Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Ihe M Ga-eme Ka M Ghara Imefusị Ego?

Olee Ihe M Ga-eme Ka M Ghara Imefusị Ego?

Echiche Baịbụl

Olee Ihe M Ga-eme Ka M Ghara Imefusị Ego?

“Ọ bụ eziokwu na anaghịzi m akpata ego buru ibu, ma ihe ndị m na-akwụ ụgwọ ha nọ na-akarịkwu. Ọtụtụ mgbe, ana m amụ anya n’abalị na-eche otú m ga-esi gbooro ezinụlọ m mkpa ha.”—James.

“Ọ na-adị m ka m̀ bu ibu chọrọ ịnyịgbu m, o nweghịkwa ihe m maara m ga-eme eme.”—Sheri.

A NA-ANỤKARỊ ka ndị mmadụ na-ekwu ụdị ihe ndị a mgbe ụkọ ego dị. Mgbe Juan Somavia, bụ́ nnukwu onyeisi oche nke Ụlọ Ọrụ Na-ahụ Maka Ndị Ọrụ n’Ụwa Niile, na-ekwu okwu ná nsogbu e nwere n’akụnụba ọtụtụ mba ụwa n’oge na-adịbeghị anya, ọ sịrị: “Ihe a abụghị nsogbu metụtara naanị mba Amerịka, ọ bụ nsogbu zuru ụwa ọnụ.”

Mgbe a chụrụ mmadụ n’ọrụ ma ọ bụ mgbe mmadụ na-enweghịzi ego ọ ga-eji gboo mkpa ezinụlọ ya, o nwere ike ịkpatara onye ahụ oké echiche ma ọ bụdị mee ka ike ụwa gwụ ya. O nwere oge ọ dị Devid, bụ́ onye so dee Baịbụl, otú ahụ. O kpere ekpere, sị: “Ihe na-enye m nsogbu n’obi adịwo ọtụtụ; mee ka m si ná nsogbu m nọ na ya pụta.” (Abụ Ọma 25:17) Gịnị ka Baịbụl kwuru banyere oge anyị a? Ihe ndị e ji ike mmụọ nsọ dee na Baịbụl ò nwere ike inyere anyị aka n’oge a ụkọ ego dị ma mee ka obi ruo anyị ala?

Ndụmọdụ Ndị Ga-enyere Anyị Aka n’Oge Ihe Siri Ike

Baịbụl buru amụma na ihe ndị a ga-eji mara na anyị nọ “n’oge ikpeazụ” nke ụwa a bụ na a ga-enwe “ihe ụfụ nke nhụjuanya” nakwa “oge dị oké egwu, nke tara akpụ.” (2 Timoti 3:1; Matiu 24:8) Anyị ahụla na ihe ndị a e kwuru na Baịbụl na-emezu! Ma olileanya ka dị, n’ihi na Chineke enyela anyị ndụmọdụ ndị ga-abara anyị uru na Baịbụl, bụ́ ndị ga-enyere anyị aka n’oge a ụkọ ego dị.

Dị ka ihe atụ, Baịbụl na-enyere anyị aka ile ego anya otú kwesịrị ekwesị. Ekliziastis 7:12 na-agụ, sị: “Amamihe bụ ihe nchebe, dịkwa ka ego bụ ihe nchebe; ma ihe ihe ọmụma ji ka mma bụ na amamihe na-echebe ndị nwe ya ndụ.” N’eziokwu, ego nwere ike ichebe mmadụ, ma amamihe Chineke, bụ́ nke dị na Baịbụl, na-echebe mmadụ nke ọma mgbe niile. Ka anyị leba anya n’ihe atụ ụfọdụ.

Ihe Ndị Na-enye Aka n’Oge Ụkọ Ego

Na-arụsi ọrụ ike. “Ihe na-agụ onye umengwụ, ma ọ dịghị ihe mkpụrụ obi ya nwere. Ma, a ga-eme ka mkpụrụ obi onye dị uchu maa abụba.” (Ilu 13:4) Gịnị ka ihe a e kwuru na-akụziri anyị? Gosi na ị bụ onye na-arụsi ọrụ ike na onye na-akwụwa aka ọtọ. Ndị na-ewe mmadụ n’ọrụ anaghị eji ndị na-arụsi ọrụ ike egwu egwu, o yikwara ka ọ̀ na-abụkarị ha ka a na-ebu ụzọ ewe n’ọrụ, anaghịkwa achụkarị ha n’ọrụ.—Ndị Efesọs 4:28.

Kowe akpa gị ebe aka gị ga-eru. Jizọs sịrị: “Ọ̀ dị onye n’ime unu nke chọrọ iwu ụlọ elu, nke na-agaghị ebu ụzọ nọdụ ala gbakọọ ihe ọ ga-efu, ka o wee hụ ma ò nwere ihe ga-ezu iji wuchaa ya?” (Luk 14:28) Ọ bụ eziokwu na ihe Jizọs na-ekwu ebe a bụ na onye chọrọ ịbụ onye na-eso ụzọ ya kwesịrị ibu ụzọ gbakọọ ihe ọ ga-efu ya, ọ bụkwa otu ihe ahụ ka mmadụ kwesịrị ime mgbe ọ chọrọ ịzụ ihe. N’ihi ya, depụta ihe ndị ị ga-eji ego mee, buru ụzọ depụta ihe ndị dị gị ezigbo mkpa na ego ole ha ga-efu.

Ekwela ka àgwà ọjọọ na-eri ego gị. Ihe ndị dị ka ịgba chaa chaa, ịṅụ sịga, ịṅụ ọgwụ ike na ịṅụbiga mmanya ókè dịcha njọ n’anya Chineke.—Ilu 23:20, 21; Aịzaya 65:11; 2 Ndị Kọrịnt 7:1.

‘Ahụla ego n’anya.’ (Ndị Hibru 13:5) Ndị hụrụ ego n’anya anaghị enwekarị obi ụtọ, obi na-agbawakarịkwa ha. E nwere ike ikwu na ha ‘na-eji ọtụtụ ihe mgbu ama onwe ha aghara aghara dị ka mma.’ (1 Timoti 6:9, 10) Ihe ọzọ bụ na ego anaghị eju ha afọ, n’ihi na ihe ọ sọkwara ha ha nwee, ọ naghị ezuru ha.—Ekliziastis 5:10.

Ka ihe i nwere na-eju gị afọ. “Ọ dịghị ihe anyị ji bịa n’ụwa, ọ dịghịkwa ihe anyị pụrụ iwere si n’ime ya pụọ. Ya mere, ebe anyị nwere ihe oriri na uwe, anyị ga-enwe afọ ojuju n’ihe ndị a.” (1 Timoti 6:7, 8) Ndị obere ihe ha nwere na-eju afọ anaghị echegbu onwe ha mgbe ụkọ ego dị. N’ihi ya, mụta ikowe akpa gị ebe aka gị ga-eru.—Gụọ igbe dị n’aka nri.

Ọ dịghị onye n’ime anyị maara ihe ga-eme echi. Ekliziastis 9:11 sịrị: “Oge ọdachi na ihe a na-atụghị anya ya na-abịakwasị [anyị] niile.” N’ihi ya, ndị maara ihe ‘na-enwe olileanya, ọ bụghị n’akụnụba ndị a na-ejighị n’aka, kama n’ebe Chineke nọ,’ bụ́ onye kwere ndị tụkwasịrị ya obi nkwa, sị: “M gaghị ahapụ gị ma ọlị, m gaghịkwa agbahapụ gị ma ọlị.”—1 Timoti 6:17; Ndị Hibru 13:5.

Ì CHETỤLA NKE A N’ECHICHE?

● Olee otú Baịbụl si kọwaa oge anyị a?—2 Timoti 3:1-5.

● Ebee ka anyị nwere ike isi nweta ndụmọdụ ga-abara anyị uru n’oge a?—Abụ Ọma 19:7.

● Olee ihe m ga-eme ka ihe dịrị ezinụlọ m mma n’ọdịnihu?—Ekliziastis 7:12.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 11]

OTÚ Ị GA-ESI KWỤSỊLATA IMEFU EGO

Ịzụ ihe: Dee ihe ndị ị chọrọ ịzụ n’akwụkwọ. Azụla ihe ọ bụla ị na-ebughị n’obi ịzụ. Gaa ebe dị iche iche kwee ọnụ tupu ị zụọ ihe. Na-aga ebe a na-ere ihe ọnụ ala nakwa mgbe ọ na-anaghị ada ọnụ. Mgbe o kwere mee, zụọ ihe n’ùkwù.

Mmefu ndị ị na-eme n’ụlọ: Na-akwụ ụgwọ ndị ị na-akwụ kwa ọnwa n’oge ka a ghara ịna gị ego karịrị ihe i kwesịrị ịkwụ. Jiri aka gị na-esi nri ị ga-eri, erikwala oké nri ma ọ bụ na-aṅụ oké mmanya. Gbanyụọ ọkụ eletrik na ihe eletrik ndị ọzọ dị n’ụlọ gị ma ọ bụrụ na o nweghị ihe i ji ha eme. Mgbe ụfọdụ, i nwere ike jiri ngwá ọrụ na-abụghị nke eletrik rụọ ọrụ. Mara ma ị̀ ga-akwaga n’ụlọ na-ebughị ibu ị ga-akwụli ụgwọ ya.

Ụgbọ njem: Ọ bụrụ na ị chọrọ ịzụ ụgbọala, zụta nke na-anaghị enye nsogbu, nke na-anaghịkwa aṅụ mmanụ ụgbọala ka mmiri. Ọ bụghị iwu na ọ ga-abụ nke ọhụrụ. Mgbe ụfọdụ, gị na ndị ọzọ nwere ike jiri otu ụgbọala gaa ebe ndị unu chọrọ ịga kama onye ọ bụla iburu ụgbọala nke ya. Mgbe ụfọdụ, jiri ọkada, ụgbọ njem ọhaneze, ma ọ bụ ụkwụ gaa ebe ị chọrọ ịga. Na-aga ezumike oge ọtụtụ ndị na-anaghị aga, i nwekwara ike ịga ya n’ebe dị nso n’ụlọ gị.

Ekwe ntị na ntụrụndụ: Ọ̀ dị mkpa na ị ga-enwe telefon n’ụlọ gị, nweekwa ekwe ntị? Ọ bụrụ na ụmụ gị nwere ekwe ntị, ì nwere ike ịkụziri ha ka ha ghara ịna-akpọkarị ndị mmadụ ma ọ bụdị hapụ inwe ya enwe? Ọ bụrụ na ị na-atụ ọda chanel ndị ị ga na-ekiri na tiivi gị, ì nwere ike iwepụtụ chanel ụfọdụ ka ego ị na-akwụ belata? Na-agbaziri akwụkwọ ị chọrọ ịgụ na fim ị chọrọ ile kama ịzụ ha azụ. *

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 26 Ị chọọ ịmatakwu ihe ga-enyere gị aka ịkwụsị imefusị ego, gụọ isiokwu bụ́ “Jiri Ego Gị Na-eme Ihe Bara Uru,” nke gbara na Teta! Eprel-Jun 2009 nakwa isiokwu bụ́ “Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị . . . Olee Otú M Pụrụ Isi Kwụsịlata Imefu Ego?” nke dị na Teta! Julaị–Septemba 2006.