Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Otú Ị Ga-esi Akwụsịlata Ịsụ Nsụ

Otú Ị Ga-esi Akwụsịlata Ịsụ Nsụ

Otú Ị Ga-esi Akwụsịlata Ịsụ Nsụ

“Mgbe ọ bụla m sụwara nsụ, ụjọ atụwa m. Ụjọ a na-emekwa ka nsụ m ka njọ. Ọ na-adị m ka m̀ nọ ná nnukwu olulu m na-enweghị ike isi na ya pụta. E nwere oge m gara na nke otu dọkịta ka o nyere m aka. Ihe ọ gwara m bụ na m kwesịrị inwe enyi nwaanyị mụ na ya ga-enwe mmekọahụ, ka o nwee ike mee ka obi na-esikwu m ike! Anwaghị m anwa gaghachi na nke dọkịta ahụ. Naanị ihe m chọrọ bụ ka ndị mmadụ were m otú m dị.”—Rafael, onye dị iri afọ atọ na abụọ.

CHEGODỊ otú ọ ga-adị gị ma ị chọọ ịgwa onye tagzi ebe ọ ga-ebu gị aga, ọsụsọ ebido gbawa gị, ikwupụta okwu esiere gị ike, gị ana-ekwughachi ihe mbụ i kwuru ugboro ugboro. Otú ahụ ka ọ na-adị ihe dị ka nde mmadụ iri isii n’ụwa niile. Nke a pụtara na n’ime otu narị mmadụ ọ bụla, otu onye n’ime ha na-asụ nsụ. * Ndị mmadụ na-akọkarị ha ọnụ ma na-agbara ha ọsọ. Ụfọdụ na-ewedị ha ka ndị na-amachaghị akwụkwọ n’ihi na ha kwuwe okwu, ha na-ahọrọ okwu ndị ga-adịrị ha mfe ọkpụkpụ karịa okwu ndị ga-esiri ha ike.

Gịnị na-akpata ịsụ nsụ? À na-agwọta ya agwọta? Ò nwere ihe onye na-asụ nsụ nwere ike ime ka okwu nwee ike na-agakwu ya were were n’ọnụ? Olee otú ndị ọzọ nwere ike isi nyere onye nsụ aka?

Ànyị Maara Ihe Na-akpata Ịsụ Nsụ?

Ụfọdụ ndị n’oge ochie kweere na ọ bụ ndị mmụọ ọjọọ na-eme ka mmadụ sụwa nsụ, kwerekwa na tupu mmadụ akwụsị ịsụ nsụ, a ga-achụpụ mmụọ ọjọọ ahụ. N’oge ụwa na-emepechabeghị anya, ụfọdụ ndị chere na nsụ na-esi n’ire. Gịnịzi ka ha na-eme mmadụ ka ọ kwụsị ịsụ nsụ? Ha na-etinye ígwè n’ọkụ daa onye ahụ n’ire ma ọ bụ siere ya nri e tinyere ezigbo ose! Ka oge na-aga, a malitere ịkpọga ndị nsụ n’ụlọ ọgwụ ka dọkịta bepụ akwara ụfọdụ dị n’ire ha nakwa nke na-adị n’akpịrị, ka o mee ka ha kwụsị ịsụ nsụ. Ma o nweghị nke mere ka ndị na-asụ nsụ kwụsị ịsụ nsụ.

Nchọpụta ndị e mere na nso nso a gosiri na ọ bụghị naanị otu ihe na-eme ka mmadụ sụwa nsụ, kama e nwere ọtụtụ ihe nwere ike ịkpata ya. Otu ihe nwere ike ịkpata nsụ bụ oké nchegbu. Ihe ọzọ bụ na o nwere ike isi n’ọbara, n’ihi na ihe dị ka mmadụ isii n’ime mmadụ iri ọ bụla na-asụ nsụ nwere ndị ikwu na-asụ nsụ. Ihe ọzọkwa bụ na mgbe e ji ihe e ji ele ụbụrụ lee ụbụrụ ndị na-asụ nsụ, a chọpụtara na otú ụbụrụ onye nsụ si ahazi okwu dị iche na nke onye na-anaghị asụ nsụ. N’otu akwụkwọ dọkịta aha ya bụ Natan Lavid dere, nke a kpọrọ Understanding Stuttering (Ịghọta Nsụ), o kwuru na ụfọdụ ndị “nwere ike bido kwuwe okwu tupu ụbụrụ ha agwa ha otú ha kwesịrị isi kpọpụta okwu. *

N’ihi ya, ihe bụ́ isi na-eme mmadụ ji asụ nsụ anaghị abụkarị otú onye ahụ si eche echiche, dị ka e chere na mbụ. Akwụkwọ bụ́ No Miracle Cures (E Nweghị Ụzọ Ọrụ Ebube E Si Agwọ Ya), sịrị: “Ihe a na-ekwu bụ na ọ bụghị otú mmadụ si eche echiche na-eme ka onye ahụ na-asụ nsụ, ọ bụghịkwanụ ịgwa onye na-asụ nsụ ka ọ kwụsị iche echiche otú ahụ o si eche ga-eme ka ọ kwụsị ịsụ nsụ.” Ma ihe nwere ike ime ka ndị na-asụ nsụ malite ichegbu onwe ha bụ otú ndị mmadụ si ele ha anya. Dị ka ihe atụ, ha nwere ike na-atụ ụjọ ikwu okwu n’ebe ndị mmadụ juru ma ọ bụ na fon.

Otú E Nwere Ike Isi Nyere Ndị Nsụ Aka

Ọ dị mma ịmara na ndị na-asụ nsụ na-enwe ike ịgụ egwú, ịtakwunyere mmadụ ihe, ịgwa onwe ha ma ọ bụ nkịta ha okwu, iso ndị ọzọ gụọ egwú, ma ọ bụdị ijije onye ọzọ n’asụghị nsụ. Ihe ọzọ bụ na ụmụaka anọ n’ime ụmụaka ise ọ bụla na-asụ nsụ na-eji aka ha akwụsị ịsụ nsụ. Oleekwanụ maka ụmụaka ndị nke ọ na-esiri ike iji aka ha kwụsị ịsụ nsụ?

Taa, e nwere ebe ndị a na-akụziri ndị na-asụ nsụ ihe ndị ha ga-eme ka nsụ ha na-akwụsịlata. Ihe ụfọdụ a na-akụziri ha bụ ka ha wetuo obi jiri nwayọọ na-ekwu okwu, nakwa ka ha si n’akpa ume na-eku ume ma ha kwuwe okwu. E nwekwara ike ịkụziri ha ihe ụfọdụ ha ga-eme tupu ha ekwuwe okwu, dị ka isi n’akpa ume na-ekupu ume obere obere tupu ha ekwuwe okwu. E nwekwara ike ịgwa ha ka ha setịa mkpụrụ okwu ụfọdụ mgbe ha na-akpọpụta ya. Ka nsụ ha na-akwụsịlata, otú ha si ekwu okwu ga-eji nwayọọ nwayọọ na-aka mma.

O nwere ike iwe mmadụ naanị awa ole na ole iji mụta ime ihe ndị ahụ. Ma ọ ga-ewe ọtụtụ awa tupu onye ahụ amụta ime ha mgbe ọ dị ya ọkụ n’obi ikwu okwu, dị ka mgbe ọ na-ekwu okwu n’ihu ọha.

Olee mgbe e kwesịrị ibido kụziwere onye nsụ ihe ndị ọ ga-eme iji kwụsị ịsụ nsụ? Ọ̀ ka mma ịhapụ nwatakịrị na-asụ nsụ ka a mara ma ọ̀ ga-eji aka ya kwụsị ya? Nchọpụta e mere na-egosi na ihe dị ka ụmụaka abụọ n’ime ụmụaka iri ọ bụla, ndị sụrụ nsụ afọ ise, na-eji aka ha kwụsị ya. Akwụkwọ ahụ bụ́ No Miracle Cures, sịrị: “Nwatakịrị ruo afọ isii, ọ ga-esi ike ya ejiri aka ya kwụsị ịsụ nsụ n’agaghị n’ebe a ga-enyere ya aka.” N’ihi ya, “ụmụaka na-asụ nsụ kwesịrị ịga hụ dọkịta na-ahụ maka nsụ n’oge.” N’ime ụmụaka ndị na-ejighị aka ha kwụsị ịsụ nsụ, ọ na-afọ obere ka ọ bụrụ ha niile na-akwụsị nsụ ma dọkịta na-ahụ maka nsụ nyere ha aka. *

Atụla Anya na Ị Ga-akwụsịcha Ịsụ Nsụ

Robert Quesal, bụ́ onye na-asụ nsụ ma bụrụkwa dọkịta na-ahụ maka nsụ, kwuru na ọtụtụ ndị na-asụ nsụ ekwesịghị ịtụwa anya na okwu ga na-aga ha were were n’ọnụ mgbe ọ bụla. Rafael, onye anyị kwuru okwu ya na mbụ, akwụsịchabeghị ịsụ nsụ n’agbanyeghị na otú o si ekwu okwu akala mma. Ọ sịrị: “Nsụ m na-aka njọ ma m nọrọ n’ihu ọha na-agụ ihe ma ọ bụ na-ekwu okwu ma ọ bụkwanụ mgbe mụ na nwa agbọghọ mara mma nọ. Ihe na-eme o ji aka njọ bụ na ndị mmadụ na-achịkarị m ọchị. Ma ugbu a, ana m agbalịzi ka m ghara ịna-echekarị banyere onwe m, ana m ewerekwa onwe m otú m dị. N’ihi ya, e nwee okwu siiri m ike ọkpụkpọ ma m kwuwe okwu, m na-achịrị ya ọchị, m na-agbalịkwa iwetu obi ma kwuwekwa ihe m na-ekwu.”

Ihe a Rafael kwuru kwekọrọ n’ihe Òtù Na-enyere Ndị Nsụ Aka n’Amerịka kwuru. Òtù ahụ sịrị na “ihe na-emekarị ka mmadụ kwụsị ịsụ nsụ bụ onye ahụ iwepụ ụjọ n’obi ya, ọ bụghị ịgbalịsi ike ka ọ ghara ịsụ nsụ.”

Ọtụtụ ndị nsụ ekwebeghị ka nsụ mee ka ha ghara ime ihe ndị ha chọrọ ime ná ndụ. Ụfọdụ n’ime ha bụdị ndị a ma ama, ndị dị ka Sir Isaac Newton, bụ́ ọkà n’ihe ọmụmụ fiziks, Winston Churchill, onye ọnụ na-eru n’okwu n’ọchịchị ndị Briten, na James Stewart, onye Amerika na-eme ihe nkiri. Ụfọdụ ndị ọzọ na-asụ nsụ amụọla otú e si akpọ ngwá egwú, otú e si ese ihe, ma ọ bụ asụsụ ndị ogbi. Ndị na-anaghị asụ nsụ kwesịrị ịja ndị nsụ mma maka mgbalị ndị ha na-eme. N’ihi ya, ka anyị na-enyere ha aka ma na-agba ha ume ókè ike kwere anyị.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 Ihe karịrị mmadụ anọ n’ime mmadụ ise ọ bụla na-asụ nsụ bụ nwoke.

^ par. 7 E nweela ihe ọhụrụ ndị e kwuru na ọ bụ ha na-akpata nsụ, nweekwa ụzọ ndị dị mma a chọpụtarala e si agwọ ya. Ma ha niile abụghị otu, ha na-eyikarịkwa ibe ha. Teta! anaghị akwado nke ọ bụla n’ihe ndị ahụ e kwuru na ọ bụ ya na-akpata nsụ, ọ naghịkwa akwado nke ọ bụla n’ụzọ ndị ahụ e si agwọ ya.

^ par. 13 Mgbe ụfọdụ, dọkịta na-ahụ maka nsụ nwere ike ịgwa onye nsụ ka ọ zụta ihe ọ ga-akwụnye ná ntị, nke ga-eme ka ọ ghara ịna-anụ olu nke ya ozugbo o kwuru okwu, ma ọ bụkwanụ ya enye ya ọgwụ ga-eme ka ahụ́ na-erukwu ya ala ma ọ na-ekwu okwu.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 30]

OLEE OTÚ I NWERE IKE ISI NYERE ONYE NSỤ AKA?

● Mee ka ahụ́ ruo onye ahụ ala. Ndụ gbalụ gbalụ dị n’ụwa a na otú o si adị ndị mmadụ ngwa ngwa na-etinye onye nsụ ụjọ n’ahụ́, mee ka nsụ ya ka njọ.

● Kama ịgwa onye na-asụ nsụ ka o jiri nwayọọ na-ekwu okwu, jiri nwayọọ na-ekwu okwu ka o nwee ike iṅomi gị. Wetuo obi gee ya ntị. Anapụla ya okwu n’ọnụ. Ekwuchapụla ihe ọ na-ekwu. Gbatụ nkịtị tupu i kwuo okwu nke gị.

● Abarala ya mba ma ọ bụ gbazie ya olu mgbe ọ na-ekwuteghị ihe ọ chọrọ ikwu. Otú i si ele ya anya n’ihu, otú ihu gị dị mgbe ọ na-agwa gị okwu, na otú i si azaghachi, kwesịrị igosi ya na i nwere mmasị n’ihe ọ na-ekwu, ọ bụghị n’otú o si ekwu ya.

● Echela na ikwute okwu nsụ ọ na-asụ ga-ewe ya iwe. Igosi onye nsụ ihu ọchị na iji akọ kwute okwu nsụ ya mgbe ụfọdụ nwere ike ime ka ahụ́ ruo ya ala. I nwere ike ikwu ihe dị ka: “Ọ bụghị mgbe niile ka ọ na-adịrị mmadụ mfe ikwu ihe ọ chọrọ ikwu.”

● Nke kacha mkpa bụ, mee ka ọ mara na ị naghị agbara ya ọsọ.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 31]

‘M JI NWAYỌỌ NWAYỌỌ KWỤSỊLATA ỊSỤ NSỤ’

Víctor, onye sụrụ nsụ ọtụtụ afọ mgbe ezinụlọ ha nwere nnukwu nsogbu, mechara kwụsị ịsụ nsụ n’agaraghị ya ụlọ ọgwụ. Ebe ọ bụ Onyeàmà Jehova, o debara aha ya n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke, bụ́ nke a na-enwe n’izu ọ bụla n’ọgbakọ niile. Ọ bụ eziokwu na ụlọ akwụkwọ a abụghị maka inyere ndị nsụ aka, a na-enyere ndị debara aha ha na ya aka ịmụta otú e si ekwu okwu nke ọma na otú obi ga-esi na-esikwu ha ike mgbe ha na-ekwu okwu.

Akwụkwọ e ji amụ ihe n’ụlọ akwụkwọ ahụ bụ Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke. N’otu igbe dị n’akwụkwọ ahụ, nke isiokwu ya bụ “Ịnagide Ịsụ Nsụ,” e kwuru, sị: “Ọ dị mkpa ịnọgide na-etinye mgbalị. . . . Ọ bụrụ na ị na-aga ikwu okwu, kwadebe nke ọma. Mee ka obi gị dịrị n’okwu gị. . . . Ọ bụrụ na ị malite ịsụ nsụ mgbe ị na-ekwu okwu, mgbe ahụ, ruo n’ókè o kwere mee, mee ka ụda olu gị dajụọ, wetuokwa obi. Mee ka uru ahụ́ ndị dị gị n’agbà ghara ikwedo ekwedo. Na-ekwu okwu n’ahịrịokwu ndị dị nkenke. Belata ịdị na-agbakwụnye okwu ndị dị ka ‘eem’ na ‘mmm.’”

Ụlọ akwụkwọ a ò nyeere Víctor aka? Víctor sịrị: “M na-aka etinye uche n’ihe m ga-ekwu ọ bụghị n’otú m ga-esi ekwu ya nke na m na-echefu na m na-asụ nsụ. Ihe ọzọ bụ na m na-amụgharị ihe m chọrọ ikwu ọtụtụ ugboro. Otú a ka m si jiri nwayọọ nwayọọ kwụsịlata ịsụ nsụ.”