Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Mere M Ga-eji Na-elebara Onwe M Anya?

Gịnị Mere M Ga-eji Na-elebara Onwe M Anya?

Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị

Gịnị Mere M Ga-eji Na-elebara Onwe M Anya?

Kanye ✔ na nke ọ bụla ị ga-achọ ime.

Ifelatatụ

Ime ka akpụkpọ ahụ́ m dịkwuo mma n’anya

Inwekwu ike

Ịdịkwu garagara

Ịkwụsịlata ichegbu onwe m

Ịkwụsị iwe oké iwe

Obi isikwu m ike

E NWERE ihe ụfọdụ gịnwa bụ́ onye na-eto eto na-agaghị ejili aka gị ahọrọ. Ụfọdụ n’ime ha bụ ndị ga-abụ ndị mụrụ gị, ụmụnne gị, na ebe ị ga-ebi. Ma, okwu banyere ahụ́ ike gị dị iche. Ihe nwere ike ikpebi ma ahụ́ ọ̀ ga-adị gị mma ma ọ bụ na ọ gaghị adị gị mma bụ ihe ndị i ketara n’aka ndị mụrụ gị nakwa otú ị họọrọ isi na-ebi ndụ. *

I nwere ike ikwu, sị: ‘Ma o rubeghị oge m ga-echewe maka ahụ́ ike m.’ Ì chere na oge erubeghị n’eziokwu? Legodị anya ná mgbago ebe ahụ e dere ihe ndị ị ga-achọ ime. Ole n’ime ha ka ị kanyere ihe? Nke bụ́ eziokwu bụ na tupu i nwee ike ime ihe ndị ahụ, ị ga-enwe ezigbo ahụ́ ike.

N’eziokwu, i nwere ike ịna-eche ụdị ihe Amber, * onye dị afọ iri na asaa, na-eche. Ọ sịrị: “O nweghị otú m ga-esi na-eri naanị nri e ji ọka wit mee, nri mmanụ na-adịghị ma ọ bụdị nri shuga na-adịghị!” Ọ bụrụ ụdị ihe a ka ị na-eche, wetuo obi. Na ahụ́ kwesịrị ịdị gị mma apụtaghị na ihe gbasara ahụ́ ike gị ga na-agba gị ara, ọ pụtaghịkwa na ị ga-akwụsị iri ihe ọ bụla na-atọ ụtọ ma ọ bụ na-agba ọsọ ọtụtụ kilomita kwa izu. Nke bụ́ eziokwu bụ na naanị ihe ole na ole ka ọ ga-abụ i mewe, gị adịwakwuo mma n’anya, obi ana-adịkwu gị ụtọ, gị adịwakwuokwa garagara. Ka anyị hụ otú ụfọdụ ndị ọgbọ gị si mee ya.

Na-eri Ihe Ndị I Kwesịrị Iri, Ị Ga-adịkwu Mma n’Anya!

Baịbụl kwuru ka anyị na-emeru ihe n’ókè. Ilu 23:20 sịrị: ‘Eribigala nri ókè.’ (Baịbụlụ Nsọ nke International Bible Society) Ọ bụghị mgbe niile ka ọ na-adị mfe ime ihe a e kwuru ebe a.

“Agụụ na-agụkarị m otú o si agụkarị ndị na-eto eto ndị ọzọ. Ndị mụrụ m na-ekwudị na afọ m bụ olulu na-anaghị eju eju!”—Andrew, ọ dị afọ iri na ise.

“Ebe ọ bụ na o nwebeghị ihe ọjọọ m chọpụtara nri ụfọdụ m na-eri na-eme m ugbu a, ọ na-esiri m ike ikweta na ha adịghị m mma n’ahụ́.”—Danielle, ọ dị afọ iri na itoolu.

Ì kwesịrị ịgbalịsikwu ike ka ị ghara ịna-eri oké nri? Lee ihe ụfọdụ ndị na-eto eto ibe gị kwuru na-enyere ha aka.

Mara mgbe afọ juru gị. Julia, onye dị afọ iri na itoolu, sịrị: “Mgbe mbụ, m na-erife nri ókè ma ọ bụrụhaala na nri ahụ agaghị eme ka m buo ibu. Ma ugbu a, ọ bụ mgbe afọ juru m ka m na-akwụsị iri nri.”

Erila nri ndị na-anaghị edozi ahụ́. Peter, onye dị afọ iri abụọ na otu, sịrị: “Naanị n’ime otu ọnwa m kwụsịrị ịṅụ mmanya ọtọ bịrịbịrị, efelatara m!”

Kwụsị irife nri ókè. Erin, onye dị afọ iri na itoolu, sịrị: “Ana m agbalị ka m ghara ịga kurukwuo nri mgbe m maara na afọ ejula m.”

Ihe Ga-enyere Gị Aka: Ebula ọnụ! I buo ọnụ, agụụ ga-agụsi gị ike, mee ka i rifee nri ókè ma i bido iri nri.

Na-emegakwu Ahụ́, Ahụ́ Ga-adịkwu Gị Garagara!

Baịbụl sịrị: ‘Ọzụzụ nke ahụ́ bara uru.’ (1 Timoti 4:8) Ma o yiri ka ọtụtụ ndị na-eto eto anaghị enwecha mmasị imega ahụ́.

“Mgbe m nọ n’ụlọ akwụkwọ sekọndrị, mmega ahụ́ so n’ule ndị anyị na-ele. Ma ọtụtụ ụmụ akwụkwọ anyị na-ada ya. Amaghị m ihe mere ha ji ada ya, n’ihi na mmega ahụ́ dị mfe ka iri nri ehihie!”—Richard, ọ dị afọ iri abụọ na otu.

“Ihe ụfọdụ ndị na-eche bụ, ‘Gịnị mere m ga-eji na-agbagharị n’èzí mgbe anwụ na-acha, ọsụsọ agbazuo m ahụ́, ike agwụkwa m, ebe m nwere ike ịnọ n’ime ụlọ na-egwu egwuregwu vidio, nke na-eme ka ọ dị m ka m̀ so ná ndị ahụ nọ na vidio ahụ?’”—Ruth, ọ dị afọ iri abụọ na abụọ.

Ọ̀ na-abụ e kwute okwu “imega ahụ́” ike agwụ gị? Ọ bụrụ na ọ na-adị gị otú ahụ, lee uru atọ ị ga-erite ma ị na-emega ahụ́ mgbe niile.

Uru nke mbụ. Imega ahụ́ na-eme ka ahụ́ gị na-alụsokwu ọrịa ọgụ. Rachel, onye dị afọ iri na itoolu, sịrị: “Papa m na-ekwukarị sị, ‘Ọ bụrụ na ị gaghị ewepụtali oge maka imega ahụ́, jikerekwa iwepụta oge maka ịrịa ọrịa.’”

Uru nke abụọ. Imega ahụ́ na-eme ka ahụ́ ruo gị ala. Emily, onye dị afọ iri na isii, sịrị: “Ịgba ọsọ na-eme ka ahụ́ ruo m ala mgbe m nwere ọtụtụ ihe m na-eche. Ahụ́ na-adị m mma, obi na-adịkwa m ụtọ.”

Uru nke atọ. Imega ahụ́ na-eme ka ị na-emekwu ihe ndị na-atọ gị ụtọ omume. Ruth, onye dị afọ iri abụọ na abụọ, sịrị: “Mmega ahụ́ ndị a na-eme n’èzí na-atọ m ụtọ. N’ihi ya, mmega ahụ́ ndị m na-eme bụ ịga ije, igwu mmiri, na ịgba ịnyịnya ígwè.”

Ihe Ga-enyere Gị Aka: Wepụta ọ dịkarịa ala nkeji iri abụọ, ugboro atọ kwa izu, na-eme ụdị mmega ahụ́ ọ bụla na-amasị gị, nke ga-emekwa ka ọsụsọ na-agba gị nke ọma.

Na-ehi Ụra nke Ọma, Ị Ga Na-emetakwu Ihe Ndị Ị Na-eme!

Baịbụl sịrị: “Obere ezumike dị mma karịa ịrụsi ọrụ ike gabiga ókè na ịchụso ifufe.” (Ekliziastis 4:6) Ọ bụrụ na ị naghị ehi ụra nke ọma, ị gaghị na-emetazi ihe ndị ị ma eme nke ọma!

“Ọ bụrụ na arahụghị m ụra nke ọma, o nweghị ihe m na-emeli. Ọ na-esi ike obi m adị n’ihe ọ bụla m na-eme!”—Rachel, ọ dị afọ iri na itoolu.

“Elekere abụọ nke ehihie kụhaala, ike na-agwụ m nke ukwuu nke na ọ na-afọ obere ka ụra buru m mgbe mụ na mmadụ na-ekwu okwu!”—Kristine, ọ dị afọ iri na itoolu.

Ì kwesịrị ịna-ehikwu ụra? Lee ihe ụfọdụ ndị na-eto eto ibe gị merela.

Na-alakpu n’oge. Catherine, onye dị afọ iri na asatọ, sịrị: “M na-agbalị ka m na-alakpu n’oge.”

Ekwela ka ndị enyi gị na-akpọ gị n’ime abalị. Richard, onye dị afọ iri abụọ na otu, sịrị: “Mgbe ụfọdụ, ndị enyi m na-akpọ m n’ime ime abalị ma ọ bụ zitere m ozi n’ekwe ntị, ma ugbu a, amụtala m ịgwa ha ka ọ dị mgbe ọzọ ka m nwee ike hie ụra.”

Nwee oge i ji ehi ụra. Jennifer, onye dị afọ iri abụọ, sịrị: “Na nso nso a, ana m agbalị kwa ụbọchị ịhụ na m hiri ụra n’oge m kpebiri iji na-ehi ụra ma teta n’oge m kpebiri iteta.”

Ihe Ga-enyere Gị Aka: Gbalịa ka ị na-ehiru ụra awa asatọ ma ọ bụ awa iri n’abalị ọ bụla.

N’ime ihe atọ a kọwara n’isiokwu a, olee nke ị ga-achọ ilebara anya ná ndụ gị?

nri mmega ahụ́ ụra

N’okpuru ebe a, dee ihe ị ga-eme iji hụ na i mewere nke ọma na nke ị kanyere ihe.

․․․․․

E nwere ọtụtụ uru ị ga-erite ma i mee ihe ole na ole iji lebara onwe gị anya. Cheta na ọ bụrụ na ahụ́ siri gị ike, ị ga-adịkwu mma n’anya, obi ga na-adịkwu gị ụtọ, ị ga na-emetakwukwa ihe ndị ị na-eme. Okwu gbasara ahụ́ ike gị adịghị ka ihe ụfọdụ ị na-agaghị ejili aka gị kpebie otú ọ ga-adị, kama ọ bụ ihe ị ga-ekpebili otú ọ ga-adị. Erin, onye dị afọ iri na itoolu, sịrị: “Mee elu mee ala, ọ bụ naanị gị ga-ekpebi otú ahụ́ ga-adị gị.”

Ị gaa n’adres Ịntanet anyị bụ́ www.watchtower.org/ype ị ga-ahụ ihe ndị ọzọ a tụlerela n’isiokwu a bụ́ “Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị”

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 11 Anyị maara na e nwere ọtụtụ ndị na-arịa ọrịa ma ọ bụ ndị nwere nkwarụ, ma o nweghị ihe ha nwere ike ime banyere ya. Isiokwu a ga-enyere ndị dị otú ahụ aka inwetụ ezigbo ahụ́ ike otú ike kwere ha.

^ par. 13 Aha a kpọrọ ụfọdụ ndị n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.

IHE Ị GA-ECHEBARA ECHICHE

● Olee otú ilebara onwe gị anya ga-esi enyere gị aka inwe obi ike?

● Olee otú i nwere ike isi gosi na i nwere ezi uche ma a bịa n’ihe banyere ahụ́ ike gị?—Ndị Filipaị 4:5.

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 22]

IHE NDỊ NA-ETO ETO IBE GỊ KWURU

“Ahụ́ mmadụ dị ka ụgbọala—ọ bụ onye nwe ya ka ọ dịịrị ilebara ya anya. O so n’ihe mere imega ahụ́ ji atọ m ụtọ.”

“I nwee onye gị na ya na-eso emega ahụ́, ọ ga-eme ka ike ghara ịgwụ gị ịga n’ihi na ị gaghị achọ ịgwa onye ahụ na ị chọghị ịga ma ọ pụta ka unu gawa.”

“Otú ahụ́ na-adị m ma m megachaa ahụ́ na-atọ m ụtọ. M bido dịwakwuo mma n’anya n’ihi na m na-emega ahụ́, obi na-esikwu m ike!”

[Foto]

Ethan

Briana

Emily

[Igbe dị na peeji nke 23]

“AGBANWERE M OTÚ M SI EBI NDỤ”

“Mgbe m dị ihe dị ka afọ isii, ebuturu m ibu. Ma n’ihi na a na-azụnyekarị m nri ratụ ratụ iji mee m obi ụtọ, iri nri ratụ ratụ jizi nwayọọ nwayọọ mara m ahụ́! Anaghịkwanụ m arụ ọrụ sitụrụ ike n’ihi na ịrụ ọrụ siri ike anaghị amasị m. Tupu m mara ihe na-eme, aghọọla m akpa akpụ, bụ́kwanụ ihe m na-achọghị. Otú m dị na otú ahụ́ m si anyị m arọ mere ka obi na-ajọ m njọ! O nwere oge m riwere ụdị nri ụfọdụ ga-enyere m aka ifelata, ma e meekwa mụ ebughachi ibu. Nke a mere na mgbe m dị afọ iri na ise, ekpebiri m na m ga-eme ihe banyere ibu m. Achọrọ m ka ihe m ga-eme iji felata bụrụ ihe na-agaghị akpatara m nsogbu n’ahụ́, nakwa ihe ga-enyere m aka ka m ghara ibukwa ibu ọzọ. Azụtara m otu akwụkwọ kọwara nri ndị dị mma mmadụ kwesịrị iri na otú mmadụ ga-esi na-emega ahụ́, ebidokwara m mewe ihe ndị m na-agụta n’akwụkwọ ahụ. Agwara m onwe m na ọ bụrụgodị na e nwee ihe mere ka m kwụsịtụ ime ihe ndị ahụ ma ọ bụ e nwee ihe kụdara m mmụọ, agaghị m akwụsị. Ị̀ ma ihe merenụ? Efelatara m! N’ime otu afọ, esepụrụ m kilogram iri abụọ na ise. Afọ abụọ agaakwala kemgbe ahụ, ebughachibeghị m ibu ọzọ. Ọ dịghị mgbe m kwetara na m ga-emecha felata! Ana m eche na ihe mere m ji melie ya abụghị naanị n’ihi na eriwere m ụdị nri m kwesịrị iri kama ọ bụ n’ihi na agbanwere m otú m si ebi ndụ. Ọ bụ ozugbo m ghọtara na e nwere ọtụtụ uru ifelata ga-abara m ka m bidoro gbalịwa ime mgbanwe ndị ọ dị mkpa ka m mee.”—Catherine, ọ dị afọ iri na asatọ.

[Foto dị na peeji nke 23]

Ahụ́ gị dị ka ụgbọala—ọ bụrụ na i lebaraghị ya anya nke ọma, ọ ga-akwụsị ịrụ ọrụ