Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Mere Ụmụ Okorobịa Ji Agbara M Ọsọ?

Gịnị Mere Ụmụ Okorobịa Ji Agbara M Ọsọ?

Ndị Na-eto Eto Na-ajụ,

Gịnị Mere Ụmụ Okorobịa Ji Agbara M Ọsọ?

Ọ ma na m bụ onye a ma ama, n’ihi na agwala m ya na ụmụ okorobịa ndị ọzọ na-anwụrụ m. Ọ na-atọ ya ọchị ma m kọọrọ ya otú ụfọdụ ndị enyi m si emegheri. Ọ makwa na m ma ihe, n’ihi na o nweela ụfọdụ ihe ọ na-ekwuteghị, mụ agbazie ya olu. Amaghị m ihe mere na ọ chọbeghị ịgwa m ka mụ na ya kpawa.

Nwa agbọghọ ahụ mara mma, ma o nweghị ihe dị ya n’ime! Ọ naghị ekwe m kwuo okwu. M kwuo ekwuo, ya asị na mụ ekwuteghị ya! Achọghịzi m iji anya ahụ ya.

Ọ̀ NA-EWUTE gị na ụmụ okorobịa na-agbara gị ọsọ? Ọ na-ewute ọtụtụ ụmụ agbọghọ, ma ndị nke i chere na ụmụ nwoke ga na-anwụrụ! Dị ka ihe atụ, o nwere otu nwa agbọghọ aha ya bụ Joan. Ọ mara mma, ọ ma ihe, okwu na-agakwa ya were were n’ọnụ. Ma, nwa agbọghọ ahụ sịrị: “Ọ na-adịkarị m ka ụmụ okorobịa hà na-agbara m ọsọ. Ụfọdụ n’ime ha mụ na ha dịwara ná mma mechara kwụsịchaa ịtụpụrụ m ọnụ!”

Olee ihe na-eme ka ụmụ okorobịa nwewe mmasị n’ebe ụmụ agbọghọ nọ? Olee ihe na-anaghị amasị ha? Olee ihe i nwere ike ime ka ihe gị masịwa nwa okorobịa isi jụrụ oyi n’agaghị kparịwa onwe gị?

Ihe I Kwesịrị Ime

Mara uche gị na obi gị. O nwere ike ịbụ na ihe gbasara ụmụ nwoke bidoro masịwa gị mgbe ị na-etopụta agbọghọ. N’oge ahụ, o nwekwara ike ọ bụghị naanị otu nwa okorobịa ka i nwere mmasị n’ebe ọ nọ. Ya bụrụ na o mere gị otú ahụ, ọ bụghị ihe ọjọọ. Ma, ọ bụrụ na i bidoro nwụwara nwa okorobịa mbụ ahụ ihe ya masịrị gị, ọ gaara eme ka ị ghara ịna-eche echiche ka onye toro eto, kpaakwa adịm ná mma gị na Chineke aka ọjọọ. Ọ na-ewe oge tupu mmadụ amụta ịkpa ezi àgwà, ‘gbanwee uche ya’ ma kpebie ime ihe ndị dị mkpa, meekwa ụfọdụ ihe kpebiri ime ná ndụ ya.—Ndị Rom 12:2; 1 Ndị Kọrịnt 7:36; Ndị Kọlọsi 3:9, 10.

N’eziokwu, e nwere ọtụtụ ụmụ okorobịa ndị na-enwe mmasị n’ụmụ agbọghọ ndị na-amachaghị nke a na-akọ ma ọ bụ ndị na-ewere na ihe ọ bụla a gwara ha bụ eziokwu. Ma, mkpa ụmụ okorobịa dị otú ahụ bụ mma nwa agbọghọ ahụ, ọ bụghị àgwà ya. Ma nke bụ́ eziokwu bụ na nwa okorobịa ọ bụla maara ihe ga-achọ nwa agbọghọ nwere àgwà dị mma, onye ga-enyere yanwa aka ịkpakwu àgwà ọma.—Matiu 19:6.

Ihe ụmụ okorobịa kwuru: “Nwa agbọghọ ihe ya na-amasị m bụ onye ga-ekpebiliri onwe ya ihe ọ ga-eme, onye ihe ọ na-eme doro anya, nakwa onye a na-anaghị akwagharị akwagharị.”—Jems.

“Nwa agbọghọ m ga-enwe mmasị n’ebe ọ nọ bụ onye na-agwa m eziokwu ma na-akwanyere m ùgwù, ọ bụghị onye na-ekweta ihe ọ bụla m kwuru. Ọ bụrụgodị na nwa agbọghọ ahụ mara mma, m gaghị enwe mmasị n’ebe ọ nọ ma ọ bụrụ na ọ naghị achọ ịgwa m otú obi dị ya ka iwe ghara iwe m. Ụjọ ụdị nwa agbọghọ ahụ na-atụ m!”—Darịn.

“Ọ na-abụ m hụ nwa agbọghọ mara mma, ihe ya ebido masịwa m. Ma, m chọpụta na o nwebeghị ezigbo ihe o kpebirila iji ndụ ya eme, ihe ya agbụ m. Ọ bụrụkwanụ na o nweela ihe ndị bara uru o kpebirila iji ndụ ya eme, ya abụrụkwa na o nweela ụfọdụ n’ime ha o merela, ọ ga-eme ka m nwekwuo mmasị n’ebe ọ nọ.”—Demịan.

Mụta ịsọpụrụ ndị ọzọ. Otú ahụ i si achọ ka a hụ gị n’anya, otú ahụkwa ka ụmụ okorobịa si achọ ka a na-asọpụrụ ha. Ka a sịkwa ihe mere Baịbụl ji kwuo na di kwesịrị ịhụ nwunye ya n’anya, nwunye ekwesịkwa ‘ịkwanyere di ya ùgwù nke ukwuu.’ (Ndị Efesọs 5:33) Ajụjụ ọnụ a gbara ọtụtụ ụmụ nwoke gosiri na ihe a Baịbụl kwuru bụ eziokwu. N’ajụjụ ọnụ ahụ, ihe karịrị ụmụ okorobịa isii n’ime ụmụ okorobịa iri ọ bụla kwuru na ịkwanyere ha ùgwù dị ha mkpa karịa ịhụ ha n’anya. Ihe karịrị ndị dimkpa asaa n’ime ndị dimkpa iri ọ bụla a gbara ajụjụ ọnụ ahụ kwukwara otu ihe ahụ.

Ịkwanyere nwa okorobịa ùgwù apụtaghị na ị ga na-ekwere ihe ọ bụla ọ gwara gị. Ọ pụtaghị na ị gaghị ekwu obi gị ma e nwee ihe o kwuru ị na-ekwetaghị. (Jenesis 21:10-12) Ma otú i si dowe ọnụ gwa nwa okorobịa okwu nwere ike ikpebi ma ihe gị ọ̀ ga-amasị ya ka ọ̀ ga-agbawara gị ọsọ. Ọ bụrụ na ị na-akatọkarị ihe ọ bụla o kwuru ma ọ bụ na-agbazi ya olu mgbe niile, o nwere ike iche na ị naghị akwanyechara ya ùgwù. Ma, ọ bụrụ na ị ghọta ihe ọ na-ekwu, jaakwa ya mma n’ihe ndị dị mma o kwuru, ọ ga-aka anabata ihe ndị ọzọ ị ga-agwa ya. Nwa okorobịa nke maara ihe ga-achọpụtakwa ma ị̀ na-akwanyere ndị ezinụlọ unu na ndị ọzọ ùgwù. *

Ihe ụmụ okorobịa kwuru: “O nweghị ihe na-atọ nwa okorobịa ka ndị ọzọ iji ihe o kwuru kpọrọ ihe, nke ka nke, nwa agbọghọ o nwere mmasị n’ebe ọ nọ.”—Antoni.

“Ọ dị m ka nkwanye ùgwù ọ̀ bụ ihe kacha mkpa n’etiti nwoke na nwaanyị ka bidoro ịkpa. Ka oge na-aga, ịhụnanya ga-abịa.”—Adrian.

“Echere m na nwa agbọghọ ọ bụla ga-akwanyeliri m ùgwù ga-ahụlikwa m n’anya.”—Mak.

Na-eji ejiji dị mma, na-adịkwa ọcha. Uwe gị na ejiji gị yiri ígwè okwu i ji na-agwa ndị mmadụ otú i si eche echiche na otú i si akpa àgwà. Tupu gị ebidodị ikwunyere nwa okorobịa okwu, ejiji gị agwala ya ọtụtụ ihe gbasara gị. Ọ bụrụ na ị na-eji ejiji dị mma, ọ ga-ekwu ihe dị mma banyere gị. (1 Timoti 2:9) Ọ bụrụ na ị na-eyi uwe na-atapagide gị n’ahụ́ ma ọ bụ nke na-adị nkịkara n’anya, ọ ga-eme ka e lewe gị anya ọjọọ!

Ihe ụmụ okorobịa kwuru: “Ejiji nwa agbọghọ na-ekwu ọtụtụ ihe banyere otú o si ele ndụ anya. Ọ bụrụ na ọ na-eyi uwe ndị na-atapagide ya n’ahụ́ ma ọ bụ ndị na-eme ka a gbawa ya nkiri, m na-aghọta na ọ chọrọ ka ụmụ nwoke chụwa ya.”—Adrian.

“O nweghị ihe na-atọ m ka nwa agbọghọ nwere olu ọma, onye na-elebara ma onwe ya ma ntutu isi ya anya nke ọma. E nwedịrị nwa agbọghọ mara mma ihe ya masịrị m, mụ emechaa chọpụta na ọ naghị elezi onwe ya anya, ihe ya agbụ m ozugbo.”—Rayan.

“Nwa agbọghọ ihe ya na-amasị m bụ onye na-anaghị eme oké ntecha, onye na-anaghị eyi uwe na-atapagide ya n’ahụ́ ma ọ bụ nke na-egosi ihe ndị o yi n’ime, ka ụmụ nwoke gbawa ya nkiri.”—Itan.

“Ọ bụrụ na nwa agbọghọ eyiri uwe hụrụ m hụrụ m, nke bụ́ eziokwu bụ na ọ ga-eme ka anya ụmụ nwoke tọ n’ebe ọ nọ. Ma ọ bụghị ụdị onye ahụ ka m ga-achọ ka mụ na ya kpawa.”—Nikọlas.

Ihe Ị Na-ekwesịghị Ime

Achụla ụmụ nwoke. Ụmụ nwaanyị na-akpa ike dị egwu n’ahụ́ ụmụ nwoke. Ha nwere ike iji ike ahụ ha nwere mee ihe ọma ma ọ bụ ihe ọjọọ. (Jenesis 29:17, 18; Ilu 7:6-23) Ọ bụrụ na ọ na-abụ ị hụ nwa okorobịa ọ bụla, gị achọọ ime ka o nwewe mmasị n’ebe ị nọ, a ga-elewe gị anya ka onye na-achụ nwoke.

Ihe ụmụ okorobịa kwuru: “Ọ bụrụ na nwa okorobịa anọkete nwa agbọghọ mara mma, ya enwee otú ahụ́ ya si na-echisa ya, o nwere ike ime ka ahụ́ nwuru ya ọkụ. N’ihi ya, ọ bụrụ na nwa agbọghọ na-akụsakarị nwa okorobịa aka ma ọ na-ekwuru ya okwu, ana m ewere ya na ọ na-achụ nwoke.”—Nikọlas.

“Ọ bụrụ na nwa agbọghọ na-akụsakarị nwa okorobịa ọ bụla ọ hụrụ aka ma ọ bụ na-egburu nke ọ bụla gaferenụ iku anya, ana m ewere ya na ọ na-achụ nwoke, ihe ya anaghịkwa amasị m.”—Josi.

“Nwa agbọghọ ọ na-abụ ya hụ nwa okorobịa ọ bụla, ya emetụ ya aka, ya hụkwa nwa okorobịa gositụrụ mmasị n’ebe ọ nọ, ya agbawa ya n’ihu; ana m ewere ya ka onye na-achụ nwoke.”—Itan.

Achọla ka gị na ya na-anọ mgbe niile. Ọ bụrụ na nwoke na nwaanyị alụọ, ha na-aghọ “otu anụ ahụ́” dị ka e si kwuo ya na Baịbụl. (Jenesis 2:24) Ebe ọ bụ na ha abụrụla di na nwunye, e nwere ọtụtụ ihe ndị ha na-emebu mgbe ha ka nọọrọ onwe ha ha hapụrụla; ugbu a, ihe na-echuzi ha ụra bụ ihe gbasara ibe ha. (1 Ndị Kọrịnt 7:32-34) Ma, ọ bụrụ na gị na nwa okorobịa ka malitere ịkpa, ma gị ma ya ekwesịghị iche na unu ga na-anọ mgbe niile. Ọ bụrụ na ị na-achọ ka anya ya dịrị n’ebe ị nọ mgbe ọ bụla, i nwere ike ime ka ọ gbaara gị ọsọ. *

Ihe ụmụ okorobịa kwuru: “Ọ bụrụ na nwa agbọghọ na-achọkarị ịma ihe ọ bụla m na-eme, na-achọkwa ka mụ na ya na-anọ mgbe niile, ma ghara ịna-akpa ndị ọzọ nso, ọ na-adị m ka ọ naghị ekwe m kuru ume.”—Darịn.

“Ọ bụrụ na nwa agbọghọ m ka matara amata na-ezitere m ozi n’ekwe ntị mgbe niile, na-achọ ịma ndị mụ na ha nọ, nke ka nke aha ụmụ agbọghọ so ná ndị mụ na ha nọ, ọ na-agwa m ka m gbawara ya ọsọ.”—Rayan.

“Ọ na-agbakasị nwa okorobịa ahụ́ ma ọ bụrụ na nwa agbọghọ anaghị ekwe ya soro ndị enyi ya nwoke nọrịa, ma ọ bụ na-ewesara ya iwe ma ọ bụrụ na ọ naghị akpọ ya aga ebe ọ bụla ọ na-aga.”—Adrian.

Jiri Onwe Gị Kpọrọ Ihe

O nwere ike ị maara ụmụ agbọghọ ndị ga-eme ihe ọ bụla ha nwere ike ime iji mee ka nwa okorobịa nwewe mmasị n’ebe ha nọ. E nwedịrị ụfọdụ n’ime ha ndị nwere ike ime ihe ha ma na ọ dị njọ naanị ka ha nwee enyi nwoke ma ọ bụkwanụ di. Ma, ihe Baịbụl kwuru na ‘mmadụ ga-aghọrọ mkpụrụ ọ kụrụ,’ dabakwara adaba n’okwu a. (Ndị Galeshia 6:7-9) Ọ bụrụ na i jighị onwe gị kpọrọ ihe, ya abụrụkwa na ị naghị eme ihe ị ma ziri ezi, i nwere ike ịdọta mmasị ụmụ nwoke ndị na-ejighị gị kpọrọ ihe, ndị na-enweghịkwa mmasị ime ihe dị mma.

Nke bụ́ eziokwu bụ na ọ bụghị ụmụ okorobịa niile ga-enwe mmasị n’ebe ị nọ, ọ kakwaara gị mma otú ahụ. Ma ọ bụrụ na ị na-elezi onwe gị anya, na-akpakwa ezigbo àgwà, ị ‘ga-aba uru nke ukwuu n’anya Chineke,’ nwa okorobịa bụ́ ezigbo mmadụ ga-enwekwa mmasị n’ebe ị nọ.—1 Pita 3:4.

Ị gaa n’adres Ịntanet anyị bụ́ www.watchtower.org/ype ị ga-ahụ ihe ndị ọzọ a tụlerela n’isiokwu a bụ́ “Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị”

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 28 Ma, ọ bụrụ na nwoke na nwaanyị ekwela onwe ha nkwa ọlụlụ, ha kwesịrị ịma ije ibe ha.

IHE Ị GA-ECHEBARA ECHICHE

● Olee otú ị ga-esi egosi na ị na-akwanyere nwa okorobịa ùgwù?

● Olee otú ị ga-esi egosi na i ji onwe gị kpọrọ ihe?

[Foto dị na peeji nke 25]

Ịhụnanya na nkwanye ùgwù dị ka ụkwụ abụọ ịnyịnya ígwè na-enwe —ha abụọ bachara uru