Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ètoruola m ibiri nke onwe m?

Ètoruola m ibiri nke onwe m?

Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị

Ètoruola m ibiri nke onwe m?

“Mgbe ụfọdụ, ọ na-adị m ka ndị mmadụ hà na-eleda m anya n’ihi na eruola m afọ iri na itoolu ma ka biri n’ụlọ ndị mụrụ m. Ha na-eche na ọ bụ mgbe m biiri nke onwe m ka m ga-eru ihe e ji mmadụ eme.”—Katie. *

“Ọ fọrọ obere ka m ruo afọ iri abụọ, ọ na-ewekwa m iwe na ndị mụrụ m anaghị ekwe m jiri aka m na-ekpebi ihe m chọrọ ime. Echeela m echiche ịga biri nke onwe m n’ihi na ndị mụrụ m anaghị ekwe m mee ihe m chọrọ, ha na-agwakwa m na ha ka m mara ihe.”—Fiona.

ỌTỤTỤ afọ tupu i toruo ibiri onwe gị, o nwere ike ị chọwala iji aka gị na-ekpebiri onwe gị ihe ị na-eme. Nke ahụ adịghị njọ. A sị ka e kwuwe, mgbe Chineke kere mmadụ, o bu n’obi na ndị na-eto eto ga-emecha hapụ nne na nna ha ma nwee ezinụlọ nke ha. (Jenesis 2:23, 24; Mak 10:7, 8) Ma, na ị chọrọ iji aka gị na-ekpebiri onwe gị ihe ndị ị na-eme ọ̀ pụtara na o ruola mgbe ị ga-ebiri nke onwe gị? O nwere ike ịbụ. Ma, olee otú ị ga-esi mara ma ì toruola n’eziokwu ibiri onwe gị? Lebagodị anya n’ajụjụ atọ dị mkpa i kwesịrị ịza. Nke mbụ bụ . . .

Gịnị Mere M Ji Chọọ Ibiri Onwe M?

Ihe ndị e depụtara n’okpuru ebe a ga-enyere gị aka ịmata ihe mere i ji chọọ ibiri onwe gị. Dee 1 n’ihe nke mbụ mere i ji chọọ ibiri onwe gị, dee 2 n’ihe nke abụọ, derezie ya otú ahụ na-aga.

․․․ Achọrọ m ịgbara nsogbu ndị dị n’ụlọ anyị ọsọ

․․․ Achọrọ m iji aka m na-ekpebiri onwe m ihe ndị m na-eme

․․․ Achọrọ m ka ndị enyi m na-akwanyekwuru m ùgwù

․․․ Achọrọ m ịga biri na nke enyi m na-achọ onye ya na ya ga-ebi

․․․ Achọrọ m ịga nye aka ebe e nwere mkpa

․․․ Achọrọ m ịmụta otú m ga-esi na-emere onwe m ihe

․․․ Achọghịzi m ka ndị mụrụ m na-akpa afọ m

․․․ Ihe ọzọ ․․․․․

O nweghị nke ọ bụla n’ihe ndị a a ga asị na ọ dị njọ. Ma, ihe i bu n’obi chọọ ịkwapụ n’ụlọ ndị mụrụ gị ga-eso ekpebi ma ị̀ ga-enwe obi ụtọ ma i biri nke onwe gị. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na ihe mere i ji chọọ ibiri onwe gị bụ ka ị gbaara nsogbu ndị dị n’ụlọ unu ọsọ ma ọ bụ ka i jiri aka gị na-ekpebiri onwe gị ihe ị ga-eme, i nwere ike imecha chọpụta na ihe adịghị otú ahụ i chere.

Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Danielle, onye nwere mgbe ọ gara biri nke onwe ya mgbe ọ dị afọ iri abụọ, mụtara ọtụtụ ihe n’oge ahụ. Ọ sịrị: “Onye ọ bụla nọ n’ụwa a ga-enwerịrị ihe ọ ga-achọ ime ọ na-agaghị enwe ike ime. I biri nke onwe gị, o nwere ihe ndị ị na-agaghị emeli n’ihi na ọrụ gị agaghị enye gị ohere ime ha ma ọ bụkwanụ ya abụrụ na i nweghị ego ime ha.” Carmen, onye hapụrụ ndị mụrụ ya gaa bie ọnwa isii ná mba ọzọ, sịrị: “Enwere m obi ụtọ na m biiri onwe m n’oge ahụ, ma ọ na-adịkarị m ka anaghị m enwe ohere ezu ike! Ọ bụ m na-arụ ọrụ ụlọ niile, ma ịza ụlọ, idozi ihe ndị mebirinụ, ịsụchasị gburugburu ebe m bi, ịsa ákwà, ihicha ụlọ, nakwa ihe ndị ọzọ.”

N’eziokwu, i biri nke onwe gị, a ga-enwe ihe ụfọdụ ị ga na-eme otú i si chọọ, nke ahụ nwekwara ike ime ka ndị enyi gị ghọta na ọkwá gị arịala. Ma, ọ bụ gị ga na-akwụ ụgwọ ihe niile a na-akwụ akwụ, na-esi nri, na-ehicha ụlọ, chọtakwa ihe ị ga-eme iji mee onwe gị obi ụtọ mgbe ndị enyi gị na ndị ezinụlọ gị na-anọghị nso. N’ihi ya, ekwekwala ka ndị ọzọ rata gị ka i jiri ọsọ gaa biri nke onwe gị. (Ilu 29:20) Ya bụrụgodị na e nwere ezigbo ihe mere i ji chọọ ịga biri nke onwe gị, ọ bụghị naanị ya kwesịrị ime ka ị kwapụ na nke ndị mụrụ gị. I kwesịrị ịmụta ihe mmadụ kwesịrị ịma tupu ọ gaa biri nke onwe ya. N’ihi ya, ajụjụ nke abụọ ị ga-aza bụ . . .

Àdịla M Njikere?

Ịkwapụ gaa biri nke onwe gị yiri ịga ntá n’oké ọhịa n’abalị. Ị̀ ga-ebili gawa oké ọhịa naanị gị ma ọ bụrụ na ị maghị ụzọ, i jighị égbè, mma, ọkụ, ị maghịkwanụ otú e si agba ntá? Ị gaghị eme ya. Ma, ọtụtụ ndị na-eto eto na-akwapụ mgbe ha na-amụtabeghị ihe mmadụ kwesịrị ịma tupu o biri nke onwe ya.

Eze Sọlọmọn maara ihe kwuru na “onye maara ihe na-echebara nzọụkwụ ya echiche.” (Ilu 14:15) Ka i nwee ike mara ma ì jikerela ibiri nke onwe gị, chebara ihe ndị a anyị na-aga ịtụle echiche. Kanye na nke ọ bụla ịma eme, kanyekwa X na nke ị na-amaghị eme.

◯ Ihe e ji ego eme Otu nwa agbọghọ dị afọ iri na itoolu, aha ya bụ Serena, sịrị: “Ejitụbeghị m ego m kwụọ ụgwọ ihe ọ bụla. Ibiri nke onwe m ma jiri ego m na-akwụ ụgwọ ihe niile na-atụ m ụjọ.” Olee otú ị ga-esi amụta ihe ị ga-eji ego gị na-eme?

Otu ilu Baịbụl sịrị: “Onye maara ihe ga-ege ntị ma nwetakwuo ntụziaka.” (Ilu 1:5) Ọ́ gaghị adị mma ma ị jụọ ndị mụrụ gị ego ole o nwere ike ifu otu onye kwa ọnwa iji kwụọ ụgwọ ụlọ, nye onwe ya nri ma kwụọ ụgwọ ụgbọ njem o ji gaa ebe niile ọ gara? Ya bụrụ na unu nwere ụgbọala, jụọ ha ihe ego e mefuru n’ụgbọala unu gbara n’isi otu onye. Gwazie ha ka ha kụziere gị otú ị ga-esi na-ahazi ego ị na-akpata na ego ị na-emefu. Gịnị mere o ji dị mkpa ka ị mụta ịhazi otú ị ga-esi na-emefu ego gị? Kevin, onye dị afọ iri abụọ, sịrị: “Ozugbo i biiri nke onwe gị, ị ga-achọpụta na e nwere ọtụtụ ihe ị na-atụghị anya na ị ga na-emefuru ego. Ọ bụrụ na ị kpachaghị anya, ị ga-arụgbu onwe gị n’ọrụ ebe ị na-achọ ego ị ga-eji kwụọ ụgwọ ndị i ji.”

Ị̀ chọrọ ịma ihe ị ga na-emefu ma i biri nke onwe gị? Ọ bụrụ na ị na-arụ ọrụ, wepụta ihe dị ka ọnwa atọ na-enye ndị mụrụ gị ego ihe ndị ha mefuru n’isi gị, ma ego nri, ma ego ụlọ ma ego ihe ndị ọzọ. Ọ bụrụ na ị kwụlighị ha ụgwọ ihe ndị ahụ ma ọ bụkwanụ na ị chọghị ịkwụ ya, mara na i jikerebeghị ibi nke onwe gị.—2 Ndị Tesalonaịka 3:10, 12.

◯ Ịrụ ọrụ ụlọ Brian, onye dị afọ iri na asaa, kwuru na ya cheta ịga biri nke onwe ya, ihe na-akacha atụ ya ụjọ bụ ịsa ákwà ya. Olee otú ị ga-esi mara ma ị̀ dịla njikere ilekọta onwe gị? Aron, onye dị afọ iri abụọ, tụrụ aro a: “Gbalịa wepụta otu izu mee ka ì bi nke onwe gị. Jiri ego gị zụọ ihe ị ga-eri, jirikwa aka gị sie ya ma ọ bụ gị azụrụ nke e siri esi. Jiri aka gị saa ma dee uwe gị. Jiri aka gị dewe ụlọ gị ọcha. Gbalịakwa jiri ego gị kwụọ ụgwọ ụgbọ njem i ji gaa ebe niile ị gara.” I mee ihe ahụ Aron kwuru, o nwere uru abụọ ọ ga-abara gị: Ọ ga-eme ka (1) ị mụta ihe ndị ga-abara gị uru, (2) ị na-eji ihe ndị mụrụ gị na-emere gị kpọrọkwuo ihe.

◯ Iso ndị ọzọ emekọ ihe n’udo Gị na ndị mụrụ gị na ụmụnne gị ùnu na-ebi n’udo? Ọ bụrụ na unu anaghị ebi n’udo, i nwere ike iche na ihe ga-aka mma ma gị na otu enyi gị biri. Ihe nwekwara ike ịka mma. Ma legodị ihe Eve, onye dị afọ iri na asatọ, kọrọ. Ọ sịrị: “O nwere ndị enyi m abụọ gara bikọta ọnụ. Tupu ha ebiri, ha dị n’ezigbo mma, ma ha mechara chọpụta na ha abụọ agaghị ebili. Otu na-adị ọcha, onye nke ọzọ na-eru unyi. Otu ji ife Chineke kpọrọ ihe, onye nke ọzọ ejichaghị ya kpọrọ ihe. Ha abụọ mechara gbasaa!”

Otu nwa agbọghọ dị afọ iri na asatọ, aha ya bụ Erin, chọrọ ịga biri nke onwe ya. Ma, ọ sịrị: “Mgbe gị na ndị mụrụ gị ka bi, e nwere ọtụtụ ihe ị ga-amụta banyere otú gị na ndị ọzọ ga-esi na-emekọ ihe. Ị ga-amụta otú ị ga-esi na-edozi nsogbu ọ bụla gị na mmadụ nwere nakwa otú ị ga-esi na-agbachi nkịtị n’ihe ụfọdụ. Achọpụtala m na ndị gara biri nke onwe ha iji gbaara nsogbu ha na ndị mụrụ ha na-enwe ọsọ anaghị amụta otú e si edozi nsogbu kama otú e si agbara nsogbu ọsọ.”

◯ Iwepụta oge maka ihe ndị gbasara ofufe Chineke Ihe ụfọdụ ndị na-ebu n’obi ebiri nke onwe ha bụ ka ha kwụsị iso ndị mụrụ ha na-eme ihe ndị gbasara ofufe Chineke. Ndị ọzọ na-ebu n’obi na ha biri nke onwe ha, ha ka ga na-amụ Baịbụl, na-emekwa ihe ndị ọzọ gbasara ofufe Chineke. Ma obere oge ha biiri nke onwe ha, ha ejiri nwayọọ nwayọọ kpawa àgwà ọjọọ. Olee ihe ị ga-eme ka ‘okwukwe gị ghara ikpu dị ka ụgbọ’?—1 Timoti 1:19.

Esola ndị mụrụ gị na-ekpe okpukpe ha na-ekpe naanị ka i mee ha obi ụtọ. Jehova Chineke chọrọ ka anyị niile jiri aka anyị chọpụta ihe mere anyị ji kwere ihe anyị kweere. (Ndị Rom 12:1, 2) N’ihi ya, nwee oge i ji amụ Baịbụl n’onwe gị na oge i ji eme ihe ndị ọzọ gbasara ofufe Chineke, ekwekwala ka ihe ọ bụla gbochie gị ịna-eme ha. Ọ́ gaghị adị mma ma i dee ụbọchị na oge ị na-eji eme ihe ndị gbasara ofufe Chineke na kalenda gị ma lee ma ì nwere ike ịna-emechi ha anya ruo otu ọnwa n’enweghị mgbe ndị mụrụ gị chetaara gị ha?

N’ikpeazụ, ajụjụ nke atọ i kwesịrị ịza bụ . . .

Olee Ihe M Bu n’Obi Ime ma M Biri nke Onwe M?

Ihe mere ụfọdụ ndị ji biri nke onwe ha bụ ka ha gbaara nsogbu ndị dị n’ụlọ ha ọsọ ma ọ bụ ka ndị mụrụ ha ghara ịna-agwa ha ihe ha ga-eme. Ebe ha na-elekwasị anya bụ ná nsogbu ndị ha ga-ahapụ, ọ bụghị ná nsogbu ndị ha ga-enwe. Ma e nwere ike iji onye na-eme ụdị ihe a tụnyere ọkwọ ụgbọala nke na-elekwasị anya n’enyo o ji ahụ ihe ndị dị n’azụ. Ọ bụrụ na o lekwasị anya n’enyo ahụ, naanị ihe ọ ga na-ahụ bụ ihe ndị ọ gbaferela, ọ gaghị ahụ ihe ndị dị n’ihu. Gịnị ka nke a na-akụziri anyị? Ka i nwee ike mee nke ọma ma i biri nke onwe gị, elekwasịla anya naanị n’ịpụrụ ndị mụrụ gị n’ụlọ, kama lekwasị anya n’ihe bara uru ị ga-emewe ma ị pụọ.

Ụfọdụ ndị na-eto eto bụ́ Ndịàmà Jehova akwagala ebe ọzọ n’obodo ha ma ọ bụdị ná mba ọzọ iji kwusaa ozi ọma n’ime ime obodo ndị a na-anaghị ezikarị ozi ọma. Ndị ọzọ na-akwaga ebe ọzọ iji nye aka wuo ebe Ndịàmà Jehova na-anọ efe ofufe ma ọ bụ na-arụ ọrụ n’alaka ụlọ ọrụ ha. Ma e nwere ndị nke chere na ha kwesịrị ibiri nke onwe ha ruo oge ụfọdụ tupu ha alụọ di ma ọ bụ nwunye. *

N’okpuru ebe a, dee otu ihe ị ga-achọ ime ma i si n’ụlọ unu kwapụ. ․․․․․

E nwere ndị nwere ike ibite aka n’ụlọ ndị mụrụ ha ma ha agaghị amụta ihe ndị ga-enyere ha aka ma ha biri nke onwe ha. Ọ bụrụgodị na ọ dị gị otú ahụ, ejila ọsọ ekpebi ihe ị ga-eme. Chebara ya echiche. Otu ilu Baịbụl sịrị: “Atụmatụ onye dị uchu aghaghị iweta uru, ma onye ọ bụla ọ na-adị ngwa ngwa aghaghị ịdaba n’ụkọ.” (Ilu 21:5) Gee ndị mụrụ gị ntị. (Ilu 23:22) Kpee ekpere banyere okwu ibiri onwe gị. Ka ị na-ekpebi ihe ị ga-eme, chebara ihe Baịbụl kwuru echiche, bụ́ nke a kọwara n’isiokwu a.

Ihe i kwesịrị ịjụ onwe gị abụghị Ètoruola m ibiri nke onwe m? kama Àmụtala m ihe ndị m kwesịrị ime ma m biri nke onwe m? Ọ bụrụ na ị zara ee n’ajụjụ nke abụọ ahụ, o nwere ike ịbụ na oge eruola ka ị gaa biri nke onwe gị.

Ị gaa n’adres Ịntanet anyị bụ́ www.watchtower.org/ype ị ga-ahụ ihe ndị ọzọ a tụlerela n’isiokwu a bụ́ “Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị”

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 Aha a kpọrọ ụfọdụ ndị n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.

^ par. 33 N’obodo ụfọdụ, nwatakịrị na-ebi n’ụlọ ndị mụrụ ya, nke ka nke ma ọ bụrụ nwa nwaanyị, ruo mgbe ọ ga-alụ di ma ọ bụ nwunye. O nweghị ihe Baịbụl kwuru n’okwu a.

IHE Ị GA-ECHEBARA ECHICHE

● Ọ bụrụgodị na nsogbu dị n’ezinụlọ unu, olee uru ọ ga-abara gị ma i biri n’ụlọ unu ruo oge ụfọdụ?

● Ugbu a ị ka bi n’ụlọ ndị mụrụ gị, olee ihe ndị ọ ga-abụ ị na-eme ha abaara ndị ezinụlọ unu uru ma nyere gị aka ijikere maka oge ị ga-ebiri nke onwe gị?

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 27]

IHE NDỊ NA-ETO ETO IBE GỊ KWURU

“Ọ bụrụ na ndị mụrụ gị na-enye gị ọrụ ị ga na-arụ mgbe gị na ha ka bi, ya bụ, ụdị ọrụ ị ga na-arụ ma i biri nke gị, ọ ga-enyeziri gị aka ịmụta otú ị ga-esi biri nke onwe gị mgbe e mechara.”

“Mmadụ ịchọ ibiri nke onwe ya adịghị njọ. Ma ọ bụrụ na ihe i bu n’obi chọọ ibiri nke onwe gị bụ ka ndị mụrụ gị kwụsị ịna-agwa gị ihe ndị ị ga-eme, mara na i torubeghị ibiri nke onwe gị.”

[Foto]

Sarah

Aron

[Igbe dị na peeji nke 29]

IHE NDỊ MỤRỤ ỤMỤ KWESỊRỊ IBURU N’UCHE

Serena, onye anyị dere ihe o kwuru n’isiokwu a, na-atụ ụjọ ịga biri nke onwe ya. Olee otu n’ime ihe mere ụjọ ji atụ ya? Ọ sịrị: “M chọgodị iji ego m zụrụ ihe, papa m anaghị ekwe. Ọ na-asị na ọ bụ ọrụ ya. N’ihi ya, ụjọ na-atụ m ma m̀ ga-ejilikwa aka m na-akwụ ụgwọ mmefu ndị m ga-eme ma m biri nke onwe m.” O doro anya na papa Serena bu ọdịmma Serena n’obi, ma ì chere na ọ na-enyere nwa ya nwaanyị a aka ịmụta otú ọ ga-esi elekọta ezinụlọ ya ma ọ lụọ di?—Ilu 31:10, 18, 27.

Ị̀ na-emere ụmụ gị ihe niile nke na ha biri nke onwe ha, ha agaghị ama otú ha ga-esi eme ihe ụfọdụ? Olee otú ị ga-esi mara ma ọ̀ bụ ihe ị na-eme? Ka anyị jiri anya onye bụ́ nne ma ọ bụ nna leba anya n’ihe anọ ahụ ụmụ gị kwesịrị ịma, bụ́ ndị a kọwara n’isiokwu a.

Ihe e ji ego eme. Ụmụ gị ndị toro eto hà ma otú e si akwụ ụgwọ ọkụ na ihe ndị ọzọ unu na-akwụ ụgwọ ha n’ụlọ? Hà ma ihe ndị ha kwesịrị ịkwụ gọọmenti ụgwọ ha na otú ha ga-esi akwụ ha? (Ndị Rom 13:7) Hà amụtala ịghara ịna-azụ ihe n’aka? (Ilu 22:7) Hà nwere ike ịhazi otú ha si emefu ego ha na-akpata ma kowe akpa ha ebe aka ha ga-eru? (Luk 14:28-30) Hà enwetụla obi ụtọ mmadụ na-enwe ma onye ahụ jiri ego ọ kpatara n’onwe ya zụrụ ihe dị ya mkpa? Hà enwetụla obi ụtọ mmadụ na-akadị enwe ma onye ahụ wepụta oge ya na ihe ndị o nwere nyere ndị ọzọ aka?—Ọrụ 20:35.

Ịrụ ọrụ ụlọ. Ụmụ gị ndị nwaanyị na ndị nwoke hà ma otú e si esi nri? Ị̀ kụzierela ha otú e si asa ákwà na otú e si ede ya? Ọ bụrụ na ha ma otú e si anya ụgbọala, hà nwere ike imezi ihe ụfọdụ na ya, dị ka ịgbanwe bọlb nwụrụ anwụ, mmanụ, ma ọ bụkwanụ taya dara afọ?

Iso ndị ọzọ emekọ ihe n’udo. Ọ̀ na-abụ mgbe ọ bụla ụmụ gị ndị toro eto sere okwu, ya abụrụ gị ga-edoziri ha okwu ahụ? Ka ị̀ kụzierela ha otú ha ga-esi ekwurịta ihe na-esere ha, dozie nsogbu ha ma gwa gị otú ha si dozie ya?—Matiu 5:23-25.

Iwepụta oge maka ihe ndị gbasara ofufe Chineke. Ị̀ na-agwa ụmụ gị ka ha kwere ihe ị na-akụziri ha, ka ị̀ na-eme ka ha ghọta otú ihe ị na-akụziri ha si bụrụ eziokwu? (2 Timoti 3:14, 15) Kama ịza ha ajụjụ ọ bụla ha jụrụ gị gbasara otú ha ga-esi na-akpa àgwà na ihe ndị ha ga-ekwere, ị̀ na-akụziri ha inwe “ikike iche echiche” na ‘ịzụ ikike nghọta ha ịmata ihe dị iche n’ihe ziri ezi na ihe na-ezighị ezi’? (Ilu 1:4; Ndị Hibru 5:14) Obi ọ̀ ga-adị gị ụtọ ma ha soro otú i si amụ Baịbụl, ka ị̀ ga-achọ ka otú ha si amụ Baịbụl ka nke gị mma?

O doro anya na ọ dịghị mfe ịkụziri ụmụaka ihe ndị a anyị kwuru okwu ha. Ma mgbalị i mere agaghị efu ọhịa, n’ihi na ị ga-enwe obi ụtọ na ha na-aga ibiri nke onwe ha n’agbanyeghị na ọ na-ewute gị na ha na-akwapụ n’ụlọ gị.

[Foto dị na peeji nke 28]

Ịkwapụ gaa biri nke onwe gị yiri ịga ntá n’oké ọhịa n’abalị. Ọ dị mkpa na ị ga-amụta ihe niile gbasara ịchụ ntá tupu ị gawa