Kpebisie Ike na Ị Ga-akwụsị Ya
Kpebisie Ike na Ị Ga-akwụsị Ya
“Ihe mbụ kacha mkpa ndị kwụsịrịla ịṅụ sịga mere bụ ikpebisi ike na ha ga-akwụsị ya.”—Akwụkwọ bụ́ “Stop Smoking Now!” (Kwụsị Ịṅụ Sịga Ugbu A)
IHE akwụkwọ a na-ekwu bụ na ị chọọ ịkwụsị ịṅụ sịga, ma ọ́ dịghị ihe ọzọ, i kwesịrị ikpebisi ike na ị ga-akwụsị ya. Gịnị ga-enyere gị aka ikpebisi ike ịkwụsị ya? Ma é nweghị ihe ọzọ, chegodị uru ọ ga-abara gị ma ị kwụsị ịṅụ sịga.
Ị gaghị na-emefusị ego gị. Onye na-aṅụ otu mkpọ sịga n’ụbọchị na-emefu ihe karịrị iri puku naịra isii n’afọ. “Amaghịdị m na m na-emefu nnukwu ego na sịga.”—Gyanu, onye bi na Nepọl.
Ọ ga-eme ka i nwekwuo obi ụtọ ná ndụ gị. “Ọ bụ mgbe m kwụsịrị ịṅụ sịga ka ndụ m bidoro tọwa m ụtọ, ndụ m nọkwa na-aka mma kemgbe ahụ.” (Regina, onye bi na Saụt Afrịka) Mmadụ kwụsị ịṅụ sịga, ọ ga-abịa nụwakwuo ụtọ nri ma nụwakwuo ísì ihe. Onye ahụ na-amalitekwa nwewekwuo ume ma na-adịkwu mma n’anya.
Ahụ́ ga-adịkwu gị mma. “Ịkwụsị ịṅụ sịga na-eme ka ahụ́ bido ozugbo dịwa ndị na-aṅụbu ya ezigbo mma, ma ụmụ nwoke ma ụmụ nwaanyị, n’agbanyeghị afọ ole ha dị.”—Ụlọ Ọrụ Na-ahụ Maka Ịchịkwa na Igbochi Ọrịa n’Amerịka.
Ị ga na-ejikwu aka gị ekpebi ihe ị ga-eme. “Ihe mere m ji kwụsị ịṅụ sịga bụ na achọghị m ka sịga na-atụrụ m ụka. Achọrọ m ka ọ bụrụ m na-agwa onwe m ihe m ga-eme.”—Henning, onye bi na Denmak.
Ọ ga-abara ndị ezinụlọ gị na ndị enyi gị uru. “Ịṅụ sịga . . . na-akpatara ndị na-anọ gị nso ọrịa. . . . Nchọpụta ndị e mere na-egosi na ọrịa kansa akpa ume na ọrịa obi na-egbu ọtụtụ puku mmadụ kwa afọ n’ihi anwụrụ ọkụ sịga ha kutere mgbe ndị ọzọ na-aṅụ ya.”—Òtù Na-ahụ Maka Ọrịa Kansa n’Amerịka.
Ị ga-eme ihe dị Onye kere gị mma. “Ndị m hụrụ n’anya, ka anyị sachapụ onwe anyị mmerụ niile nke anụ ahụ́.” (2 Ndị Kọrịnt 7:1) “Nyefee Chineke ahụ́ unu dị ka àjà . . . dị nsọ, nke dị Chineke mma.”—Ndị Rom 12:1.
“Ozugbo m ghọtara na Chineke achọghị ka anyị na-eme ihe ọ bụla ga-emebi ahụ́ anyị, ekpebiri m na agaghị m aṅụkwa sịga.”—Sylvia, onye bi na Spen.
Ma ọ bụghị mgbe niile ka mmadụ ikpebisi ike na ya chọrọ ịkwụsị ịṅụ sịga na-eme ka onye ahụ kwụsị ya. O nwekwara ike ịdị mkpa ka ndị ọzọ nyere onye ahụ aka, ma ndị ezinụlọ ya ma ndị enyi ya. Olee otú ha nwere ike isi nye aka?