Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị Ga-akwụsịli Ya!

Ị Ga-akwụsịli Ya!

Ị Ga-akwụsịli Ya!

OGE eruola mgbe ị ga-enwe “obi ike, meekwa ihe.” (1 Ihe E Mere 28:10) Olee ihe ndị ọzọ ga-enyere gị aka ịkwụsị ịṅụ sịga?

Detuo ụbọchị ọ ga-abụ. Ngalaba Na-ahụ Maka Ahụ́ Ike na Ọdịmma Ọhaneze n’Amerịka tụrụ aro na ọ bụrụ na mmadụ chọrọ ịkwụsị ịṅụ sịga, ụbọchị mbụ onye ahụ ga-akwụsị ya kwesịrị ịbụ n’ime izu abụọ o kpebichara ya. N’oge ahụ, ọ ka ga-adị gị ọkụ n’obi ime ya. Kanye ihe n’ụbọchị ahụ na kalenda gị, gwa ndị enyi gị ihe i kpebiri ime, hụkwa na i bidoro ya n’ụbọchị ahụ i kwuru, ihe ọ sọkwara ya mee.

Dee ihe ndị i kpebiri n’otu kaadị. Ihe ndị i nwere ike ide na kaadị ahụ bụ ihe ndị a e dere n’okpuru ebe a na ihe ọ bụla ọzọ nwere ike ime ka obi sikwuo gị ike ịkwụsị ya:

● Ihe mere i ji chọọ ịkwụsị

● Nọmba ekwe ntị ndị ị ga-akpọ mgbe sịga gụsiwere gị ike

● Ihe ndị ọ ga-abụ i cheta ha enyere gị aka ime ihe i kpebiri, i nwedịrị ike idepụta amaokwu Baịbụl ndị dị ka Ndị Galeshia 5:22, 23

Hụ na ị na-eji kaadị a aga ebe ọ bụla ị na-aga, na-agụkwa ya ugboro ugboro n’ụbọchị. Ị kwụsịgodị ịṅụ sịga, ahapụla kaadị ahụ, na-agụgharị ihe ndị ahụ i dere mgbe ọ bụla sịga gụwara gị.

Aṅụla sịga n’oge ndị i ji aṅụ ya. Tupu ụbọchị ahụ i kpebiri ịkwụsị ịṅụ sịga eruo, gbalịa ka ị ghara ịṅụ sịga n’oge ndị i ji aṅụ ya. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na ọ na-abụ i sihaala n’ụra bilie gị aṅụọ sịga, gbalịa ka ị ghara ịṅụ sịga ruo mgbe ọ gafere otu awa ma ọ bụ karịa. Ọ bụrụ na ọ na-abụ i riwe nri ma ọ bụ i richahaala nri gị aṅụọ sịga, kwụsị ịṅụ ya mgbe ahụ. Agakwala ebe ndị ọzọ na-aṅụ sịga. Mgbe naanị gị nọ, mụwa otú ị ga-esi agwa onye nyere gị sịga, sị: “I meela, agaghị m aṅụ. Akwụsịla m ịṅụ sịga.” I mee ihe ndị a, ha ga-eme ka ị dị njikere maka ụbọchị ahụ i kpebiri ịkwụsị. Ọ ga-emekwa ka i cheta na n’oge na-adịghị anya ị ga-abụzi onye na-aṅụbu sịga.

Ihe ndị ọzọ ị ga-eme. Ka ụbọchị ahụ na-eru nso, zụta ihe ndị ị ga-eji na-atagharị ọnụ, dị ka karọt, chịngọm, ahụekere, na ihe ndị ọzọ. Chetara ndị enyi gị na ndị ezinụlọ gị ụbọchị ọ ga-abụ, gwakwa ha otú ha ga-esi enyere gị aka. Tupu ụbọchị ahụ eruo, tụfuo ihe ndị i ji etinye ntụ sịga, ihe i ji amụnye sịga ọkụ, na ihe ndị ọzọ nwere ike ime ka sịga gụwa gị, dị ka sịga ndị dị n’ụlọ gị, n’ụgbọala gị, n’akpa uwe gị, ma ọ bụkwanụ n’ebe ị na-arụ ọrụ. Nke bụ́ eziokwu bụ na ọ dị mfe iwere sịga i nwere n’ụlọ gị ma ọ bụ n’akpa gị ṅụọ karịa ịgwa enyi gị ka o nye gị sịga ma ọ bụ gịnwa ịga zụrụ ya. Ihe ọzọkwa bụ, na-arịọ Chineke mgbe niile ka o nyere gị aka, kpesiwekwa ekpere ike mgbe ahụ ị kwụsịrị ịṅụ sịga ka ị ghara ịlaghachi na ya ọzọ.—Luk 11:13.

E nweela ọtụtụ ndị ha na sịga, bụ́ enyi adịgboroja, nke na-egbu mmadụ, mechara “see okwu.” Ị ga-emelikwa ya. I mee ya, ahụ́ ga-esikwu gị ike, ị ga-enwerekwa onwe gị ma kwụsị ịbụ ohu sịga.

[Foto dị na peeji nke 9]

Na-eji kaadị ahụ i dere ihe ndị i kpebiri na-aga ebe ọ bụla ị na-aga, na-agụkwa ya ugboro ugboro n’ụbọchị