Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ka Otú Ahụ́ Gị Na-acha Dị Gị Mma

Ka Otú Ahụ́ Gị Na-acha Dị Gị Mma

Ka Otú Ahụ́ Gị Na-acha Dị Gị Mma

● Ụfọdụ ndị n’Afrịka, n’Ebe Ndịda Eshia, ná mba ndị dị n’akụkụ oké osimiri Karibian, nakwa ná mba ụfọdụ ndị dị n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Oké Osimiri Mediterenian na-ewere onye akpụkpọ ahụ́ ya dị ọcha ka onye bara ọgaranya na onye ma ebe a nọ. N’ihi nke a, ọtụtụ ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị nọ ná mba ndị a na-ete ude ndị ga-eme ka akpụkpọ ahụ́ ha chawa ọcha—ma mgbe ụfọdụ ọ na-akpatara ha ọrịa.

A na-etinye ihe na-achagharị akpụkpọ ahụ́, a na-akpọ hydroquinone, n’ime ụfọdụ ude ndị na-eme ka mmadụ chawa ọcha. Ma ihe a na-achagharị akpụkpọ ahụ́ na-eme ka akpụkpọ ahụ́ kwụsị ịna-emepụta ihe na-echebe ya ka anwụ ghara imebi ya. Ọ na-abanye n’ime akpụkpọ ahụ́, o nwekwara ike imebi ihe a na-agaghị emeziteli ọzọ n’ahụ́ mmadụ. Nke a nwere ike ime ka akpụkpọ ahụ́ mmadụ yie nke onye kara nká. O nwekwara ike ịkpatara mmadụ ọrịa kansa. A na-ejikwa ihe a na-akpọ mekuri eme ude ụfọdụ, ma ọ na-akpatakwara mmadụ ọrịa.

Ọ bụrụ na mmadụ na-etekarị ude na-achagharị akpụkpọ ahụ́, o nwere ike ịgha ya ọkọ ndị gbara okpotokpo n’ahụ́, mee ka e nwee ebe ndị chagharịrị achagharị n’akpụkpọ ahụ́ ya, ma ọ bụ mee ka ahụ́ onye ahụ dị pekepeke, nke na a waa ya ahụ́, ọ gaghị ekwe ndụchi. Ọ bụrụkwa na ihe ndị e ji mee ude ndị a abanye n’ọbara mmadụ, o nwere ike imebi imeju, akụrụ, ma ọ bụ ụbụrụ onye ahụ. O nwedịrị ike ime ka ihe ndị ọzọ dị mkpa n’ime ahụ́ kwụsị ịrụ ọrụ.

Ọ bụ ihe na-eju anya na ka ụfọdụ ndị dị ojii na-ete ihe ga-eme ka ha chaa ọcha, ọtụtụ ndị dị ọcha na-agbalịsi ike ịhụ na akpụkpọ ahụ́ ha gbajiri. N’eziokwu, ọ dịghị njọ ma obere anwụ chasa mmadụ. Dị ka ihe atụ, o nwere ike ime ka ahụ́ mepụtakwuo vitamin D. Ma mmadụ ịnọte aka n’anwụ, karịchaa ịnọ ya mgbe anwụ na-achasi ike, nwere ike imebi ihe n’akpụkpọ ahụ́ ya. Nke bụ́ eziokwu bụ na akpụkpọ ahụ́ gbajie, ọ na-egosi na e nweela ihe mebiri na ya, na-egosikwa na akpụkpọ ahụ́ na-agbalị ichebe onwe ya ka anwụ na-achasa ya ghara imebikwu ihe. Ma otú ahụ o si gbajie agaghị echebe akpụkpọ ahụ́ ruo ebighị ebi. Ọ bụ eziokwu na ọ na-enye aka ma mmadụ na-etekarị ude ndị na-echebe akpụkpọ ahụ́ ka anwụ ghara imebi ya, anyị kwesịkwara icheta na ude ndị ahụ anaghị echebecha akpụkpọ ahụ́, ọ naghịkwa egbochi ọrịa kansa ụfọdụ na-eme n’akpụkpọ ahụ́, ma ụdị nke nwere ike ime ka akpụ̀ gbapụta mmadụ n’ahụ́.

Ọ bụ nke a mere Ngalaba Òtù Mba Ụwa nke Na-ahụ Maka Ahụ́ Ike ji kwuo na ihe dị mkpa bụ “ịkụziri ndị mmadụ ka otú ahụ́ ha na-acha dị ha mma,” n’ihi na ọ bụ ya “ga-eme ka ndị mmadụ ghọta mkpa ọ dị ichebe onwe ha ka anwụ ghara imebi akpụkpọ ahụ́ ha.” Ma ebe ndị maara ihe n’ezie na-elekwasị anya bụ n’idozi ihe Baịbụl kpọrọ “mmadụ zoro ezo nke dị n’ime obi,” nke bụ́ ihe a ga-emeli ka ọ ka mma, n’ihi na ọ dịghị ka akpụkpọ ahụ́ nkịtị nke a na-enweghị ike ime ka ọ ka mma ma ọ kahaala nká.—1 Pita 3:3, 4; Ilu 16:31.