Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Jizọs Nyere Ndụ Ya Maka Ọtụtụ Mmadụ

Jizọs Nyere Ndụ Ya Maka Ọtụtụ Mmadụ

Jizọs Nyere Ndụ Ya Maka Ọtụtụ Mmadụ

Jizọs Kraịst gwara ndị na-eso ụzọ ya na ya bịara n’ụwa, “ọ bụghị ka e jeere ya ozi, kama ka o jee ozi, ka o nyekwa mkpụrụ obi ya ka ọ bụrụ ihe mgbapụta n’ọnọdụ ọtụtụ mmadụ.” (Matiu 20:28) O ji obi ya dum chụọ ndụ ya n’àjà ka ọ baara ndị ọzọ uru.

Olee otú ọnwụ Jizọs si bụrụ ihe e ji gbapụta ụmụ mmadụ? Gịnị mere o ji dị mkpa na ọ ga-anwụ? Olee ndị Jizọs nwụrụ maka ha? Oleekwa uru ọnwụ ya baara gị?

Ndịàmà Jehova ji obi ụtọ na-akpọ gị ka ị bịa soro ha chọpụta otú Baịbụl si zaa ajụjụ ndị a. N’afọ a, a ga-echeta ọnwụ Jizọs na Tuzdee, Mach 30, mgbe anyanwụ dachara. N’ụbọchị ahụ, a ga-eji Akwụkwọ Nsọ zaa ajụjụ ndị ahụ a jụrụ.

I nwere ike ịga nke a ga-eme n’Ụlọ Nzukọ Alaeze kacha dịrị gị nso. Biko jụta Ndịàmà Jehova bi n’ógbè gị oge ọ ga-abụ na ebe ọ ga-abụ.