Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Nọrọ Jehova Nso!”

“Nọrọ Jehova Nso!”

Mgbakọ Distrikti

“Nọrọ Jehova Nso!”

nke Ndịàmà Jehova

● A ga-enwe ọtụtụ puku mgbakọ ụbọchị atọ a n’obodo dị iche iche n’ụwa niile. Na Naịjirịa, ọ ga-amalite n’Ọktoba 1-3. A ga-eji abụ olu ụtọ malite ihe omume ụbọchị ọ bụla ma o jiri nkeji iri abụọ gafee elekere itoolu nke ụtụtụ. Isiokwu nke ụbọchị Fraịdee bụ “Ịbịaru Chineke Nso Dị M Mma,” o si n’Abụ Ọma 73:28. Onyeisi oche mgbakọ kwuchaa okwu mmeghe, isiokwu ndị ọzọ a ga-ekwu bụ “Mgbakọ Distrikti Na-enyere Anyị Aka Ịnọ Jehova Nso” na “Ọkpara Ya Chọrọ Ikpughe Ya.” E kwuchaa ha, a ga-enwe okwu mmadụ anọ ga-ekwu, nke bụ́ “Ṅomie Ndị Ha na Jehova Nwere Mmekọrịta Chiri Anya.” Okwu a ga-atụle otú Jehova na Ebreham, Rut, Hezekaya, na Meri si nwee mmekọrịta chiri anya. A ga-eji okwu bụ́ isi, nke isiokwu ya bụ “Otú Jehova Si Abịaru Anyị Nso,” mechie nnọkọ ụtụtụ.

Isiokwu nke okwu mbụ a ga-ekwu n’ehihie Fraịdee bụ “Azịza nke Ajụjụ Ndị Metụtara Jehova.” Okwu ndị ga-eso ya bụ “Kwe Ka Ịdọ Aka ná Ntị Jehova Na-akpụzi Gị” na “Ya Adịla Mgbe Ị ‘Ga-eweso Jehova Oké Iwe.’” Okwu ọzọ ga-eso bụ okwu mmadụ ise ga-ekwu nke isiokwu ya bụ “Mkparịta Ụka Na-enyere Ezinụlọ Aka Ịnọ Jehova Nso.” Isiokwu ise a ga-ekwu n’isiokwu a bụ: “Jehova Bụ Onye Ya na Ndị Ọzọ Kacha Akparịta Ụka” “Ndị Bụ́ Di, Unu na Ndị Nwunye Unu Na-akparịta Ụka!,” “Ndị Bụ́ Nwunye, Unu na Ndị Di Unu Na-akparịta Ụka!,” “Ndị Mụrụ Ụmụ, Unu na Ụmụ Unu Na-akparịta Ụka!,” nakwa “Ụmụ, Unu na Ndị Mụrụ Unu Na-akparịta Ụka!” Isiokwu nke okwu ikpeazụ n’ehihie Fraịdee bụ “Ihe Ndị E Kere Eke Na-eme Ka A Mata ‘Chineke Dị Ndụ!’”

Isiokwu nke ụbọchị Satọdee bụ “Ya na Ndị Na-eme Ihe n’Eziokwu Na-enwe Mmekọrịta Chiri Anya,” o si n’Ilu 3:32. N’isiokwu mmadụ ise ga-ekwu, nke bụ́ “Nyere Ndị Mmadụ Aka ‘Ka Ha na Chineke Dị ná Mma,’” a ga-ekwu isiokwu ndị a: “Ndị E Kewapụrụ Ekewapụ na Ndị Na-enweghị Olileanya,” “Ọ Jụrụ Ha, Sị,” “Na-enyere Onye Gị na Ya So Gaa Ozi Ọma Aka,” “Jiri Omume Ọma Gị Rite Ha n’Uru,” nakwa “Jiri Ịnụ Ọkụ n’Obi Nọgidesie Ike ná Mbọ Ị Na-agba.” E kwuchaa okwu abụọ bụ́ “Ozi Oge Niile Ga-eme Ka Gị na Jehova Dịkwuo ná Mma” na “Ọ Dịghị Ihe Na-eme Ka Ndị Hụrụ Jehova n’Anya Sụọ Ngọngọ,” a ga-eji okwu baptizim pịachie nnọkọ ụtụtụ ahụ. E kwuchaa ya, e mezie ndị ruru eru ka e mee ha baptizim baptizim.

N’ehihie Satọdee, a ga-enwe okwu mmadụ asatọ ga-ekwu nke isiokwu ya bụ, “Ekwela Ka Ihe Ọ Bụla Mee Ka Ị Ghara Ịnọ Jehova Nso”—“Ụzọ Aghụghọ Dị Iche Iche nke Setan,” “Nganga,” “Ego,” “Ahụ́ Ike,” “Ọrụ,” “Ntụrụndụ,” “Ezinụlọ,” na “Nkà na Ụzụ.” Nke a gachaa, a ga-enwe ihe nkiri a ga-ege ege nke isiokwu ya bụ “Adakwala Mbà Mgbe Jehova Na-abara Gị Mba!” A ga-eji isiokwu bụ́ “Nọrọ Jehova Nso Dị Ka Jeremaya Mere” pịachie nnọkọ ehihie Satọdee.

Isiokwu ụbọchị Sọnde bụ “Ọ Bụ Jehova . . . Ka Unu Ga-arapara n’Ahụ́,” o si na Jọshụa 23:8. A bụchaa abụ ụtụtụ ma kpee ekpere mmeghe, a ga-enwe okwu mmadụ asatọ ga-ekwu, nke isiokwu ya bụ “Ịghọta Àgwà Ọma Jehova.” N’okwu a, a ga-akọwa àgwà asatọ n’ime àgwà ọma ndị Jehova nwere, ha bụ, “Ọ Na-adị Mfe Ịbịakwute Ya,” “O Nwere Ọmịiko,” “O Ji Anyị Kpọrọ Ihe,” “Ọ Na-emesapụ Aka,” “Ọ Naghị Ele Mmadụ Anya n’Ihu,” “Ọ Na-agbaghara Mmehie,” “O Nwere Ezi Uche,” na “Ọ Na-eguzosi Ike n’Ihe.”E kwuchaa ha, ihe ga-esochi bụ okwu ihu ọha nke isiokwu ya bụ “Olee Otú Ị Ga-esi Abịaru Chineke Nso?” A ga-eji nchịkọta Ụlọ Nche nke a ga-amụ n’izu ahụ mechie nnọkọ ụtụtụ.

Ihe omume pụrụ iche a ga-eme n’ehihie Sọnde bụ ihe nkiri a ga-eyi uwe ihe nkiri mee, bụ́ nke a ga-egosi ihe ndị mere na narị afọ mbụ. Ihe nkiri a bụ banyere otú Ndị Kraịst si gbapụ na Jeruselem. Isiokwu ya bụ “Na-eje Ije n’Okwukwe, Ọ Bụghị n’Ihe Anya Na-ahụ.” Ihe nkiri ahụ gachaa, a ga-eji okwu bụ́ “Nọgide ‘n’Ebe Nzuzo nke Onye Kasị Elu’” mechie mgbakọ ahụ.

Bido ugbu a mewe ndokwa ịga mgbakọ a. Ị chọọ ịmata ebe kacha dịrị gị nso a ga-enwe mgbakọ a, jụọ Ndịàmà Jehova nọ n’ógbè gị ma ọ bụ detara ndị na-ebipụta magazin a akwụkwọ ozi ka ha gwa gị. E depụtara ebe ndị a ga-enwe mgbakọ a na Naịjirịa n’adres Ịntanet anyị bụ́ www.pr418.com.