Ihe Ezinụlọ Ga-atụle
Ihe Ezinụlọ Ga-atụle
Olee Ihe Ndị Na-ekwesịghị Ịdị n’Ihe Osise A?
Gụọ Ọpụpụ 12:1-8, 17-20, 24-27; Mak 14:12, 22-26; Jọn 13:1, 21-30. Ugbu a, lee anya n’ebe ahụ e sere ndị na-eri Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị. Olee ihe ndị i hụrụ n’ihe osise ahụ nke a na-ekwughị n’akụkọ ahụ? Dee ihe ndị ị chọpụtara n’okpuru ebe a.
1. ․․․․․
2. ․․․․․
3. ․․․․․
IHE A GA-EKWURỊTA:
Gịnị mere Jizọs ji jiri achịcha na-ekoghị eko dochie anya ahụ́ ya? IJI NYERE GỊ AKA: Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 5:6-8; Ndị Hibru 4:14, 15.
GỊNỊ KA Ị MAARA BANYERE EZE SỌLỌMỌN?
4. Ònye bụ mama Sọlọmọn?
IJI NYERE GỊ AKA: Gụọ 2 Samuel 12:24.
․․․․․
5. E wezụga Sọlọmọn, ụmụ nwoke ole ka mama Sọlọmọn mụtaara Devid?
IJI NYERE GỊ AKA: Gụọ 2 Samuel 11:26, 27; 1 Ihe E Mere 3:5.
․․․․․
IHE A GA-EKWURỊTA:
Gịnị mere Sọlọmọn ji nwee amamihe otú ahụ o nwere?
IJI NYERE GỊ AKA: Gụọ 1 Ndị Eze 3:5-14.
Gịnị ka ị ga-eme ka i nwee ike ghọọ onye maara ihe?
SITE NA MAGAZIN A
Zaa ajụjụ ndị a, ma denye amaokwu Baịbụl ndị na-adịghị na ha.
PEEJI NKE 14 Gịnị ka ‘ihe odide ndị dị nsọ’ dị na Baịbụl nwere ike ime? 2 Timoti 3:․․․․․
PEEJI NKE 15 Gịnị ka “nkasi obi sitere n’Akwụkwọ Nsọ” nwere ike ime ka anyị nwee? Ndị Rom 15:․․․․․
PEEJI NKE 21 Ịnọ naanị gị tụgharịa uche n’ihe ụfọdụ na-egosi na i nwewela gịnị? Ilu 1:․․․․․
PEEJI NKE 26 Nwoke na nwaanyị lụọ, gịnị ka ha na-aghọ? Jenesis 2:․․․․․
AZỊZA
1. O kwesịrị ịbụ naanị ndịozi 11 nọ ya, ọ bụghị 12.
2. Achịcha ahụ kwesịrị ịbụ nke na-ekoghị eko.
3. Anụ ahụ kwesịrị ịbụ anụ nwa atụrụ, ọ bụghị anụ ézì.
4. Bat-shiba.
5. E wezụga Sọlọmọn, Bat-shiba mụtaara Devid ụmụ nwoke anọ ọzọ.