Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Kwụsịnụ Ichegbu Onwe Unu”

“Kwụsịnụ Ichegbu Onwe Unu”

“Kwụsịnụ Ichegbu Onwe Unu”

“Ego niile anyị nwere n’ụlọ akụ̀ gwụrụ, ma nke anyị chekwara n’aha ụmụ anyị. Anyị nọrọ ọtụtụ ọnwa n’enweghị ego na-abata anyị n’aka.”

● Enwere m otu ụlọ akwụkwọ n’otu ime obodo dị n’India. Ụlọ akwụkwọ ahụ na-emekwa nnọọ nke ọma. O nwedịrị oge ụmụ akwụkwọ anyị ruru narị ise. Ka oge na-aga, otu ụlọ akwụkwọ a ma ama nke dị n’otu obodo ukwu dị nso ebe ahụ malitere iji bọs na-abịa n’ime obodo ebe ahụ na-eburu ụmụ akwụkwọ, ha mekwara ka ọ dịrị ụmụ akwụkwọ mfe ịmalite akwụkwọ n’ụlọ akwụkwọ ha. O jughị m anya mgbe ọtụtụ ụmụ akwụkwọ m gafere n’ụlọ akwụkwọ ahụ dị n’obodo ukwu. Nke a mere ka ọnụ ọgụgụ ụmụ akwụkwọ nọ n’ụlọ akwụkwọ m si n’ihe dị ka narị ise gbadaruo ihe dị ka iri isii. Ihe bịara ka njọ mgbe otu onye m binyere ego na-ekweghịzi akwụ m ụgwọ ahụ. Ebe ọ bụ na m nwere ọtụtụ ndị nkụzi na ndị ọrụ ndị ọzọ m na-akwụ ụgwọ, abanyere m n’ụgwọ.

Mụ na ezinụlọ m nọọrọ ala kwurịta nsogbu a. A bịa n’ihe gbasara ego, anyị niile mụtara ịchụ ihe ụfọdụ n’àjà iji nwee ike ime ihe ahụ Jizọs kwuru banyere ‘anya anyị ilegide otu ebe.’ Ihe ọ pụtara bụ na anyị mụtara ikowe akpa anyị ebe aka anyị ga-eru. (Matiu 6:22, 25) O nwedịrị oge anyị kwụsịrị iji ụgbọala anyị aga ebe ọ bụla n’ihi na anyị enweghị ego mmanụ ụgbọala na ego anyị ji elekọta ya. Anyị malitere ịga ahịa n’oge mgbede, mgbe ihe oriri na-adị ọnụ ala. Anyị wetulatakwara aka n’ihe ndị anyị na-eri n’ụbọchị.

Anyị bụ Ndịàmà Jehova, n’ihi ya kwa, anyị maara na ọ dị mkpa ka anyị na Ndịàmà ibe anyị na-ezukọta maka ife Chineke. (Ndị Hibru 10:25) N’ihi ya, n’agbanyeghị na anyị enweghị ego, anyị kpebiri na o nweghị ọmụmụ ihe ma ọ bụ mgbakọ Ndị Kraịst ndị anyị na-enwe a ga-achọ anyị achọ na ya, ọ sọkwa ya ya bụrụ na ebe a na-aga ya dị anya. Anyị na-agakwa ozi ọma na-akụziri ndị mmadụ Baịbụl, mgbe ụfọdụkwa, ọ na-abụ n’ebe dị ezigbo anya. Anyị na-eji otu obere ọgba tum tum aga kama iji ụgbọala. Ọ bụ naanị mmadụ abụọ ka ọgba tum tum ahụ nwere ike ibu.

Ma nke a emeghị ka anyị ghara ịna-agachi ozi ọma anya. Kama nke ahụ, nwunye m na nwa m nwaanyị malitere ịgachikwu ozi ọma anya. Mgbe ụfọdụ, ha na-aga ije ihe ruru kilomita isii ma ọ bụ asatọ iji ruo n’ụlọ ndị nwere mmasị ma kụziere ha Baịbụl. Mụ na nwa m nwoke gbalịkwara hụ na anyị na-ewepụtakwu oge na-aga akụziri ndị mmadụ Baịbụl.

Ihe adịtụrụla anyị mma ugbu a. Ma ihe a mere anyị akụzierela onye ọ bụla n’ezinụlọ anyị na ọ dịghị mma ịtụkwasị obi n’ihe onwunwe. Anyị mụtakwara na ọ baghị uru mmadụ ichegbu onwe ya n’ihe ọ na-agaghị agbanweli. Abụ Ọma 55:22 na-agba anyị ume n’ụzọ pụrụ iche. Ọ sịrị: “Tụkwasị Jehova ibu arọ gị, ya onwe ya ga-akwadokwa gị. Ọ dịghị mgbe ọ ga-ekwe ka onye ezi omume maa jijiji.” N’oge ahụ ụkọ ego ji anyị aka ọjọọ, anyị bịara chọpụta na ihe a Akwụkwọ Nsọ kwuru bụ eziokwu!—Ọ bụ onye na-agụ akwụkwọ anyị detara ya.