya, ọ chọghịkwa ikwunyere onye ọ bụla okwu. Ma ike ka ga-agwụkwa ya mgbe ahụ ọ jụrụ ikwu okwu, obi ya ga-amawakwa ya ikpe n’ihi otú ahụ o si gwa ndị mụrụ ya okwu.—Ilu 29:11.

Ihe ọzọkwa bụ na obi agaghị adị nne na nna Sera mma n’ihi otú o si gwa ha okwu ma ọ bụ n’ihi otú ebe niile ga-esi jụọ oyi mgbe o kwuchara ihe ahụ. Ha nwere ike ichewe na e nwere ihe Sera na-ezochiri ha. Ha nwedịrị ike ịgwa ya na ọ ga-azarịrị ha ajụjụ ha, nke ahụ ga-emekwa ka iwe wewekwuo ya. N’ikpeazụ, nke A abụghị ihe ga-aka mma ime.

O doro anya na ọ ka mma ma Sera họrọ Nke B karịa Nke A. Ma e nweghị ihe ọzọ, ọ zara ndị mụrụ ya ihe ha jụrụ ya. Ma ebe ọ bụ na ihe ahụ Sera na-ekwu esighị ya n’obi, ma ya ma ndị mụrụ ya agaghị enweta ihe ha chọrọ, ya bụ, mkparịta ụka ga-esi n’obi.

Ma ọ bụrụ na Sera ahọrọ Nke CH, ahụ́ ga-aka eru ya ala n’ihi na ha ahapụla ịkọ ihe ọ bụla gbasara ụlọ akwụkwọ mgbe ahụ. Ndị mụrụ ya ga-enwekwa obi ụtọ na ọ gbalịrị ka ha na ya kwurịta okwu. Ọ bụrụ na Sera ahọrọ nke a, ọ ga-aka abara ma ya ma ndị mụrụ ya uru n’ihi na ha niile na-eme ihe e dere ná Ndị Filipaị 2:4, bụ́ nke sị: “Echela echiche banyere nanị ihe metụtara gị, kama, na-eleba anya n’ihe banyere ndị ọzọ na ihe ha na-eme.”—Baịbụlụ Nsọ nke International Bible Society.

Ị gaa n’adres Ịntanet anyị bụ́ www.watchtower.org/ype ị ga-ahụ ihe ndị ọzọ a tụlerela n’isiokwu a bụ́ “Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị”

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 Aha a kpọrọ ụfọdụ ndị n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.

IHE Ị GA-ECHEBARA ECHICHE

▪ Olee uru ọ bara ịchọta oge dị mma iji kọọrọ ndị mụrụ gị ihe bụ́ mkpa gị?—Ilu 25:11.

▪ Olee uru dị n’ịkọrọ ndị mụrụ gị nsogbu gị?—Job 12:12.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 18]

HÀ NA-AGHỌTAHIE GỊ?

Ọ̀ na-esiri gị ike ịgwa ndị mụrụ gị okwu? O nwere ike ihe ị na-ekwu abụghị ihe ha na-anụ.

Ị sị . . .

“Achọghị m ikwu ihe ọ bụla banyere ya.”

Ihe ndị mụrụ gị na-anụ bụ . . .

“M ga-akọrọ ndị enyi m obi m na mkpa m, ma unu adịghị mkpa ná ndụ m nke ga-eme ka m kọọrọ unu obi m.”

Ị sị . . .

“Unu agaghị aghọta.”

Ihe ndị mụrụ gị na-anụ bụ  . . .

“Unu akaala, unu amakwaghị ebe a nọ. Ọ baghị uru unu ịgbalịwa ịmata ihe ndị m na-eme.”

[Igbe/Foto dị na peeji nke 21]

IHE NDỊ NA-ETO ETO IBE GỊ KWURU

“Akọọrọ m ndị mụrụ m otu nsogbu m nwere n’ụlọ akwụkwọ, ọ tụkwara m n’anya otú ha si gee m ntị ozugbo. Ha nyeziiri m aka idozi nsogbu ahụ n’egbughị oge!”—Natali.

“Ọ naghị adịkarị mfe mmadụ ịkọrọ ndị mụrụ ya ihe, ma ọ bụrụ na onye ahụ akata obi kọọrọ ha nsogbu o nwere, ọ ga-adị ya ka ebe e buturu ya ibu arọ o bu.”—Devani.

[Igbe dị na peeji nke 21]

IHE NDỊ MỤRỤ ỤMỤ KWESỊRỊ IBURU N’UCHE

Ebe ọ bụ na ihe banyere ụmụ gị na-emetụ gị n’obi, o nwere ike ị na-eche ma ọ̀ na-esiri ha ike ịkọrọ gị ihe. Gụọ ụfọdụ ihe ndị na-eto eto gwara ndị na-ebipụta Teta! na ọ bụ ya mere ha anaghị akọrọ ndị mụrụ ha ihe. Ị gụchaa ya, jụzie onwe gị ajụjụ ndị a a jụrụ ebe a, gụọkwa amaokwu Baịbụl ndị e depụtara.

Ọ na-esiri m ike ịkọrọ papa m nsogbu ndị m na-enwe n’ihi na ọrụ o nwere ịrụ karịrị akarị, ma n’ụlọ ọrụ ha ma n’ọgbakọ. O yiri ka a naghị enwe oge dị mma m ga-aga akọrọ ya mkpa m.—Andru.

‘Ò nwere otú m si na-eme ka ụmụ m chee na enweghị m ohere mụ na ha ga-eji kwurịta okwu? Ọ bụrụ na e nwere, olee ihe m ga-eme ka ụmụ m nwee ike na-abịa akọrọ m nsogbu ha? Olee mgbe m nwere ike iwepụta oge ka mụ na ụmụ m jiri ya na-akparịta ụka?’—Diuterọnọmi 6:7.

Eji m anya mmiri bịa kọọrọ mama m na mụ na mmadụ sere okwu n’ụlọ akwụkwọ. Ebu m n’obi na ọ ga-akasi m obi, ma ihe o mere bụ ịbawara m mba. Kemgbe ahụ, anaghịzi m akọrọ ya ihe ọ bụla dị mkpa.”—Kenji.

‘Olee ihe m na-eme ma ụmụ m kọọrọ m nsogbu ha nwere? A sịgodị na ọ dị mkpa ịbara ha mba, è nwere m ike ijide onwe m gegodị ha ntị tupu m nyewe ha ndụmọdụ?’—Jems 1:19.

Ọ dị ka ọ̀ na-abụ ndị nne na nna gwachaa nwa ha na ha agaghị ewe iwe ma nwa ahụ kọọrọ ha nsogbu ọ banyere na ya, e mechaa ha ewewe iwe. Nke a na-eme ka ọ dị nwa ahụ ka hà ghọgburu ya.”—Rechel.

‘Ọ bụrụ na nwa m agwa m ihe kwesịrị iwe m iwe, olee otú m ga-esi jide onwe m ka m ghara ịbawara ya mba ozugbo ahụ?’—Ilu 10:19.

E nwere ọtụtụ mgbe m kọọrọ mama m ihe m na-achọghị ka onye ọzọ mara, ya emechaa gaa kọọrọ ya ndị enyi ya. O tere ezigbo aka tupu m kọọrọ ya nsogbu ọzọ m nwere.”—Chantel.

‘Àna m egosi na m na-eme ihe na-agaghị ewute nwa m ma hapụ ịkọrọ ndị ọzọ ihe ọ bụla ọ kọọrọ m, bụ́ nke ọ na-achọghị ka ndị ọzọ mara?’—Ilu 25:9.

E nwere ọtụtụ ihe m ga-achọ ịkọrọ ndị mụrụ m. Naanị ihe m chọrọ bụ ka ha jụọ m ihe ga-eme ka m kọọrọ ha ya.”—Kọtni.

‘Ènwere m ike ibu ụzọ kpanyewere nwa m ụka? Olee oge ga-akacha mma mụ na ya ga-eji na-akparịta ụka?’—Ekliziastis 3:7.

[Foto dị na peeji nke 19]

Na e nwere ihe gbochiri gị na ndị mụrụ gị ikwurịta okwu n’oge ị chọrọ ya apụtaghị na ị ga-akwụsị ịkọrọ ha ihe—i nwere ike chọta ụzọ ọzọ kọọrọ ha ihe ị chọrọ ịkọrọ ha!