Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Ka Ị Ma Banyere Ndịàmà Jehova?

Gịnị Ka Ị Ma Banyere Ndịàmà Jehova?

Gịnị Ka Ị Ma Banyere Ndịàmà Jehova?

Otu nwaanyị nke bi na Denmak, onye a na-azụ ịghọ onye nta akụkọ, dere, sị: “Agụrụ m ọtụtụ ihe e dere banyere Ndịàmà Jehova n’Ịntanet, nụ asịrị dị iche iche e ji ha gbaa, nụkwa okwu ọjọọ e kwuru banyere ha. N’ihi ya, elewere m Ndịàmà Jehova anya ọjọọ”

ONYE nta akụkọ a mechara gbaa otu ezinụlọ bụ́ Ndịàmà Jehova ajụjụ ọnụ. Gịnị meziri? Ọ sịrị: “Agbanwere m otú ahụ m si ele ha anya ozugbo m batara n’ụlọ ha! Ọ ga-abụ na ndị mmadụ amachaghị ndị ha bụ, ma ọ bụkwanụ ya abụrụ na ndị niile na-ele ha anya ọjọọ ebughị ụzọ chọpụta ndị ha bụ. Ama m na ọ bụ ihe mụnwa mere. Emechakwara m chọpụta na otú ahụ m si ele ha anya adịghị mma.”—Cecilie Feyling dere ya n’akwụkwọ akụkọ bụ́ Jydske Vestkysten.

Mgbe otu nwoke, onye ọrụ ya bụ iwe ndị mmadụ n’ọrụ n’otu nnukwu ụlọ ahịa dị na Yurop, na Ndịàmà Jehova mekọrọ ihe ugboro ugboro, ọ chọpụtara na Ndịàmà Jehova na-akwụwa aka ọtọ. N’ihi ya, o kpebiri iwe Ndịàmà Jehova n’ọrụ.

N’eziokwu, ihe e ji mara Ndịàmà Jehova bụ ikwusa ozi ọma. Ma, ha achọpụtala na ụfọdụ ndị anaghị achọ ka ha na ha mụọ Baịbụl, ebe ndị ọzọ na-achọ. Nke bụ́ eziokwu bụ na Ndịàmà Jehova na ihe karịrị nde mmadụ asaa, ndị bi n’ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ mba niile dị n’ụwa, na-amụ Baịbụl mgbe niile, ụfọdụ n’ime ndị a na-emechakwa kụziwere ndị ọzọ Baịbụl. Dị ka ihe atụ, otu òtù chọọchị nke dị n’Amerịka kwuru na n’ime chọọchị iri abụọ n’ise kacha ibu e nwere n’ụwa, ọ bụ naanị anọ ka ọnụ ọgụgụ ha rịrị elu, Ndịàmà Jehova bụkwa otu n’ime ha.

Gịnị mere ọtụtụ nde mmadụ ji ekwe ka ha na Ndịàmà Jehova na-amụ Baịbụl? Olee otú ha na ha si amụ ya? Ndịàmà Jehova hà na-atụ anya ka ndị ha na ha na-amụ Baịbụl ghọọkwa Ndịàmà Jehova? A sịgodị na ị chọghị ịbụ Onyeàmà Jehova, i kwesịrị ịma nke bụ́ eziokwu. N’ihi ya, egela asịrị ndị mmadụ na-agba, kama chọpụta nke bụ́ eziokwu. Ilu 14:15 kwuru, sị: “Naanị onye [na-enweghị] uche na ekwenye ihe niile; ma onye nwere uche na-atụle mara nke bụ nke.”—Baịbụl Nsọ Nhazi Katọlik.

Ka Teta! a nyere gị aka ịmatakwu ndị Ndịàmà Jehova bụ na ịma nke bụ́ eziokwu banyere ha. N’eziokwu, na ị na-agụ magazin a gosiri na ị chọrọ ịma nke bụ́ eziokwu banyere ha. N’ihi ya, ọ ga-adị mma ma i mee ihe a: Ka ị na-agụ isiokwu anọ ndị na-eso nke a, jiri Baịbụl gị gụọ amaokwu Baịbụl niile ndị e kwuru okwu ha. * I mee ya, ọ ga-egosi na ị ma ihe, gosikwa na i “nwere ezi obi,” dị ka Baịbụl kwuru.—Ọrụ 17:11.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 7 Ọ bụrụ na i nweghị Baịbụl, i nwere ike jiri otu adres dị na peeji nke 5 dee akwụkwọ ozi ka e wetara gị otu ma ọ bụ gị esi n’adres Ịntanet bụ www.watchtower.org zie ozi ka e zitere gị ya. E nwekwara akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl, ndị dị n’asụsụ karịrị narị atọ na iri asatọ, n’adres Ịntanet ahụ.